Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
JENỤWARỊ 1-7
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MATIU 1-3
“Alaeze Eluigwe Eruwo Nso”
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 3:1, 2
ikwusa ozi ọma: Okwu Grik a sụgharịrị ikwusa pụtara “ikwupụta ihe dị ka ọkụ ékwé na-eme.” Ọ na-akọwa otú e si zie ozi ahụ: ọ na-abụkarị okwu a nọ n’èzí na-agbasa, ọ bụghị okwuchukwu a gwara ìgwè mmadụ.
Alaeze: Ihe a bụ nke mbụ okwu Grik bụ́ ba·si·leiʹa gbara. Ọ pụtara ọchịchị nwere ókèala na ndị mmadụ, nke otu eze na-achị. Okwu Grik a pụtara ugboro otu narị na iri isii na abụọ n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Iri ise na ise n’ime ha bụ n’akwụkwọ Matiu ka ọ dị. Ọtụtụ n’ime ha pụtara n’ebe e kwuru gbasara ọchịchị Chineke nke dị n’eluigwe. Otú okwu a si pụta ọtụtụ ugboro n’Oziọma Matiu nwere ike ime ka a kpọwazie ya akwụkwọ Oziọma Alaeze.
Alaeze nke eluigwe: Okwu a pụtara ihe dị ka ugboro iri atọ naanị n’Oziọma Matiu. N’Oziọma Mak na Luk, e dere okwu yiri ya bụ́ “Alaeze Chineke,” nke na-egosi na “Alaeze Chineke” bụ ọchịchị dị n’eluigwe, nke ga-esi n’eluigwe na-achị ụwa.—Mat. 21:43; Mak 1:15; Luk 4:43; Dan. 2:44; 2 Tim. 4:18.
eruwo nso: Ọ pụtara na oge Onye ga-achị Alaeze eluigwe ga-apụta adịla nso.
nwtsty ihe e ji kọwaa Mat. 3:4
Otú Jọn Onye Na-eme Baptizim Dị n’Ile Anya na Uwe Ya
Jọn na-eyi uwe e ji ajị kamel kpaa. Ọ na-ekekwa ájị̀ akpụkpọ anụ n’úkwù ya. O nwekwara ike itinye obere ihe ụfọdụ n’ájị̀ ahụ o kere n’úkwù. Ịlaịja onye amụma jikwara ụdị ejiji a. (2 Eze 1:8) Uwe e ji ajị kamel kpaa bụ uwe ọtụtụ ndị ogbenye na-eyikarị. Ndị bara ọgaranya na-eyikarị uwe e ji silk ma ọ bụ linin mee. (Mat. 11:7-9) Ebe ọ bụ na Jọn bụ onye Naziraịt kemgbe a mụrụ ya, o ga-abụ na ọ kpụtụbeghị isi mbụ. O nwekwara ike ịbụ na ma ọdịdị ya ma uwe ya na-eme ka onye hụrụ ya mata ozugbo na ọ na-ebi ndụ dị mfe, jirikwa ndụ ya niile na-ejere Chineke ozi.
Igurube
Na Baịbụl, “igurube” nwere ike ịpụta ụdị ụkpara ọ bụla nwere mpi mkpụmkpụ, karịchaa, ụkpara ndị nke ahụ na-aga n’ìgwè buru ibu. Nchọpụta e mere na Jeruselem gosiri na e kee protin a na-eri ebe ahụ ụzọ anọ, atọ n’ime ya na-esi n’igurube si n’ọzara. Ndị na-eri ya taa, na-ewepụ isi ya, ụkwụ ya, nku ya na afọ ya. Ha na-ata obi ya fọrọnụ ná ndụ ma ọ bụ sie ya n’ọkụ. Ndị mmadụ na-ekwu na igurube ndị a na-atọ ka oporo ma ọ bụ nshịkọ, na-enyekwa protin.
Mmanụ Aṅụ Ọhịa
Ihe a bụ foto ụlọ aṅụ ọhịa rụrụ (1) na ụgbụgbọ mmanụ aṅụ juru (2). O nwere ike ịbụ na mmanụ aṅụ ahụ Jọn rachara bụ nke aṅụ ọhịa ndị bi ebe ahụ a na-akpọ Apis mellifera syriaca na-emepụta. Aṅụ ndị a na-akpa ezigbo ike nwere ike ibi n’ọzara Judia na-ekpo ezigbo ọkụ ma kpọọkwa nkụ. Ndị mmadụ anaghị azụli aṅụ ndị a n’ihi oké ike ha na-akpa. Ma, a chọpụtara na n’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ itoolu gara aga, ndị Izrel ji ite ájá zụọ aṅụ. E gwupụtara ọtụtụ n’ime ite ájá ndị ahụ n’etiti otu obodo mepere emepe (a na-akpọzi obodo ahụ Tel Rehov) dị ná ndagwurugwu Jọdan. Ọ ga-abụ na ebe ha si nweta aṅụ ndị ha zụrụ n’ite ájá ndị ahụ bụ n’ebe a na-akpọ Tọki ugbu a.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 1:3
Tema: Bụ nwaanyị mbụ n’ime ụmụ nwaanyị ise a kpọrọ aha ha n’usoro ọmụmụ Mesaya dị n’akwụkwọ Matiu. Ụmụ nwaanyị ndị ọzọ fọrọnụ bụ Rehab na Rut, na-abụghị ndị Izrel (amaokwu nke 5); Bat-shiba, “nwunye Yuraya” (amaokwu nke 6); na Meri (amaokwu nke 16). Ọ bụ aha ụmụ nwoke naanị kwesịrị ịdị n’usoro ọmụmụ Jizọs. O nwere ike ịbụ na ihe mere aha ụmụ nwaanyị ndị a ji dịrị na ya bụ n’ihi na ha niile nwere otú pụrụ iche ha si mechaa ghọọ ndị nne ochie Jizọs.
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 3:11
na-eme unu baptizim: Ma ọ bụ “mikpuo unu.” Okwu Grik bụ ba·ptiʹzo pụtara “imikpu; ịdaba.” E nwekwara ebe ndị ọzọ Baịbụl kwuru na a na-emikpu mmadụ kpamkpam n’ime mmiri ma e mewe ya baptizim. N’otu oge, Jọn nọ na-eme ndị mmadụ baptizim n’otu ebe dị ná ndagwurugwu Jọdan dị Selim nso “n’ihi na e nwere mmiri buru ibu n’ebe ahụ.” (Jọn 3:23) Mgbe Filip mere ọnaozi Itiopia ahụ baptizim, ha abụọ “banyekwara n’ime mmiri.” (Ọrụ 8:38) E dekwara otu okwu Grik ahụ na Septuagint ná 2 Ndị Eze 5:14. Ebe ahụ kwuru na Neaman gara “mikpuo onwe ya ugboro asaa na Jọdan.”
JENỤWARỊ 8-14
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MATIU 4-5
“Ihe Anyị Na-amụta n’Ozizi Elu Ugwu Jizọs”
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 5:3
Obi ụtọ: Ihe a na-ekwu ebe a abụghị inwe obi ụtọ nkịtị, dị ka nke mmadụ na-enweta ná ntụrụndụ. Kama, ọ bụ ọnọdụ mmadụ nọ na ya n’ihi ịbụ onye nwetara ngọzi Chineke, nakwa n’ihi ịbụ onye ya na Chineke dị ná mma. E kwukwara na Chineke bụ onye obi ụtọ, Jizọs abụrụkwa onye obi ụtọ n’ebube ya nke eluigwe.—1 Tim. 1:11; 6:15.
ndị maara mkpa ime mmụọ ha: Okwu Grik a sụgharịrị “ndị maara mkpa” pụtara “ndị dara ogbenye (ndị nọ ná mkpa; ndị nọ n’ụkọ; ndị arịrịọ).” N’ebe a, e ji ya na-akọwa ndị maara nke ọma na ha nwere mkpa. E jikwa ya kọwaa ọnọdụ “onye arịrịọ” bụ́ Lazarọs na Luk 16:20, 22. Nkebi ahịrịokwu Grik ahụ ọtụtụ nsụgharị Baịbụl dere “ogbenye n’ime mmụọ” na-ekwu gbasara ndị ọ na-ewute nke ukwuu n’ihi na ha maara na ha dara ogbenye n’ime mmụọ nakwa na ha chọsiri Chineke ike ná ndụ ha.
