-
Gịnị Bụ Uche Chineke?Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
-
-
Gịnị Bụ Uche Chineke?
Chineke chọrọ ka anyị biri n’udo, nweekwa obi ụtọ. Ọ chọkwara ka ụwa anyị a ghọọ paradaịs ebe anyị ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi.
Ma, i nwere ike ịna-eche ma nke ahụ ò nwere ike ime eme. Baịbụl kwuru na Alaeze Chineke ga-eme ya. O kwukwara na ọ bụ uche Chineke ka mmadụ niile mara gbasara Alaeze ahụ, marakwa ihe Chineke bu n’obi imere anyị.—Abụ Ọma 37:11, 29; Aịzaya 9:7.
Chineke chọrọ ka anyị baara onwe anyị uru.
Nna ọ bụla hụrụ nwa ya n’anya na-achọ ka ihe gaziere ya. Otú ahụkwa ka Nna anyị nke eluigwe chọrọ ka ihe gaziere anyị, ya bụ, ka anyị nwee obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi. (Aịzaya 48:17, 18) O kwere nkwa na ‘onye na-eme uche ya ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.’—1 Jọn 2:17.
Chineke chọrọ ka anyị jee ije n’ụzọ ya.
Baịbụl kwuru na Chineke ‘na-akụziri anyị ụzọ ya,’ ka anyị nwee ike ‘ije ije na ya.’ (Aịzaya 2:2, 3) O ‘wepụtarala aha ya otu ndị,’ ka ha mee ka a mara uche ya n’ụwa niile.—Ọrụ Ndịozi 15:14.
Chineke chọrọ ka ndị na-efe ya dịrị n’otu.
Ife Jehova na-eme ka ndị mmadụ hụ ibe ha n’anya ma dị n’otu, ọ naghị ekewa ha. (Jọn 13:35) Ole ndị taa na-akụziri ndị mmadụ otú ha ga-esi jiri otu obi na-efe Chineke? Gbalịa gụọ broshọ a, ọ ga-enyere gị aka ịmata ha.
-
-
Olee Ụdị Ndị Anyị Bụ?Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
-
-
ISI NKE 1
Olee Ụdị Ndị Anyị Bụ?
Denmak
Taịwan
Venezuwela
India
Ndịàmà Jehova ole ka ị ma? Ụfọdụ n’ime anyị nwere ike ịbụ ndị agbata obi gị, ndị gị na ha na-arụ ọrụ ma ọ bụ ụmụ klas unu. O nwekwara ike ịbụ na o nweela mgbe anyị na gị kwurịtara ihe dị na Baịbụl. Ànyị bụ ndị ole? Gịnị mere anyị ji ezi ndị mmadụ ozi ọma?
Anyị bụ mmadụ ibe gị. E nwere ụfọdụ n’ime anyị bụ́ ndị ọgaranya, nwee ndị na-enweghị ego, nweekwa ndị gụrụ akwụkwọ na ndị na-agụghị akwụkwọ. Ụfọdụ n’ime anyị nọbu n’okpukpe dị iche iche. E nwedịrị ndị nke na-ekwebughị na Chineke dị. Ma, tupu anyị aghọọ Ndịàmà Jehova, anyị wepụtara oge mụọ Baịbụl nke ọma. (Ọrụ Ndịozi 17:11) Anyị nabatara ihe anyị mụtara, jirikwa aka anyị kpebie na anyị ga-efe Jehova.
Ịmụ Baịbụl na-abara anyị uru. Anyị ezughị okè otú ahụ mmadụ niile na-ezughị okè, o nwekwara ihe ndị anyị na-anaghị emetacha. Ma, mbọ anyị na-agba kwa ụbọchị ịmụ Baịbụl emeela ka àgwà anyị dịkwuo mma. (Abụ Ọma 128:1, 2) Ọ bụ ya bụ otu n’ime ihe mere anyị ji agwa ndị mmadụ ihe ndị anyị na-amụta na Baịbụl.
Anyị na-eme ihe Baịbụl kwuru. Baịbụl na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-akpa àgwà. Ihe ndị ọ na-akụziri anyị na-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ ma na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù. Ọ na-emekwa ka anyị na-ekwu eziokwu ma na-emere ndị ọzọ ihe ọma. Ihe Baịbụl na-akụziri anyị na-eme ka anyị baara obodo anyị uru. Ọ na-emekwa ka udo dịrị n’ezinụlọ anyị dị iche iche. Ebe anyị ma na “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu,” anyị na ụmụnna anyị dị n’otu n’ụwa niile. Anyị hụrụ ha niile n’anya n’agbanyeghị agbụrụ ha si, anyị anaghịkwa ese okwu n’ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọ bụ eziokwu na o nweghị onye n’ime anyị zuru okè, anyị dị iche.—Ọrụ Ndịozi 4:13; 10:34, 35.
Olee ihe gosiri na Ndịàmà Jehova dị ka ndị ọzọ?
Olee ihe Ndịàmà Jehova mụtarala na Baịbụl?
-
-
Gịnị Mere Anyị Ji Na-aza Ndịàmà Jehova?Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
-
-
ISI NKE 2
Gịnị Mere Anyị Ji Na-aza Ndịàmà Jehova?
Noa
Ebreham na Sera
Mozis
Jizọs Kraịst
Ọtụtụ ndị na-eche na okpukpe Ndịàmà Jehova bụ okpukpe ọhụrụ. Ma, kemgbe ihe karịrị puku afọ abụọ na narị asaa gara aga, Chineke kpọrọ ndị na-efe ya “ndị àmà” ya. (Aịzaya 43:10-12) Tupu afọ 1931, ihe a na-akpọ anyị bụ Ndị Mmụta Baịbụl. Gịnịzi mere anyị ji malite ịza Ndịàmà Jehova?
E ji ya mara Chi anyị na-efe. N’Akwụkwọ Nsọ ndị e dere n’oge ochie, aha Chineke bụ́ Jehova pụtara ihe karịrị ugboro puku asaa. N’ọtụtụ Baịbụl ndị e nwere taa, e jirila utu aha ndị dị ka Onyenwe Anyị ma ọ bụ Chineke dochie ya. Ma, mgbe Chineke gwara Mozis na aha ya bụ Jehova, ọ sịrị ya: “Nke a bụ aha m ruo mgbe ebighị ebi.” (Ọpụpụ 3:15) O ji nke a gosi na ya dị iche na chi ụgha niile ndị mmadụ na-efe. Obi dị anyị ụtọ na anyị bụ Ndịàmà Jehova.
E ji ya ama ọrụ anyị na-arụ. Ọtụtụ ndị fere Chineke n’oge ochie gbaara ndị ọzọ àmà gbasara okwukwe ha nwere n’ebe Jehova nọ. Onye mbụ n’ime ha bụ Ebel, onye ezi omume. Ka oge na-aga, Noa, Ebreham, Sera, Mozis, Devid na ndị ọzọ bịara soro ná ndị Baịbụl kpọrọ “oké ìgwè ndị àmà.” (Ndị Hibru 11:4–12:1) Anyị kpebisiri ike na anyị ga na-eme ka ndị mmadụ mara nke bụ́ eziokwu gbasara Chineke anyị otú ahụ mmadụ nwere ike kpebie na ya ga-aga n’ụlọikpe gbaara onye aka ya dị ọcha akaebe.
O gosiri na anyị na-eme ka Jizọs. Baịbụl kwuru na Jizọs bụ “ezi onye àmà nke kwesịrị ntụkwasị obi.” (Mkpughe 3:14) Jizọs ji ọnụ ya kwuo na ya mere ‘ka a mara aha Chineke’ nakwa na ya ‘gbaara eziokwu gbasara Chineke àmà.’ (Jọn 17:26; 18:37) N’ihi ya, ezigbo ndị na-eso ụzọ Kraịst ga-abụrịrị ndị a kpọkwasịrị aha Jehova. Ha kwesịkwara ime ka ndị ọzọ mara aha ahụ. Ọ bụ ya ka Ndịàmà Jehova na-agba mbọ na-eme.
Gịnị mere Ndị Mmụta Baịbụl ji zawa Ndịàmà Jehova?
Olee mgbe Jehova bidoro inwe ndị àmà n’ụwa?
Olee Onyeàmà kacha ndị àmà niile Jehova nwerela?
-