Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
MEE 7-13
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MAK 7-8
“Bulie Osisi Ịta Ahụhụ Gị, Na-eso M Mgbe Niile”
nwtsty ihe a kọwara na Mak 8:34
ya jụ onwe ya: Ma ọ bụ “ya hapụ ime ihe ahụ́ ya chọrọ.” Ihe ọ pụtara bụ na mmadụ ga-adị njikere ịhapụ ihe na-amasị ya ma ọ bụkwanụ sị Chineke jiri ya mee ihe ọ bụla masịrị ya. E nwekwara ike ịsụgharị okwu Grik pụtara “ya jụ onwe ya” ka ọ bụrụ “ọ ga-asịrịrị onwe ya mba.” Ịsụgharị ya otú a dabara adaba n’ihi na o nwere ike ịpụta na onye ahụ ga-ahapụ ihe ndị na-agụ ya, ihe ndị ọ chọrọ ime na ihe ndị na-amasị ya. (2 Kọr. 5:14, 15) Mak jikwa okwu Grik a kọwaa ngọnahụ Pita gọnahụrụ Jizọs.—Mak 14:30, 31, 72.
MEE 14-20
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MAK 9-10
“Ọhụụ nke Na-eme Ka Okwukwe Sie Ike”
nwtsty ihe a kọwara na Mak 9:7
otu olu: Ihe a bụ nke abụọ n’ime ebe atọ e dere n’akwụkwọ Mak na Jọn na Jehova n’onwe ya si n’eluigwe gwa ndị mmadụ okwu.—Jọn 12:28; gụọ ihe a kọwara na Mak 1:11, mwbr18.04 4.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mak 10:17, 18
Ezi Onye Ozizi: O doro anya na ihe mere nwoke a ji kpọọ Jizọs “Ezi Onye Ozizi” bụ iji tuo ya aha, n’ihi na ndị ndú okpukpe ndị Juu na-achọkarị ka ndị mmadụ na-etu ha ụdị aha a. Ọ bụ eziokwu na Jizọs kwere ka ndị mmadụ na-akpọ ya “Onye Ozizi” na “Onyenwe anyị” n’ihi na ọ bụ ihe ọ bụ (Jọn 13:13), ma, o nyere Nna ya nsọpụrụ niile.
Ọ dịghị onye bụ́ ezi onye, ma e wezụga otu onye, ya bụ, Chineke: Ihe a Jizọs kwuru gosiri na ọ ma na ọ bụ Jehova bụ onye kacha onye ọ bụla eme ihe ọma nakwa na ọ bụ Jehova ka o ruuru ikpebi ihe dị mma na ihe na-adịghị mma. Mgbe Adam na Iv nupụụrụ Jehova isi rie mkpụrụ osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ, ha gosiri na ha chọrọ iji aka ha na-ekpebi ihe dị mma na ihe na-adịghị mma. Ma, Jizọs emeghị ka ha, kama, o wedara onwe ya n’ala kweta na ọ bụ Nna ya kwesịrị ịrụ ọrụ a. Chineke esila n’Okwu ya bụ́ Baịbụl mee ka anyị mata ihe ndị dị mma ọ chọrọ ka anyị na-eme.—Mak 10:19.
MEE 21-27
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MAK 11-12
“Ọ Tụnyere Ihe Karịa Ihe Ndị Niile Ahụ Tụnyere”
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Mak 12:41, 42
igbe ndị ahụ a na-atụnye ego: Akwụkwọ ndị mgbe ochie ndị kọrọ gbasara ndị Juu kwuru na a na-akpọ igbe ndị ahụ “opi” n’ihi na ha na-enwe obere oghere n’elu ha, ma saa mbara n’ala ha. Ndị mmadụ na-atụnye ego onyinye dị iche iche n’ime ha. Otu okwu Grik a a sụgharịrị “igbe ndị ahụ a na-atụnye ego” ka a sụgharịrị ‘ebe a na-edebe ego’ na Jọn 8:20. O yiri ka ebe ahụ a na-edebe ego ọ̀ dị n’Ogige Ụmụ Nwaanyị dị n’ime ụlọ nsọ. (Gụọ ihe a kọwara na Mat. 27:6 na Sgd-IB isi nke 15.) Ọtụtụ akwụkwọ ndị Rabaị kwuru na ọ bụ igbe iri na atọ ka a na-edowe gburugburu mgbidi ogige ahụ. A na-ekwukwa na ụlọ nsọ ahụ nwekwara ọnụ ụlọ ebe a na-ewekọta ego niile e nwetara n’igbe ndị ahụ.
