Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 92 p. 216-p. 217 para. 7
  • Jizọs Gwọrọ Ndị Ekpenta Iri, ma Naanị Otu n’Ime Ha Bịara Kelee Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jizọs Gwọrọ Ndị Ekpenta Iri, ma Naanị Otu n’Ime Ha Bịara Kelee Ya
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • A Gwọrọ Ndị Ekpenta Iri na Njem Ikpeazụ Jisọs Jere Na Jerusalem
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Ị̀ Na-echeta Ịsị I Meela?
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Jizọs Rụrụ Ọtụtụ Ọrụ Ebube
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ekwela Ka Ihe Ọ Bụla Dọpụ Uche Gị n’Oge A Bụ́ “Ụbọchị Ozi Ọma”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 92 p. 216-p. 217 para. 7
Ebe otu n’ime ndị ekpenta iri Jizọs gwọrọ laghachiri na-ekele ya

ISI NKE 92

Jizọs Gwọrọ Ndị Ekpenta Iri, ma Naanị Otu n’Ime Ha Bịara Kelee Ya

LUK 17:11-19

  • JIZỌS AGWỌỌ NDỊ EKPENTA IRI

Jizọs gawara n’otu obodo a na-akpọ Ifrem nke dị nso n’ebe ugwu Jeruselem. Ebe a ọ gawara mere ka nkata ndị Sanhedrin kpara igbu ya kụọ afọ n’ala. Ya na ndị na-eso ụzọ ya nọtụrụ n’Ifrem ka ndị iro ya ghara ịkpara ya aka. (Jọn 11:54) Ma, oge Ememme Ngabiga nke afọ 33 eruwela. N’ihi ya, Jizọs malitere njem ọzọ. O si Sameria banye Galili. Ihe a bụ nke ikpeazụ ọ gara ebe ahụ tupu ya anwụọ.

Ka Jizọs si n’otu obodo nta na-aga n’obodo nta ọzọ, ọ hụrụ ụmụ nwoke iri bụ́ ndị ekpenta. E nwere ụdị ọrịa ekpenta ndị na-eji ntakịrị ntakịrị eribisi ahụ́ onye na-arịa ya, dị ka mkpịsị aka onye ahụ, mkpịsị ụkwụ ya ma ọ bụ ntị ya. (Ọnụ Ọgụgụ 12:10-12) Iwu Chineke kwuru na onye ekpenta ga na-eti mkpu, sị: “Adịghị m ọcha, adịghị m ọcha.” Iwu ahụ kwukwara na ọ ga-ebipụ iche.—Levitikọs 13:45, 46.

Ndị ekpenta iri ahụ mere ihe iwu ahụ kwuru. Ha abịaghị Jizọs nso, kama ha nọ n’ebe dị anya tie mkpu, sị: “Jizọs, Onye Ozizi, meere anyị ebere!” Mgbe Jizọs hụrụ ha, ọ sịrị ha: “Gaanụ gosi ndị nchụàjà onwe unu.” (Luk 17:13, 14) Ihe a Jizọs kwuru gosiri na ọ kwanyeere Iwu Chineke ùgwù n’ihi na Iwu Chineke kwuru na ọ bụrụ na onye ekpenta agbakee, ọ bụ ndị nchụàjà ga-ekwu na ahụ́ adịla ya mma. Malite mgbe ahụ, ya na ndị mmadụ nweziri ike ibikọta.—Levitikọs 13:9-17.

Mgbe Jizọs hụrụ ndị ekpenta iri

Obi siri ndị ekpenta iri ahụ ike na Jizọs ga-agwọli ha. N’ihi ya, ha gawara ịhụ ndị nchụàjà n’agbanyeghị na ha agbakebeghị. Mgbe ha ka nọ n’ụzọ, ha chọpụtara na ahụ́ adịla ha mma. Ọ bụ maka na ha nwere okwukwe na Jizọs mere ahụ́ ji dị ha mma.

Otu onye Sameria nke so ná ndị ekpenta iri ahụ a gwọrọ laghachiri ka ọ hụ Jizọs. Ma, mmadụ itoolu ndị ọzọ alaghachighị. Gịnị mere nwoke Sameria ahụ ji gawa ịhụ Jizọs? Ọ chọrọ ikele ya maka ihe o meere ya. O ji “oké olu na-enye Chineke otuto” n’ihi na ọ ghọtara na ọ bụ Chineke mere ka a gwọọ ya. (Luk 17:15) Mgbe ọ hụrụ Jizọs, ọ dara n’ụkwụ ya, na-ekele ya.

Jizọs gwara ndị nọ ebe ahụ, sị: “Ọ́ bụghị mmadụ iri ka e mere ka ha dị ọcha? Oleekwanụ mmadụ itoolu ndị ọzọ? È nwere onye a hụrụ lọghachitere inye Chineke otuto ma ọ́ bụghị nwoke a bụ onye mba ọzọ?” Ọ gwaziri nwoke Sameria ahụ, sị: “Bilie lawa; okwukwe gị emewo ka ahụ́ dị gị mma.”—Luk 17:17-19.

Ọgwụgwọ Jizọs gwọrọ ndị ekpenta iri ahụ gosiri na Jehova Chineke nọnyeere ya. Ma, uru onye ekpenta nke a lọghachirinụ ritere abụghị naanị na a gwọrọ ya, kama o yikwara ka Jizọs ò nyeere ya aka ịbanye n’ụzọ ga-eduba ya ná ndụ. N’oge anyị a, Chineke ejighị Jizọs na-agwọ ndị mmadụ ọrịa otú o mere n’oge ochie. Ma, ọ bụrụ na anyị e nwee okwukwe na Jizọs, anyị ga-enwe ike inweta ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu. Ànyị na-ekele Chineke maka ndụ ebighị ebi ọ ga-enye anyị n’ọdịnihu, otú nwoke Sameria ahụ kelere Jizọs?

  • Ebee ka Jizọs gawara nke mere ka ndị chọrọ igbu ya ghara inweta ya?

  • Gịnị mere ndị ekpenta iri ahụ ji guzoro n’ebe dị anya, gịnịkwa mere Jizọs ji gwa ha ka ha gaa gosi ndị nchụàjà onwe ha?

  • Gịnị ka ihe e meere nwoke Sameria ahụ na ihe o mere na-akụziri anyị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya