-
Gịnị Mere Anyị Ji Aga Mgbakọ?Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
-
-
ISI NKE 11
Gịnị Mere Anyị Ji Aga Mgbakọ?
Meksiko
Jamanị
Bọtswana
Nikaragua
Ịtali
Olee ihe mere ihu ji bụrụ ndị e sere na peeji a ọchị ọchị? Ha nọ mgbakọ Ndịàmà Jehova. Chineke nyere ụmụ Izrel iwu ka ha na-aga mgbakọ ugboro atọ n’afọ. Obi na-adị ha ụtọ ịga mgbakọ ndị ahụ. Taa, ọ na-adịkwa anyị ka oge anyị ga-aga mgbakọ mee ruwe eru. (Diuterọnọmi 16:16) Anyị na-enwe mgbakọ atọ n’afọ. Otu bụ mgbakọ ukwu. Ọ na-ewe abalị atọ. Mgbakọ abụọ ndị ọzọ bụ mgbakọ sekit. Ọ na-ewe otu ụbọchị, ma a na-enwe ya ugboro abụọ n’afọ. Olee uru ịga mgbakọ ndị a na-abara anyị?
Ha na-eme ka anyị matakwuo ụmụnna anyị. Aṅụrị na-eju ụmụ Izrel obi ma ha nọrọ “n’etiti ìgwè ndị zukọrọ ọnụ” na-eto Jehova. Anyịnwa na-enwekwa obi ụtọ ma anyị na ụmụnna anyị zukọta ná mgbakọ na-efe Jehova. (Abụ Ọma 26:12; 111:1) Anyị bịa mgbakọ ndị a, anyị na ụmụnna anyị ndị si ọgbakọ dị iche iche ma ọ bụ ndị si mba ndị ọzọ na-akpakọrịta. Ihe ọzọ na-eme anyị obi ụtọ bụ na anyị na ụmụnna anyị na-erikọ nri ma a gbasaa nnọkọ nke ụtụtụ. (Ọrụ Ndịozi 2:42) Ná mgbakọ ọ bụla anyị gara, anyị na-ahụ ihe na-eme ka obi sikwuo anyị ike na anyị hụrụ ‘ụmụnna anyị dum n’anya.’—1 Pita 2:17.
Ha na-enyere anyị aka ime uche Chineke. Uru ọzọ ụmụ Izrel na-erite ma ha gaa mgbakọ bụ na a na-akọwara ha Okwu Chineke nke ọma, ha aghọta ya. (Nehemaya 8:8, 12) Anyịnwa na-ejikwa ihe ndị a na-akụziri anyị ma anyị gaa mgbakọ akpọrọ ihe. Ihe a na-atụle ná mgbakọ nke ọ bụla na-abụ ihe si na Baịbụl. A na-ekwu okwu dị iche iche, ndị mmadụ na-apụtakwa kọọ otú ha si merie nsogbu ha nwere, mgbe ụfọdụkwa ha egosi ndị bịaranụ otú ihe ahụ si mee. Ihe a niile na-enyere anyị aka ịna-eme uche Chineke. A na-akọkwara anyị otú ụmụnna anyị si na-agba mbọ ife Chineke n’oge a ihe siri ezigbo ike. Nke a na-emekwa ka anyị kpebisikwuo ike ịna-eme uche Chineke. Anyị gaa mgbakọ ukwu, a na-enwe ndị na-apụta mee ihe anyị na-akpọ Ihe Nkiri. Ọ na-abụkarị akụkọ si na Baịbụl. Ihe nkiri ahụ na-enyere ndị bịara mgbakọ ahụ aka ịghọtakwu otú ihe ahụ a kọrọ na Baịbụl si mee na ihe anyị kwesịrị ịmụta na ya. Ná mgbakọ ọ bụla anyị gara, a na-eme ndị nyeferela Chineke onwe ha baptizim.
Gịnị mere aṅụrị ji eju anyị obi ma anyị gaa mgbakọ?
Olee uru ị ga-erite ma ị bịa mgbakọ anyị?
-
-
Olee Otú E Si Hazie Ozi Ọma Anyị Na-ekwusa?Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
-
-
ISI NKE 12
Olee Otú E Si Hazie Ozi Ọma Anyị Na-ekwusa?
Spen
Belarus
Họng Kọng
Peruu
Obere oge tupu Jizọs anwụọ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Matiu 24:14) Ma, olee otú a ga-esi kwusaa ozi ọma ahụ n’ụwa niile? Ọ bụ ma e kwusaa ya otú ahụ Jizọs si kwusaa ya mgbe ọ nọ n’ụwa.—Luk 8:1.
Anyị na-agba mbọ gakwuru ndị mmadụ n’ụlọ ha. Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke site n’ụlọ ruo n’ụlọ. (Matiu 10:11-13; Ọrụ Ndịozi 5:42; 20:20) A gwara Ndị Kraịst oge ochie ebe ha ga-aga zie ozi ọma. (Matiu 10:5, 6; 2 Ndị Kọrịnt 10:13) N’otu aka ahụ taa, a haziri otú anyị ga-esi na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke ahazi. Ọgbakọ ọ bụla nwekwara ebe ha na-ekwusa ozi ọma. Nke a na-enyere anyị aka ‘ikwusara ndị mmadụ ozi ọma na ịgbara ha àmà nke ọma’ otú ahụ Jizọs gwara anyị mee.—Ọrụ Ndịozi 10:42.
Anyị na-agbalị gakwuru ndị mmadụ ebe ọ bụla anyị nwere ike ihu ha. Jizọs ziri ndị mmadụ ozi ọma n’ebe ọ bụla ọ hụrụ ha. O nwedịrị ndị ọ nọ n’ikpere mmiri zie ozi ọma, nweekwa onye nke o ziri ozi ọma mgbe ọ bịara isere mmiri n’olulu mmiri. (Mak 4:1; Jọn 4:5-15) Anyịnwakwa na-ezi ndị mmadụ ozi ọma n’ebe ọ bụla anyị hụrụ ha, ma ọ̀ bụ n’okporo ámá ma ọ̀ bụ n’ebe ha na-anọ achụ afọ ha ma ọ̀ bụkwanụ n’ebe ha na-anọkarị atụrụ ndụ. Anyị na-ejidị ekwentị ezi ndị mmadụ ozi ọma. Anyị anaghịkwa agbachi nkịtị ghara izi ndị agbata obi anyị na ndị ọrụ ibe anyị ozi ọma ma ihe a ga-eji zie ha ozi ọma mee. Anyị na-agbakwa mbọ zie ụmụ akwụkwọ ibe anyị ozi ọma n’ụlọ akwụkwọ. Anyị esila ụzọ ndị a niile kwusaara ọtụtụ ndị n’ụwa “ozi ọma banyere nzọpụta.”—Abụ Ọma 96:2.
Ò nwere onye i chetara i nwere ike izi ozi ọma, kọọrọ ya ihe Alaeze Chineke ga-emere ya n’ọdịnihu? Ọ bụrụ na e nwere, gakwuru ya ozugbo.
Olee “ozi ọma” e kwesịrị ikwusa?
Olee otú o si bụrụ na Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma otú ahụ Jizọs si kwusaa ya?
-
-
Ònye Bụ Ọsụ Ụzọ?Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
-
-
ISI NKE 13
Ònye Bụ Ọsụ Ụzọ?
Kanada
Ọ na-aga ozi ụlọ n’ụlọ
Ọ na-amụrụ mmadụ ihe
Ọ na-amụ ihe
Jizọs bụ ọsụ ụzọ n’ụdị nke ya, n’ihi na Chineke zitere ya n’ụwa ka ọ bịa zie ndị mmadụ ozi ọma. Ọ bụrụ na ha anabata ozi ọma ahụ, a ga-azọpụta ha. (Matiu 20:28) Taa, ndị na-eso ụzọ ya na-eme ụdị ihe ahụ o mere. Ha na-aga ‘na-eme ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ’ Jizọs. (Matiu 28:19, 20) Ụfọdụ n’ime ha aghọọla ndị anyị na-akpọ ndị ọsụ ụzọ oge niile.
Ọsụ ụzọ bụ onye na-ekwusa ozi ọma mgbe niile. Ndịàmà Jehova niile na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ma, ụfọdụ n’ime ha ahaziela oge ha ka ha nwee ike ịbụ ndị ọsụ ụzọ oge niile. Ha na-eji awa iri asaa aga ozi ọma kwa ọnwa. Ọtụtụ n’ime ha anaghị eji ụbọchị niile dị n’izu achụ afọ ha, ka ha nwee ike na-aga ozi ọma otú ha chọrọ. A na-ahọrọ ụfọdụ n’ime ha ka ha bụrụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. A họrọ ha, e ziga ha n’ebe a na-enwechaghị ndị na-ekwusa ozi ọma. Ha na-eji otu narị awa na iri atọ ma ọ bụ karịa aga ozi ọma kwa ọnwa. Ndị ọsụ ụzọ anaghị achụ ihe onwunwe ka à na-anwụ anwụ. Ihe ọ bụla ha nwere na-eju ha afọ. Obi na-esikwa ha ike na Jehova ga-egboro ha mkpa ha. (Matiu 6:31-33; 1 Timoti 6:6-8) Ndị na-enweghị ike ịbụ ndị ọsụ ụzọ oge niile ma ọ bụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche nwere ike bụrụ ndị ọsụ ụzọ inyeaka. Ha na-eji iri awa atọ ma ọ bụ iri awa ise aga ozi ọma n’ọnwa.
Ọsụ ụzọ hụrụ Chineke na ụmụ mmadụ n’anya. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ chọpụtara na e nwere ọtụtụ ndị chọrọ ịma banyere Jehova na nzube ya. Anyị chọpụtakwara otu ihe ahụ taa. (Mak 6:34) Ma, Jehova akụzierela anyị otú anyị ga-esi na-enyere ha aka ka ha nwee nchekwube na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. Ọ bụ otú ọsụ ụzọ si hụ ndị agbata obi ya n’anya mere o ji eji oge ya na ike ya ekwusara ha ozi ọma Alaeze Chineke. (Matiu 22:39; 1 Ndị Tesalonaịka 2:8) Ihe a niile ọ na-eme na-enye aka eme ka okwukwe ya sikwuo ike, ya na Chineke adịrịkwuo ná mma. Ọ na-emekwa ka obi na-adị ya ụtọ.—Ọrụ Ndịozi 20:35.
Ònye bụ ọsụ ụzọ?
Olee ihe na-eme ka mmadụ kpebie na ya ga-abụ ọsụ ụzọ oge niile?
-