obere mkpụrụ ego abụọ: Na Grik, ọ bụ “leptọn abụọ.” Okwu Grik bụ́ le·ptonʹ pụtara ihe dị obere ma taa ahụ́. Ọ bụ ego kacha nta e ji ọla kọpa ma ọ bụ ọla nchara kpụọ e ji azụ ihe n’Izrel oge ochie. Otu narị Leptọn na iri abụọ na asatọ bụ otu dinarịọs.—Gụọ Sgd-IB isi nke 18B
nke ga-azụtali ihe dị nnọọ nta: Na Grik ọ bụ “kwọdran.” Okwu Grik bụ́ ko·dranʹtes (nke e si n’okwu Latịn bụ́ Kwọdran nweta) bụ mkpụrụ ego ndị Rom e ji ọla kọpa ma ọ bụ ọla nchara mee. Kwọdran iri isii na anọ bụ otu dinarịọs. Mak ji ego ndị Rom a na-eme ka anyị mata ihe ego ndị Juu ga-azụtali.—Gụọ Sgd-IB isi nke 18B.
w87 12/1 30 ¶1
Onyinye Gị Ọ̀ Bụ Àjà Ị Na-chụrụ Chineke?
E nwere ọtụtụ ihe bara anyị uru anyị ga-amụta n’akụkọ a. Ihe akụkọ ahụ kacha akụziri anyị bụ na ọ bụ eziokwu na anyị niile nwere ohere magburu onwe ya iji ihe ndị anyị nwere na-akwado ofufe Chineke, onyinye na-akacha amasị ya bụ ma anyị nye ya ihe anyị ji kpọrọ oké ihe, ọ bụghị ihe na-enwechaghị ihe anyị ji ya kpọrọ. Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị ma ànyị na-enye Chineke ihe na-enweghị ihe anyị jicha ya kpọrọ, ka ànyị na-achụ ihe ụfọdụ n’àjà iji nye Chineke onyinye?
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
nwtsty ihe a kọwara na Mak 11:17
ụlọ ekpere dịịrị mba niile: Matiu, Mak na Luk kwughachiri ihe dị n’Aịzaya 56:7 n’akwụkwọ ndị ha dere, ma ọ bụ naanị Mak tinyere “dịịrị mba niile [ndị niile]” na nke ya. (Mat. 21:13; Luk 19:46) Ihe mere e ji rụọ ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem bụ ka ndị Izrel na ndị mba ọzọ na-atụ egwu Chineke nọrọ na ya na-ekpe ekpere ma na-efe Jehova. (1 Eze 8:41-43) Jizọs katọrọ ndị Juu ji ụlọ nsọ ahụ mere ebe a na-ere ahịa, nke mere ka ọ ghọzie ọgba nke ndị na-apụnara mmadụ ihe. Ihe ahụ ha na-eme gbochiri ndị mba niile ịbịakwute Jehova n’ụlọ ekpere ya, gbochiekwa ha ịmata ya nke ọma.
MEE 28–JUN 3
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MAK 13-14
“Ekwela Ka Ịtụ Egwu Mmadụ Mee Ka Ị Ma n’Ọnyà”
it-2 619 ¶6
Pita
Onye na-eso ụzọ Jizọs ọzọ nyeere Pita aka kpọrọ ya banye n’ime mbara èzí nnukwu onye nchụàjà ahụ. (Jọn 18:15, 16) Pita agaghị nọrọ duu n’ebe gbara itiri ka a ghara ịhụ ya, kama, ọ pụtara na-anya ọkụ ka ahụ́ kporo ya ọkụ. Ìhè ọkụ ahụ mere ka ndị nọ ebe ahụ mata na ọ bụ onye na-eso ụzọ Jizọs, olu okwu ya nke gosiri na ọ bụ onye Galili nyekwaara ha aka ịmata ya. Mgbe a jụrụ ya ma ọ̀ bụ onye na-eso ụzọ Jizọs, ọ gọnahụrụ Jizọs ugboro atọ, kwuo na ya amatụdịghị onye ọ bụ. Ọ malitere ịdụ ikwu na ịṅụ iyi iji zọrọ isi ya. O gbughị oge oké ọkpa ebee nke ugboro abụọ, Jizọs ‘atụgharịa legide Pita anya.’ Nke a mere ka Pita pụọ n’èzí kwaa ákwá nke ukwuu. (Mat. 26:69-75; Mak 14:66-72; Luk 22:54-62; Jọn 18:17, 18; gụọ isiokwu Bekee bụ́ COCKCROWING dị na it-1 486; nakwa isiokwu Bekee bụ́ OATH dị na it-2 516.) Ma, a zara ekpere Jizọs kpere tupu mgbe ahụ n’isi Pita nke mere ka okwukwe ya ghara ịnyụ ka ọkụ.—Luk 22:31, 32.