Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
MACH 1-7
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌNỤ ỌGỤGỤ 7-8
“Ihe Anyị Na-amụta n’Otú E Si Hazie Ụmụ Izrel”
it-1 497 ¶3
Ọgbakọ
Ná mba Izrel, e nwere ụmụ nwoke ndị a họpụtara ahọpụta na-anọchitekarị anya ụmụ Izrel niile. (Ezra 10:14) E nwere ndị nke a na-akpọ “ndị isi nke ebo dị iche iche.” Ndị isi ndị a nyere onyinye mgbe a rụchara ụlọikwuu. (Ọnụ Ọgụ. 7:1-11) N’oge Nehemaya, e nwekwara ndị nchụàjà, ndị Livaị, na “ndị isi ndị Izrel” bịanyere aka n’ihe a kpọrọ “ndokwa nke a pụrụ ịtụkwasị obi.” Ndị a nọchitere anya ndị Izrel. (Nehe. 9:38–10:27) Mgbe ụmụ Izrel nọ na-eme njem n’ala ịkpa, e nwere narị ndị ikom abụọ na iri ise n’ime ha “bụ́ ndị isi nke nzukọ ahụ, ndị a na-akpọ òkù ịbịa nzukọ, ndị a ma ama.” Ndị a sonyeere Kora, Detan, Abaịram, na Ọn na-emegide Mozis na Erọn. (Ọnụ Ọgụ. 16:1-3) Mozis họọrọ ndị okenye Izrel dị mmadụ iri asaa dị ka Jehova gwara ya. Ndị a ga-enyere ya aka n’ibu ‘ibu ndị Izrel’ nke ọ na-agaghị ebuli naanị ya. (Ọnụ Ọgụ. 11:16, 17, 24, 25) Levitikọs 4:15 kwuru banyere “ndị okenye nke nzukọ ahụ.” O yikwara ka ọ̀ bụ ndị okenye, ndị isi, ndị ikpe, na ndị ndú ụmụ Izrel na-anọchite anya ndị Izrel niile.—Ọnụ Ọgụ. 1:4, 16; Jọsh. 23:2; 24:1.
it-2 796 ¶1
Ruben
N’ebe ụmụ Izrel mara ụlọikwuu, ebo Ruben mara ụlọikwuu ha n’ebe ndịda, ebo Simion na ebo Gad amaakwa nke ha n’akụkụ ha. Ọ bụ ebo Ruben na-edu ha. Ụmụ Izrel kwaliwe, ebo atọ a na-eso ebo Juda, Ịsaka na Zebulọn n’azụ. (Ọnụ Ọgụ. 2:10-16; 10:14-20) Ọ bụkwa usoro a ha si aga ka ha si nye onyinye n’ụbọchị a raara ụlọikwuu ahụ nye Jehova.—Ọnụ Ọgụ. 7:1, 2, 10-47.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 835
Nwa E Bu Ụzọ Mụọ
Ebe ọ bụ na ọ bụ ụmụ nwoke mbụ e bu ụzọ mụọ n’Izrel na-abụ ndị isi nke ezinụlọ dị iche iche, ha nọchiri anya mba Izrel niile. Jehova kpọdịrị mba Izrel niile “ọkpara m.” Ọ bụ ya bụ mba o bu ụzọ mụọ n’ihi ọgbụgba ndụ ya na Ebreham gbara. (Ọpụ. 4:22) Ebe ọ bụ na Jehova napụtara ha, o nyere iwu ka ha ‘dooro ya ihe ọ bụla bụ́ oké e bu ụzọ mụọ nsọ, bụ́ nke meghere akpa nwa n’etiti ụmụ Izrel, n’etiti mmadụ nakwa n’etiti anụmanụ.’ (Ọpụ. 13:2) N’ihi ya, ụmụ nwoke mbụ e bu ụzọ mụọ n’Izrel bụ nke Chineke.
MACH 8-14
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌNỤ ỌGỤGỤ 9-10
“Otú Jehova Si Edu Ndị Ya”
it-1 398 ¶3
Otú E Si Hazie Ụmụ Izrel
Otú ìgwè ụmụ Izrel si esi n’ebe ha mara ụlọikwuu akwali aga ebe ọzọ n’usoro n’usoro (Mozis kwuru n’Ọnụ Ọgụgụ 33 banyere ihe dị ka ebe iri anọ ha mara ụlọikwuu) gosikwara na a haziri ha nke ọma. Ọ bụrụ na ígwé ojii ahụ akwụsị n’elu ụlọikwuu ahụ, ụmụ Izrel agaghị akwali. Ma, ígwé ojii ahụ kwụlie, ụmụ Izrel akwalie. “Ụmụ Izrel na-akwali mgbe Jehova nyere iwu ka ha kwalie, ha na-amakwa ụlọikwuu mgbe Jehova nyere iwu ka ha maa ụlọikwuu.” (Ọnụ Ọgụ. 9:15-23) A na-eji opi abụọ e ji ọlaọcha mee eme ka ha mata mgbe ha ga-akwali na mgbe ha ga-ama ụlọikwuu. (Ọnụ Ọgụ. 10:2, 5, 6) Ọ bụrụ na a fụọ opi ahụ, ya adasitụ ike, dalatatụkwa ala, ọ ga-egosi mgbe ha ga-akwali. Mgbe mbụ a fụrụ opi a bụ “n’afọ nke abụọ [1512 T.O.N.K.], n’ọnwa nke abụọ, n’abalị iri abụọ n’ọnwa ahụ.” Ha kwaliwe, ndị bu igbe ọgbụgba ndụ ahụ na-anọ n’ihu, ebo atọ ndị mbụ, ya bụ, ebo Juda, Ịsaka, na Zebụlọn esochie ha. Ọ bụ ebo Juda na-edu ebo atọ a. Ndị ọzọ na-esochi ha bụ ụmụ Geshọn na ụmụ Meraraị, ndị na-arụkwa ọrụ e kenyere ha n’ụlọikwuu. Ndị ọzọ na-esochi bụ ebo Ruben, Simiọn, na Gad. Ọ bụ ebo Ruben na-edu ebo atọ a. Ndị nke a kwalichaa, ụmụ Kohat, bụ́ ndị na-ebu ihe ndị dị n’ebe nsọ ahụ esochie ha. Ndị ọzọ na-akwali bụ ebo Ifrem, Manase, na Benjamin. Ọ bụ ebo Ifrem na-edu ebo atọ a. Ndị ikpeazụ na-akwali bụ ebo Dan, Asha, na Naftalaị. Ọ bụ ebo Dan na-edu ebo atọ a. Otú a e si hazie ha mere ka ebo abụọ kacha ike ma kacha buo ibu nọrọ ụmụ Izrel n’ihu na n’azụ, ya bụ, otu n’ihu, otu n’azụ.—Ọnụ Ọgụ. 10:11-28.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 199 ¶3
Nzukọ
Ihe Mere Izukọta Ọnụ Ji Dị Mkpa. Ememme Ngabiga a gwara ụmụ Izrel ka ha na-eme kwa afọ mere ka o doo anya na ọ dị ezigbo mkpa ịna-ezukọ otú Jehova kwuru iji mụta ihe n’aka ya. A ga-egbu nwoke ọ bụla dị ọcha, na-emeghịkwa njem ma ọ bụrụ na o soghị mee Ememme Ngabiga. (Ọnụ Ọgụ. 9:9-14) Mgbe Eze Hezekaya na-agwa ndị Juda na ndị Izrel ka ha gaa Jeruselem mee Ememme Ngabiga, lee ihe ụfọdụ ọ gwara ha: “Ụmụ Izrel, lọghachikwutenụ Jehova . . . unu ekwesila olu ike dị ka nna nna unu hà mere. Doonụ onwe unu n’okpuru Jehova, bịakwanụ n’ebe nsọ ya nke o doworo nsọ ruo mgbe a na-akaghị aka wee fee Jehova bụ́ Chineke unu, ka iwe dị ọkụ ọ na-eweso unu wee dajụọ. . . . Jehova bụ́ Chineke unu na-eme amara, na-emekwa ebere. Ọ gaghịkwa ewepụ ihu ya n’ebe unu nọ ma ọ bụrụ na unu alọghachikwute ya.” (2 Ihe 30:6-9) Ọ bụrụ na mmadụ akpachara anya hapụ ịga nnọkọ a, a na-ewere ya na onye ahụ ahapụla Chineke. Ọ bụ eziokwu na Ndị Kraịst anaghị eme Ememme Ngabiga, ma Pọl gwakwara ha ka ha ghara ịhapụ ịna-aga nzukọ ndị Chineke. Ọ sịrị: “Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche iji kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ, ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị, dị ka ụfọdụ ndị na-emekarị, kama ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume, na-emekwa otú ahụ karị, ka unu na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.”—Hib. 10:24, 25.
MACH 15-21
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌNỤ ỌGỤGỤ 11-12
“Gịnị Mere Anyị Kwesịrị Iji Zere Ịna-emekarị Mkpesa?”
it-2 719 ¶4
Esemokwu
Ntamu. Ntamu na-eme ka ndị mmadụ daa mbà n’obi, ọ na-emeghasịkwa ihe. Obere oge ụmụ Izrel hapụchara Ijipt, ha tamuru ntamu megide Jehova. Ha katọrọ otú Mozis na Erọn, Jehova họpụtara, si na-edu ha. (Ọpụ. 16:2, 7) Ha megidere ihe a nke na Mozis dara nnọọ mbà ma rịọ ka ọ nwụọ. (Ọnụ Ọgụ. 11:13-15) Ịtamu ntamu nwedịrị ike ịkpatara mmadụ nsogbu nwere ike ịta isi ya. Jehova weere ya na ọ bụ yanwa ka ndị ahụ tamuru ntamu megide Mozis nupụụrụ isi. (Ọnụ Ọgụ. 14:26-30) Ọtụtụ ndị nwụrụ n’ihi ntamu ahụ.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 309
Mana
Otú Ọ Dị. Mana “na-acha ọcha dị ka mkpụrụ kọrịanda,” “o yikwara” esó deliọm. Esó deliọm bụ ihe na-anya anya ma na-egbuke egbuke na-esi n’ahụ́ osisi agbapụta. Mana na-atọ ka “achịcha dị mbadamba e tinyere mmanụ aṅụ” ma ọ bụ “achịcha dị ụtọ nke a gwara mmanụ.” E jiri nkume igwe nri gwee mana ma ọ bụkwanụ sụọ ya n’ikwe, a na-esizị ya n’ọkụ ma ọ bụkwanụ jiri ya mee achịcha.—Ọpụ. 16:23, 31; Ọnụ Ọgụ. 11:7, 8.
