Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jr isi 3 p. 32-42
  • “Gwa Ha Okwu A”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Gwa Ha Okwu A”
  • Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ‘JEHOVA METỤRỤ M AKA N’ỌNỤ’
  • “JEHOVA, Ị GHỌGBUWO M”
  • ‘IKEKWE, HA GA-EGE NTỊ, ONYE Ọ BỤLA AHAPỤ ỤZỌ ỌJỌỌ YA’
  • “Apụghị M Ịgbachi Nkịtị”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • “Etinyewo M Okwu M n’Ọnụ Gị”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • Ị̀ Na-ajụ Kwa Ụbọchị, “Olee Ebe Jehova Nọ?”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • Olee Ụdị Ndị Ị Ga-emeta Enyi?
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
jr isi 3 p. 32-42

ISI NKE ATỌ

“Gwa Ha Okwu A”

1. (a) Olee otú Jizọs na Jeremaya si yie? (b) Gịnị mere anyị ji kwesị iṅomi Jeremaya n’ozi anyị?

JIZỌS KRAỊST bụ onye anyị kacha eṅomi n’ikwusa ozi ọma. Ma anyị kwesịrị iburu n’uche na ndị hụrụ Jizọs na narị afọ mbụ chetara onye amụma bụ́ Jeremaya. (Mat. 16:13, 14) Chineke nyere Jizọs iwu ikwusa okwu ya otú ahụ o nyere Jeremaya. Dị ka ihe atụ, e nwere mgbe Chineke gwara Jeremaya, sị: “Gwa ha okwu a, sị, ‘Nke a bụ ihe Jehova . . . kwuru.’” (Jere. 13:12, 13; Jọn 12:49) Mgbe Jeremaya na-eje ozi ya, ọ kpara àgwà yiri ndị ahụ Jizọs mechara kpaa.

2. Olee otú mkpa ndị mmadụ taa si yie nke ndị Juu n’oge Jeremaya?

2 Ma, ụfọdụ Ndịàmà Jehova nwere ike ịsị: ‘Ozi ọma anyị na-ekwusa dị iche n’ozi Jeremaya kwusara. Ndị ọ gwara ihe Chineke kwuru bụ mba raara onwe ha nye ya, ma ọtụtụ n’ime ndị anyị na-ezi ozi ọma amaghị Jehova.’ Ọ bụ eziokwu. Ma, n’oge Jeremaya, ọtụtụ ndị Juu bụ “ndị nzuzu,” kwụsịkwa ife ezi Chineke. (Gụọ Jeremaya 5:20-22.) Ha kwesịrị ịgbanwe ma ọ bụrụ na ha chọrọ ka Jehova nabata ofufe ha. Otú ahụ ka ọ dị ndị mmadụ taa, ma hà kwuru na ha bụ Ndị Kraịst ma ọ bụ na ha ekwughị. Ha kwesịrị ịmụta ịtụ egwu Jehova ma fee ya n’ezie. Ka anyị chọpụta otú anyị ga-esi fee ezi Chineke ma nyere ndị mmadụ aka, si otú ahụ ṅomie Jeremaya.

Foto dị na peeji nke 33

‘JEHOVA METỤRỤ M AKA N’ỌNỤ’

3. Gịnị ka Chineke mere Jeremaya mgbe ọ malitere ọrụ ya, oleekwa ihe nke ahụ mere ka Jeremaya ghọta?

3 Cheta na mgbe Jeremaya malitere ibu amụma, Jehova gwara ya, sị: “Gakwuru ndị niile m ga-eziga gị ka ị gakwuru; kwuokwa ihe niile m ga-enye gị iwu ka i kwuo. Atụla ihu ha ụjọ, n’ihi na ‘anọnyeere m gị ịnapụta gị,’ ka Jehova kwuru.” (Jere. 1:7, 8) Chineke mere ihe Jeremaya na-atụghị anya ya. Jeremaya gwara anyị, sị: ‘Jehova matịrị aka ya metụ m n’ọnụ. Jehova wee sị m: “Lee, etinyewo m okwu m n’ọnụ gị. Lee, enyefewo m”’ gị ọrụ taa. (Jere. 1:9, 10) Malite mgbe ahụ, Jeremaya ghọtara na ya bụ ọnụ na-ekwuchitere Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile.a Jehova nyeere Jeremaya aka, nke mere ka o jirikwuo ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi ya.—Aịza. 6:5-8.

