Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
JULAỊ 2-8
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | LUK 6-7
“Na-emere Ndị Ọzọ Ihe Ọma”
nwtsty ihe a kọwara na Luk 6:37
Na-atọhapụnụ ndị mmadụ, a ga-atọhapụkwa unu: Ma ọ bụ “Na-agbagharanụ ndị mmadụ, a ga-agbaghakwara unu.” Okwu Grik a sụgharịrị “ịgbaghara” pụtara “ịhapụ onye e ji eji; izilaga; ịtọpụ n’agbụ (dị ka a na-eme onye mkpọrọ).” Ihe ebe a na-ekwu bụ na kama ịna-ekpe ndị ọzọ ikpe ma ọ bụ na-ama ha ikpe, anyị kwesịrị ịtọhapụ ma ọ bụ gbaghara ndị mejọrọ anyị, ọ bụrụgodị na anyị chere na e kwesịrị ịta ha ahụhụ.
nwtsty ihe a kọwara na Luk 6:38
Na-enyenụ ihe: Okwu Grik a sụgharịrị “na-enyenụ ihe” gosiri na ọ bụ ihe a ga-emere na-aga. E nwekwara ike ịsụgharị ya “akwụsịla ịna-enye ihe.”
nwtsty ihe a kọwara na Luk 6:38
n’apata ụkwụ unu: Okwu Grik e si sụgharịta okwu a pụtara “n’obi gị.” Ma n’amaokwu a, o yiri ka ọ̀ pụtara ebe a fụkọtara afụkọta n’uwe elu mmadụ. O nwere ike ịbụ na e ji okwu bụ́ ‘ịwụnye n’apata ụkwụ’ na-akọwa ihe ahụ ndị ahịa ụfọdụ na-eme n’oge ochie. Ha na-awụjuru mmadụ ihe ọ zụrụ n’ebe ọ fụkọtara n’uwe elu ya.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
nwtsty ihe a kọwara na Luk 7:35
ụmụ ya: Ma ọ bụ “ihe si na ya pụta.” N’amaokwu a, e kwuru na amamihe nwere ụmụ. N’ebe ọzọ e kwuru gbasara amamihe na Mat. 11:19, a sịrị na ọ na-arụ “ọrụ.” Ụmụ amamihe ma ọ bụ ihe ndị ọ rụpụtara pụtara ihe ndị si ma n’ọrụ Jọn Onye Na-eme Baptizim ma n’ọrụ Jizọs pụta, ndị gosiri na ebubo ndị e boro ha abụghị eziokwu. Ihe Jizọs na-ekwu n’ebe a bụ: ‘Leenụ ihe mmadụ na-eme, ụnụ ga-ama ma ebubo e boro ya ọ̀ bụ eziokwu.’
JULAỊ 9-15
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | LUK 8-9
“Olee Ihe A Chọrọ n’Aka Onye Na-eso Ụzọ Jizọs?”
it-2 494
Akwụ́
Mgbe otu onye odeakwụkwọ ndị Juu gwara Jizọs, sị: “Onye Ozizi, m ga-eso gị gaa ebe ọ bụla ị chọrọ ịga,” Jizọs sịrị ya: “Nkịta ọhịa nwere ọgba, anụ ufe nke eluigwe nwekwara akwụ́, ma Nwa nke mmadụ enweghị ebe ọ ga-atọgbọ isi ya.” (Mat. 8:19, 20; Luk 9:57, 58) Jizọs gwara nwoke ahụ na ọ bụrụ na ọ chọrọ ịbụ onye na-eso ụzọ ya, o kwesịghị ịtụ anya inweta ihe niile na-eme ka ndụ na-adị ụtọ, nakwa na ọ ga-atụkwasị Jehova obi ya niile. Otu ihe a ka Jizọs chọrọ ka anyị mụta mgbe ọ sịrị: “Nye anyị nri taa maka ụbọchị taa” n’ekpere ahụ ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya. Ọ bụkwa ya mere o ji kwuo, sị: “N’ụzọ dị otú ahụ, n’ezie, ọ dịghị onye ọ bụla n’ime unu nke na-ahapụghị ihe niile o nwere nke pụrụ ịbụ onye na-eso ụzọ m.”—Mat. 6:11; Luk 14:33.
