Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
JUN 1-7
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 813
Ịdọwa Ákwà Mgbokwasị
Ọ bụ ihe ndị Juu na mba ndị ọzọ gbara ha gburugburu na-eji egosi na ihe wutere ha, karịchaa ma ha nụ banyere ọnwụ nwanne ha ma ọ bụ onye ikwu ha. Ọtụtụ mgbe, ha dọwawa uwe ahụ, ha na-adọwa ya n’ihu naanị otú a ga na-ahụ obi ha anya. Ọ pụtara na ha anaghị adọwacha uwe ahụ nke na a gaghịzi eyili ya eyi.
Onye mbụ e kwuru na Baịbụl si otú a dọwaa uwe ya bụ Ruben, ọkpara Jekọb. Mgbe ọ gaghachiri n’olulu ebe ahụ a tụbara Josef, ma ọ hụghị ya, ọ dọwara uwe ya ma kwuo, sị: “Nwatakịrị ahụ anọkwaghị n’ebe ahụ! Mụ onwe m kwa—gịnịzi ka m ga-eme?” Ebe ọ bụ na ọ bụ Ruben bụ ọkpara, ọ bụ ya ka a ga-ajụ ajụjụ nwanne ya nwoke. Mgbe a gwara Jekọb nna ya, na Josef nwa ya anwụọla, ọ dọwakwara uwe ya ma yiri ákwà iru uju (Jen. 37:29, 30, 34). N’Ijipt, mgbe ụmụnne Josef hụrụ na a chọtara iko a na-achọ achọ n’akpa Benjamin, ha dọwara uwe ha iji gosi na o wutere ha.—Jen. 44:13.
JUN 8-14
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JENESIS 46-47
“Ha Nwetara Nri n’Oge Ụnwụ”
w87 5/1 15 ¶2
Ichebe Ndụ n’Oge Ụnwụ Nri
2 Afọ asaa nke ịba ụba ahụ gwụsịrị, ụnwụ nri ahụ wee malite dị ka Jehova buru n’amụma—bụ́ ụnwụ nri nke na-adịghị nanị n’Ijipt kama “n’ala nile.” Mgbe ndị ahụ agụụ na-agụgbu n’Ijipt malitere itiri Fero mkpu ka e nye ha nri, Fero gwara ha, sị: “Jekwurunụ Josef; ihe ọ sị unu mee meenụ ya.” Josef resịrị ndị Ijipt nri ruo mgbe ego ha gwụsịrị. Ha wee were anụ ụlọ ha na-akwụ ụgwọ. E mesịa, ndị ahụ bịakwutere Josef, sị: “Zụrụ anyị na ala anyị n’ọnọdụ nri, anyị onwe anyị na ala anyị ga-aghọkwara Fero ndị ohu.” Ya mere Josef zụtaara Fero ala nile nke ndị Ijipt.—Jenesis 41:53-57; 47:13-20.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 220 ¶1
Àgwà na Imegharị Aka
Iji aka mechie onye nwụrụ anwụ anya. Jehova gwara Jekọb, sị: “Josef ga-eji aka ya mechie anya gị.” (Jen. 46:4) Ihe a ọ gwara ya pụtara na Jekọb nwụọ, ọ bụ Josef ga-emechi anya ya, nke bụ́kwanụ ọrụ ndị bụ́ ọkpara na-arụ. N’ihi ya, o yiri ka Jehova ò si otú a mee ka Jekọb mata na a ga-enye Josef ihe ruuru ọkpara.—1 Ihe 5:2.
