Abụ nke 116
Ìhè Na-enwusikwu Ike
1. Ndị amụma chọr’ịma banyere Kraịst,
Onye ’madụ dum n’ele anya ya.
’Mụọ nsọ gwara ha na Mesaya g’abịa,
Na ọ g’abụ Onye Nzọpụta.
Oge eruola, Mesaya n’achị ugbu a,
A’yị n’ahụ ihe n’egosi ya.
Ịmụt’ihe ndị a bụ ezigbo ih’ùgwù,
Ọ bụ ihe ndị ’mụ’ozi chọr’ịma!
(KORỌS)
Ìhè n’enwukwu n’ụzọ anyị;
A’yị n’eje ije n’ehihi’ọcha.
Hụ ihe Chinek’anyị n’ezi anyị;
Ọ n’eduzi nz’ụkwụ anyị dum.
2. Jizọs nyer’anyị ohu ya nwer’uche,
Nke n’eny’anyị nri n’oge ya.
Ìhè nk’eziokwu n’enwusikwu ike taa,
N’eru n’obi, mee k’e che’echiche.
Anyị n’ah’ụzọ, guzosiekwa ike.
Anyị n’eje ije n’ìhè.
Ekele dịrị Jaa, Onye eziokwu,
A’yị ji ọṅụ n’eje ije n’ụzọ ya.
(KORỌS)
Ìhè n’enwukwu n’ụzọ anyị;
A’yị n’eje ije n’ehihi’ọcha.
Hụ ihe Chinek’anyị n’ezi anyị;
Ọ n’eduzi nz’ụkwụ anyị dum.
(Gụọkwa Rom 8:22; 1 Kọr. 2:10; 1 Pita 1:12.)