-
Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mach 26Ozi Alaeze—2012 | Mach
-
-
Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mach 26
IZU NA-AMALITE NA MACH 26
Abụ nke 92 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 18 ¶12-18 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jeremaya 12-16 (Nkeji 10)
Nke 1: Jeremaya 13:1-14 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ọ̀ Bụ Naanị Ikwere na Jizọs Ka A Ga-eji Zọpụta Mmadụ?—td 21CH (Nkeji 5)
Nke 3: Ihe Alaeze Chineke Ga-emere Ụmụ Mmadụ—td 2A (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa. Gwa ọgbakọ unu ókèala ebe unu na-agabeghị kesaa akwụkwọ ịkpọ òkù maka Ncheta Ọnwụ Jizọs.
Nkeji 10: Nabata Ndị Bịaranụ. (Rom 15:7) Okwu okenye ga-ekwu. Kwuo ndokwa ndị unu mere maka Ncheta Ọnwụ Jizọs. Kwuokwa ihe ụfọdụ anyị nwere ike ime iji nabata ndị nwere mmasị na ndị na-anaghị ejekwa ozi bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs. Mee ihe ngosi abụọ. Nke mbụ bụ tupu Ncheta Ọnwụ Jizọs amalite. Onye nkwusa ekelee onye natara akwụkwọ ịkpọ òkù Ncheta Ọnwụ Jizọs, mechaa bịa. Nke abụọ bụ mgbe a gbasara. Ha abụọ ekwurịta otú onye nkwusa ahụ ga-esi chọrọ ya bịa ka ha kwurịtakwuo ihe gbasara Baịbụl.
Nkeji 20: “Ihe Ndị E Kere Eke Na-egosi na Chineke Dị.” Ajụjụ na azịza. Ọ ga-esi na broshọ bụ́ Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Akụkụ nke 3, paragraf nke 3-21. Jiri ihe e kwuru na paragraf nke mbụ n’Ozi Alaeze a mere okwu mmeghe dị nkenke. Jụwazie ndị na-ege ntị ajụjụ paragraf nke 3-21 na broshọ ahụ. Mee ya otú ahụ a na-eme n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Unu tụlechaa, jiri ihe e kwuru na paragraf nke 2 n’Ozi Alaeze a mere okwu mmechi n’agaghị egbu oge. Gbaa mmadụ niile ume ka ha lee vidio bụ́ The Wonders of Creation Reveal God’s Glory.
Abụ nke 110 na Ekpere
-
-
Ihe Ndị E Kere Eke Na-egosi na Chineke DịOzi Alaeze—2012 | Mach
-
-
Ihe Ndị E Kere Eke Na-egosi na Chineke Dị
Obi na-atọ ọtụtụ ndị ụtọ ile ihe ndị e kere eke. Ma, ọ bụ mmadụ ole na ole ghọtara na ihe ndị e kere eke na-eme ka anyị ghọtakwuo ụdị onye onye kere ha bụ. (Rom 1:20) N’oge ochie, Devid gụrụ Okwu Chineke, jiri ya chọpụta ụdị onye Jehova bụ. Ma, ihe ndị e kere eke o ji anya ya ‘hụ’ mekwara ka ya na Chineke dịrịkwuo ná mma. (Ọma 8:3, 4) Broshọ bụ́ Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie? ga-enyere ma anyịnwa ma ụmụ anyị ma ndị anyị na-amụrụ Baịbụl aka ilerukwu anya n’ihe ndị Jehova kere. Nke a ga-eme ka anyị ghọtakwuo ụdị onye ọ bụ, ghọtakwuokwa àgwà ya. Mgbe ahụzi, anyị na ya ga-adịkwu ná mma.
Leruo Ihe Ndị Jehova Kere Eke Anya: Jizọs gwara anyị ka anyị ‘leruo anụ ufe nke eluigwe anya’ ma ‘mụta ihe site n’okooko lili dị n’ọhịa.’ (Mat. 6:26, 28) Anyị mee otú ahụ, okwukwe anyị ga-esikwu ike, anyị agaghịkwa enwe obi abụọ ma è nwere onye kere ha. Ihe ọzọkwa bụ na ọ ga-eme ka anyị ghọtakwuo amamihe dị egwu Jehova nwere, meekwa ka obi sie anyị ike na ọ hụrụ anyị n’anya nakwa na ọ ga-anapụta anyị ma anyị nwee nsogbu. Ekwela ka mere nke a na nke ọzọ juru n’ụwa megharịa gị anya. Wepụta oge leruo ihe ndị Jehova kere eke anya ma hụ otú ha si dị egwu. Ka ị na-ele ha, gbalịa ka ị ghọta ihe ha na-akọrọ gị gbasara Chineke.—Ọma 19:1.
-