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 5:7
ime ebere: Mgbe Baịbụl kwuru banyere ‘ime ebere’ na “ebere,” ihe ọ na-ekwu abụghị naanị ịgbaghara mmadụ mmehie ma ọ bụ iji obi ebere kpee ikpe. Kama, ọtụtụ mgbe ihe ọ na-ekwu gbasara ya bụ mmadụ inwere mmadụ ibe ya ọmịiko nke na-eme ka onye ahụ si n’ala ala obi ya nyere onye ahụ nọ ná mkpa aka.
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 5:9
ndị na-eme udo: Ọ bụghị naanị na ndị a na-agbalị ime ka udo dịrị na-aga, kama, ha na-emekwa ka udo dịrị n’ebe udo na-adịghị.
w07 12/1 17
Kụziere Nwa Gị Otú E Si Eme Udo
Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst chọsiri nnọọ ike ịzụ ụmụ ha ka ha bụrụ ndị ‘na-achọ udo ma na-achụso ya.’ (1 Pita 3:11) Obi ụtọ mmadụ na-enwe n’ihi ịbụ onye na-eme udo dị nnọọ ukwuu nke na o kwesịrị ime mgbalị nile o nwere ike ime iji ghara ịdị na-enyo ndị ọzọ enyo, zerekwa ịkpasu ndị ọzọ iwe ma ọ bụ ibu iwe n’obi.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 4:9
fee m ofufe: Okwu Grik a sụgharịrị “ife ofufe” na-egosi ihe na-agaghị egbu oge. Okwu ahụ bụ́ “fee m ofufe” gosiri na Ekwensu a naghị agwa Jizọs ka o ferezie ya na-aga. Ihe ọ chọrọ bụ ka o ‘fee ya ofufe’ naanị otu ugboro.
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 4:23
na-ezi ihe . . . na-ekwusa: Izi ihe dị iche n’ime nkwusa, n’ihi na ọrụ onye nkụzi karịrị naanị ikwupụta ihe. Onye nkụzi na-ezi ihe, na-akọwa ihe, na-ekwu ihe otú ọ ga-edo anya ma na-egosikwa ihe àmà ga-akwado ihe ọ na-ekwu.
JENỤWARỊ 15-21
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MATIU 6-7
“Buru Ụzọ Na-achọ Alaeze Ahụ”
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 6:24
ohu: Okwu Grik a pụtara onye na-agba ohu, ya bụ́, onye naanị otu nna ukwu nwe. Ihe Jizọs na-ekwu n’ebe a bụ na ọ gaghị ekwe omume Onye Kraist inye Chineke ofufe a na-ekewaghị ekewa ma ka jirikwa ike ya niile na-akpakọbara onwe ya akụnụba.
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 6:33
na-achọ: N’asụsụ Grik, okwu a na-egosi ihe a ga-emere na-aga. O nwekwara ike ịpụta “nọgide na-achọ.” Ezi ndị na-eso ụzọ Jizọs ekwesịghị ịchọtụ Alaeze ahụ oge ụfọdụ ma hapụ ya chụrụzie ihe ndị ọzọ gawa. Kama, ha kwesịrị ịnọgide na-eme ka ọ bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ ha.
alaeze ahụ: N’ụfọdụ ihe odide oge ochie nke Grik, e dere ya “Alaeze Chineke.”
ezi omume: Ndị na-achọ ezi omume Chineke bụ ndị na-eme uche ya ma na-erube isi n’ihe iwu ya kwuru. Ihe a megidere ozizi ndị Farisii, bụ́ ndị na-eji aka ha ekpebi ihe ha chere bụ́ ezi omume.—Mat. 5:20.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 7:28, 29
juru ìgwè mmadụ ahụ anya: E nwere ike ikwu na okwu Grik a pụtara “ihe ịtụ mmadụ n’anya nke mere ka onye ahụ gharazie inwe ọnụ okwu.” O gosikwara na okwu Jizọs nọgidekwara na-emetụ ìgwè mmadụ ahụ n’ahụ́.
otú o si ezi ihe: Okwu a na-ekwu gbasara otú Jizọs si akụzi ihe, ihe ndị ọ kụziri, nakwa ihe niile o kwuru n’Ozizi Elu Ugwu ya.
ọ bụghị dị ka ndị odeakwụkwọ ha: Kama ikwughachi ihe ndị rabaị a na-akwanyere ùgwù kwuru, otú ahụ ndị odeakwụkwọ na-emekarị, Jizọs kwuru okwu ka onye nnọchite anya Jehova, dị ka onye nwere ikike. Ihe ndị ọ kụziri sitere n’Akwụkwọ Nsọ.—Jọn 7:16.
JENỤWARỊ 22-28
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MATIU 8-9
“Jizọs Hụrụ Ndị Mmadụ n’Anya”
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 8:3
bitụ ya aka: Iwu Mozis kwuru ka ndị ekpenta bipụ iche ka ọrịa ahụ ghara ife ndị ọzọ. (Lev. 13:45, 46; Ọnụ Ọgụ. 5:1-4) Ma, ndị ndú okpukpe ndị Juu tụkwasịrị iwu ndị ọzọ n’elu iwu a. Dị ka ihe atụ, ha kwuru na mmadụ ekwesịghị ịbịa onye ekpenta nso karịa kubit anọ, ya bụ, ihe dị ka mita abụọ. N’ụbọchị ifufe na-efe, ndị mmadụ agaghị abịa ha nso karịa otu narị kubit, ma ọ bụ ihe dị ka mita iri anọ na ise. Ụdị iwu ndị a mere ka a na-emekpọ ndị ekpenta ọnụ. Ọ pụtara na iwu a kwadoro onye rabaị ịgbara ndị ekpenta ọsọ ma ọ bụkwanụ ịtụ ha nkume ka ha ghara ịbịaru ha nso. Ma, Jizọs adịghị ka ha n’ihi na ọmịiko o nwere n’ahụ́ onye ekpenta ahụ mere ka o mee ihe ndị Juu ndị ọzọ na-agaghị anwa anwa mee, ya bụ, imetụ nwoke ahụ aka. O metụrụ ya aka n’agbanyeghị na o nwere ike iji okwu ọnụ efu gwọọ ya.—Mat. 8:5-12.
Achọrọ m: Ọ bụghị naani na Jizọs nabatara arịrịọ nwoke ahụ, kama o kwuru ihe gosiri na ya chọsiri ike ime ihe maka ya. O si n’ala ala obi ya gwọọ ya, ọ bụghị n’ihi na ọ bụ ọrụ dịịrị ya.
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 9:10
na-eri ihe: Ma ọ bụ “na-eri ihe na tebụl.” Mmadụ abụọ ịnọ n’otu tebụl rikọọ nri na-egosi na ha dị n’ezigbo mma. N’ihi ya, ndị Juu n’oge Jizọs na ndị na-abụghị ndị Juu agaghị anwa anwa rikọọ nri n’otu tebụl.
ndị ọnaụtụ: Ọtụtụ ndị Juu na-anatara ndị ọchịchị Rom ụtụ isi. Ndị mmadụ kpọrọ ndị Juu ndị a asị, ọ bụghị naanị n’ihi na ha na ndị ọchịchị Rom ha kpọrọ asị na-emekọ ihe, kama, ha na-anara ndị mmadụ ego karịrị ego ha kwesịrị ịkwụ n’ụtụ isi. Ndị Juu kpọrọ ndị ọnaụtụ asị, na-ewere ha otú ahụ ha si were ndị mmehie na ndị akwụna.—Mat. 11:19; 21:32.
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 9:36
nwere ọmịiko: Okwu Grik bụ́ splag·khniʹzo·mai e si sụgharịa okwu a nwere ihe jikọrọ ya na “eriri afọ” (splagʹkhna). Ọ pụtara ihe imetụ mmadụ n’ime ahụ́, ma ọ bụ ihe iru mmadụ n’ahụ́. Ọ bụ otu n’ime okwu ndị kacha akọwa inwe ọmịiko n’asụsụ Grik.
JENỤWARỊ 29–FEBỤWARỊ 4
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MATIU 10-11
“Jizọs Gwara Ndị Mmadụ Okwu Gbara Ha Ume”
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 10:29, 30
nza: A na-eji okwu Grik bụ strou·thiʹon akọwa obere nnụnụ niile. Ma ọtụtụ mgbe, ọ na-apụta nza. Ọ bụ nza bụ nnụnụ a na-eri eri kacha dị ọnụ ala.
otu mkpụrụ ego nke ga-azụtali naanị ihe dị nta: Ya bụ, “otu asariọn,” bụ́ ego ole a na-akwụ mmadụ ma ọ rụọ ọrụ nkeji iri anọ na ise. (Gụọ sgd-IB isi nke 18) N’oge nke atọ a Jizọs mere njem na-aga Galili, o kwuru na ego ole a na-ere nza abụọ bụ otu asariọn. Mgbe ihe dị ka otu afọ gachara, ka Jizọs nọ na Judia na-ekwusa ozi ọma, o kwuru na e nwere ike ire nza ise asariọn abụọ. (Luk 12:6) Ihe e kwuru n’amaokwu abụọ a gosiri na nza enwechaghị uru ọ bara n’anya ndị na-ere ya nke na ha nwere ike inye mmadụ nke ise ahụ n’efu.
a gụwo ntutu niile dị n’isi unu ọnụ: Ntụtụ isi dị n’isi mmadụ ọ bụla nwere ike ịkarị otu nari puku. Na Jehova maara gbasara nke ọ bụla n’ime ntụtụ ndị a, na-eme ka obi sie anyị ike na ọ na-eche gbasara onye ọ bụla n’ime ndị na-eso ụzọ Kraịst.
nwtsty ihe e ji kọwaa Mat. 10:29
Nza
Nza bụ nnụnụ a na-eri eri kacha dị ọnụ ala. E nwere ike iji ego a kwụrụ mmadụ n’ọrụ ọ rụrụ ná nkeji iri anọ na ise zụta nza abụọ. A na-eji okwu Grik ahụ a kọwa obere nnụnụ niile, ma nza nke na-anọ ebe ndị mmadụ bi (Passer domesticus biblicus) ma nza nke a kpọrọ Spanish sparrow (Passer hispaniolensis), bụ́kwanụ nke juru n’Izrel ruo taa.
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 11:28
boro ibu dị arọ: Ndị Jizọs kpọrọ ka ha bịakwute ya bụ ndị nchegbu na ndọgbu n’ọrụ “boro ibu dị arọ.” Ọ bụ omenala ndị mmadụ ndị ha tụkwasịrị n’Iwu Mosis mere ka ofufe ha na-efe Jehova bụụrụ ha ibu arọ. (Mat. 23:4) Ha mekwara ka Ụbọchị Izu Ike kwesịrị ịbụ ụbọchị ịṅụrị ọṅụ, siere ndị mmadụ ezigbo ike.—Ọpụ. 23:12; Mak 2:23-28; Luk 6:1-11.
m ga-emekwa ka unu nweta ume: Okwu Grik a sụgharịrị “inweta ume” nwere ike ịpụta ma izu ike (Mat. 26:45; Mak 6:31), ma ịhapụ ndọgbu n’ọrụ iji nwetaghachi ume (2 Kọr. 7:13; Faị. 7). Ihe ndị e kwuru n’amaokwu a gosiri na ịnyara “yok” Jizọs (Mat. 11:29) bụ ije ozi, ọ bụghị izu ike. Ihe okwu Grik a na-ekwu bụ na Jizọs ga-eme ka ndị ike gwụrụ nweta ume na ike ga-eme ka ọ gụwa ha agụụ iburu yok Jizọs nke dị mfe obubu.
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mat. 11:29
Nyaranụ yok m: Jizọs ji “yok” na-akọwa ido onwe n’okpuru nke iwu na ntụziaka nke ọchịchị. Ọ bụrụ na ihe o bu n’uche bụ yok gbara mkpị, nke Chineke boro ya, ọ pụtara na ihe ọ na-agwa ndị na-eso ụzọ ya bụ ka ha soro ya nyara yok ahụ, n’ihi na ya ga-enyere ha aka. Ọ bụrụ otú ahụ, e nwere ike ide okwu ahụ ka ọ bụrụ: “Bịanụ soro m nyara yok m.” Ma, ọ bụrụkwanụ na yok ahụ bụ nke o nyawara ndị ọzọ, ọ pụtara na ihe ọ na-ekwu bụ ka mmadụ doo onwe ya n’okpuru ọchịchị na ntụziaka nke Kraịst.