nwtsty ihe a kọwara n’Ọrụ 7:14
Ha niile dị mmadụ iri asaa na ise: O nwere ike ịbụ na o nweghị amaokwu Akwụkwọ Nsọ Hibru Stivin na-ekwughachi ihe e dere na ya mgbe o kwuru na ndị ezinụlọ Jekọb banyere n’Ijipt dị mmadụ iri asaa na ise. E deghị ọnụ ọgụgụ a n’Akwụkwọ Nsọ Hibru nke ndị Masoret depụtaghachiri. Jen. 46:26 kwuru, sị: “Mkpụrụ obi niile ha na Jekọb so bata n’Ijipt si n’úkwù ya pụta, ma e wezụga ndị nwunye ụmụ Jekọb. Ha niile dị mkpụrụ obi iri isii na isii.” Amaokwu nke 27 sịrị: “Mkpụrụ obi niile nke ụlọ Jekọb bụ́ ndị batara n’Ijipt dị iri asaa.” E nwere ụzọ abụọ e si gụọ ndị a ọnụ. Ụzọ nke mbụ bụ ịgụ ndị si n’úkwù Jekọb ma ọ bụ ndị ọ mụtara, ụzọ nke abụọ abụrụ ịgụ ndị niile so ha bata n’Ijipt. E kwukwara ọnụ ọgụgụ ndị si n’ezinụlọ Jekọb n’Ọpụ. 1:5 nakwa na Diut. 10:22. N’ebe ndị a, e kwuru na ha dị mmadụ “iri asaa.” Ọ ga-abụ na nke ahụ Stivin kwuru bụ ụzọ nke atọ e nwere ike isi gụọ ya, ya bụ, ịgụnye ndị ikwu Jekọb ndị ọzọ. Ụfọdụ na-ekwu na ndị a gụnyekwuru n’ọnụ ọgụgụ a bụ ụmụ Manase na Ifrem na ụmụ ụmụ ha, ndị a kpọrọ aha na Jenesis 46:20 ná nsụgharị Septuagint. Ndị ọzọ kwuru na ndị so n’ọnụ ọgụgụ a bụ ndị nwunye ụmụ Jekọb, bụ́ ndị a na-agụnyeghị n’ọnụ ọgụgụ nke ahụ e kwuru na Jenesis 46:26. N’ihi ya, ọnụ ọgụgụ a bụ́ “iri asaa na ise” nwere ike ịbụ ngụkọta ọnụ ọgụgụ ndị niile banyere n’Ijipt. O nwere ike ịbụ na Akwụkwọ Nsọ Hibru e kesara n’oge ndịozi kwadoro ọnụ ọgụgụ a. Kemgbe ọtụtụ afọ, ndị ọkà mmụta ma na ọnụ ọgụgụ ndị ezinụlọ Jekọb banyere Ijipt dị iri asaa na ise, dị ka e dere na Jen. 46:27 nakwa n’Ọpụ. 1:5 na Septuagint Grik. N’agbata afọ 1901 na afọ 2000, a hụrụ iberibe akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ abụọ nke e dere Ọpụ. 1:5 na ya n’asụsụ Hibru, ọ bụkwa iri asaa na ise ka e dere n’amaokwu ahụ. Ọ ga-abụ na Stivin si n’otu n’ime akwụkwọ ochie ndị a nweta ọnụ ọgụgụ a. N’agbanyeghị ụzọ mmadụ nwere ike ịsị na ọ bụ ya kacha mma isi gụọ ndị ezinụlọ Jekọb banyere n’Ijipt, ọ bụ otu ụzọ e nwere ike isi gụọ ya ka Stivin si nweta ọnụ ọgụgụ nke ya.
JUN 15-21
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JENESIS 48-50
“Ndị Agadi Nwere Ọtụtụ Ihe Ha Ga-akụziri Ndị Ọzọ”
it-1 1246 ¶8
Jekọb
Obere oge tupu Jekọb anwụọ, ọ gọziri ụmụ ụmụ ya, ya bụ, ụmụ Josef. Ma, Jehova duziri ya, ya agọzie Ifrem ka nwa nke ọkpara n’agbanyeghị na ọ bụ Manase bụ nke ọkpara. Mgbe ọ gọzichara ha, ọ gwaziri Josef, bụ́ onye ọ ga-ekenye okpukpu abụọ nke ihe nketa ya, sị: “Ana m enye gị ala nke ji otu ibé ala karịa nke ụmụnne gị, bụ́ nke m ji mma agha m na ụta m nara ndị Amọraịt.” (Jen. 48:1-22; 1 Ihe 5:1) Jekọb zụrụ ibé ala ahụ dị nso na Shikem n’aka ụmụ Hemọ n’enweghị nsogbu (Jen. 33:19, 20). Ebe ọ bụ ọzụzụ ka ọ zụrụ ala a, o yiri ka ò ji nkwa a o kwere Josef gosi okwukwe o nwere. Ọ ga-abụ na ọ na-ekwu banyere mmeri ụmụ ya ga-emeri ndị Kenan dị ka à ga-asị na ọ bụ yanwa ji mma agha ya na ụta ya merie ha. Ihe so n’okpukpu abụọ nke ihe nketa ahụ e nyere Josef bụ ala abụọ e nyere ebo Ifrem na ebo Manase.
it-2 206 ¶1
Ngwụsị Ụbọchị Ndị A
Amụma Jekọb Buru Mgbe Ọ Nọ n’Ute Ọrịa. Mgbe Jekọb gwara ụmụ ya ndị nwoke sị, “Zukọtanụ ka m gwa unu ihe gaje ime unu ná ngwụsị ụbọchị ndị a,” ihe ọ na-ekwu bụ banyere oge ihe ndị o kwuru ga-amalite imezu. (Jen. 49:1) Ihe karịrị narị afọ abụọ tupu mgbe ahụ, Jehova gwara nna nna Jekọb bụ́ Ebreham na a ga-emekpa ụmụ ya ahụ́ ruo narị afọ anọ. (Jen. 15:13) N’ihi ya, “ngwụsị ụbọchị ndị a” Jekọb kwuru banyere ya agaghị ebido ruokwa mgbe narị afọ anọ nke mkpekpa ahụ́ ahụ gwụchara. Amụma a Jekọb buru nwekwara ike imezu n’isi “Izrel nke Chineke.”—Gal. 6:16; Rom 9:6.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 289 ¶2
Benjamin
Amụma Jekọb buru mgbe ọ nọ n’ute ọrịa gosiri ụdị ike ndị si n’agbụrụ Benjamin ga-akpa. O kwuru banyere Benjamin, sị: “Benjamin ga na-adọgbu anụ dị ka anụ ọhịa wolf. N’ụtụtụ ka ọ ga-eri anụ o jidere, n’anyasị ka ọ ga-eke ihe ọ kwatara akwata.” (Jen. 49:27) A ma ndị si n’agbụrụ Benjamin ama ka ndị na-agba èbè nke ọma. Ha na-eji ma aka nri ma aka ekpe agbapụ nkume dị n’èbè ha. Ha na-agbata ihe “há ka otu ntutu isi.” (Ikpe 20:16; 1 Ihe 12:2) Onyeikpe na-eme aka ekpe aha ya bụ Ihud si n’ebo Benjamin. Ọ bụ ya gburu Eze Eglọn nke na-emegide ndị Izrel. (Ikpe 3:15-21) Ọ dịkwa mma ịmara na ọ bụ “n’ụtụtụ,” ya bụ, mgbe alaeze Izrel ka na-amalite amalite, ka e si n’ebo Benjamin, bụ́ ebo “kasị nta n’ebo niile,” nweta Eze mbụ nke Izrel aha ya bụ Sọl, nwa Kish. Ọ ghọkwara onye agha dị ike nke lụrụ agha megide ndị Filistia. (1 Sam. 9:15-17, 21) “N’anyasị,” ya bụ, mgbe a na-enweghịzi eze n’ala Izrel, e sikwa n’ebo Benjamin nweta ndị zọpụtara ụmụ Izrel n’aka Alaeze Ukwu Peshia, ya bụ, Esta na Mọdekaị.—Esta 2:5-7.
JUN 29–JULAỊ 5
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 12 ¶5
Jehova
Mmadụ ‘ịmara’ banyere ihe ma ọ bụ ịmara banyere onye ọzọ apụtaghị naanị ịma na ihe ahụ ma ọ bụ onye ahụ dị adị. Nebal na-enweghị uche maara aha Devid, mana, ọ jụkwara, sị, “Ònye bụ Devid?” ya bụ, ihe ọ na-ekwu bụ na o nweghị onye Devid bụ. (1 Sam. 25:9-11; tụlee 2 Sam. 8:13.) Fero jụkwara Mozis, sị: “Ònye bụ Jehova, nke mere m ga-eji rube isi n’ihe o kwuru wee hapụ ndị Izrel ka ha laa? Amaghị m onye Jehova bụ ma ọlị, agaghịkwa m ahapụ ndị Izrel ka ha laa.” (Ọpụ. 5:1, 2) Ọ ga-abụ na ihe Fero na-ekwu bụ na Jehova abụghị ezi Chineke, na ọ bụghị Jehova ga-agwa eze Ijipt ihe ọ ga-eme, nakwa na o nweghị ike imezu ihe Mozis na Erọn sị na ọ ga-eme. Ma ugbu a, Fero na ndị Ijipt nakwa ndị Izrel ga-amata ihe aha Jehova pụtara; ha ga-amatakwu banyere onye nwe aha ahụ. Jehova mere ka Mozis mata na ọ ga-emezu nzube ya banyere mba Izrel. Ọ ga-anapụta ha, nyekwa ha Ala Nkwa ahụ, si otú ahụ mezuo ọgbụgba ndụ ya na ndị nna nna ha gbara. Chineke gwara ha, sị: “Unu ga-amara na mụ onwe m bụ Jehova bụ́ Chineke unu.”—Ọpụ. 6:4-8.