Isi nke Iri na Abụọ
Nkasi Obi Maka Ndị Chineke
1. Olee atụmanya ọjọọ na-echere Jerusalem na ndị bi n’ime ya, ma olileanya dị aṅaa ka e nwere?
IRI afọ asaa—oge mmadụ na-adịrụkarị ndụ—nke ahụ bụ ogologo oge mba Juda ga-anọ ná ndọrọ n’agha na Babilọn. (Abụ Ọma 90:10; Jeremaịa 25:11; 29:10) Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ndị Israel a dọọrọ n’agha ga-anọ na Babilọn kaa nká, nwụọ. Cheedị otú ịkwa emo na akaje ndị iro ha ga-eme ha ga-esi menye ha ihere. Cheekwa banyere nkọcha ọ ga-ewetara Chineke ha, bụ́ Jehova, mgbe obodo ọ kpọkwasịrị aha ya tọgbọọrọ chakoo ruo nnọọ ogologo oge. (Nehemaịa 1:9; Abụ Ọma 132:13; 137:1-3) Ụlọukwu ahụ ha hụrụ n’anya, nke jupụtara n’ebube Chineke mgbe Solomọn raara ya nye, agakwaghị adị. (2 Ihe E Mere 7:1-3) Lee atụmanya ọjọọ nke ahụ bụ! Ma Jehova, site n’ọnụ Aịsaịa, na-ebu amụma banyere mweghachi. (Aịsaịa 43:14; 44:26-28) N’isi 51 nke akwụkwọ Aịsaịa, anyị na-ahụ amụma ndị ọzọ na-ekwu banyere nkasi obi na mmesighachi obi ike a.
2. (a) Ole ndị ka Jehova na-agwa okwu nkasi obi ya site n’ọnụ Aịsaịa? (b) Olee otú ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi si ‘agbaso ezi omume’?
2 Nye ndị nọ na Juda, bụ́ ndị tinyere obi ha n’ebe ọ nọ, Jehova na-asị: “Geenụ m ntị, unu ndị na-agbaso ezi omume, ndị na-achọ Jehova.” (Aịsaịa 51:1a) ‘Ịgbaso ezi omume’ na-egosipụta ịrụ ọrụ. Ndị “na-agbaso ezi omume” agaghị nanị na-azọrọ na ha bụ ndị Chineke. Ha ga-eji ịnụ ọkụ n’obi gbalịsie ike ịbụ ndị ezi omume na ibi ndụ kwekọrọ n’uche Chineke. (Abụ Ọma 34:15; Ilu 21:21) Ha ga-elekwasị Jehova anya dị ka onye nanị ya bụ Isi Iyi nke ezi omume, ha ‘ga-achọkwa Jehova.’ (Abụ Ọma 11:7; 145:17) Ọ bụghị na ha amatabeghịrịị onye Jehova bụ ma ọ bụ ụzọ isi bịakwute ya n’ekpere. Kama, ha ga-agbalị ịbịarukwu ya nso, na-efe ya ofufe, na-ekpegara ya ekpere, ma na-achọ nduzi ya n’ihe nile ha na-eme.
3, 4. (a) Ònye bụ “oké nkume” ahụ e si na ya wapụta ndị Juu, ònye bụkwa “ọnụ olulu” ahụ e si na ya gwupụta ha? (b) N’ihi gịnị ka icheta ebe ha sitere ga-eji wetara ndị Juu nkasi obi?
3 Otú ọ dị, ndị na-agbaso ezi omume n’ezie dị ole na ole na Juda ma e jiri ha tụnyere ndị na-adịghị agbaso ya, nke a pụkwara ime ka ha nwee ịda mbà n’obi na nkụda mmụọ. Ya mere, site n’iji ihe atụ nke ebe a na-agbari okwute eme ihe, Jehova gbara ha ume, sị: “Legidenụ oké nkume anya nke e siri wapụta unu, legidekwanụ ọnụ olulu nke e siri gwupụta unu. Legidenụ Abraham, bụ́ nna unu, legidekwa Sera nke mụpụtara unu: n’ihi na ọ bụ mgbe ọ bụ nanị otu onye ka M kpọrọ ya, M wee gọzie ya, mee ka ọ baa ụba.” (Aịsaịa 51:1b, 2) “Oké nkume” e si na ya wapụta ndị Juu bụ Abraham, onye a ma ama n’akụkọ ihe mere eme, onye ndị Israel ji anya isi nke ukwuu. (Matiu 3:9; Jọn 8:33, 39) Ọ bụ nna nna, bụ́ mmadụ, onye mụrụ mba ahụ. “Ọnụ olulu” ahụ bụ Sera, onye nna nna ndị Israel bụ́ Aịsak si n’akpa nwa ya pụta.
