Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
NỌVEMBA 1-7
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JOSHỤA 18-19
“Otú Jehova Si Keere Ụmụ Izrel Ala Gosiri na Ọ Ma Ihe”
it-1 359 ¶1
Ókè
N’ihi ya, ihe ọ pụtara bụ na e nwere ihe abụọ e lekwasịrị anya na ha mgbe a na-ekere ndị Izrel ala. Nke mbụ bụ ihe e fetara na nza, nke abụọ abụrụ otú ebo nke ọ bụla hà. Ihe nza ahụ ga-eme ka a mata bụ ebe ala a ga-ekenye ebo nke ọ bụla dị. O nwere ike ikwu na ọ dị n’ebe ugwu, n’ebe ndịda, n’ebe ọwụwa anyanwụ, n’ebe ọdịda anyanwụ, n’akụkụ mmiri, ma ọ bụkwanụ n’ebe bụ́ ugwu ugwu. Ihe ọ bụla nza ahụ kwuru bụ ihe Jehova kwuru. Ọ na-eme ka ebo nke ọ bụla ghara imere ebo ọzọ anyaụfụ ma ọ bụ sesawa ha okwu. (Ilu 16:33) Chineke hazikwara ya otú ga-eme ka ọnọdụ nke ebo ọ bụla dịrị otú ahụ Jekọb si buo ya n’amụma na Jenesis 49:1-33 mgbe ọ nọ n’ọnụ ọnwụ.
it-1 1200 ¶1
Ihe Nketa
Ala e kenyere ebo nke ọ bụla. Ọ bụ Jehova nyere ụmụ Izrel niile ala nkwa ahụ. Ọ gwakwara Mosis ebe ókè ya niile ga-adị. (Ọnụ Ọgụ. 34:1-12; Josh. 1:4) Mosis kenyere ụmụ Gad, ụmụ Ruben, na ọkara ebo Manase ala nke ha. (Ọnụ Ọgụ. 32:33; Josh. 14:3) Joshụa na Elieza ji ife nza kenye ebo ndị nke ọzọ ala nke ha. (Josh. 14:1, 2) Dị ka Jekọb buru n’amụma na Jenesis 49:5, 7, o nweghị ala pụrụ iche e kenyere ebo Simiọn na Livaị ka ọ bụrụ nke ha. E nyere ebo Simiọn ala (nakwa obodo ụfọdụ) n’ime ebe e kenyere Juda (Josh. 19:1-9), e sikwa n’ebe niile e kenyere ụmụ Izrel ala nye ebo Livaị obodo iri anọ na asatọ. Ebe ọ bụ na e nyere ndị Livaị ọrụ pụrụ iche n’ebe nsọ, ọ bụ Jehova bụ ihe nketa ha. A na-enye ha otu ụzọ n’ụzọ iri ka ọ bụrụ òkè ha ma ọ bụ ihe nketa ha maka ozi ha na-eje. (Ọnụ Ọgụ. 18:20, 21; 35:6, 7) A na-ekenye ezinụlọ nke ọ bụla ọrụ n’ebe e kenyere ebo ha ala. Ka ezinụlọ nke ọ bụla na-ebukwu ibu, e nweekwa ụmụ ndị e kwesịrị ikenye ala, a na-ekerisiri ha ala ndị dị adị.
it-1 359 ¶2
Ókè
E jirichaa ife nza mata ebe a ga-ekenye ebo nke ọ bụla, ọ ga-adị mkpa ịmata otú ebe ahụ ga-aha. Ihe a ga-eji amata ya bụ otú ebo ahụ hà. “Unu ga-efe nza keere ezinụlọ unu dị iche iche ala ahụ ka ọ bụrụ nke unu. Unu ga-ekenye ndị dị ọtụtụ ala buru ibu, kenye ndị na-adịghị ọtụtụ ala na-ebughị ibu. Ala ọ bụla nza maara onye ọ bụla ka onye ahụ ga-eketa.” (Ọnụ Ọgụ. 33:54) Ọ bụ ebe ahụ nza kwuru na a ga-ekenye ebo nke ọ bụla ka a ga-ekenye ha. Ma, e nwere ike ịgbanwetụ otú ebe ahụ ga-aha. N’ihi ya, mgbe a chọpụtara na ebe e kenyere ebo Juda buru oké ibu, e weere akụkụ ya ụfọdụ nye ebo Simiọn.—Josh. 19:9.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 359 ¶5
Ókè
Ihe Baịbụl kwuru banyere otú e si kee ala ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Jọdan gosiri na e bu ụzọ fee nza iji mata ebe a ga-ekenye ebo Juda (Josh. 15:1-63), Josef (ya bụ, ebo Ifrem) (Josh. 16:1-10), na ọkara ebo Manase ndị bi n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Jọdan (Josh. 17:1-13), a gwakwara ndị nke ọ bụla ókè ala ha na obodo ndị e kenyere ha. Mgbe nke a gachara, o yiri ka à kwụsịtụrụ ike ala, ebe ọ bụ na e kwuru na ụmụ Izrel si na Gilgal gaa gbakọta na Shaịlo. (Josh. 14:6; 18:1) E kwughị oge ole o were tupu a maliteghachi ike ala ahụ. Ma, Joshụa mechara baara ebo asaa fọrọnụ mba n’ihi oge ha na-egbu ịga biri n’ala ndị fọrọnụ. (Josh. 18:2, 3) E nweela ọtụtụ ihe a sị na ọ bụ ya mere ebo asaa ahụ ji gbuo oge ịga biri n’ala ndị ahụ fọrọnụ. Ụfọdụ kwuru na ihe mere ha ji tụsara ahụ́ ga-abụ n’ihi ọtụtụ ihe ha kwatara n’agha mgbe ha meriri obodo ndị ahụ nakwa n’ihi na o nweghị ndị Kenan nọ na-eyi ha egwu ịlụso ha ọgụ mgbe ahụ. Ihe ọzọkwa nwere ike ịkpata igbu oge a bụ otú ha ga-esi merie ndị agha ụfọdụ dị ike ka fọrọ n’ebe ndị ahụ. (Josh. 13:1-7) Ihe ọzọkwa abụrụ na ọ ga-abụ na ha amachaghị ala ndị fọrọ n’Ala Nkwa ahụ nke ọma otú ha si mara ala ndị nke ahụ e kerela.
NỌVEMBA 8-14
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JOSHỤA 20-22
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 402 ¶3
Kenan
Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ obodo ndị dị na Kenan ekweghị ka ndị Izrel merie ha ma chịwa ha, ma a ka nwere ike ikwu na Jehova ‘nyere ndị Izrel ala niile ọ ṅụrụ iyi na ọ ga-enye ndị nna nna ha,’ na o mere ka ha “zuru ike n’ebe ọ bụla ha nọ,” nakwa na “o nweghị otu n’ime ọmarịcha nkwa niile Jehova kwere ndị Izrel nke na-emezughị. Ha niile mezuchara.” (Josh. 21:43-45) Ndị iro ndị Izrel fọrọnụ enweghị nke nọ na-enye ndị Izrel ezigbo nsogbu. Chineke kwuru na mbụ na ọ ga-eji “nke nta nke nta” chụpụchaa obodo ndị dị na Kenan ka anụ ọhịa ghara ijupụta n’obodo ndị ahụ ma ndị bi na ha jiri ike pụọ. (Ọpụ. 23:29, 30; Diut. 7:22) Ọ bụ eziokwu na ndị Kenan nwere ngwá agha karịrị nke ndị Izrel, nweekwa ụgbọ ịnyịnya agha ndị nwere mma, ọ bụrụ na ndị Izrel emerilighị ụfọdụ n’ime ha, a gaghị asị na Jehova emezughị ihe o kwere ha ná nkwa. (Josh. 17:16-18; Ikpe 4:13) Kama nke ahụ, akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl gosiri na ihe mere e ji merie ụmụ Izrel mgbe ụfọdụ bụ n’ihi na ha hapụrụ Chineke ha.—Ọnụ Ọgụ. 14:44, 45; Josh. 7:1-12.
NỌVEMBA 15-21
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JOSHỤA 23–24
“Ndụmọdụ Ikpeazụ Joshụa Nyere Mba Izrel”
it-1 75
Ijikọta Aka
O nwere ihe dị iche a chọrọ ka mba Izrel mee ma ha banye n’ala Kenan bụ́ Ala Nkwa ahụ. Chineke nyere ha ikike iweghara ala ahụ kpamkpam iji mezuo nkwa o kwere ndị nna nna ha. Ha anaghị aga ibi n’ala ahụ ka ndị mbịarambịa. Jehova nyekwara ha iwu ka ha na mba ndị na-ekpere arụsị n’ala ahụ ghara ijikọ aka. (Ọpụ. 23:31-33; 34:11-16) Naanị iwu Chineke ka ha ga na-edebe, ọ bụghị iwu nke mba ndị ahụ Chineke na-aga ịchụpụ. (Lev. 18:3, 4; 20:22-24) A dọrọ ha aka ná ntị karịchaa ka ha na mba ndị ahụ ghara ịgọ ọgọ. Ha na mba ndị ahụ gọwa ọgọ, ọ ga-eme ka ha lụọ ụmụ nwaanyị ndị na-ekpere arụsị, ha enweekwa ndị ọgọ na-ekpere arụsị. Ihe ndị a ga-aghọrọ ha ọnyà, meekwa ka ha dapụ n’ezi ofufe.—Diut. 7:2-4; Ọpụ. 34:16; Josh. 23:12, 13.
DISEMBA 13-19
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | NDỊ IKPE 8–9
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 753 ¶1
Efọd, nke 1
Ọ bụ eziokwu na Gidiọn bu ihe ọma n’obi mee efọd iji cheta mmeri Jehova mere ka ụmụ Izrel merie ma si otú ahụ kwanyere Chineke ùgwù, ma efọd ahụ o mere “bụụrụ Gidiọn na ezinụlọ ya ọnyà” n’ihi na mba Izrel bidoro fewe efọd ahụ kama ife Jehova. (Ikpe 8:27) Ma, Baịbụl ekwughị na Gidiọn so fee efọd ahụ. Kama nke ahụ, o sodị ná ndị Pọl onyeozi kpọrọ aha mgbe ọ na-ekwu banyere “oké ìgwè” ndịàmà ji obi ha niile fee Jehova tupu oge Ndị Kraịst.—Hib. 11:32; 12:1.
DISEMBA 20-26
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | NDỊ IKPE 10-12
“Jefta Bụ Nwoke Ji Ihe Gbasara Chineke Kpọrọ Ihe”
it-2 27 ¶2
Jefta
Jefta bụ nwoke na-eji ịnụ ọkụ n’obi eme ihe. O gbughị oge ime ihe ndị o kwesịrị ime dị ka onyeisi. O zigaara eze Amọn ozi, gwa ya na ndị obodo ya bịara ịlụso ndị Izrel agha. N’ihi ya, na ọ bụ ha na-achọ ndị Izrel okwu. Eze Amọn gwara ya na ọ bụ n’ihi na ndị Izrel naara ha ala ha. (Ikpe 11:12, 13) Ihe Jefta zaghachiri ya gosiri na ọ bụghị onye agha na-amaghị nke a na-akọ, kama, na ọ ma ihe ndị mere n’oge ochie nke ọma, marakwa otú Chineke si mesoo ndị ya n’oge ahụ. O kwuru ihe gosiri na ihe ahụ eze Amọn kwuru abụghị eziokwu. Ọ gwara ya na (1) ndị Izrel eweereghị ala ndị Amọn, ala ndị Moab, ma ọ bụ nke ndị Ịdọm (Ikpe 11:14-18; Diut. 2:9, 19, 37; 2 Ihe 20:10, 11); (2) ọ bụghị ndị Amọn bi n’ala ahụ mgbe ndị Izrel meriri ya. Ọ bụ ndị Amọraịt bi na Kenan bi na ya. Chineke nyefekwara eze ha bụ́ Saịhọn na ala ha n’aka ndị Izrel; (3) kemgbe narị afọ atọ, ndị Amọn ekwughị na ndị Izrel weere ala ha. Gịnịzi mere ha ji bịa ugbu a na-ekwu na ha weere ala ha?—Ikpe 11:19-27.
