Ekwela Ka Nchegbu Rikpuo Gị
“UNU echegbula onwe unu nye echi: n’ihi na echi ga-echegburu onwe ya. Ihe ọjọọ nke ụbọchị taa ezuworo ya.” (Matiu 6:34) N’ezie ndụmọdụ ahụ Jisọs Kraịst nyere bara uru nye anyị nile bụ́ ndị na-adị ndụ taa n’etiti ọha na eze ebe ihe na-aga ngwa ngwa, jupụtakwa ná nchekasị.
Otú ọ dị, n’ụzọ ezi uche dị na ya, ọ̀ ga-ekwe omume na anyị agaghị echegbu onwe anyị banyere nsogbu, mkpebi, ọrụ, na ibu ọrụ anyị? Ọtụtụ nde mmadụ na-enwe ịda mbà n’obi, obi erughị ala, na ibu arọ. Ọ bụ ya mere ọgwụ ndị na-akụjụ ahụ na ndị na-atụ ụra ji bụrụ azụmahịa na-enye ọtụtụ nde dollar.
Ebe A Ga-akpa Ókè
Ọ dị anyị mkpa ime atụmatụ na ịdị njikere maka ibu ọrụ, ihe omume, mkpebi, na nsogbu anyị—ma hà dị ngwa ma ọ bụ na ha adịghị. Bible na-agba anyị ume ‘ịnọdụ ala gụọ [ihe] ọ ga-ewe’ tupu anyị ana-amalite ihe omume ọ bụla gbara ọkpụrụkpụ. (Luk 14:28-30) Nke a na-agụnye ịtụle nhọrọ ndị dịnụ, ịtụle mmetụta ihe ga-esi na ha pụta pụrụ inwe, na ịmara ihe ọ ga-efu n’ihe metụtara oge, ike, na ego.
Ọ bụ ezie na mmadụ kwesịrị iji nlezianya tụlee ihe pụrụ ime ma eleghị anya, ịnwa iche echiche banyere ihe nile pụrụ ịdapụta agaghị ekwe omume ma ọ bụ mee ka ihe ka mma. Dị ka ihe atụ, n’ihi ezinụlọ ịnọ ná nchebe, ị pụrụ ịtụle ihe ị ga-eme a dịghị ama ama ọkụ abaa n’ebe obibi gị. Ị pụrụ ịzụta ma tinye ihe ndị na-achọpụta anwụrụ ọkụ na ihe ndị e ji emenyụ ọkụ n’ebe obibi gị. Ị pụrụ ime atụmatụ ma mụgharịa ụzọ mgbapụ site n’akụkụ dị iche iche nke ụlọ gị. Ma olee mgbe atụmatụ ezi uche dị na ya, nke bara uru na-akwụsị, nchegbu gabigara ókè, nke na-enweghịkwa isi ebido? Nchegbu dị otú ahụ na-ebido mgbe ị malitere inwe oké ihe mgbu banyere ọtụtụ ọnọdụ ndị i chepụtara echepụta, nke ọtụtụ n’ime ha pụrụ ịbụ nnọọ ihe echiche efu kpatara. Echiche ndị na-enye nsogbu n’obi pụrụ irikpu gị, na-eme ka i kwere na ọ ghaghị ịbụ na ilegharawo ihe ụfọdụ anya ma ọ bụ na i mebeghị ihe zuru ezu iji chebe ezinụlọ gị. Nhụjuanya a i ji aka gị kpatara onwe gị pụrụ ịbụrụ gị oké ibu arọ nke na e nwere ike ị gaghị ehi ụra n’ihi ya.
Mosis n’Ihu Fero
Jehova Chineke nyere onye amụma ya bụ́ Mosis ọrụ tara akpụ. Nke mbụ, Mosis aghaghị ịpụta n’ihu ụmụ Israel ma mee ka ha kwere na Jehova ahọpụtawo ya iduru ha pụọ n’Ijipt. Ọzọ, Mosis aghaghị ịpụta n’ihu Fero ma rịọ ya ka ọ hapụ ụmụ Israel ka ha laa. N’ikpeazụ, Mosis aghaghị iduru ìgwè mmadụ dị ọtụtụ nde n’ọnụ ọgụgụ site n’ọzara banye n’ala nke ndị na-enweghị omume enyi bi. (Ọpụpụ 3:1-10) Ihe a nile pụrụ ịbụworị ihe na-emenye ụjọ karịsịa, ma Mosis ò kwere ka ibu ọrụ a mee ka uche ya jupụta ná nchekasị na-enweghị isi?
N’ụzọ doro anya, Mosis nwere nchegbu banyere ọtụtụ ihe. Ọ jụrụ Jehova, sị: “Lee, mgbe mụ onwe m na-abịakwute ụmụ Israel, sị ha, Chineke nke nna unu ha ezitewo m n’ebe unu nọ; mgbe ha ga-asịkwa m, Gịnị bụ aha Ya? ọ̀ bụ gịnị ka m ga-asị ha?” Jehova nyere ya azịza ya. (Ọpụpụ 3:13, 14) Mosis nwekwara nchegbu banyere ihe pụrụ ime ma ọ bụrụ na Fero ajụ ikwenye n’ihe ọ ga-agwa ya. Ọzọ, Jehova zaghachiri onye amụma ahụ. Otu nsogbu ikpeazụ—Mosis kwetara na ya ‘abụghị onye ọkà okwu.’ Olee otú a pụrụ isi dozie nke a? Jehova wepụtara Erọn ikwuchitere Mosis okwu.—Ọpụpụ 4:1-5, 10-16.
N’ịbụ onye nwere azịza nye ajụjụ ya tinyere okwukwe o nwere n’ebe Chineke nọ, Mosis mere dị ka Jehova nyeworo n’iwu. Kama iji echiche ndị na-eyi egwu banyere ihe pụrụ ime mgbe ọ ga-agakwuru Fero na-emekpa onwe ya ahụ, “otú a ka [Mosis] mere.” (Ọpụpụ 7:6) Ọ bụrụ na o kwere ka nchegbu rikpuo ya, ndị a pụrụ ibelatawo okwukwe na anyaike dị mkpa iji rụzuo ọrụ e kenyere ya.
Ụzọ ziri ezi Mosis si mee ihe banyere ọrụ e nyere ya bụ ihe atụ nke ihe Pọl onyeozi kpọrọ ‘uche zuru okè.’ (2 Timoti 1:7; Taịtọs 2:2-6) Ọ bụrụ na Mosis egosighị uche zuru okè, ọ pụrụ ịbụwo onye ịdị ukwuu nke ọrụ e kenyere ya riri ọnụ n’ụzọ dị mfe nke na ma eleghị anya ọ gaghị anakwereworị ya.
Ịchịkwa Echiche Gị
Ì si aṅaa emeghachi omume mgbe i chere ule nke okwukwe gị ma ọ bụ ọnwụnwa ihu ná ndụ ị na-adị kwa ụbọchị? Ị̀ na-ama jijiji, na-eche nanị banyere ihe mgbochi na ihe ịma aka ndị yiri ka hà dị n’ihu? Ka ị̀ na-ele ha anya n’ụzọ ziri ezi? Dị ka ụfọdụ ga-ekwu, ‘Ebula ụzọ gafee àkwà mmiri tupu ị na-eru ya.’ E kwuwerị, e nwere ike ọ gaghị adị mkpa ịgafe àkwà mmiri ahụ dị gị n’echiche! Ya mere n’ihi gịnị ka ihe nwere ike ghara ime ma ọlị ga-eji na-emekpa gị ahụ? Bible na-ekwu, sị: “Nchegbu n’obi mmadụ na-eme ka obi ruru ala.” (Ilu 12:25) Ihe na-esikarị na ya apụta bụ na mmadụ ga na-eyigharị oge n’ime mkpebi, na-ahapụ ihe ruo mgbe oge gabigara.
Ihe dị njọ karị bụ mmerụ ahụ ime mmụọ nke nchegbu na-enweghị isi pụrụ ịkpata. Jisọs Kraịst gosiri na aghụghọ nke akụ̀ na “nchegbu nke oge a” pụrụ ịkpagbu ekele e nwere maka “okwu alaeze eluigwe” ahụ kpam kpam. (Matiu 13:19, 22) Dị nnọọ ka ogwu pụrụ igbochi mkpụrụ ọkụkụ iru ntozu okè na ịmị mkpụrụ, otú ahụ nchegbu a na-achịkwaghị achịkwa pụrụ igbochi anyị inwe ọganihu ime mmụọ na ịmị mkpụrụ iji nye Chineke otuto. Nhụjuanya na-emebi ihe nke mmadụ kpataara onwe ya emewo ọbụna ka ụfọdụ ndị ghara ịrara onwe ha nye Jehova. Ha na-enwe nchegbu, ‘Gịnị ma ọ bụrụ na ebighị m ndụ kwekọrọ ná nraranye m?’
Pọl onyeozi gwara anyị na n’agha ime mmụọ anyị, anyị na-agbalịsi ike ịdọta “ihe nile ọ bụla a na-echepụta n’agha ịṅa ntị Kraịst.” (2 Ndị Kọrint 10:5) Ọ ga-amasị onye iro ukwu anyị, bụ́ Setan bụ́ Ekwensu, iji nchegbu anyị mee ihe iji mee ka anyị daa mbà na iji mee ka ike gwụ anyị n’ụzọ anụ ahụ, n’ụzọ mmetụta uche, nakwa n’ụzọ ime mmụọ. Ọ bụ ọkà n’iji inwe obi abụọ amata ndị na-anọghị na nche n’ọnyà. Ọ bụ ya mere Pọl jikwa dọọ ndị Kraịst aka ná ntị ka ha ghara ‘inye ekwensu ụzọ.’ (Ndị Efesọs 4:27) Dị ka “chi nke oge a,” Setan enwewo ihe ịga nke ọma ‘n’ime ka anya nke uche nke ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì n’etiti ha.’ (2 Ndị Kọrint 4:4) Ka anyị ghara ikwe ka ọ chịkwaa uche anyị ma ọlị!
Enyemaka Dị
Mgbe nwatakịrị na-eche nsogbu ihu, ọ pụrụ ịgakwuru nna na-ahụ n’anya ma nata nduzi na nkasi obi. N’otu aka ahụ, anyị pụrụ iji nsogbu anyị gakwuru Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova. N’ezie, Jehova na-akpọ anyị òkù ịtụkwasị ya ibu na nchegbu ndị anyị na-enwe. (Abụ Ọma 55:22) Dị ka nwatakịrị nke na-enwekwaghị nchegbu banyere nsogbu ya mgbe ọ natasịworo ihe mmesi obi ike n’aka nna ya, ọ bụghị nanị na anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova ibu anyị kamakwa anyị kwesịrị ịhapụrụ ya ha.—Jemes 1:6.
Anyị si aṅaa atụkwasị Jehova ibu anyị? Ndị Filipaị 4:6, 7 na-aza, sị: “Unu echegbula onwe unu n’ihe ọ bụla; kama n’ihe nile ọ bụla site n’ekpere na arịrịọ, ya na ekele, meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ. Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi unu na echiche uche unu nche n’ime Kraịst Jisọs.” Ee, ná nzaghachi nye ekpere na arịrịọ ndị anyị na-arịọ n’esepụghị aka, Jehova pụrụ inye anyị ịdị jụụ nke ime ahụ bụ́ nke na-echebe uche anyị pụọ n’ịbụ nke nchegbu ndị na-adịghị mkpa na-enye nsogbu.—Jeremaịa 17:7, 8; Matiu 6:25-34.
Otú ọ dị, iji rụọ ọrụ kwekọrọ n’ekpere anyị, anyị ekwesịghị ikewapụ onwe anyị ma n’ụzọ anụ ahụ ma n’uche. (Ilu 18:1) Kama nke ahụ, anyị ga-eme nke ọma ịtụle ụkpụrụ na nduzi Bible ndị metụtara nsogbu anyị, si otú a na-ezere ịdabere ná nghọta anyị. (Ilu 3:5, 6) Ma ndị na-eto eto ma ndị agadi pụrụ ichigharịkwuru Bible na mbipụta dị iche iche nke Watch Tower maka ihe ọmụma bara ụba n’ime mkpebi na idozi nsogbu. Tụkwasị na nke a, n’ọgbakọ ndị Kraịst, e ji ndị okenye maara ihe ma nwee ahụmahụ na ndị Kraịst ndị ọzọ tozuru okè bụ́ ndị dị njikere mgbe dum ịgwa anyị okwu, gọzie anyị. (Ilu 11:14; 15:22) Ndị nsogbu anyị na-akpalighị mmetụta uche ha, bụ́ ndị na-elekwa ihe anya dị ka Chineke si ele, pụrụ inyere anyị aka mgbe mgbe ile nsogbu anyị anya n’ụzọ dị iche. Ọ bụkwa ezie na ha agaghị emere anyị mkpebi, ha pụrụ ịbụ ebe anyị ga-esi enweta agbamume na nkwado.
“Chere Chineke”
Ọ dịghị onye pụrụ ịgọnahụ na e nwere nrụgide zuru ezu n’idozi nsogbu ndị bụ́ ezie anyị na-enwe kwa ụbọchi n’atụkwasịghị ha ihe site n’ichegbu onwe anyị banyere nsogbu ndị dị anyị n’echiche. Ọ bụrụ na nchegbu banyere ihe pụrụ ịdapụta na-eme ka anyị na-atụ ụjọ ma na-enwe ahụ erughị ala, mgbe ahụ ka anyị chigharịkwuru Jehova n’ekpere na arịrịọ. Legara Okwu ya na nzukọ ya anya maka nduzi, amamihe, na uche zuru okè. Anyị ga-ahụ na n’agbanyeghị ọnọdụ ọ bụla pụrụ ibilite, enyemaka dị iji dozie ya.
N’inwe obi dị arọ na ahụ ịma jijiji, ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Gịnị mere i ji rudaa n’ala, mkpụrụ obi m? Gịnị mere i ji sụọ ude nke ukwuu n’ime m? Chere Chineke: n’ihi na m ga-ekelekwa Ya ọzọ, Onye bụ nzọpụta nke ihu m, na Chineke m.” (Abụ Ọma 42:11) Ka anyị kwuo ụdị ihe ndị ahụ.
Ee, mee atụmatụ maka ihe a pụrụ ịtụ anya ya n’ụzọ ezi uche dị na ya, ma hapụrụ Jehova ihe a na-atụghị anya ya. “Na-atụkwasịnụ Ya nchegbu nile unu na-echegbu onwe unu, n’ihi na ihe nile banyere unu na-emetụ Ya n’obi.”—1 Pita 5:7.
[Foto dị na peeji nke 23]
Dị ka Devid, ị̀ na-atụkwasị Jehova ibu na nchegbu ndị ị na-enwe?