Foto dị na peeji nke 34
Foto dị na peeji nke 34
Foto dị na peeji nke 34

4. Kọọ ahụmahụ nke ụfọdụ ndị ji ezigbo ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma.

4 Jehova anaghị emetụ ndị ohu ya aka nkịtị taa. Ma ọ na-esi n’ike mmụọ nsọ ya eme ka ha chọsie ike ikwusa ozi ọma. Ọtụtụ n’ime ha na-eji ezigbo ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwanna nwaanyị bi na Spen aha ya bụ Maruka. Aka ya na ụkwụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ kemgbe ihe karịrị afọ iri anọ. Ọ naghị adịrị ya mfe ije ozi site n’ụlọ ruo n’ụlọ. N’ihi ya, o si n’ụzọ ndị ọzọ na-ekwusa ozi ọma. Otu ụzọ bụ ide akwụkwọ ozi. Maruka na-agwa nwa ya nwaanyị ihe ọ ga-ede, ya edee ya. Ná mkpọsa e mere n’otu ọnwa, Maruka na nwa ya nwaanyị zigaara ndị mmadụ ihe karịrị otu narị akwụkwọ ozi na iri ise. Ha na-etinye otu traktị n’envelopu nke ọ bụla. Ha si otú ahụ mee ka ọtụtụ ndị bi n’otu obodo dị ha nso nụ ozi ọma. Maruka gwara nwa ya nwaanyị, sị: “Ọ bụrụ na onye nwere ezi obi anata otu n’ime akwụkwọ ozi ndị a anyị dere, Jehova ga-eme ka anyị nweta onye anyị ga na-amụrụ Baịbụl.” Otu okenye nọ n’ọgbakọ ha dere, sị: “Ana m ekele Jehova n’ihi ụmụnna nwaanyị ndị dị ka Maruka, bụ́ ndị na-akụziri ndị ọzọ iji ihe ndị dị mkpa n’ezie kpọrọ ihe.”

5. (a) Gịnị nyeere Jeremaya aka iji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi Chineke n’agbanyeghị na ndị mmadụ enweghị mmasị? (b) Gịnị ga-enyere gị aka iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma?

5 N’oge Jeremaya, eziokwu Chineke atọghị ọtụtụ n’ime ndị bi na Jeruselem ụtọ. Onye amụma ahụ ọ̀ kwụsịrị ikwusa ozi Chineke n’ihi na ọtụtụ ndị enweghị mmasị n’ihe ọ na-agwa ha? Mbanụ! Jeremaya kwuru, sị: “Ọnụma juru m obi dị ka o juru Jehova. Ike agwụwo m idi ya.” (Jere. 6:10, 11) Gịnị ga-enyere gị aka inwe ụdị ịnụ ọkụ n’obi ahụ Jeremaya nwere? Otu ihe ga-enyere gị aka bụ ịtụgharị uche n’ihe ùgwù na-enweghị atụ i nwere, nke bụ́ ịnọchite anya ezi Chineke. Ị ma na ndị a ma ama n’ụwa a akọchaala aha ezi Chineke. Cheekwa banyere otú ndị ndú okpukpe sirila duhie ndị bi n’ókèala unu, dị ka ndị nchụàjà mere n’oge Jeremaya. (Gụọ Jeremaya 2:8, 26, 27.) Ma, ozi ọma Alaeze Chineke nke ị na-ekwusa na-egosi n’ezie na Chineke na-emere ndị mmadụ amara. (Ákwá 3:31, 32) N’ezie, ịtụgharị uche na nke a ga-enyere gị aka iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma ma na-enyere ndị yiri atụrụ aka.

6. Olee nsogbu ndị tara akpụ Jeremaya nwetara?

6 I nwere ike ikweta na iji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma anaghị adịkarị mfe. Mgbe Jeremaya na-ejere Jehova ozi, o nwetakwara nsogbu ndị tara akpụ. Otu n’ime nsogbu ya bụ ndị amụma ụgha. I nwere ike ịgụ banyere otu ihe atụ na Jeremaya isi iri abụọ na asatọ. Ọtụtụ ndị egeghị ya ntị, o nwekwara mgbe ụfọdụ ọ nọ naanị ya. (Jere. 6:16, 17; 15:17) Ihe ọzọ bụ na e nwere mgbe ndị iro chọrọ igbu ya.—Jere. 26:11.

Gịnị mere i ji kwesị ịtụkwasị Jehova obi na ọ ga-enyere gị aka imeri nsogbu ndị ị na-enwe n’ozi ọma ị na-ekwusa?

“JEHOVA, Ị GHỌGBUWO M”

7, 8. Olee otú nghọgbu Chineke ‘ghọgburu’ Jeremaya si baara ya uru?

7 Ọ dị mgbe ndị mmadụ nọ na-akwa Jeremaya emo ma na-akparị ya kwa ụbọchị, ya agwa Chineke otú obi dị ya. Olee ihe i chere mere Jeremaya 20:7, 8 ji kwuo na Jehova ‘ghọgburu’ onye amụma ya kwesịrị ntụkwasị obi?—Gụọ ya.

8 Ọ pụtaghị na Jehova ji aghụghọ mesie Jeremaya ike. Kama, nghọgbu Chineke ‘ghọgburu’ Jeremaya baara onye amụma ahụ uru. Jeremaya chere na mmegide akarịala, na naanị ya agaghị arụli ọrụ ahụ Chineke nyere ya. Ma ọ rụrụ ya n’ihi na Onye Pụrụ Ime Ihe Niile kwadoro ya ma nyere ya aka. N’ihi ya, i nwere ike ikwu na Jehova meriri Jeremaya, gosi na ike ya karịrị nke Jeremaya na ihe o bu n’obi. Mgbe Jeremaya bụ́ onye nke Chineke chere na ike agwụla ya, Jehova ji ike ya nyere ya aka. N’ihi ya, e nwere ike ikwu na ọ ghọgburu Jeremaya. Chineke gosiri na ike ya karịrị adịghị ike nke onye amụma ahụ. Jeremaya nọgidere na-ekwusa ozi Chineke n’agbanyeghị na ndị mmadụ enweghị mmasị, kpọọ ya asị, na-atakwa ya ahụhụ.

9. Gịnị mere ihe Jeremaya 20:11 kwuru ji kwesị ime ka i nwee obi ike?

9 Jehova nọnyeere Jeremaya ma nyere ya aka, dị ka “dike dị egwu.” (Jere. 20:11) Chineke nwekwara ike inye gị ike ka i jiri ịnụ ọkụ n’obi na-akwado ezi ofufe ma na-ejere ya ozi n’agbanyeghị nsogbu ndị tara akpụ na-abịara gị. Ị ga-ahụ na Jehova ga-adị ka “dike dị egwu” nke na-akwado gị.

10. Gịnị ka i kpebisiri ike ime mgbe a na-emegide gị?

10 Pọl onyeozi mere ka okwu a doo anya mgbe ọ na-agba Ndị Kraịst a na-akpagbu ume. O dere, sị: “Na-akpanụ àgwà n’ụzọ kwesịrị ozi ọma banyere Kraịst, ka m wee nụ . . . na unu guzosiri ike n’otu mmụọ, jiri otu mkpụrụ obi na-agbakọ mbọ maka okwukwe nke sitere n’ozi ọma, gharakwa ịbụ ndị ndị na-emegide unu na-emenye ụjọ n’ụzọ ọ bụla.” (Fil. 1:27, 28) Dị ka Jeremaya na Ndị Kraịst narị afọ mbụ mere, i nwere ike ịtụkwasị Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile obi ka ị na-eje ozi gị. N’ezie, i kwesịrị ime otú ahụ. Ọ bụrụ na ụfọdụ ndị akparịa gị ma ọ bụ lụso gị ọgụ, cheta na Jehova nọnyeere gị, na o nwekwara ike inye gị ike. Ọ bụ ihe o meere Jeremaya na ọtụtụ ụmụnna gị n’oge anyị a; n’ihi ya, o nwere ike imere gị otú ahụ. Rịọsie ya ike ka o nyere gị aka. Nweekwa obi ike na ọ ga-aza ekpere gị. I nwekwara ike ịchọpụta na a ‘ghọgbuola’ gị mgbe Chineke na-enye gị ike iji obi ike na-emeri nsogbu n’atụghị ụjọ. N’ezie, i nwere ike ime ihe karịrị ihe i chere na ị ga-emeli.—Gụọ Ọrụ Ndịozi 4:29-31.

11, 12. (a) Olee mgbanwe ndị i nwere ike ime ka i nwee ike inwetakwu ndị ị ga-ezi ozi ọma? (b) Olee ihe ị mụtara na foto dị na peeji nke 39 nke i nwere ike ime n’ókèala unu?

11 E nwere ụzọ dị iche iche ihe anyị na-agụ banyere ozi Jeremaya nwere ike isi nyere anyị aka imekwu nke ọma n’ikwusa ozi ọma. Mgbe ọ rụrụ ọrụ ibu amụma Jehova nyere ya ruo ihe karịrị afọ iri abụọ, o kwuru, sị: “M wee na-agwa unu okwu, na-ebili n’isi ụtụtụ na-ekwu okwu, ma unu egeghị ntị.” (Jere. 25:3) N’ezie, ọ na-amalite n’oge kama ịmalite mgbe oge gaferela. È nwere ihe ga-abara anyị uru anyị nwere ike ịmụta n’ihe a o mere? N’ọtụtụ ọgbakọ, e nwere ndị nkwusa na-ebili n’isi ụtụtụ gaa zie ndị mmadụ ozi ọma n’ebe ụgbọala ma ọ bụ ụgbọ okporo ígwè na-akwụsị. N’ime ime obodo, ọtụtụ ụmụnna anyị na-eji ụtụtụ agakwuru ndị ọrụ ugbo na ndị ọzọ na-arụ ọrụ n’ụdị oge ahụ ma zie ha ozi ọma. È nwere ụzọ ndị ọzọ i chetara i nwere ike isi mee ihe a Jeremaya mere mgbe o ji ikwesị ntụkwasị obi na-eje ozi ya? Ọ́ gaghị adị mma ka ị na-ebili n’oge ka i nwee ike ịnọ mgbe a na-amalite nzukọ ozi ubi ọgbakọ mara ọkwa ya?

12 Ihe ọzọ bụ na ikwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’oge ehihie na n’oge mgbede na-arụpụtakarị ihe magburu onwe ya n’ọtụtụ ebe. Ụfọdụ ndị nkwusa na-ekwusakwa ozi ọma n’abalị. Ha na-aga n’ebe a na-ere mmanụ ụgbọala, n’ụlọ nri, na ebe ndị ọzọ ndị mmadụ na-achụ nta ego ehihie na abalị. Ì nwere ike ịhazigharị ihe ndị ị na-eme ka i nwee ike ịga zie ndị mmadụ ozi ọma mgbe o yikarịrị ka ị̀ ga-enweta ha n’ụlọ ma ọ bụ n’ebe ọzọ?

Gịnị mere obi ji sie gị ike na Jehova nọnyeere gị ka ị na-ezisa ozi ya?

13, 14. (a) Olee otú ihe nlereanya Jeremaya si gbasa ịga nletaghachi? (b) Gịnị gosiri na anyị kwesịrị imezu nkwa anyị kwere banyere ime nletaghachi?

13 Ọ dị mgbe Jehova nyere Jeremaya iwu ka ọ gaa guzoro n’ọnụ ụzọ ámá nke ụlọ nsọ ya ma ọ bụ nke Jeruselem buo amụma. (Jere. 7:2; 17:19, 20) Ịnọ n’ọnụ ụzọ ámá buo amụma ahụ mere ka Jeremaya gwa ọtụtụ ndị okwu Jehova. Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị, ma ndị a ma ama ma ndị ahịa ma ndị ọzọ na-achụ nta ego, na-esikarị n’ọnụ ụzọ ámá ahụ agafe, o nwere ike ịbụ na ọ gwara ụfọdụ ndị okwu ugboro ugboro iji nyere ha aka ịghọta ihe ha nụrụ n’oge gara aga. N’ihe banyere iletaghachi ndị gosiri mmasị, olee ihe anyị kwesịrị ịmụta n’ihe a Jeremaya mere?