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Luk 9:59, 60
lie nna m: O nwere ike ịbụ na okwu a apụtaghị na nna nwoke a ka nwụrụ anwụ, ya ana-arịọ ka a hapụ ya ka ọ gaa lie nna ya. Ya bụrụ otú ahụ, ọ garaghị anọ ebe ahụ na-agwa Jizọs okwu, n’ihi na n’oge ochie, n’ala Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu, mmadụ nwụọ, a na-eli onye ahụ ngwa ngwa. Ha na-elikarị onye ahụ n’ụbọchị ọ nwụrụ. N’ihi ya, ọ ga-abụ na nna nwoke a emeela agadi, ma ọ bụkwanụ na ahụ́ adịghị ya, ọ bụghị na ọ nwụọla. Ọ ga-abụrịrị na nwoke ahụ nwere ndị ezinụlọ ndị ọzọ nwere ike ilekọta nna ya n’ihi na Jizọs agaraghị agwa ya ka ọ hapụ nna ya na-arịa arịa. (Mak 7:9-13) Ihe nwoke a na-ekwu n’eziokwu, bụ: ‘M ga-eso gị, ma ọ gaghị abụ ugbu a nna m ka nọ ndụ. Biko chere ka nna m nwụgodị. M lichaa ya, mụ esowe gị.’ Ma n’uche Jizọs, nwoke a na-atụfu ohere o nwere igosi na ya na-ebute ihe gbasara Alaeze Chineke ụzọ ná ndụ ya.—Luk 9:60, 62.
Hapụ ndị nwụrụ anwụ ka ha lie ndị ha nwụrụ anwụ: Ihe a kọwara na Luk 9:59 gosiri na o yikarịrị ka ahụ́ adịghị nna nwoke a Jizọs nọ na-agwa okwu, ọ bụghị na ọ nwụọla. N’ihi ya, ihe Jizọs na-ekwu, bụ: ‘Hapụ ndị nwụrụ anwụ n’anya Chineke, ka ha lie ndị ha nwụrụ anwụ,’ ya bụ, ka nwoke a hapụ ndị ezinụlọ ya ndị ọzọ ka ha lekọta nna ya ruo mgbe ọ ga-anwụ, tupu ya ekwuwa okwu ili ya. Ọ burụ na nwoke a esowe Jizọs, ọ ga-eso ná ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi, ọ gaghị eso ná ndị ahụ nwụrụ anwụ n’anya Chineke. Ihe Jizọs zara nwoke ahụ gosiri na mmadụ ibute ihe gbasara Alaeze Chineke ụzọ ná ndụ ya nakwa ịna-ekwusa Alaeze ahụ n’ebe niile, ga-eme ka onye ahụ bụrụ onye dị ndụ n’anya Chineke.
nwtsty ihe e ji kọwaa Luk 9:62
Ịkọ Ugbo
Ndị Juu oge ochie na-akọkarị ugbo n’udu mmiri, mgbe mmiri dere ala oké ọkọchị mere ka ọ kpọọ nkụ. (Gụọ sgd-IB isi nke 19.) Ihe ha na-eji eme ọ́gụ̀ ụfọdụ ha ji akọ ugbo bụ osisi pịrị ọnụ, mgbe ụfọdụkwa a na-eji ígwè eme ọnụ ya. A na-ejikọtazi ya na osisi ọzọ, otu anụ ụlọ ma ọ bụ abụọ ana-adọkpụ ya. A kọchaa ugbo, a kụọ ya ihe. N’Akwụkwọ Nsọ Hibru, a na-ejikarị ịkọ ugbo ama atụ. (Ikpe 14:18; Aịza. 2:4; Jere. 4:3; Maị. 4:3) Jizọs ji ihe gbasara ọrụ ugbo mee ihe atụ ọtụtụ ugboro mgbe ọ na-akụzi ihe dị mkpa. Dị ka ihe atụ, o ji ihe gbasara otú e si akọ ugbo kọwaa uru ọ bara mmadụ iji obi ya niile bụrụ onye na-eso ụzọ ya. (Luk 9:62) Ọ bụrụ na onye ji anụ ụlọ na-akọ ugbo ekwe ka ihe ọ bụla dọpụ ya uche n’ugbo ọ na-akọ, ihe ọ na-akọ ga-agbagọ agbagọ. Ọ bụrụkwa na onye na-eso ụzọ Kraịst ekwe ka ihe ọ bụla dọpụ ya uche ma ọ bụ mee ka ọ hapụ ịrụ ọrụ ya dị ka Onye Kraịst, ọ gaghịzi eru eru inweta Alaeze Chineke.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
nwtsty ihe a kọwara na Luk 8:3
