Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
MEE 6-12
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 NDỊ KỌRỊNT 4-6
“Anyị Adịghị Ada Mbà”
it-1 724-725
Ntachi Obi
Anyị ekwesịghịkwa ịkwụsị inwe olileanya na anyị ga-emecha dịrị ndụ ebighị ebi ma zuo okè. Ọ bụrụgodị na ndị na-emegide anyị egbuo anyị, ọ gaghị eme ka anyị ghara inweta ndụ ahụ. (Rom 5:4, 5; 1 Tesa. 1:3; Mkpu. 2:10) Ọ bụrụ na anyị elekwasị anya n’olileanya magburu onwe ya anyị nwere maka ọdịnihu, o nweghị ihe anyị ga-eji ahụhụ anyị na-ata ugbu a kpọrọ. (Rom 8:18-25) N’agbanyeghị otú ahụhụ ọ bụla anyị na-ata ugbu a siruru n’ike, ọ “na-adịru nwa oge, dịkwa mfe” ma e jiri ya tụnyere ndụ ebighị ebi anyị ga-enweta n’ọdịnihu. (2 Kọr. 4:16-18) Ọ bụrụ na mmadụ ana-echeta na ọnwụnwa ndị na-abịara anyị ugbu a na-adịru nwa oge ma buru nkwa Chineke kwere n’obi, ọ ga-eme ka ọ ghara ịda mbà, meekwa ka ọ nọgidesie ike n’okwukwe.
MEE 20-26
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 177
Nsusu Ọnụ
“Nsusu Ọnụ Dị Nsọ.” Ndị Kraịst oge mbụ na-eji “nsusu ọnụ dị nsọ” (Rom 16:16; 1 Kọr. 16:20; 2 Kọr. 13:12; 1 Tesa. 5:26) ma ọ bụ “nsusu ọnụ nke ịhụnanya” (1 Pita 5:14), ekele ibe ha. O yiri ka ọ̀ na-abụ nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị na-esi otú a ekele ibe ha. Otú a ha si eji isusu ọnụ ekele ekele ka ndị Hibru oge ochie sikwa eme. Ọ bụ eziokwu na Akwụkwọ Nsọ agwaghị anyị ọtụtụ ihe banyere “nsusu ọnụ dị nsọ” ma ọ bụ “nsusu ọnụ nke ịhụnanya,” ihe a Ndị Kraịst oge mbụ na-eme gosiri na ha hụrụ ibe n’anya, nakwa na ha dị n’otu.—Jọn 13:34, 35.
MEE 27–JUN 2
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 880
Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Galeshia
Pọl kpọrọ ndị Galeshia, “Ndị Galeshia na-amaghị ihe.” O nweghị ihe gosiri na ọ bụ naanị ụmụ amaala Galeshia bi n’ebe ugwu Galeshia ka ọ na-agwa okwu. (Gal. 3:1) Kama, Pọl na-abara ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ ndị dị n’ebe ahụ mba n’ihi na ha kwere ka ụfọdụ ndị bu okpukpe ndị Juu n’isi na-agwa ha ihe ha ga-eme. Ụmụnna ndị ahụ na-achọ ime ka ụmụnna ndị ọzọ mewe ihe ha chere nọ ọ bụ ezi omume nke gbakwasịrị ụkwụ n’Iwu Mozis kama ime ‘ezi omume n’ihi okwukwe’ nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ kwadoro. (2:15–3:14; 4:9, 10) Ndị nọ ‘n’ọgbakọ ndị dị na Galeshia’ (1:2) Pọl degaara akwụkwọ ozi esighị n’otu agbụrụ. E nwere ma ndị Juu ma ndị na-abụghị ndị Juu n’ọgbakọ ahụ. Ndị so ná ndị na-abụghị ndị Juu bụ ndị a tọghatara atọghata e biri úgwù na ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù. O dokwara anya na ụfọdụ n’ime ha bụ ndị Selt. (Ọrụ 13:14, 43; 16:1; Gal. 5:2) Ọ bụ ndị a niile ka Pọl kpọrọ ndị Galeshia n’ihi na ha bi n’ebe a na-akpọ Galeshia. Ihe ihe a niile pụtara bụ na ndị Pọl degaara akwụkwọ ozi bụ ndị ọ ma nke ọma bi n’ebe ndịda nke ógbè ndị Rom na-achị, ọ bụghị ndị bi n’ebe ugwu ya, n’ihi na Pọl amaghị ndị bi ebe ahụ, ọ gatụbeghịkwa ebe ahụ mbụ.