Foto nke aka ekpe: Ebe ndị Betel na Bruklin na-agba krismas n’afọ 1926. Nke a bụ Krismas ikpeazụ ha gbara; foto nke aka nri: Ndị mmadụ na-achọpụta na Ndịàmà Jehova dị iche
NKEBI NKE 3
Ihe Ndị E Ji Ama Ndị Alaeze Chineke Na-achị—Ha Na-agbalị Ime Uche Chineke
KA E were ya na e nwere otu ụbọchị i ji ụkwụ na-aga, hụ otu onye agbata obi gị, gị efeere ya aka, ya efeekwara gị. Ya asị gị bịa na o nwere ihe ya chọrọ ịjụ gị. Mgbe ị bịakwutere ya, ya ajụọ gị, sị: “Gịnị mere unu ji dị iche?” Gị agwa ya na ị ghọtaghị ihe ọ na-ajụ. Ya ajụọ gị, sị: “Ọ̀ kwa ị bụ Onyeàmà Jehova?” Gị asị ya, ee. Ya agwa gị na ihe mere ya ji ajụ gị ihe a bụ na ya chọpụtara na unu dị iche na chọọchị ndị ọzọ. Na unu anaghị eme ememme ndị ọzọ na-eme. Unu anaghị eso na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, unu anaghịkwa aga agha, ma ya fọdụzie ịṅụ sịga na ịkpọ anwụrụ. Ọ gwakwara gị na ya chọpụtakwara na ezinụlọ gị na-akpa àgwà ọma. Ya ajụọ gị, sị, “Gịnị mere unu ji dị iche?”
Ị ma na ihe mere anyị ji dị iche na chọọchị ndị ọzọ bụ n’ihi na Alaeze Chineke na-achị anyị. Jizọs bụ́ Eze anyị na-emekwa ka anyị dịrị ọcha. Ọ na-enyere anyị aka ka anyị na-akpa àgwà ka ya, nakwa ka anyị ghara ịkpa àgwà otú ụwa a si akpa. Ná nkebi nke atọ a, anyị ga-eleba anya n’otú Alaeze Mesaya si na-eme ka anyị na-akụzi eziokwu, na-akpakwu àgwà ọma, na-emekwa ka nzukọ anyị na-eme ihe otú Jehova chọrọ. Ihe a niile na-eme ka a na-enye Jehova otuto.