4 Abraham na Sera agafeela afọ ndụ ha pụrụ ịmụ nwa, ha amụghịkwa nwa. Ma, Jehova kwere nkwa ịgọzi Abraham na ‘ime ka ọ baa ụba.’ (Jenesis 17:1-6, 15-17) Site ná mweghachi Chineke weghachiri ikike ịmụ nwa ha, Abraham na Sera mụrụ otu nwa n’agadi ha, ọ bụkwa n’ebe ọ nọ ka mba ya na Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ sitere. N’ụzọ dị otú a, Jehova mere otu nwoke ahụ nna nke otu nnukwu mba, ndị ọnụ ọgụgụ ha mesịrị ghọọ nke a na-apụghị ịgụta ọnụ, dị ka kpakpando nke eluigwe. (Jenesis 15:5; Ọrụ 7:5) Ọ bụrụ na Jehova pụrụ isi otú a kpọrọ Abraham site n’ala dị anya ma mee ka ọ ghọọ nnukwu mba, n’ezie ọ pụrụ imezu nkwa ya nke ịtọhapụ ndị fọdụrụnụ kwesịrị ntụkwasị obi n’ịbụ ndị e ji eji na Babilọn, weghachi ha n’ala nna ha, ma mee ka ha ghọghachi nnukwu mba. E mezuru nkwa Chineke kwere Abraham; a ga-emezukwa nkwa o kwere ndị Juu ahụ a dọọrọ n’agha.
5. (a) Ole ndị ka Abraham na Sera sere onyinyo ha? Kọwaa. (b) Ná mmezu ikpeazụ ya, olee ndị sitere ‘n’oké nkume ahụ’?
5 Ịgbari okwute ahụ, nke bụ́ ihe atụ, nke e kwuru okwu ya n’Aịsaịa 51:1, 2 yiri ka o nwere ihe ndị ọzọ ọ pụtara. Deuterọnọmi 32:18 kpọrọ Jehova “Oké Nkume ahụ” nke mụrụ Israel na ‘Onye mụpụtara Israel n’ihe mgbu nke ịmụ nwa.’ N’okwu nke ikpeazụ ahụ, e ji otu ngwaa Hibru ahụ dị n’Aịsaịa 51:2 mee ihe n’ihe banyere ọmụmụ Sera mụrụ Israel. N’ihi ya, Abraham nọ dị ka ihe atụ amụma nke Jehova, bụ́ Abraham Ka Ukwuu. Nwunye Abraham, bụ́ Sera, na-ese nnọọ onyinyo nzukọ eluigwe Jehova nke ndị mmụọ nile e kere eke mejupụtara, bụ́ nke nwunye ma ọ bụ nwanyị Chineke na-anọchite anya ya n’Akwụkwọ Nsọ. (Jenesis 3:15; Mkpughe 12:1, 5) Ná mmezu ikpeazụ nke ihe ndị a e kwuru n’amụma Aịsaịa, mba nke sitere ‘n’oké nkume ahụ’ bụ “Israel nke Chineke,” ọgbakọ nke ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ nke a mụrụ na Pentikọst 33 O.A. Dị ka a tụlere n’isiokwu ndị bu ụzọ n’akwụkwọ a, Babilọn dọọrọ mba ahụ n’agha na 1918 ma e weghachiri ha na 1919 n’ọnọdụ nke inwe ọganihu ime mmụọ.—Ndị Galetia 3:26-29; 4:28; 6:16.
6. (a) Gịnị na-echere ala Juda, mweghachi dịkwa aṅaa ga-adị mkpa? (b) Aịsaịa 51:3 na-echetara anyị mweghachi dị aṅaa nke oge a?
6 Nkasi obi Jehova nye Zaịọn, ma ọ bụ Jerusalem, na-agụnye ọ bụghị nanị nkwa ịmụpụta mba bara ụba n’ọnụ ọgụgụ. Anyị na-agụ, sị: “Jehova akasiwo Zaịọn obi: Ọ kasiwo mkpọmkpọ ebe ya nile, mee ka ọzara ya dị ka Iden, mee ka ala ya nke ihe na-adịghị dị ka ubi Jehova a gbara ogige; obi ụtọ na ọṅụ ka a ga-ahụ n’ime ya, na ekele, na olu abụ ọma.” (Aịsaịa 51:3) N’ime afọ 70 ahụ nke ịtọgbọrọ n’efu, ala Juda ga-aghọ ọzara, bụrụ nke ogwu, uke na ahịhịa ọhịa ndị ọzọ jupụtara. (Aịsaịa 64:10; Jeremaịa 4:26; 9:10-12) Ya mere, tinyere ibirighachi na Juda, mweghachi ahụ ga-agụnye iweghachi ala ahụ, bụ́ nke a ga-eme ka ọ ghọọ ogige yiri Iden nke nwere ala ubi na-emepụta ihe na ubi mkpụrụ osisi na-amịpụta mkpụrụ bụ́ ndị mmiri na-ede nke ọma. Ala ahụ ga-eyi ka ọ na-aṅụrị ọṅụ. Ọ bụrụ na e jiri ya tụnyere ntọgbọrọ n’efu ya n’oge ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ, ala ahụ ga-eyi paradaịs. Ihe fọdụrụnụ e tere mmanụ n’ime Israel nke Chineke banyere na paradaịs dị nnọọ otú ahụ n’ụzọ ime mmụọ na 1919.—Aịsaịa 11:6-9; 35:1-7.
Ihe Ndị Mere A Ga-eji Nwee Obi Ike n’Ebe Jehova Nọ
7, 8. (a) Gịnị ka òkù Jehova na-akpọ ka e gee ya ntị pụtara? (b) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka Juda ṅaa Jehova ntị?
7 N’ịkpọ òkù ka a ṅaa ntị ọzọ, Jehova na-ekwu, sị: “Ṅaanụ m ntị, unu ndị m; unu kwa mba nke m, geenụ m ntị: n’ihi na otu iwu ga-esi n’ọnụ m pụta, M ga-emekwa ka ikpe m nwee ọnọdụ ka ọ bụrụ ìhè nke ndị nile. Ezi omume m dị nso, nzọpụta m apụtawo, ogwe aka m abụọ ga-ekpe ndị nile ikpe; àgwàetiti nile ga-ele anya m, ọ bụ ogwe aka m ka ha ga-echere.”—Aịsaịa 51:4, 5.
8 Òkù Jehova na-akpọ ka e gee ya ntị gụnyere ihe karịrị nanị ịnụrụ ozi ya. Ọ pụtara ịṅa ntị iji mee ihe a nụrụ. (Abụ Ọma 49:1; 78:1) Mba ahụ aghaghị ịmata na Jehova bụ Isi Iyi nke ntụziaka, ikpe ziri ezi, na nzọpụta. Ọ bụ nanị ya bụ Isi Iyi nke nghọta ime mmụọ. (2 Ndị Kọrint 4:6) Ọ bụ Ọkàikpe kachasịnụ nke ihe a kpọrọ mmadụ. Iwu na ihe e kpere n’ikpe ndị na-esite n’aka Jehova bụ ìhè nye ndị kwere ka ha na-eduzi ha.—Abụ Ọma 43:3; 119:105; Ilu 6:23.
9. E wezụga ndị ha na Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ, olee ndị ga-erite uru n’ọrụ nzọpụta nke Jehova?
9 Ihe ndị a nile gaje ịbụ eziokwu, ọ bụghị nanị nye ndị ha na Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ, kamakwa nye ndị obi ha ziri ezi nọ n’ebe nile, ọbụna n’àgwàetiti ndị dịkarịsịrị anya nke oké osimiri. Obi ike ha nwere n’ebe Chineke nọ nakwa n’ikike o nwere ime ihe n’ihi ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi na ịzọpụta ha, agaghị akụ afọ n’ala. Ikike ma ọ bụ ike ya, nke ogwe aka ya na-anọchite anya ya, bụ ihe e ji n’aka; ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ igbochi ya. (Aịsaịa 40:10; Luk 1:51, 52) N’otu aka ahụ taa, ọrụ ime nkwusa nke ndị fọdụrụ n’Israel nke Chineke ji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ emewo ka ọtụtụ nde mmadụ, ndị ọtụtụ n’ime ha si n’àgwàetiti ndị dịmiri adịmi nke oké osimiri, chigharịkwute Jehova ma nwee okwukwe na ya.
10. (a) Eziokwu dị aṅaa ka a ga-amanye Eze Nebukadneza ịmata? (b) Olee “eluigwe” na “ụwa” ndị a ga-eme ka ha bịa ná njedebe?
10 Jehova zoziri aka n’otu eziokwu nke Eze Nebukadneza nke Babilọn ga-amụta. Ọ dịghị ihe dị n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa nke pụrụ igbochi Jehova imezu uche ya. (Daniel 4:34, 35) Anyị na-agụ, sị: “Welienụ anya unu lee eluigwe, legidekwanụ ụwa dị n’okpuru: n’ihi na eluigwe ga-apụ n’anya dị ka anwụrụ ọkụ, ụwa ga-akakwa nká dị ka uwe, ndị bi ya ga-anwụkwa dị ka anwụnta: ma nzọpụta m ga-adịru mgbe ebighị ebi, a gaghị ebibikwa ezi omume m.” (Aịsaịa 51:6) Ọ bụ ezie na ịhapụ ndị a dọọrọ n’agha ka ha laa megidere ụkpụrụ ndị eze Babilọn, a gaghị egbochi Jehova ịzọpụta ndị ya. (Aịsaịa 14:16, 17) A ga-etiji “eluigwe,” ma ọ bụ ike ndị na-achị achị, nke Babilọn mgbe a ga-emeri ya. “Ụwa” Babilọn, nke bụ́ ndị nọ n’okpuru ike ndị ahụ na-achị, ga-eji nwayọọ nwayọọ bịa ná njedebe. Ee, ọbụna ike kasịnụ n’oge ahụ agaghị eguzogideli ike Jehova ma ọ bụ gbochie ọrụ nzọpụta ya.
11. N’ihi gịnị ka mmezu zuru ezu nke amụma bụ́ na a ga-eme ka “eluigwe” na “ụwa” nke Babilọn bịa ná njedebe ji bụrụ ihe na-agba ume nye ndị Kraịst taa?
11 Lee ka o si bụrụ ihe na-agba ume nye ndị Kraịst taa ịmata na e mezuru okwu amụma ndị a n’ụzọ zuru ezu! N’ihi gịnị? N’ihi na Pita onyeozi jiri okwu ndị yiri ha mee ihe banyere ihe ka ga-eme n’ọdịnihu. O kwuru okwu banyere ụbọchị Jehova nke ji ọsọ na-abịaru nso, “nke eluigwe ga-ere ọkụ wee laa n’iyi n’ihi ya, ihe nile dị n’eluigwe ga-agbakwa ọkụ wee gbazee!” O kwuziri, sị: “Ma dị ka nkwa Ya si dị, anyị na-ele anya eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke ezi omume bi n’ime ha.” (2 Pita 3:12, 13; Aịsaịa 34:4; Mkpughe 6:12-14) Ọ bụ ezie na mba ndị dị ike na ndị ọchịchị ha dị elu, ndị yiri kpakpando, pụrụ ịma Jehova aka, n’oge nke ya a ga-ebibi ha—gwepịa ha n’ụzọ dị mfe dị ka anwụnta nkịtị. (Abụ Ọma 2:1-9) Ọ bụ nanị ọchịchị ezi omume nke Chineke ga-achị ọha mmadụ na-eme ezi omume ruo mgbe ebighị ebi.—Daniel 2:44; Mkpughe 21:1-4.
12. N’ihi gịnị ka ndị Chineke na-ekwesịghị iji tụọ egwu mgbe ndị mmegide bụ́ ụmụ mmadụ na-ekwutọ ha?
12 N’ịgwa “ndị na-agbaso ezi omume” okwu, Jehova na-ekwuzi, sị: “Geenụ m ntị, unu ndị maara ezi omume, bụ́ ndị ahụ nke iwu m dị n’obi ha; unu atụla egwu ịta ụta mmadụ, unu atụkwala ụjọ nkwulu nile ha. N’ihi na nla ga-erichapụ ha dị ka uwe, ahụhụ ga-erichapụkwa ha dị ka ajị anụ: ma ezi omume m ga-adịru mgbe ebighị ebi, nzọpụta m ga-adịrukwa ọgbọ nile.” (Aịsaịa 51:7, 8) A ga-ekwutọ ma kọchaa ndị na-atụkwasị Jehova obi n’ihi nguzo ha ji obi ike were, ma nke a abụghị ihe a ga-atụ egwu. Ndị nkọcha ahụ bụ ụmụ mmadụ efu na-anwụ anwụ, ndị a “ga-erichapụ” dị ka nla si erichapụ uwe e ji ajị anụ mee.a Dị ka ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie, ezi ndị Kraịst taa enweghị ihe mere ha ga-eji tụọ onye ọ bụla na-emegide ha ụjọ. Jehova, bụ́ Chineke nke mgbe ebighị ebi, bụ nzọpụta ha. (Abụ Ọma 37:1, 2) Nkọcha nke sitere n’aka ndị iro Chineke bụ ihe àmà na-egosi na ndị Jehova nwere mmụọ ya.—Matiu 5:11, 12; 10:24-31.