14 Jeremaya ma na ọrụ ibu amụma Chineke nyere ya nwere ike ime ka ndị mmadụ dị ndụ. Mgbe Jeremaya na-enweghị ike ịga zie ndị mmadụ ozi Chineke, o dunyere Barọk bụ́ enyi ya ka ọ gaa nọchite anya ya. (Gụọ Jeremaya 36:5-8.) Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie ihe a Jeremaya mere? Ọ bụrụ na anyị agwa onye nwe ụlọ na anyị ga-abịa ọzọ, ànyị na-eme ihe anyị kwuru? Ọ bụrụ na anyị enweghị ike imezu nkwa anyị kwere ịga mụọrọ mmadụ ihe ma ọ bụ zaa ya ajụjụ ọ jụrụ, ànyị na-agwa onye ọzọ ka ọ gaa nọchite anya anyị? Jizọs kwuru, sị: “Ka Ee unu kwuru bụrụ Ee.” (Mat. 5:37) Anyị kwesịrị ime ihe anyị kwuru, n’ihi na anyị na-anọchite anya Chineke nke na-ekwu eziokwu ma na-eme ihe n’usoro.—1 Kọr. 14:33, 40.

Foto dị na peeji nke 39

Ị̀ hazigharịala ihe ị na-eme nakwa otú i si ekwusa ozi ọma ka i nwee ike izi ọtụtụ ndị ozi ọma?

15, 16. (a) Olee otú ọtụtụ ndị sirila wepụtakwuo oge ije ozi ọma, si otú ahụ na-eṅomi Jeremaya? (b) Gịnị ka ị mụtara n’ihe nwanna nwaanyị ahụ si Chili, e sere na peeji nke 40, mere?

15 Jeremaya degaara ndị Juu nọ na Babịlọn akwụkwọ ozi ma gwa ha “okwu dị mma” Jehova kwuru na ya ga-akpọlata ha Jeruselem. O si otú ahụ gbaa ha ume. (Jere. 29:1-4, 10) Taa, anyị nwere ike iji akwụkwọ ozi ma ọ bụ ekwe ntị gwa ndị mmadụ “okwu dị mma” Jehova ga-emezu n’oge na-adịghị anya. Ì nwere ike isi otú ahụ nyere ndị ikwu gị ma ọ bụ ndị ọzọ aka ma ọ bụrụ na ha bi n’ebe dị anya ma ọ bụ na ọ na-esi ike inweta ha n’ụlọ?

16 Jeremaya jezuru ozi ya. Ọtụtụ ndị nkwusa Alaeze taa na-eṅomi ya ma na-arụpụta ihe dị mma. Otu nwanna nwaanyị n’obodo Chili gakwuuru otu nwaanyị si n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè, nke dị n’okpuru ala, na-apụ. Nwaanyị ahụ nwere obi ụtọ mgbe ọ nụrụ ihe Baịbụl kwuru. O kwetara ka nwanna nwaanyị ahụ bịa n’ụlọ ya mụwara ya ihe. Ma nwanna nwaanyị ahụ edetughị adres nwaanyị ahụ. Mgbe o chetara na ọ dị mkpa ka o nyere nwaanyị ahụ gosiri mmasị aka ịmụtakwu eziokwu, ọ rịọrọ Jehova n’ekpere ka o nyere ya aka. Ọ gaghachiri n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè ahụ n’ụdị oge ahụ n’echi ya. Ọ hụrụ nwaanyị ahụ ọzọ. O detuziri adres ya ma mechaa gaa n’ụlọ ya inyere ya aka ịghọta Baịbụl. Chineke ga-ekpe ụwa Setan ikpe n’oge na-adịghị anya. Ma ndị chegharịrịnụ, nweekwa okwukwe n’ozi ọma, nwere olileanya. (Gụọ Abụ Ákwá 3:31-33.) N’ihi ya, ka anyị na-ekwusasi ozi ọma ike n’ókèala anyị, si otú ahụ gosi na anyị chọrọ ka a zọpụta ndị mmadụ.

Foto dị na peeji nke 40

Ị̀ na-eme ihe i kwesịrị ime iji nyere ndị niile ị hụrụ na ha nwere mmasị aka?

