-
Olee Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ Na-agagasị?Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
-
-
ISI NKE 14
Olee Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ Na-agagasị?
Amerịka
Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Ọ dị na Patasịn, Niu Yọk
Panama
Ihe e ji mara Ndịàmà Jehova kemgbe ụwa bụ na a na-azụ ha ka ha nwee ike ịna-ekwusa ozi ọma nke ọma. E nwere ụfọdụ ụlọ akwụkwọ pụrụ iche ndị ọsụ ụzọ na-aga ka ha nwee ike ‘jezuo ozi ha.’—2 Timoti 4:5.
Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ. Ọ na-abụ o ruo otu afọ mmadụ malitere ịsụ ụzọ oge niile, ya agaa ụlọ akwụkwọ a n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị ya nso. Abalị isii ka a na-aga ụlọ akwụkwọ a. Ọ na-enyere ọsụ ụzọ aka ịbịarukwu Jehova nso, ịmata otú ọ ga-esi na-ezi ozi ọma nke ọma nakwa ịnọgidesi ike n’ozi ya.
Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze. Ọ bụ ndị bụterela ọsụ ụzọ aka na-aga ụlọ akwụkwọ a. Ọ bụ ọnwa abụọ ka a na-aga ya. Ha na-abụ ndị dị njikere ịhapụ obodo ha gaa ebe ọ bụla a ga-eziga ha. Ha na-ekwu ihe ahụ Aịzaya kwuru. Ọ sịrị, “Lee m! Ziga m.” Ha sikwa otú ahụ na-eṅomi Jizọs Kraịst bụ́ onye kacha zie ozi ọma n’ụwa. (Aịzaya 6:8; Jọn 7:29) Ịkwaga ebe ọzọ nwere ike ịpụta na onye ahụ ga-agbanwe otú o si ebi ndụ. Omenala na nri ndị obodo ebe ọ na-aga nwekwara ike ịdị ezigbo iche na nke ha. O nwekwara ike ịbụ na ọ ga-amụ asụsụ ọhụrụ ka o nwee ike izi ndị obodo ahụ ozi ọma. Ụlọ akwụkwọ a na-enyere ndị ọsụ ụzọ aka ịmụta ihe ndị ga-abara ha uru n’ebe a ga-eziga ha, nyekwara ha aka inwe nkà ndị ga-eme ka ha baara Jehova na ọgbakọ ya uru. Ndị na-aga ya bụ ụmụnna nwoke ndị lụrụla nwaanyị na ndị nwunye ha, ụmụnna nwoke na-alụbeghị nwaanyị nakwa ụmụnna nwaanyị ndị na-alụbeghị di. Ha na-abụkwa ndị nọ n’agbata iri afọ abụọ na atọ na iri afọ isii na ise.
Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Gilied bụ okwu Hibru. A sụgharịa ya, ọ pụtara “Nnukwute Ihe Àmà.” Kemgbe a malitere ụlọ akwụkwọ a n’afọ 1943, ihe karịrị puku mmadụ asatọ gụrụla akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied agbaala nnukwute àmà “ruo nsọtụ ụwa.” Àmà ndị ha gbara rụpụtakwara ọtụtụ ihe ọma. (Ọrụ Ndịozi 13:47) O nweghị ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị na Peruu mgbe mbụ e zigara ndị ozi ala ọzọ ebe ahụ. Ma ugbu a, e nweela ihe karịrị otu puku ọgbakọ n’ebe ahụ. Mgbe mbụ ndị ozi ala ọzọ rutere Japan, Ndịàmà Jehova erughị mmadụ iri n’ebe ahụ. Ma ugbu a, ha akarịala narị puku abụọ. Ọnwa ise ka a na-aga ụlọ akwụkwọ a. Ndị gara ya na-eji ọnwa ise ahụ amụ Baịbụl nke ọma. Ndị na-aga ụlọ akwụkwọ a bụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ndị na-eje ozi n’ala ọzọ, ndị na-eje ozi na Betel nakwa ndị nlekọta sekit. Ihe a na-akụziri ha n’ụlọ akwụkwọ a bụ ihe ga-enyere ha aka ime ka ọrụ ikwusa ozi ọma na-aga n’ihu.
Olee uru Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ bara?
Olee ndị na-aga Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze?
-
-
Olee Ọrụ Ndị Okenye Na-arụ n’Ọgbakọ Anyị?Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
-
-
ISI NKE 15
Olee Ọrụ Ndị Okenye Na-arụ n’Ọgbakọ Anyị?
Finland
Ha na-akụzi ihe
Ha na-eleta anyị
Ha na-ezi ozi ọma
Anyị enweghị ndị ụkọchukwu. Kama, anyị nwere ndị a na-akpọ ndị okenye. N’oge ndịozi Jizọs, a na-ahọpụta ụmụ nwoke ndị na-eme ihe Baịbụl kwuru ka ha na-elekọta ma “na-azụ ọgbakọ Chineke dị ka atụrụ.” Ọ bụkwa otú ahụ ka anyịnwa na-eme. (Ọrụ Ndịozi 20:28) Ndị okenye a na Chineke dị n’ezigbo mma. Ha ji obi ha dum na-azụ anyị, a naghị amanye ha amanye. Ha jikwa ịnụ ọkụ n’obi elekọta atụrụ Chineke, ọ bụghị n’ihi na ha hụrụ uru aghụghọ n’anya. (1 Pita 5:1-3) Olee ọrụ ha na-arụrụ anyị?
Ha na-elekọta anyị. Ndị okenye na-eji Baịbụl agwa anyị ihe anyị kwesịrị ime. Ha na-enyekwara anyị aka ka anyị na Jehova dịrị ná mma. Ha ma na ọrụ a Chineke nyere ha dị mkpa. N’ihi ya, ha anaghị eji aka ike emeso anyị ihe. Kama, ha na-agbalị ịhụ na obi dị anyị mma. (2 Ndị Kọrịnt 1:24) Onye na-azụ atụrụ na-eleru atụrụ nke ọ bụla o nwere anya nke ọma. Otú ahụkwa ka ndị okenye na-eme. Ha na-agbalị ịma onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ anyị.—Ilu 27:23.
Ha na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-eme uche Chineke. N’izu ọ bụla, ndị okenye na-akụziri anyị Okwu Chineke ma anyị gaa ọmụmụ ihe. Ihe ndị ahụ ha na-akụziri anyị na-eme ka okwukwe anyị nwere na Chineke sikwuo ike. (Ọrụ Ndịozi 15:32) Ha anaghị eji ozi ọma egwu egwu. Ha soro anyị na-aga ozi ọma, ha na-akụziri anyị otú dị iche iche e si ezi ozi ọma.
Ha na-agba anyị ume. Ndị okenye na-enyere onye nke ọ bụla n’ime anyị aka ka ya na Chineke dịrị ná mma. Ka ha nwee ike ime ya, ha nwere ike leta mmadụ n’ụlọ ya. Ha nwekwara ike nọrọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze jiri Baịbụl gbaa onye ahụ ume ma kasie ya obi.—Jems 5:14, 15.
Ọ bụghị naanị ọrụ ọgbakọ ka ndị okenye na-arụ. Ọtụtụ n’ime ha nwere ezinụlọ ha na-elekọta. Ha na-arụkwa ọrụ ha ji akpa afọ ezinụlọ ha. Ihe a niile na-eme ka ha ghara ịna-enwecha efe. N’eziokwu, ha na-arụsị ọrụ ike, anyị kwesịkwara ịna-akwanyere ha ezigbo ùgwù.—1 Ndị Tesalonaịka 5:12, 13.
Olee ọrụ ndị okenye na-arụ n’ọgbakọ?
Olee ihe ndị okenye na-eme iji gosi na ha hụrụ anyị n’anya?
-
-
Olee Ọrụ Ndị Ohu Na-eje Ozi Na-arụ?Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
-
-
ISI NKE 16
Olee Ọrụ Ndị Ohu Na-eje Ozi Na-arụ?
Mianmaa
Ha na-akụzi ihe
Ha na-ahazi ndị pụtara ozi ọma
Ha na-edewe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha
Baịbụl kwuru na e nwere ụzọ ndị nwoke abụọ na-arụrụ ọgbakọ ọrụ. Ha bụ “ndị nlekọta [ya bụ, ndị okenye] na ndị ohu na-eje ozi.” (Ndị Filipaị 1:1) N’ọgbakọ ọ bụla, a na-enwekarị ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi. Olee ọrụ ndị ohu na-eje ozi na-arụ?
Ha na-enyere ndị okenye aka. Ndị ohu na-eje ozi na Jehova dị n’ezigbo mma. Ha kwesịrị ntụkwasị obi, dịrịkwa uchu. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị na-eto eto, ụfọdụkwa abụrụ ndị torola eto. Ha na-arụ ọrụ ndị dị mkpa n’ọgbakọ, bụ́ ndị na-eme ka ihe na-aga siriri werere. Ọrụ ha na-abụkarịkwa ọrụ e ji ọkpụkpụ aka arụ. Ọrụ ndị a ha na-arụ na-eme ka ndị okenye nwee ike ilekwasị anya n’ịkụzi ihe na ilekọta ọgbakọ.
Ha na-arụ ọrụ ndị bara uru. Ụfọdụ ndị ohu na-eje ozi bụ ndị atendantị. Ha na-anabata ndị bịara ọmụmụ ihe. Ndị ọzọ na-elekọta ígwè e ji ekwu okwu. E nwekwara ndị nke na-ahụ maka akwụkwọ anyị, nweekwa ndị nke na-ahụ maka ego ọgbakọ. Ụfọdụkwa na-ahụ maka ebe ọgbakọ na-aga ekwusa ozi ọma. Ndị ohu na-eje ozi na-enyekwa aka edewe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha. Ndị okenye nwere ike gwa ụfọdụ n’ime ha ka ha gaa na-enyere ndị agadi nọ n’ọgbakọ aka. N’eziokwu, ha na-eji obi ha niile arụ ụdị ọrụ ọ bụla a gwara ha rụọ. Ọ bụ ya mere ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ji akwanyere ha ùgwù.—1 Timoti 3:13.
Ha na-akpa àgwà e ji mara ezigbo Ndị Kraịst. Ihe mere e ji ahọpụta ndị ohu na-eje ozi bụ na ha na-akpa àgwà ọma ndị e ji mara ezigbo Ndị Kraịst. Ha na-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike ma ha na-ezi anyị ihe n’ọgbakọ. Otú ha si agachi ozi ọma anya na-eme ka anyị jiri ịga ozi ọma kpọrọ ihe. Ha anaghị agba ihe ndị okenye kwuru ụkwụ. Nke a na-eme ka ọgbakọ dịrị n’otu, ndị nọ na ya ana-enwekwa obi ụtọ. (Ndị Efesọs 4:16) Ka oge na-aga, hanwa nwekwara ike ịbụ ndị okenye.
Olee ụdị ndị ndị ohu na-eje ozi bụ?
Olee otú ndị ohu na-eje ozi si enye aka eme ka ihe na-aga siriri werere n’ọgbakọ?
-