na-ejere ha ozi: Ma ọ bụ “na-akwado ha (na-egboro ha mkpa).” Okwu Grik bụ́ di·a·ko·neʹo nwere ike ịpụta igboro ndị ọzọ mkpa, dị ka ịzụtara ha nri, isi ya na ibunye ha ya. Ọ bụ ụdị ihe a ka okwu ahụ pụtara na Luk 10:40 (‘ime ihe niile’), Luk 12:37 (“jeere ha ozi”), nakwa (“na-ekesa ihe oriri”) n’Ọrụ 6:2. Ma okwu Grik a nwekwara ike ịpụta ozi ndị ọzọ mmadụ na-ejere ibe ya. N’amaokwu a, e ji ya akọwa otú ụmụnna nwaanyị e kwuru gbasara ha n’amaokwu nke abụọ na nke atọ si kwadoo Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya, si otú ahụ nyere ha aka ịrụcha ọrụ Chineke nyere ha. Ụmụ nwaanyị ndị a ji ihe ọma a ha mere too Chineke. Chineke gosikwara na mmesapụ aka ha masịrị ya, ma mee ka e dee gbasara ya ka ọgbọ ndị ga-abịa n’ọdịnihu gụọ ya. (Ilu 19:17; Hib 6:10) E jikwa otu okwu Grik a kọwaa ihe ụmụ nwaanyị ụfọdụ mere na Mat. 27:55; Mak 15:41.
JULAỊ 16-22
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | LUK 10-11
“Ihe Atụ Onye Sameria Bụ́ Ezigbo Onye Agbata Obi”
nwtsty ihe e ji kọwaa Luk 10:30
Ụzọ Si Jeruselem Gaa Jeriko
Ọ ga-abụ na ụzọ a e dere (1) yiri ụzọ ahụ si Jeruselem gaa Jeriko n’oge ochie. Ụzọ ahụ karịrị kilomita iri abụọ n’ogologo, nweekwa ebe kpọdara akpọda dị otu kilomita. Ụzọ a gara gbagọrọ gbagọrọ si Jerụselem ruo Jeriko. Ọ na-atọgbọkarị chakoo, n’ihi ya, ndị agha na-eche nche na ya iji chebe ndị njem n’aka ndị omekome na-ezukarị ohi na ya. Ebe ụzọ a si n’ọzara Judia pụta ka Jeriko ndị Rom na-achị dị. Ọ dị n’ebe a e dere (2). Ebe a e dere (3) ka obodo Jeriko ochie dịbu. Ọ dị n’ebe dị ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ kilomita abụọ ma e si na Jeriko nke ndị Rom gawa ya.
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Luk 10:33, 34
otu onye Sameria: Ndị Juu na-eledakarị ndị Sameria anya, ha anaghịkwa achọ ka ha na ha mekọọ ihe ọ bụla. (Jọn 4:9) Ụfọdụ ndị Juu na-akpọdị mmadụ “onye Sameria” iji kparịa ya. (Jọn 8:48) Otu onye rabaị kwuru n’akwụkwọ a na-akpọ Mishna, sị: “Onye tara achịcha ndị Sameria dị ka onye tara anụ ézì.” (Shebith 8:10) Ọtụtụ ndị Juu agaghị anabata akaebe onye Sameria gbara ma ọ bụkwanụ kwe ka onye Sameria meere ha ihe. Ebe Jizọs ma na ndị Juu weere ndị Sameria ka ndị na-abaghị uru, o mere ihe atụ a a na-akpọkarị ihe atụ onye Sameria bụ́ ezigbo onye agbata obi, iji kụzie ihe gbara ọkpụrụkpụ.
kechie ọnyá ya, wụkwasị ha mmanụ na mmanya: N’ebe a, Luk onye ọgwọ ọrịa, sara anya ná mmiri dee ihe atụ a Jizọs mere. Otú o si kọwaa otú e si lekọta ọnyá onye ahụ e merụrụ ahụ́ dabara n’otú e si eme ya n’oge ahụ. Ha na-ejikarị mmanụ na mmanya emela ọnyá. Mgbe ụfọdụ, a na-eji mmanụ eme ka ihu ọnyá ghara ịkpọchi (tụlee Aịza. 1:6), a na-awụsakwa mmanya n’ọnyá iji gbochie njé ịba na ya. Luk kọwakwara otú e si kechie ọnyá ahụ ka ọ ghara ịna-eriba.
ụlọ ndị njem: N’asụsụ Grik, ọ pụtara “ebe a na-anabata ndị mmadụ.” Ndị njem na anụmanụ ha ji eme njem nwere ike ihi n’ebe ahụ. Onye na-elekọta ụlọ ndị a na-enye ndị njem ihe ndị dị ha mkpa, ọ bụrụkwa na a kwụọ ya ụgwọ, o nwere ike inye aka lekọta ndị a hapụụrụ ya.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
nwtsty ihe a kọwara na Luk 10:18
Amalitewo m ịhụ Setan ka ọ dara dị ka àmụ̀mà nke si n’eluigwe: O doro anya na Jizọs na-ekwu ihe ga-eme n’ọdịnihu. O kwuru na ya hụrụ ka a chụpụrụ Setan n’eluigwe, dị ka à ga-asị na o meela eme. Mkpu. 12:7-9 kọrọ gbasara agha ahụ a lụrụ n’eluigwe, gosikwa na ọ bụ Alaeze Mesaya ahụ amalitere n’eluigwe mere e ji chụda Setan n’ụwa. Ihe Jizọs na-ekwu n’ebe a bụ na o doro anya na a ga-emeri Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’agha ahụ, n’ihi na Chineke enyela ndị na-eso ụzọ ya iri asaa ikike ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ, n’agbanyeghị na ha bụ ụmụ mmadụ na-ezughị okè.—Luk 10:17.
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Luk 11:5-9
Enyi m, gbazinye m ogbe achịcha atọ: Ihe atụ a Jizọs mere gosiri na ndị Izrel ejighị ile ọbịa egwuri egwu. Mgbe ụfọdụ, onye ọbịa nwere ike ịbịarute na nke mmadụ n’ime abalị n’ihi ihe ụfọdụ nwere ike ịdapụtara ya n’ụzọ. Ọ bụrụgodị na onye ọbịa abịarute na nke mmadụ n’etiti abalị, onye ahụ na-agbakeri ala iji nye ya nri. O nwedịrị ike ịga nyewe ndị agbata obi ya nsogbu n’ime abalị ahụ ka ha gbazinye ya nri.
kwụsị inye m nsogbu: N’ihe atụ a, ihe mere onye agbata obi ahụ achọbughị inye nwoke ahụ ihe ọ na-arịọ ya bụ n’ihi na ọ labala, ọ bụghị na ọ bụ ajọ mmadụ. N’oge ahụ, ụlọ ndị ogbenye na-ebi na-abụkarị otu ọnụ ụlọ sara mbara. N’ihi ya, ọ bụrụ na papa ha ebilie, o nwere ike imete mmadụ niile n’ụra, ma ụmụaka.
nọgidesiri ike na-arịọ: Okwu Grik a sụgharịrị “nọgidesie ike na-arịọ” nwere ike ịpụta “imefe ihe ókè” na “emeghị ihere.” Ma, n’ebe a, ọ pụtara mmadụ isi ọnwụ na ọ ga-enweta ihe ọ chọrọ. Nwoke a Jizọs ji mee ihe atụ a emeghị ihere ịnọgide na-arịọ ka e meere ya ihe ọ chọrọ. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na ọ bụ otú ahụ ka ha kwesịrị isi na-ekpe ekpere.—Luk 11:9, 10.
JULAỊ 23-29
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | LUK 12-13
“Unu Dị Oké Ọnụ Ahịa Karịa Ọtụtụ Nza”
nwtsty ihe a kọwara na Luk 12:6
nza: A na-eji okwu Grik bụ strou·thiʹon akọwa obere nnụnụ niile. Ma ọtụtụ mgbe, ọ na-apụta nza. Nza bụ nnụnụ a na-eri eri kacha dịrị ọnụ ala.
nwtsty ihe a kọwara na Luk 12:7
a gụwo ọbụna ntutu isi niile unu ọnụ: Ntụtụ isi dị n’isi mmadụ ọ bụla nwere ike ịkarị otu nari puku. Na Jehova maara gbasara nke ọ bụla n’ime ntụtụ ndị a, na-eme ka obi sie anyị ike na o ji onye ọ bụla n’ime ndị na-eso ụzọ Kraịst kpọrọ ihe.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
nwtsty ihe a kọwara na Luk 13:24
Gbalịsienụ ike: Ma ọ bụ “Nọgide na-agba mbọ.” Ndụmọdụ a Jizọs nyere gosiri na anyị kwesịrị iji obi anyị niile gbasie mbọ ike ka anyị nwee ike isi n’ọnụ ụzọ dị warara banye. Ọtụtụ akwụkwọ kwuru na otú ọzọ e nwere ike isi sụgharịa okwu a bụ “Tinyesienụ mgbalị ike; Gbasienụ mbọ ike.” Okwu Grik bụ́ a·go·niʹzo·mai na okwu Grik bụ́ a·gonʹ yiri. A na-ejikarị a·gonʹ ekwu gbasara ịsọmpi ndị na-eme egwuregwu. Ná Ndị Hibru 12:1, e ji ya kwuo gbasara “ọsọ” ndụ Ndị Kraịst na-agba. Ma, n’ebe ụfọdụ, ọ na-apụtakwa ‘ịgba mgba’ (Fil. 1:30; Kọl. 2:1) ma ọ bụ ‘ịlụ ọgụ’ (1 Tim. 6:12; 2 Tim. 4:7). E nwekwara ebe ụfọdụ okwu Grik a dị na Luk 13:24 pụtara ihe ndị dị ka ‘iso n’asọmpi’ (1 Kọr. 9:25), ‘mmadụ ịdọgbu onwe ya n’ọrụ’ (Kọl. 1:29; 4:12; 1 Tim. 4:10), na ‘ịlụ ọgụ’ (1 Tim. 6:12). Ebe ọ bụ na ihe okwu a pụtara gbasara asọmpi, ụfọdụ ndị na-ekwu na Jizọs ji ya na-agba Ndị Kraịst ume ka ha gbasie mbọ ike otú ahụ onye so n’egwuregwu asọmpi na-eme, iji nweta ihe a na-agbata n’ọsọ.
nwtsty ihe a kọwara na Luk 13:33
o kwesịghị: Ma ọ bụ “o kweghị omume (tụfịakwa!).” Ọ bụ eziokwu na o nweghị amụma Baịbụl kwuru hoo haa na Mesaya ga-anwụ na Jeruselem, ma e nwere ike ikwu na ihe e dere na Daniel 9:24-26 gosiri na ọ bụ ebe ahụ ka ọ ga-anwụ. Ihe ọzọkwa bụ na e kwesịrị ịtụ anya na ọ bụrụ na ndị Juu egbuwe onye amụma, karịchaa onye dị ka Mesaya, ọ ga-abụ na Jeruselem. Ebe ọ bụ na Sanhedrin dị na Jeruselem, mmadụ iri asaa na otu na-ekpe ikpe na ya na-abịakwa ebe ahụ ekpe ikpe, o doro anya na ọ bụ n’ebe ahụ ka a ga-anọ kpee ndị niile a na-ebo ebubo na ha bụ ndị amụma ụgha ikpe. O nwekwara ike ịbụ na ihe Jizọs bu n’obi kwuo ihe a bụ na ọ bụ na Jeruselem ka a na-anọ achụrụ Chineke àjà, ọ bụkwa ebe ahụ ka a na-anọ egbu nwa atụrụ Ememme Ngabiga. Ka oge na-aga, ihe ahụ Jizọs kwuru mechara mezuo. A kpụpụrụ ya n’ihu ụlọikpe Sanhendrin dị na Jeruselem ma maa ya ikpe ọnwụ. Ọ bụkwa na Jeruselem, n’azụ mgbidi ya, ka ọ nwụrụ dị ka “nwa atụrụ Ememme Ngabiga.”—1 Kọr. 5:7.
JULAỊ 30–ỌGỌST 5
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | LUK 14-16
“Ihe Atụ Nwa Mmefu”
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Luk 15:11-16
Otu nwoke nwere ụmụ ndị ikom abụọ: Ihe ụfọdụ e kwuru n’ihe atụ nwa mmefu (nke a na-akpọkwa “nwa ahụ furu efu”) pụrụ iche. Ọ bụ otu n’ime ihe atụ kacha too ogologo Jizọs mere. Otu ihe mere o ji pụọ iche bụ otú o si kọwaa ihe na-eme n’ezinụlọ. N’ihe atụ Jizọs ndị ọzọ, ọ na-ejikarị ihe ndị na-adịghị ndụ eme ihe atụ, dị ka ụdị mkpụrụ akụkụ dị iche iche, ala ma ọ bụ otú ndị nna ukwu si emeso ndị ohu ha. (Mat. 13:18-30; 25:14-30; Luk 19:12-27) N’ihe atụ a, Jizọs gosiri otú otu nna na ụmụ ya ndị nwoke si bụrụ nnu na mmanụ. Ọtụtụ ndị nụrụla ihe atụ a nwere ike ha enweghị ụdị nna dị obiọma otú ahụ. Ihe atụ a na-egosi ụdị obi ebere na ịhụnanya Nna anyị nke eluigwe nwere n’ebe ụmụ ya bụ́ ụmụ mmadụ nọ, ma ndị nke na-enweghị mgbe ha gbahapụrụ ya, ma ndị nke kpafuru akpafu ma mechaa lọghachikwute ya.
Nke nta n’ime ha: Iwu Mozis kwuru ka a na-ekenye diọkpara òkè abụọ. (Diut. 21:17) Ebe ọ bụ na nke okenye n’ihe atụ a bụ diọkpara, ọ pụtara na ihe nwanne ya nke nta ketara bụ ọkara ihe nke okenye ketara.
mefusịrị: Okwu Grik e si na ya sụgharịta okwu a pụtara ‘ịtụfusị ihe (aghara aghara) ma ọ bụ ịchụsasị.’ (Luk 1:51; Ọrụ 5:37) Otu e si dee ya na Matiu 25:24, 26, bụ ‘ịfụcha mkpụrụ.’ N’ebe a, ọ pụtara imefusi ihe ma ọ bụ ịzụ ihe aghara aghara.
ndụ ịla n’iyi: Ma ọ bụ “ndụ imefusi ihe.” E ji okwu Grik ya na ya yiri sụgharịa ihe dị na Efe. 5:18; Taị. 1:6; 1 Pita 4:4. Ebe okwu Grik a nwekwara ike ịpụta imefu ego aghara aghara, ụfọdụ Baịbụl kpọrọ ya “ibi ndụ nzuzu.”
ka ọ na-azụ ézì: Iwu Mozis kwuru na ézì bụ anụmanụ na-adịghị ọcha, n’ihi ya, ịzụ ézì bụ ọrụ e ledara anya na ọrụ onye Juu na-ekwesịghị ịrụ.—Lev. 11:7, 8.
ụgbụgbọ mkpụrụ osisi karọb: Ụgbụgbọ mkpụrụ osisi karọb na-acha ka mkpekele ụgba. Aha Grik ya bụ́ ke·raʹti·on pụtara “obere mpi.” Ọ dabara adaba n’ihi na otú o si hịgọọ mere ka o yie mpi anụmanụ. Ruokwa taa, ọtụtụ ndị ka na-eji ya azụ ịnyịnya, ehi na ézì. Ihe gosiri na ọnọdụ nwa okorobịa a ajọgbuola onwe ya ná njọ bụ na ọ nọ na-agụsi ya agụụ ike iri nri ézì.—Lee ihe a kọwara na Luk 15:15.
nwtsty ihe ụfọdụ a kọwara na Luk 15:17-24
mehiekwa gị: Ma ọ bụ “n’anya gị.” Mbuụzọ Grik a sụgharịrị mehiekwa gị bụ e·noʹpi·on. Ọ pụtara “n’ihu; n’anya.”
ndị i goro ọrụ: Mgbe nwa mmefu a na-alọta, o bu n’obi ịrịọ nna ya ka o werezie ya ka otu n’ime ndị o goro ọrụ ọ bụghị ka nwa ya. Onye e goro ọrụ anaghị ebi n’ụlọ ndị goro ya ọrụ ka ndị odibo ha, kama, ọ na-esi esi abịa ọrụ. Ọ na-abụkarị onye a na-akwụ ụgwọ maka ọrụ ụbọchị.—Mat. 20:1, 2, 8.
jiri nwayọọ susuo ya ọnụ: Ma ọ bụ “jiri ịhụnanya susuo ya ọnụ.” Ụfọdụ ndị na-ekwu na okwu Grik a sụgharịrị “jiri nwayọọ susuo ya ọnụ” bụ ụdị ọzọ nke okwu Grik maka ịhụnanya bụ́ phi·leʹo e ji akọwa ịhụnanya miri emi. Mgbe ụfọdụ, a na-asụgharị ya “isusu ọnụ” (Mat. 26:48; Mak 14:44; Luk 22:47), ma ọ na-apụtakarị ‘ịhụ n’anya nke ukwuu’ (Jọn 5:20; 11:3; 16:27). Otú nna a si jiri obi ya niile makụọ nwa ya nwoke a chegharịrịnụ n’ihe atụ a, gosiri na ọ dị njikere ịnabata ya ọzọ.
ka a kpọọ m nwa gị: A gbakwunyere “Mee ka m bụrụ otu n’ime ndị i goro ọrụ” na Luk 15:21, n’ụfọdụ akwụkwọ ndị e ji dee Baịbụl n’oge ochie. Ma Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Bekee etinyeghị ya n’ihi na ọ dịghị n’akwụkwọ ndị kacha ochie e ji dee Baịbụl. Ụfọdụ ndị ọká mmụta sịrị na ihe mere e ji gbakwunye okwu ndị a na Luk 15:21 bụ ka ya na ihe e kwuru na Luke 15:19 bụrụ otu.
uwe mwụda . . . ọla . . . akpụkpọ ụkwụ: Uwe mwụda a abụghị uwe mwụda ọ bụla kama ọ bụ nke kacha mma. O nwere ike ịbụ uwe a kpara ihe mara mma na ya, ụdị nke a na-enye onye ọbịa a na-akwanyere ùgwù. Ọla nna a gbanyere nwa ya nwoke a n’aka gosiri na ọ hụrụ ya n’anya, nakwa na ọ chọrọ ka a na-akwanyekwara ya ùgwù ka nwa ya. Ọ na-esi ike ịhụ ebe ohu gba ọla aka ma ọ bụ yiri akpụkpọ ụkwụ. N’ihi ya, nna ahụ ji ihe ndị a mee ka o doo onye ọ bụla anya na ya anabatala nwa ya a.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
nwtsty ihe a kọwara na Luk 14:26
ịkpọ asị: Na Baịbụl, okwu bụ́ ‘ịkpọ asị’ pụtara ọtụtụ ihe. O nwere ike ịpụta mmadụ iburu onye ọzọ iwe n’obi, nke nwere ike ime ka ọ chọọ igbu ma ọ bụ merụọ onye ahụ ahụ́. O nwekwara ike ịpụta achọghị iji anya ahụ mmadụ ma ọ bụ enweghị mmasị n’ihe. Nke a ga-eme ka ọ na-agbara onye ahụ ma ọ bụ ihe ahụ ọsọ. Ịkpọasị nwekwara ike ịpụta ahụrughị ihe n’anya otú a hụrụ ibe ya. Iji maa atụ, mgbe e kwuru na Jekọb “kpọrọ Lia asị” ma hụ Rechel n’anya, ihe ọ pụtara bụ na ọ hụrughị Lia n’anya otú ọ hụrụ Rechel. (Jen. 29:31; Diut. 21:15) E sikwa otú a kọwaa ya n’akwụkwọ ndị ọzọ ndị Juu dere n’oge ochie. N’ihi ya, Jizọs anaghị agwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha kpọ ndị ezinụlọ ha ma ọ bụ onwe ha asị, n’ihi na ọ ga-emegide ihe e kwuru n’ebe ndị ọzọ n’Akwụkwọ Nsọ. (Tụlee Mak 12:29-31; Efe. 5:28, 29, 33.) E nwere ike ịsị na ‘ịkpọ asị’ e kwuru okwu ya na Luk 14:26 pụtara “ahụrughị ihe n’anya otú a hụrụ ibe ya.”