13, 14. Gịnị ka okwu bụ́ “Rehab” na “ogologo anụ mmiri” sere onyinyo ya, oleekwa otú e si ‘kpọwasịa’ ma ‘mapuo’ ya?
13 Dị ka a ga-asị na ọ na-akpọ Jehova òkù ka o mee ihe maka ndị Ya e ji eji, Aịsaịa na-ekwu, sị: “Teta, teta, yiri ike dị ka uwe, gị ogwe aka Jehova; teta, dị ka n’ụbọchị nile nke mgbe ochie, bụ́ ọgbọ nile nke mgbe nile ebighị ebi gara aga. Ọ́ bụghị gị onwe gị bụ ihe ahụ nke kpọwasịworo Rehab, nke mapuworo ogologo anụ mmiri? Ọ́ bụghị gị onwe gị bụ ihe ahụ nke meworo ka oké osimiri tasịa, bụ́ mmiri nke ogbu mmiri hiri nne; nke meworo ebe nile miri emi nke oké osimiri ka ọ ghọọ ụzọ ndị e meworo ka ha nwere onwe ha ga-esi gabiga?”—Aịsaịa 51:9, 10.
14 E ji nlezianya họrọ ihe atụ ndị ahụ ghọrọ ihe akụkọ ndị Aịsaịa kwuru maka ha. Onye Israel ọ bụla maara banyere mgbapụta a gbapụtara mba ahụ site n’Ijipt na ngafe ha si n’Oké Osimiri Uhie gafere. (Ọpụpụ 12:24-27; 14:26-31) Okwu bụ́ “Rehab” na “ogologo anụ mmiri” na-ezo aka n’ebe Ijipt nke Fero na-achị nọ, bụ́ onye megidere Ọpụpụ nke Israel site n’Ijipt. (Abụ Ọma 74:13; 87:4; Aịsaịa 30:7) N’ịbụ nke malitere n’Ebe Osimiri Naịl Si Gbasaa, ogologo ya agbatịakwa ruo ọtụtụ narị kilomita ruo na Ndagwurugwu Naịl ahụ na-eme nri nke ọma, Ijipt oge ochie yiri ogologo anụ mmiri. (Ezikiel 29:3) Ma e gburisịrị ogologo anụ mmiri a mgbe Jehova wụkwasịrị ya Ihe Otiti Iri ahụ. A mapuru ya, merụọ ya ahụ nke ukwuu, meekwa ka ike ghara ịdị ya mgbe e bibiri usuu ndị agha ya n’ime mmiri nke Oké Osimiri Uhie ahụ. Ee, Jehova gosiri ike nke ogwe aka ya n’ụzọ o si mesoo Ijipt. Ọ̀ bụ na ọ gaghị adịkwa njikere n’otu aka ahụ ịlụrụ ndị ya e mere ka ha jee biri na Babilọn ọgụ?
15. (a) Olee mgbe, ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka iru újú na ize ume nke Zaịọn ga-esi gbalaga? (b) Ole mgbe ka iru újú na ize ume gbalagaara Israel nke Chineke n’oge a?
15 N’ilepụ anya n’ihu ugbu a gaa ná mgbapụta nke Israel site na Babilọn, amụma ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Ndị Jehova a gbapụtara agbapụta ga-alọtakwa, were iti mkpu ọṅụ bata n’ime Zaịọn; ọṅụ ebighị ebi ga-adịkwa n’isi ha: obi ụtọ na ọṅụ ka ha ga-abịarute, iru újú na ize ume agbalawo.” (Aịsaịa 51:11) N’agbanyeghị otú ọnọdụ ha na Babilọn dịruru mwute, ndị na-achọ ezi omume Jehova nwere atụmanya na-enye obi ụtọ. Oge ga-abịa mgbe iru újú na ize ume na-agakwaghị adị. Iti mkpu ọṅụ, ịṅụrị ọṅụ, obi ụtọ—a ga-anụ ihe ndị a n’ọnụ ndị ahụ a zụtaghachiri azụtaghachi, ma ọ bụ, ndị a gbapụtara agbapụta. Ná mmezu nke oge a nke okwu amụma ndị ahụ, a tọhapụrụ Israel nke Chineke ná ndọrọ n’agha nke Babilọn na 1919. Ha ji oké ọṅụ laghachi n’ógbè ime mmụọ ha—ọṅụ nke dịgideworo ruo taa.