it-2 27 ¶3
Jefta
Jefta kwuru ihe bụ́ isi n’okwu ahụ. Ihe ahụ o kwuru gosiri na okwu ahụ gbasara ofufe ha na-efe Jehova. O kwuru na ọ bụ Jehova Chineke nyere Izrel ala ahụ, n’ihi ya, na ha agaghị ewere akụkụ ya ọ bụla nye ndị na-ekpere arụsị. Ọ kpọrọ chi Kimọsh chi ndị Amọn. Ụfọdụ na-ekwu na ihe a o kwuru ezighị ezi. Ọ bụ eziokwu na chi ndị Amọn bụ Milkọm, Kimọsh abụrụ chi ndị Moab, ma mba abụọ a nwere ọtụtụ ebe ha si yie, ha na-efekwa ọtụtụ chi. Solomon medịrị ka e fewe chi Kimọsh n’Izrel n’ihi ụmụ nwaanyị ndị mba ọzọ ọ gara lụọ. Ihe a o mere adịghị mma. (Ikpe 11:24; 1 Eze 11:1, 7, 8, 33; 2 Eze 23:13) Ihe ọzọ bụ na ụfọdụ ndị ọkà mmụta kwuru na “Kimọsh” nwere ike ịpụta “Onye Nkwatu” ma ọ bụ “Onye Mmeri.” (Lee akwụkwọ bụ́ Gesenius’s Hebrew and Chaldee Lexicon, nke S. Tregelles sụgharịrị, 1901, peeji nke 401.) Ọ ga-abụ na ihe mere Jefta ji kpọtụ chi a aha bụ iji gosi na ọ bụ ya ka ndị Amọn na-ekwu na ọ ‘kwaturu’ ma ọ bụ ‘merie’ mba ndị ọzọ ma were ala ha nye hanwa bụ́ ndị Amọn.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 26
Jefta
Jefta Abụghị Nwa A Kwatara n’Iko. Nne Jefta bụ “nwaanyị akwụna.” Ma, ọ pụtaghị na Jefta bụ nwa a kwatara n’iko. Nne ya bụbu nwaanyị akwụna tupu Gilied alụọ ya ka ọ bụrụ nwaanyị ya nke abụọ, otú ahụ Rehab bụbu nwaanyị akwụna tupu Salmọn alụọ ya. (Ikpe 11:1; Josh. 2:1; Mat. 1:5) Otu ihe gosiri na Jefta abụghị nwa a kwatara n’iko bụ na ụmụnne ya ndị nwunye nna ya mụrụ chụpụrụ ya ka ọ ghara iso keta ihe nna ha. Ọ bụrụ na ọ bụ nwa a kwatara n’iko, ha agaghị achụpụwa ya ka ọ ghara iketa ihe nna ha n’ihi na ọ ga-edo anya na o nweghị ihe mere ọ ga-eji keta ihe nna ha. (Ikpe 11:2) Ihe ọzọ bụ na Jefta mechara bụrụ onye a nabatara ka ọ bụrụ onyeisi ụmụ nwoke Gilied (nke ọ ga-abụ na ụmụnne ya ndị ahụ so ná ndị a kacha anụ aha ha n’ime ha). (Ikpe 11:11) Ọ chụdịịrị Chineke àjà n’ụlọikwuu Chineke. (Ikpe 11:30, 31) O nweghị nke gaara ekwe omume n’ime ihe ndị a ma á sị na Jefta bụ nwa a kwatara n’iko n’ihi na Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel kwuru, sị: “E nweghị nwa a kwatara n’iko ga-eso n’ọgbakọ Jehova. Nwa ya ọ bụla agaghị eso n’ọgbakọ Jehova, ruokwa n’ọgbọ nke iri n’ụmụ ya.”—Diut. 23:2.