-
Olee Ihe Anyị Ga-eme Ka Ụlọ Nzukọ Alaeze Anyị Na-adị Mma n’Anya?Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
-
-
ISI NKE 26
Olee Ihe Anyị Ga-eme Ka Ụlọ Nzukọ Alaeze Anyị Na-adị Mma n’Anya?
Estonia
Zimbabwe
Mongolịa
Puweto Riko
Ebe ọ bụ na Ụlọ Nzukọ Alaeze bụ ebe anyị na-anọ efe Jehova, anyị kwesịrị ime ka ọ dị ọcha, dịkwa mma n’anya. Anyị kwesịkwara ịrụzi ihe ọ bụla mebiri na ya n’ihi na ọ bụ otu n’ime ụzọ dị mkpa anyị si efe Chineke. Anyị ekwesịghị iji ọrụ a gwuo egwu. Onye ọ bụla kwesịkwara iso na-arụ ya.
A gbasaa ọmụmụ ihe, nye aka mee ka ebe niile dị ọcha. A gbasaa ọmụmụ ihe n’ụbọchị ọ bụla, ụmụnna na-eji obi ụtọ nye aka zachaa Ụlọ Nzukọ Alaeze. Otu ugbo n’ọnwa, ọgbakọ na-abịakwa dewe ya ọcha. Ọ bụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ga-ahụ maka ọrụ a ga-arụ n’ụbọchị ahụ. Ọ ga-ahụ na e mere ihe niile e kwesịrị ime. Ụfọdụ ga-aza Ụlọ Nzukọ Alaeze, ụfọdụ ejiri ákwà hichasịa ala ya, ụfọdụ ehichasịa oche ma hazie ha. E nwekwara ndị ga-eji ncha saa ebe a na-anyụ mamịrị ma wụọ ya ọgwụ na-egbu nje. A na-agwakwa ụfọdụ ka ha hichasịa windo na enyo, ndị ọzọ ekpofuo ahịhịa ma ọ bụkwanụ wepụsịa ọnyà ududo. A na-ewepụtakwa otu ụbọchị n’afọ ọ bụla, jiri ya hichaa Ụlọ Nzukọ Alaeze ma rụzie ihe niile e kwesịrị ịrụzi. Mgbe ọ bụla a ga-arụ ọrụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ụmụ anyị na-eso anyị aga arụ ọrụ. Nke a na-eme ka ha mata na ebe ahụ bụ ebe a na-efe Chineke, ọ bụghị ebe a na-egwu egwu.—Ekliziastis 5:1.
Nye aka rụzie ihe ndị e kwesịrị ịrụzi. N’afọ ọ bụla, a na-enwe ndị a na-eziga ka ha gaa lee otú Ụlọ Nzukọ Alaeze niile e nwere dị. Ha lechaa, ha agwa ọgbakọ na-anọ na ya amụ ihe ihe ha kwesịrị ime ka ọ na-adị mma n’anya. Nke a na-eme ka ha ghara ịna-emefusị ego ha ga-eji mee ihe ọzọ. (2 Ihe E Mere 24:13; 34:10) Ebe anyị na-anọ efe Jehova kwesịrị ịbụ ebe dị ọcha ma dị mma n’anya. Ọ bụrụ na anyị niile enye aka na-edewe ya ọcha, anyị na-egosi na anyị ejighị ya egwu egwu. O gosikwara na anyị hụrụ Jehova n’anya. (Abụ Ọma 122:1) Ọ na-enyekwa anyị aha ọma n’obodo anyị.—2 Ndị Kọrịnt 6:3.
Gịnị mere anyị ekwesịghị ileghara Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị anya?
Olee ihe anyị na-eme iji hụ na Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị dị ọcha?
-
-
Olee Uru Ọ́bá Akwụkwọ Dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Baara Anyị?Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
-
-
ISI NKE 27
Olee Uru Ọ́bá Akwụkwọ Dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Baara Anyị?
