OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Ị Ga-ekwusali Ozi Ọma, Kụziekwa Ihe
Na mbụ, Mozis chere na ọ gaghị arụli ọrụ Jehova nyere ya. (Ọpụ. 4:10, 13) Ò nwetụla mgbe ọ dị gị otú ahụ? Gị na Ndịàmà Jehova, ùnu na-amụ Baịbụl? Ị̀ na-eche ma ị̀ ga-esolikwa ha na-aga ozi ọma ụlọ n’ụlọ? O nwekwara ike ịbụ na ị bụ onye na-eto eto ọ na-esiri ike izi ozi ọma n’ụlọ akwụkwọ. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ụjọ na-atụ gị iji ekwentị ezi ozi ọma ma ọ bụ ikwusa ozi ọma na-ebe na-ekwo ekwo. Ọ bụrụ otú ahụ, rịọ Jehova ka o nye gị mmụọ nsọ ya. (1 Pita 4:11) Ka obi sie gị ike na ọ ga-enyere gị aka ịrụ ọrụ ọ bụla o nyere gị.—Ọpụ. 4:11, 12.
LEENỤ VIDIO BỤ́ NWEE OBI IKE . . . ONYE NKWUSA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Olee nsogbu Nwanna Nwaanyị Aoyama nwere?
Olee ihe nyeere ya aka inwe obi ike?—Jere. 20:7-9
Olee otú imekwu ihe n’ozi Jehova si baara ya uru?
Olee nsogbu ndị Jehova ga-enyere gị aka imeri n’ozi ọma?