MACH 22-28
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 740
Ala Chineke Nyere Ndị Izrel
N’EZIOKWU, ala ahụ Chineke nyere mba Izrel dị mma. Mgbe Mozis zipụrụ ndị nledo ka ha gaa ledoo Ala Nkwa ahụ ma weta ụfọdụ n’ime ihe ndị ọ na-amịpụta, ha ji mkpụrụ fig, mkpụrụ pọmigranet, na ụyọkọ mkpụrụ vaịn lọta. Mkpụrụ osisi ndị ahụ buru ibu nke na ụmụ nwoke abụọ ji okporo osisi buru ha lọta. Ọ bụ eziokwu na ụjọ tụrụ ha n’ihi na ha enweghị okwukwe, ma ha kwuru, sị: “Ọ bụ ebe mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru.”—Ọnụ Ọgụ. 13:23, 27.
EPREL 19-25
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌNỤ ỌGỤGỤ 22-24
“Jehova Mere Ka Nkọcha Ghọọ Ngọzi”
it-2 291
Ara Ọgbụgba
Imegide Jehova Bụ Izuzu Nzuzu. Belam onye amụma zuzuru nzuzu. Ọ chọrọ ịga buo amụma megide ndị Izrel n’ihi ego Eze Belak na ndị Moab ga-enye ya. Ma, Jehova kụghasịrị atụmatụ ya. Pita onyeozi dere banyere Belam, sị: “Ịnyịnya ibu nke na-adịghị ekwu okwu ji olu mmadụ kwuo okwu, wee gbochie omume onye ara nke onye amụma ahụ chọrọ ime.” Okwu Grik onyeozi a ji kwuo banyere ara ọgbụgba Belam bụ pa·ra·phro·niʹa, nke nwere ike ịpụta “mmadụ ime ka onye isi mebiri.”—2 Pita 2:15, 16; Ọnụ Ọgụ. 22:26-31.
EPREL 26–MEE 2
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 359 ¶1-2
Ókè
N’ihi ya, ihe ọ pụtara bụ na e nwere ihe abụọ e lekwasịrị anya mgbe a na-ekere ndị Izrel ala. Nke mbụ bụ ihe e fetara na nza, nke abụọ abụrụ otú ebo ọ bụla hà. Ihe nza ahụ ga-eme ka a mata bụ ebe ala a ga-ekenye ebo nke ọ bụla dị. O nwere ike ikwu na ọ dị n’ebe ugwu, n’ebe ndịda, n’ebe ọwụwa anya, n’ebe ọdịda anyanwụ, n’akụkụ mmiri, ma ọ bụkwanụ n’ebe bụ́ ugwu ugwu. Ihe ọ bụla nza ahụ kwuru bụ ihe Jehova kwuru. Ọ na-eme ka ebo nke ọ bụla ghara imere ebo ọzọ anyaụfụ ma ọ bụ sesawa ha okwu. (Ilu 16:33) Chineke hazikwara ya otú ga-eme ka ọnọdụ nke ebo ọ bụla dịrị otú ahụ Jekọb si buo ya n’amụma na Jenesis 49:1-33 mgbe ọ nọ n’ọnụ ọnwụ.
Mgbe e jichara ife nza mata ebe ebo nke ọ bụla ga-ebi, ihe ọzọ a na-emezi bụ ịmata otú ala ha ga-aha. Ihe a na-eji amata ya bụ otú ebo ahụ hà. “Keenụ ala ahụ n’etiti onwe unu site n’ife nza ka ọ bụrụ nke unu n’ezinụlọ n’ezinụlọ. Unu ga-enye ezinụlọ dị ọtụtụ ihe nketa dị ukwuu, unu ga-enyekwa ezinụlọ dị ole na ole ihe nketa dị obere. Ebe ọ bụla nza mara, ebe ahụ ga-aghọ nke ya.” (Ọnụ Ọgụ. 33:54) Ebe ahụ nza kwuru bụ ebe ebo nke ọ bụla ga-enweta. Ma, e nwere ike ịgbanwetụ otú ala ahụ ga-aharu. Ọ bụ ihe a mere na mgbe a chọpụtara na ala e kenyere ebo Juda buru ezigbo ibu, e wepụtụrụ ebe ụfọdụ nye ya ebo Simiọn.—Josh. 19:9.