Izrel
Chek Ripọblik
Benin
Keman Aịlands
Ò nwere ihe ụfọdụ ị ga-achọ ịmatakwu na Baịbụl? Ò nwere amaokwu Baịbụl ị na-amachaghị otú ị ga-esi akọwa ya? È nwere onye a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl ị ga-achọ ịmatakwu ihe gbasara ya? Ò nwere ebe a kpọrọ aha na Baịbụl ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e kwuru na Baịbụl ị chọrọ ịmakwu gbasara ya? Ò nwere ihe na-enye gị nsogbu n’obi ị ga-achọ ka Baịbụl nyere gị aka ịma ihe ị ga-eme? Ọ bụrụ na e nwere, gaa n’ọ́bá akwụkwọ dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.
Akwụkwọ ndị e ji eme nchọnchọ na-adị na ya. O nwere ike, i nweghị akwụkwọ niile Ndịàmà Jehova bipụtara n’asụsụ Igbo. Ma, ị gaa n’ọ́bá akwụkwọ dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ị ga-ahụ akwụkwọ anyị ndị e bipụtara n’oge na-adịchabeghị anya. I nwekwara ike ịhụ Baịbụl ndị ọzọ na-abụghị Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, hụkwa akwụkwọ ọkọwa okwu na akwụkwọ ndị ọzọ e ji eme nchọnchọ. I nwere ike iji ha mee nchọnchọ tupu a malite ọmụmụ ihe ma ọ bụkwanụ mgbe ọmụmụ ihe gbasara. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu nwere kọmputa, e nwere ike itinye Watchtower Library nke Igbo n’ime ya. Ọtụtụ akwụkwọ anyị dị na Watchtower Library. Otú e si eji ya achọ ihe anaghị ara ahụ́. I nwere ike denye isiokwu, mkpụrụ okwu ma ọ bụkwanụ amaokwu Baịbụl ka ọ chọtara gị ebe niile ọ gbara n’akwụkwọ anyị.
Ọ na-abara ndị na-eme ihe omume n’Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ uru. Ọ́bá akwụkwọ dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ga-abara gị uru mgbe ị na-akwado ihe omume gị. Ọ bụ onye nlekọta ọmụmụ ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ na-ahụ maka ọ́bá akwụkwọ na-adị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ bụ ya ka ọ dị n’aka ịhụ na e tinyere akwụkwọ ọhụrụ ọ bụla n’ebe ahụ. Ọ na-ahụkwa na e dewere ha n’usoro n’usoro. O nwere ike igosi gị otú ị ga-esi achọta ihe ị chọrọ ịchọ ma ọ bụkwanụ onye gị na ya na-amụ Baịbụl egosi gị ya. Ma, o nweghị onye kwesịrị iwere akwụkwọ ọ bụla dị ebe ahụ laa. Onye ọ bụla ji akwụkwọ dị ebe ahụ na-achọ ihe kwesịrị ijizi ya ejizi, o kwesịghịkwa ịka ya ihe.
Baịbụl kwuru na onye chọrọ inwe “ihe ọmụma Chineke” kwesịrị ịchọ ya “dị ka akụ̀ zoro ezo.” (Ilu 2:1-5) Ị ga-ejili ọ́bá akwụkwọ dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze chọta ihe ọmụma Chineke.
Olee ihe ndị na-adị n’ọ́bá akwụkwọ dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze?
Ònye ga-enyere gị aka ịma otú e si eji akwụkwọ ndị dị na ya achọ ihe?
-
-
Gịnị Ka Ị Ga-ahụ ma Ị Gaa Ebe Anyị Na-edewe Ihe n’Ịntanet?Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
-
-
ISI NKE 28
Gịnị Ka Ị Ga-ahụ ma Ị Gaa Ebe Anyị Na-edewe Ihe n’Ịntanet?
Frans
Pọland
Rọshịa
Jizọs Kraịst gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ebe ndị mmadụ nọ, ka ha wee hụ ọrụ ọma unu wee nye Nna unu nọ n’eluigwe otuto.” (Matiu 5:16) Ọ bụ ihe a Jizọs kwuru mere anyị ji eji ihe ụfọdụ nkà na ụzụ na-ewepụta na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. Otu n’ime ha bụ Ịntanet. Anyị nwere ebe anyị na-edewe ihe na ya. Adres ya bụ jw.org/ig. Ebe a bụ ebe ị ga-aga n’Ịntanet mata nke bụ́ eziokwu banyere ihe anyị kweere na ọrụ anyị na-arụ. Olee ihe ị ga-ahụ ma ị gaa ebe ahụ?
Ị ga-ahụ ajụjụ ndị mmadụ na-ajụkarị na otú e si jiri Baịbụl zaa ha. O nwere ọtụtụ ajụjụ ndị dị mkpa ụmụ mmadụ na-ajụ taa. Ị gaa n’ebe anyị na-edewe ihe n’Ịntanet, ị ga-ahụ ebe e ji Baịbụl zaa ụfọdụ n’ime ha. A zara isii n’ime ha na traktị bụ́ Ò Nwere Mgbe Nsogbu Ụwa A Ga-akwụsị? na Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Ga-adị Ndụ Ọzọ? N’Ịntanet, anyị nwere traktị ndị a n’ihe karịrị narị asụsụ isii. Ị ga-ahụkwa Baibụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’ihe karịrị otu narị asụsụ na iri atọ. E nwekwara akwụkwọ bụ́ Gịnị Ka Baibụl Na-akụziri Anyị?, nweekwa Ụlọ Nche na Teta! ndị ọhụrụ n’ọtụtụ asụsụ. I nwere ike ịgụ ọtụtụ n’ime ha n’Ịntanet ma ọ bụkwanụ gị egere ha egere. Ị chọọkwa, i nwere ike tinye ha n’ihe dị ka ekwentị. E nweekwa onye ị ma ga-achọ ịgụ nke ọ bụla n’ime ha, i nwedịrị ike isi ebe ahụ bipụtara ya nke e dere n’asụsụ ọ na-asụ. N’Ịntanet, ị ga-ahụ ọtụtụ akwụkwọ anyị n’asụsụ ndị ogbi. I nwekwara ike isi ebe ahụ were ihe ndị a na-egere egere, ndị dị ka ihe nkiri na abụ ndị ga na-eme gị obi ụtọ.
Ị ga-ahụ ihe ndị bụ́ eziokwu gbasara anyị. N’ebe ahụ, ị ga-ahụ ebe a kọrọ gbasara otú ọrụ anyị si na-aga n’ụwa dum na otú anyị si agbatara ndị nwere ọdachi ọsọ enyemaka. Ị ga-ahụkwa ihe ndị ọzọ a kọrọ gbasara anyị. E nwekwara vidio ndị ga-egosi gị ihe a na-ekwu. Ihe ọzọ ị ga-ahụ bụ ebe ndị a ga-enwe mgbakọ dị iche iche na otú i nwere ike isi kpọtụrụ alaka ụlọ ọrụ anyị dị iche iche.
Anyị na-eji ihe ndị a eme ka ìhè Okwu Chineke na-enwu n’ebe ndị dị anya n’ụwa. Ndị mmadụ n’ebe niile na-anụ ozi ọma Alaeze Chineke, ma ndị bi n’Antaktika, bụ́ ebe oyi kacha atụ n’ụwa. Ekpere anyị bụ ka ‘okwu Jehova na-aga n’ihu ọsọ ọsọ’ ruo n’ụwa niile. Anyị chọkwara ka o wetara Chineke otuto.—2 Ndị Tesalonaịka 3:1.
Olee otú anyị si eji ebe anyị na-edewe ihe n’Ịntanet enyere ndị mmadụ aka ịmụta ihe Baịbụl na-akụzi?
Olee ihe ị ga-achọ ịhụ n’ebe anyị na-edewe ihe n’Ịntanet?
-