-
Olee Otú Jehova Ga-esi Cheta Gị?Ụlọ Nche—2000 | Febụwarị 1
-
-
Olee Otú Jehova Ga-esi Cheta Gị?
“CHINEKE m, cheta m.” Nehemaịa ji okwu ndị ahụ rịọ Chineke arịrịọ ọtụtụ ugboro. (Nehemaịa 5:19; 13:14, 31) Ọ bụ ihe dị otú o kwesịrị na mgbe ndị mmadụ nọ n’oké ihe isi ike, ha na-eji okwu arịrịọ yiri nke ahụ echigharịkwuru Chineke.
Otú ọ dị, gịnị ka ndị mmadụ na-ebu n’uche mgbe ha na-arịọ Chineke ka o cheta ha? O doro anya na ha na-ele anya ihe karịrị nanị Chineke icheta aha ha. Obi abụọ adịghị ya na ha na-enwe otu ụdị olileanya ahụ otu n’ime ndị omekome ahụ e gbukọrọ ha na Jisọs, nwere. Onye a, n’adịghị ka onye nke ọzọ, rịọrọ Jisọs, sị: “Cheta m mgbe ọ bụla Ị ga-abịa n’alaeze Gị.” Ọ chọrọ ọ bụghị nanị ka Jisọs cheta onye ọ bụ kamakwa ka o meere ya ihe—ka ọ kpọlite ya n’ọnwụ.—Luk 23:42.
Mgbe mgbe, Bible na-egosi na n’ebe Chineke nọ, “icheta” pụtara ime ihe dị mma. Dị ka ihe atụ, mgbe idei mmiri rikpuru ụwa ruo ụbọchị 150, “Chineke chetara Noa . . . , Chineke wee mee ka ifufe gabiga n’elu ụwa, mmiri wee tawa.” (Jenesis 8:1) Ọtụtụ narị afọ mgbe e mesịrị, Samson, bụ́ onye ndị Filistia rụkpọrọ anya ma jiri chen kee agbụ, kpere ekpere, sị: “Jehova, biko, cheta m, biko, Chineke, meekwa m ka m dị ike nanị otu ugbo a.” Jehova chetara Samson site n’inye ya ike karịrị nke mmadụ ka o wee nwee ike ịbọrọ onwe ya ọbọ megide ndị iro Chineke. (Ndị Ikpe 16:28-30) N’akụkụ Nehemaịa, Jehova gọziri mgbalị ya, e weghachikwara ezi ofufe na Jerusalem.
“Ka ha hà, bụ́ ihe e dere n’akwụkwọ nsọ n’oge gara aga, e dere ha izi anyị ihe, ka anyị wee were ntachi obi na nkasi obi nke ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ nwee olileanya,” ka Pọl onyeozi dere. (Ndị Rom 15:4) Ọ bụrụ na anyị echeta Jehova site n’ịgbalị ime uche ya, dị ka ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi mere n’oge gara aga, anyị pụrụ inwe obi ike na Jehova ga-echeta anyị site n’inyere anyị aka inweta ihe ndị na-akpa anyị kwa ụbọchị, site n’ịkwado anyị n’ọnwụnwa anyị, na site n’ịnapụta anyị mgbe ọ ga-ekpe ndị na-adịghị asọpụrụ Ya ikpe.—Matiu 6:33; 2 Pita 2:9.
-
-
Ọ̀ Ga-amasị Gị Ka Mmadụ Bịa na Nke Gị?Ụlọ Nche—2000 | Febụwarị 1
-
-
Ọ̀ Ga-amasị Gị Ka Mmadụ Bịa na Nke Gị?
Ọbụna n’ụwa a nọ ná nsogbu, ị pụrụ inweta obi ụtọ site n’ezi ihe ọmụma nke Bible banyere Chineke, Alaeze ya, na nzube ya dị ebube maka ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ bụrụ na ị ga-achọ inwetakwu ihe ọmụma ma ọ bụ nwee mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị n’ebe obibi gị iji duziere gị ọmụmụ Bible n’efu, biko deta akwụkwọ na Watch Tower, P.M.B. 1090, Benin City, Edo State, Nigeria, ma ọ bụ n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peji nke 30.
-