‘IKEKWE, HA GA-EGE NTỊ, ONYE Ọ BỤLA AHAPỤ ỤZỌ ỌJỌỌ YA’

17. N’ókèala unu, olee otú i nwere ike isi ṅomie ihe Jeremaya mere?

17 Jehova achọghị ka ndị Juu nwụọ. Ihe dị ka afọ iri tupu e bibie Jeruselem, Jehova si n’ọnụ Jeremaya kwuo olileanya ndị ahụ ndị Babịlọn dọọrọ n’agha kwesịrị inwe. O kwuru, sị: “M ga na-ele ha anya ọma, m ga-emekwa ka ha lọta n’ala a. M ga-ewu ha dị ka ụlọ, agaghị m akwatu ha; m ga-akụ ha dị ka osisi, agaghịkwa m efopụ ha.” Jeremaya gwara ha, sị: ‘Olileanya dịịrị unu n’ọdịnihu.’ (Jere. 24:6; 26:3; 31:17) Jeremaya lere ndị mmadụ anya otú Chineke si ele ha. O ji obi ya niile na-eje ozi ya, na-agwa ha ihe Jehova chọrọ ka ha mee, ya bụ, “Biko, onye ọ bụla hapụ ụzọ ọjọọ ya, meenụ ka omume unu dị mma.” (Jere. 35:15) Ọ̀ dị ụzọ ndị ọzọ i chetara ị ga-esi gosi na ihe banyere ndị bi n’ókèala unu na-emetụ gị n’obi nke ukwuu?

18, 19. (a) Ka anyị na-ekwusa ozi ọma, olee echiche na-ezighị ezi anyị kwesịrị izere? (b) Olee àgwà Jeremaya anyị kwesịrị inwe?

18 O nweghị mgbe ịhụnanya Jeremaya hụrụ ndị mmadụ jụrụ oyi. Mgbe e bibiri Jeruselem, ọ ka nwekwaara ha obi ebere. (Gụọ Abụ Ákwá 2:11.) Ndị Juu ji isi ha kote ọdachi ahụ dakwasịrị ha. Ma, Jeremaya asịghị ha, ‘Ọ̀ kwa m gwara unu agwa?’ Kama nke ahụ, ihe mere ha wutere ya nke ukwuu. N’otu aka ahụ, ozi anyị ekwesịghị ịbụ ihe e ji emezu iwu, ya bụ, ihe na-esighị anyị n’obi. Mgbalị anyị na-eme izi ndị mmadụ ozi ọma kwesịrị igosi na anyị hụrụ Chineke anyị dị ebube n’anya nke ukwuu, nakwa ndị mmadụ, bụ́ ndị o kere n’oyiyi ya.

Foto dị na peeji nke 42

Ị̀ na-egosi ndị mmadụ na ị chọrọ ka ihe dịrị ha mma?

19 Ọ dịghị ihe ùgwù ma ọ bụ ọkwá e nwere n’ụwa a nke karịrị ịbụ Onyeàmà ezi Chineke anyị. Ọ bụ otú ọ dị Jeremaya n’obi, nke mere o ji dee, sị: “Okwu gị ruru m aka, m wee rie ya; okwu gị wee bụrụ ihe na-enye m ọṅụ na ihe na-eme ka obi tọọ m ụtọ; n’ihi na a kpọkwasịwo m aha gị, Jehova.” (Jere. 15:16) Ozi ọma anyị na-ekwusa nwere ike ime ka ọtụtụ ndị bịa mara Onye ahụ nyere ha ndụ ma hụ ya n’anya. Ọ bụrụ na anyị ejiri ịnụ ọkụ n’obi na ịhụnanya na-eje ozi Chineke, dị ka Jeremaya mere, anyị ga-enyere ọtụtụ ndị aka ime otú ahụ.

N’ihi ihe nlereanya Jeremaya, olee ụzọ ndị ọzọ i nwere ike isi kwusaa “okwu dị mma” nke Jehova n’ọdịnihu?

a E nwere ọtụtụ mgbe Jehova zitere ndị mmụọ ozi ya, ha ekwuo okwu ka à ga-asị na ọ bụ ya na-ekwu. Ọ bụ otú ahụ ka o mere na nke Jeremaya.—Ikpe 13:15, 22; Gal. 3:19.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya