Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Anyị Ekweghị Emebi Iwu Chineke
    Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2016
    • INDONESHIA

      Anyị Ekweghị Emebi Iwu Chineke

      Daniel Lokollo

      • A MỤRỤ YA N’AFỌ 1965

      • E MERE YA BAPTIZIM N’AFỌ 1986

      • ONYE Ọ BỤ Ọ bụ ọsụ ụzọ pụrụ iche nke na-ekweghị emebi iwu Chineke mgbe a na-akpagbu ya.

      Onye a bụ Nwanna Daniel Lokollo

      N’ABALỊ iri na anọ n’ọnwa Eprel afọ 1989, n’oge m na-eduzi ọmụmụ ihe na Maụmere, dị́ n’Agwaetiti Flọris, ndị uwe ojii batara ebe ahụ n’ike ma nwụchie mụ na ụmụnna atọ ọzọ.

      Ndị na-eche anyị nche n’ụlọ mkpọrọ mere ihe niile ha nwere ike ime ka anyị kelee ọkọlọtọ. Mgbe anyị jụrụ, ha kụrụ anyị ihe ma gbaa anyị ụkwụ. Ha kpọpụtakwara anyị n’oké anwụ ruo abalị ise. O ruo n’abalị, anyị na-edina n’ala simenti n’obere ọnụ ụlọ mkpọrọ anyị nọ na ya. Nke a mere ka ezigbo oyi na-atụ anyị. Ike na-agwụcha anyị, ahụ́ na-afụkwa anyị ụfụ n’ihi ahụ́ e merụsịrị anyị. Anyị bịakwara ruo unyi. Onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ gwara anyị ugboro ugboro ka anyị mee ihe Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị. Ma, anyị gwara ya, sị, “Ruokwa mgbe anyị ga-anwụ, anyị agaghị ekele ọkọlọtọ.” Obi dị anyị ụtọ ‘ịta ahụhụ n’ihi ezi omume’ otú ahụ ọ dị Ndị Kraịst oge mbụ.—1 Pita 3:14.

  • Anyị Mere Ihe A Gwara Anyị ma Dịrị Ndụ
    Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2016
    • INDONESHIA

      Anyị Mere Ihe A Gwara Anyị ma Dịrị Ndụ

      Blasius da Gomes

      • A MỤRỤ YA N’AFỌ 1963

      • E MERE YA BAPTIZIM N’AFỌ 1995

      • ONYE Ọ BỤ Ọ bụ okenye ọgbakọ nke lekọtara atụrụ Jehova n’oge e nwere ọgba aghara okpukpe n’Ambọn. Ambọn bụ otu n’ime agwaetiti e nwere n’Agwaetiti Maluku.

      Onye a bụ Nwanna Blasius da Gomes

      N’ABALỊ iri na itoolu n’ọnwa Jenụwarị afọ 1999, nghọtahie ndị Alakụba na Ndị Kraịst nwere bịaziri ghọọ tigbuo zọgbuo. Isi n’ụlọ m gaa n’ebe ọ malitere dị kilomita atọ. Ọ bụghịkwa obere nsogbu.a

      Mgbe m kpọpụchara ndị ezinụlọ m, m kpọrọ ndị nkwusa ndị ọzọ n’ekwentị ka m mara otú ha mere. M gwara ha etinyela aka n’ọgba aghara ahụ nakwa ka ha ghara ịga ebe e nwere ọgba aghara. Mgbe e mechara, ndị okenye gakwuuru ụmụnna anyị gbaa ha ume ka okwukwe ha sikwuo ike, gwakwa ha ka ha na-ezukọta obere obere enwe ọmụmụ ihe.

      Alaka ụlọ ọrụ gwara anyị kpọpụ nwanna ọ bụla bi n’ebe ndị a na-enwe ọgba aghara ahụ. Anyị gwakwara ụmụnna anyị ndị bi n’ebe ndị ahụ ka ha kwapụ. Ma, e nwere otu nwanna na-ekweghị akwapụ. Ọgba aghara ahụ mechakwara taa isi ya. Ma, ọkọ akọghị nwanna ọ bụla mere ihe alaka ụlọ ọrụ kwuru.

      a E nwere tigbuo zọgbuo n’ebe niile na Maluku ruo ihe karịrị afọ abụọ. O mekwara ka ọtụtụ ndị hapụ ụlọ ha gbaa ọsọ ndụ.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya