-
Ị̀ Pụrụ Ịtụkwasị Bible Obi?Ụlọ Nche—1993 | Jun 15
-
-
Ị̀ Pụrụ Ịtụkwasị Bible Obi?
ỌBỤRỤ na i bulie Bible, ị̀ ga-atụ anya ịchọta otu mkpụrụ ego? Gịnị banyere mkpụrụ ego ọla ọcha nke oge ochie a?
Ọtụtụ na-eche na Bible bụ akwụkwọ ochie nke na-enye akụkọ ochie dị ụtọ na omume ọma na-adọrọ mmasị. N’agbanyeghị nke ahụ, ha adịghị ekwere na ihe ndekọ Bible bụ akụkọ ihe mere eme ziri ezi, ya mere ha na-agọnahụ ọbụbụ ọ bụ Okwu Chineke. Otú ọ dị, e nwere ihe àmà juru eju nke izi ezi Bible. Mkpụrụ ego nke a (e mere ka ọ dị ukwu) bụ ihe atụ dị mma. Gịnị ka ihe e dere na ya kwuru?
E mere mkpụrụ ego ahụ na Tasọs, obodo dị n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ nke ebe bụ Turkey ugbu a. E mere mkpụrụ ego ahụ n’oge ọchịchị nke onye na-achị ala Peasia bụ́ Mazaeus na narị afọ nke anọ T.O.A. O mere ka a mara ya dị ka onye na-achị ala nke ógbè “Ofé Osimiri,” ya bụ, Osimiri Yufretis.
Ma n’ihi gịnị ka ahịrị okwu ahụ ji na-adọrọ mmasị? N’ihi na ị ga-ahụ ụdị aha ahụ n’ime Bible gị. Ezra 5:6–6:13 setịpụrụ nzirịta ozi n’etiti eze Peasia bụ́ Daraiọs na onye na-achị ala a kporọ Tatenaị. Ihe bụ isiokwu bụ ndị Juu iwughachi ụlọ nsọ ha na Jerusalem. Ezra bụ odeakụkwọ nke nwere nkà n’Iwu Chineke, ị ga-atụkwa anya ka o dee kpọmkwem ihe a chọrọ, na-ezi ezi n’ihe o dere. Ị ga-ahụ n’Ezra 5:6 na 6:13 na ọ kpọrọ Tatenaị “onye na-achị ala n’ofé Osimiri.”
Ezra dere nke ahụ n’ihe dị ka 460 T.O.A., ihe dị ka 100 afọ tupu a kpụọ mkpụrụ ego a. Oo, e nwere ndị ga-eche na aha a kpọrọ onye ọchịchị oge ochie bụ ihe ọmụma dị nta. Ma ọ bụrụ na ị pụrụ ịdabere na ndị dere Bible ọbụna n’ihe ndị dị nta otú ahụ, nke ahụ ọ́ gaghị eme ka ntụkwasị obi i nwere n’ebe ihe ndị ọzọ ha dere dị bawanye ụba?
N’isiokwu abụọ ndị mbụ ná mbipụta nke a, ị ga-achọpụta ihe ndị ọzọ mere a ga-eji nwee ụdị ntụkwasị obi dị otú ahụ.
-
-
Ọ̀ Ga-amasị Gị Ka Mmadụ Bịa Na Nke gị?Ụlọ Nche—1993 | Jun 15
-
-
Ọ̀ Ga-amasị Gị Ka Mmadụ Bịa Na Nke gị?
Ọbụna n’ụwa nke a nọ ná nsogbu, ị pụrụ inweta obi ụtọ site n’ezi ihe ọmụma nke Bible banyere Chineke, Alaeze ya, na nzube ya dị ebube maka ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ bụrụ na ị ga-achọ inwetakwu ihe ọmụma ma ọ bụ nwee mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị iji duziere gị ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu, biko deta akwụkwọ na Watch Tower, P.M.B. 1090, Benin City, Edo State, ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peji nke 2.
-