16. Gịnị ka o were iji gbapụta ndị Juu?
16 Gịnị ka mgbapụta nke ndị Juu ga-ewe? Amụma Aịsaịa ekpugheworị na Jehova na-enye “Ijipt ka ọ bụrụ ihe mgbapụta gị, . . . Etiopia na Seba n’ọnọdụ gị.” (Aịsaịa 43:1-4) Nke a ga-eme mgbe e mesịrị. Mgbe o merisịrị Babilọn ma tọhapụ ndị Juu a dọọrọ n’agha, Alaeze Ukwu Peasia ga-emeri Ijipt, Etiopia, na Seba. A ga-enye ndị ahụ n’ọnọdụ mkpụrụ obi ndị Israel. Nke a bụ n’ikwekọ n’ụkpụrụ ahụ e kwupụtara n’Ilu 21:18: “Ihe mgbapụta ịgbapụta onye ezi omume ka onye na-emebi iwu bụ; ọzọ, n’ọnọdụ ndị ziri ezi ka onye na-aghọgbu aghọgbu nọ.”
Mmesikwu Obi Ike
17. Gịnị mere na ọ dịghị mkpa ka ndị Juu tụwa ọnụma nke Babilọn egwu?
17 Jehova mesikwuru ndị ya obi ike, sị: “Mụ onwe m, ọbụna Mụ onwe m, bụ Onye ahụ na-akasi unu obi; ònye ka ị bụ, na ị na-atụ egwu mmadụ ga-anwụ anwụ, na ị na-atụ egwu nwa mmadụ nke a ga-eme ka ọ dị ka ahịhịa; i wee chezọọ Jehova Onye meworo gị, Onye na-esetị eluigwe, tọọkwa ntọala ụwa: i wee tụọ oké egwu mgbe nile ogologo ụbọchị nile n’ihi ọnụma nke onye mkpagbu, mgbe o doziri akụ́ ibibi? ma olee ebe ọnụma nke onye [na-agba gị gburugburu] dị?” (Aịsaịa 51:12, 13) Ọtụtụ afọ nke ije biri n’ala ọzọ ka dị n’ihu. N’agbanyeghị nke ahụ, o nweghị ihe mere ha ga-eji tụwa ọnụma nke Babilọn egwu. Ọ bụ ezie na mba ahụ, bụ́ ike ọchịchị ụwa nke atọ n’ihe ndekọ Bible, ga-emeri ndị Chineke ma chọọ ‘ịgba ha gburugburu,’ ma ọ bụ imechi ụzọ ha ga-esi gbapụ, ndị Juu na-ekwesị ntụkwasị obi maara na Jehova ebuwo amụma banyere ọdịda Babilọn site n’aka Saịrọs. (Aịsaịa 44:8, 24-28) N’adịghị ka Onye Okike—Chineke nke mgbe ebighị ebi, bụ́ Jehova—ndị bi na Babilọn ga-ala n’iyi dị ka ahịhịa nke na-akpọnwụ n’ihi oké anwụ n’oge ọkọchị. Mgbe ahụ, olee ebe iyi egwu ha na ọnụma ha ga-adị? Lee ka o si bụrụ amaghị ihe ịtụwa mmadụ egwu ma chezọọ Jehova, bụ́ onye mere eluigwe na ụwa!
18. Ọ bụ ezie na ndị ya ga-abụ ndị mkpọrọ ruo oge ụfọdụ, mmesi obi ike dịgasị aṅaa ka Jehova na-enye ha?
18 Ọ bụ ezie na a ga-adọrọ ndị Jehova n’agha ruo nwa oge, mee ka ha bụrụ ‘ndị mkpọrọ na-ehuda ehuda,’ dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ntọhapụ ha ga-abịa na mberede. A gaghị ekpochapụ ha na Babilọn ma ọ bụ ha anwụọ n’agụụ dị ka ndị mkpọrọ—bụrụ ndị e mere ka ha ghọọ ndị na-adịghị ndụ n’ime Sheol, ya bụ olulu. (Abụ Ọma 30:3; 88:3-5) Jehova na-emesi ha obi ike, sị: “Onye mkpọrọ nke na-ehuda ehuda emewo ngwa ka a tọpụ ya; ọ gaghị anwụkwa wee rịdaa n’olulu, nri ya agaghị akọkwa ụkọ.”—Aịsaịa 51:14.
19. N’ihi gịnị ka ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi pụrụ iji nwee obi ike zuru ezu n’ihe Jehova kwuru?
19 N’ịga n’ihu n’ịkasị Zaịọn obi, Jehova gara n’ihu ikwu, sị: “Mụ onwe m bụkwa Jehova Chineke gị, Onye na-eme ka oké osimiri dere duu, mgbe mmali mmiri ya nile na-ebigbọ: Jehova nke usuu nile nke ndị agha bụ aha Ya. M wee tinye okwu m nile n’ọnụ gị, ọ bụkwa na ndò aka m ka M kpuchiworo gị, ịkụ eluigwe dị ka ihe ọkụkụ, na ịtọ ntọala nke ụwa, na ịsị Zaịọn, Ndị m ka ị bụ.” (Aịsaịa 51:15, 16) Bible kwuru okwu ugboro ugboro banyere ikike Chineke nwere ime ka ike ya ruo n’oké osimiri na ịchịkwa ya. (Job 26:12; Abụ Ọma 89:9; Jeremaịa 31:35) Ọ na-achịkwa n’ụzọ zuru ezu ike nke ihe ndị e kere eke, dị ka o gosipụtara mgbe ọ napụtara ndị ya n’Ijipt. Ònye ka a pụrụ iji tụnyere “Jehova nke usuu nile nke ndị agha” ọbụna n’ụzọ kasị nta?—Abụ Ọma 24:10.
20. Olee “eluigwe” na “ụwa” ndị ga-amalite ịdị mgbe Jehova weghachiri Zaịọn, okwu nkasi obi dịkwa aṅaa ka ọ ga-ekwu?
20 Ndị Juu ka nọgidere na-abụ ndị ha na Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ, Jehova na-emesikwa ha obi ike na ha ga-alaghachi n’ala nna ha, ibirighachi n’okpuru Iwu ya. Ha ga-ewughachi Jerusalem na ụlọukwu ahụ n’ebe ahụ ma maliteghachi ịrụ ọrụ dịịrị ha n’okpuru ọgbụgba ndụ ahụ ya na ha gbara site n’aka Mosis. Mgbe ndị Israel bụ́ ndị si ala ọzọ lọta nakwa anụ ụlọ ha malitere ibijupụtaghachi n’ala ahụ, “ụwa ọhụrụ” ga-amalite ịdị. “Eluigwe ọhụrụ,” bụ́ usoro ọchịchị ọhụrụ ga na-achị ya. (Aịsaịa 65:17-19; Hagaị 1:1, 14) Jehova ga-asịkwa Zaịọn ọzọ: “Ndị m ka ị bụ.”
Òkù Ime Ihe
21. Olee òkù ime ihe nke Jehova kpọrọ?
21 Ebe o mesiworo Zaịọn obi ike, Jehova kpọrọ òkù ka e mee ihe. N’ikwu okwu dị ka a ga-asị na ọ kwụsịla ịta ahụhụ, ọ sịrị: “Teta, teta, bilie, Jerusalem, nke siworo n’aka Jehova ṅụọ iko nke ọnụma Ya; ọkwá ahụ, bụ́ iko nke ịsụ ngọngọ, ka ị ṅụworo, ṅụsịa.” (Aịsaịa 51:17) Ee, Jerusalem aghaghị isi n’ọdachi dakwasịrị ya bilie ma nwetaghachi ọkwá na ịma mma mbụ ya. Oge ga-abịa mgbe ọ ga-aṅụsịworị iko ihe atụ nke ntaramahụhụ sitere n’aka Chineke. Ọ dịghị iwe Chineke nke ga-afọdụ megide ya.
22, 23. Gịnị ga-eme Jerusalem mgbe ọ ṅụrụ iko nke iwe Jehova?
22 Ka o sina dị, ka a nọ na-enye Jerusalem ntaramahụhụ, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ndị bi n’ime ya, “ụmụ” ya, nke ga-enwe ike igbochi ihe na-emenụ. (Aịsaịa 43:5-7; Jeremaịa 3:14) Amụma ahụ na-ekwu, sị: “Ọ dịghị onye ndú o nwere n’etiti ụmụ ndị ikom nile ọ mụworo: ọ dịghịkwa onye na-ejide aka ya n’etiti ụmụ ndị ikom nile o meworo ka ha tozuo okè.” (Aịsaịa 51:18) Lee ka ọ ga-esi taa ahụhụ n’aka ndị Babilọn! “Ihe abụọ ndị a adakwasịwo gị; ònye ga-egosi gị ebere o nwere n’ahụ gị? mbibi na ntikpọ na oké ụnwụ na mma agha: M̀ ga-esi aṅaa kasie gị obi? Ụmụ gị ndị ikom atụbọwo atụbọ, dinaa ala n’isi èzí nile, dị ka anịgọ mara n’ọnyà; ha bụ ndị jupụtara n’ọnụma Jehova, na ịbasi mba ike Chineke gị.”—Aịsaịa 51:19, 20.
23 Jerusalem, ndo! Ọ ga-enweta “mbibi na ntikpọ” nakwa “oké ụnwụ na mma agha.” Ebe ha na-enweghị ike iduzi ya na ime ya ka o bilie, guzoro ọtọ, “ụmụ” ya ga-eguzoro n’emelighị ihe ọ bụla, bụrụ ndị tara ahụ, ndị na-adịghị ike ịchụghachi ndị Babilọn na-awakpo ha azụ. Ha ga-atụbọ, dinara ala n’ihi adịghị ike, n’isi, ma ọ bụ na nkuku okporo ámá dị iche iche n’ebe onye ọ bụla ga na-ahụ ha, bụrụkwa ndị ike gwụsịworo. (Abụ Ákwá 2:19; 4:1, 2) Ha ga-aṅụworị iko nke ọnụma Chineke, ha ga-abụkwa ndị na-adịtụghị ike dị ka anụ mara n’ọnyà.
24, 25. (a) Olee ihe a na-agaghị emekwa ọzọ maka Jerusalem? (b) Ọ bụrụ na Jerusalem ṅụsịa, olee ndị ọzọ ga-aṅụ iko nke iwe Jehova?
24 Ma ajọ ọnọdụ a ga-abịa ná njedebe. Aịsaịa na-ekwu n’ụzọ na-enye nkasi obi, sị: “N’ihi nke a, biko, nụrụ nke a, gị nwanyị e wedara n’ala, nke ihe na-egbukwa, ma ọ bụghị mmanya vine: otú a ka Onyenwe gị sịrị, bụ́ Jehova, na Chineke gị Nke na-ekpe ọnụ ndị Ya n’ikpe, Lee, ewepụwo m n’aka gị iko nke ịsụ ngọngọ, bụ́ ọkwá ahụ nke bụ́ iko nke ọnụma m; ị gaghị aṅụkwa ya ọzọ: ma M ga-etinye ya n’aka ndị na-emekpa gị ahụ; ndị sịrị mkpụrụ obi gị, Huda n’ala, ka anyị wee gabiga: i wee mee ka azụ gị dị ka ala na dị ka èzí nye ndị na-agabiga.” (Aịsaịa 51:21-23) Mgbe o nyesịrị Jerusalem ahụhụ, Jehova dị njikere ime ebere na inwe mmụọ mgbaghara n’ebe ọ nọ.
25 Ugbu a Jehova ga-eme ka iwe ya si n’ebe Jerusalem nọ pụọ ma chee ya ihu n’ebe Babilọn nọ. Babilọn ga-ebibielarị Jerusalem ma wedaa ya n’ala. (Abụ Ọma 137:7-9) Ma Jerusalem agaghị aṅụkwa iko dị otú ahụ ọzọ site n’aka Babilọn ma ọ bụ ndị ha na ya jikọrọ aka. Kama nke ahụ, a ga-anapụ Jerusalem iko ahụ ma nye ya ndị ṅụrịrị ọṅụ mgbe e menyere ya ihere. (Abụ Ákwá 4:21, 22) Babilọn ga-ada n’ihi na ọ ṅụzawo anya. (Jeremaịa 51:6-8) Ka ọ dịgodị, Zaịọn ga-ebili! Lee mgbanwe ọnọdụ nke ahụ bụ! N’eziokwu, atụmanya dị otú ahụ pụrụ ịkasi Zaịọn obi. Ndị ohu Jehova pụkwara ijide n’aka na a ga-edo aha ya nsọ site n’ọrụ nzọpụta ya dị iche iche.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ihe àmà na-egosi na nla a na-ezo aka na ya n’ebe a bụ nla nke na-erikasị ákwà, karịsịa mgbe ọ ka bụ ọtị na-ebibi ihe.
[Foto dị na peeji nke 167]
Jehova, bụ́ Abraham ahụ Ka Ukwuu, bụ “oké nkume” ahụ nke e siri na ya “wapụta” ndị ya
[Foto dị na peeji nke 170]
Ndị na-emegide ndị Chineke ga-apụ n’anya, dị ka uwe nla riri
[Foto dị na peeji nke 176, 177]
Jehova egosipụtawo ike o nwere ịchịkwa ihe ndị e kere eke
[Foto dị na peeji nke 178]
A gaje ibugara Babilọn na ndị ha na ya jikọrọ aka iko ahụ Jerusalem na-aghaghị ịṅụworị