Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ọ̀ Bụ Ịmụ Mmadụ Ọzọ Ga-eme Ka A Zọpụta Mmadụ?
    Ụlọ Nche—2009 | Eprel 1
    • Ọ̀ Bụ Ịmụ Mmadụ Ọzọ Ga-eme Ka A Zọpụta Mmadụ?

      AJỤỌ gị, sị, “À mụọla gị ọzọ?” gịnị ka ị ga-aza? A jụọ ya ọtụtụ ndị kweere na Kraịst gburugburu ụwa, ha ga-asị, “Eenụ!” Ha kweere na ihe e ji amata ezigbo Ndị Kraịst niile bụ na a ga-amụ ha ọzọ, nakwa na ọ bụ naanị ịmụ mmadụ ọzọ ga-eme ka a zọpụta ya. Ha kwenyeere ndị ndú okpukpe, nke otu n’ime ha, bụ́ ọkà mmụta okpukpe a na-akpọ Robert C. Sproul, dere, sị: “Ọ bụrụ na a mụghị mmadụ ọzọ, . . . ọ bụghị Onye Kraịst.”

      Ì so ná ndị kweere na ịmụ mmadụ ọzọ ga-eme ka a zọpụta mmadụ? Ọ bụrụ otú ahụ, o doro anya na i kwesịrị inyere ndị ikwu gị na ndị enyi gị aka ka a mụọ ha ọzọ, ka nzọpụta ruo ha aka. Ma, ihe dịgodị ha mkpa bụ ịghọta ọdịiche dị n’onye a mụrụ ọzọ na onye a na-amụbeghị ọzọ. Olee otú ị ga-esi akọwara ha ihe ịmụ mmadụ ọzọ pụtara?

      Ọtụtụ ndị kweere na ‘ịmụ mmadụ ọzọ’ pụtara mmadụ ikwe nkwa ijere Chineke na Kraịst ozi, bụ́ nke ga-eme ka onye ahụ, bụ́ onye nwụrụ anwụ n’ime mmụọ, gbanwee ghọọ onye dị ndụ n’ime mmụọ.

      Ọ̀ ga-eju gị anya ma a gwa gị na ihe ahụ ọtụtụ ndị kweere adabaghị n’ihe Baịbụl kwuru? Ị̀ ga-achọ ịmara ihe Okwu Chineke na-akụzi n’ezie banyere ịmụ mmadụ ọzọ? O doro anya na ị ga-erite uru ma ọ bụrụ na i leba anya nke ọma n’isiokwu a. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ maka na ịghọta ihe ịmụ mmadụ ọzọ pụtara n’ezie ga-emetụta ndụ gị, metụtakwa ihe ị na-atụ anya ya n’ọdịnihu.

      Gịnị Ka Baịbụl Na-akụzi?

      Otu n’ime ebe ụfọdụ ‘ịmụ mmadụ ọzọ’ pụtara na Baịbụl bụ Jọn 3:1-12, bụ́ ebe kọrọ banyere ụka na-emetụ n’ahụ́ Jizọs na otu onye ndú okpukpe na Jeruselem kparịtara. E dechara ihe amaokwu ndị ahụ kwuru n’igbe dị n’isiokwu a. Anyị na-agba gị ume ka ị gụọ ya nke ọma.

      N’ebe ahụ, Jizọs kwuru ihe dị iche iche banyere ‘ịmụ mmadụ ọzọ.’a N’eziokwu, ihe Jizọs kwuru ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ ise a dị mkpa:

      ◼ Olee otú ịmụ mmadụ ọzọ dịruru ná mkpa?

      ◼ Ọ̀ bụ anyị ga-ekpebi ma a ga-amụ anyị ọzọ?

      ◼ Gịnị mere e ji amụ mmadụ ọzọ?

      ◼ Olee otú e si amụ mmadụ ọzọ?

      ◼ Olee mgbanwe a na-enwe ma a mụọ mmadụ ọzọ?

      Ka anyị leba anya n’ajụjụ ndị a n’otu n’otu.

      [Ihe e dere n’ala ala peeji]

      a Okwu bụ́ ‘ịmụ mmadụ ọzọ’ dịkwa na 1 Pita 1:3, 23. O si n’okwu Grik bụ́ gen·naʹo.

      [Igbe/Foto dị na peeji nke 4]

      “A Ghaghị Ịmụ Unu Ọzọ”

      “E nwere otu nwoke n’ime ndị Farisii, aha ya bụ Nikọdimọs. Ọ bụ otu n’ime ndị na-achị ndị Juu. Onye a bịakwutere ya n’abalị, sị ya: ‘Rabaị, anyị maara na ị bụ onye ozizi nke si n’ebe Chineke nọ bịa; n’ihi na ọ dịghị onye pụrụ ime ihe ịrịba ama ndị a ị na-eme ma ọ bụrụ na Chineke anọnyereghị ya.’ Jizọs zara ya, sị: ‘N’ezie, n’ezie, ana m asị gị, Ọ bụrụ na a mụghị mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịhụ alaeze Chineke.’ Nikọdimọs sịrị ya: ‘Olee otú a pụrụ isi mụọ mmadụ mgbe o mere agadi? Ọ̀ pụrụ ịbanye n’afọ nne ya nke ugboro abụọ ka a mụọ ya?’ Jizọs zara, sị: ‘N’ezie, n’ezie, ana m asị gị, Ọ bụrụ na a mụghị mmadụ site na mmiri na mmụọ nsọ, ọ pụghị ịbanye n’alaeze Chineke. Ihe a mụrụ site n’anụ ahụ́ bụ anụ ahụ́, ihe a mụkwara site na mmụọ nsọ bụ mmụọ. Ya ejula gị anya na m sịrị gị, A ghaghị ịmụ unu ọzọ. Ifufe na-efega n’ebe ọ chọrọ, ị na-anụkwa ụda ya, ma ị dịghị ama ebe o si abịa na ebe ọ na-eje. Otú a ka ọ dị onye ọ bụla a mụrụ site na mmụọ nsọ.’ Nikọdimọs wee sị ya: ‘Olee otú ihe ndị a pụrụ isi mee?’ Jizọs zara ya, sị: ‘Ị̀ bụ onye nkụzi n’Izrel ma ị maghị ihe ndị a? N’ezie, n’ezie, ana m asị gị, Ihe anyị maara ka anyị na-ekwu, ihe anyị hụkwara ka anyị na-agba àmà ya, ma unu adịghị anabata àmà anyị na-agba. Ọ bụrụ na m gwara unu ihe nke ụwa ma unu ekwetaghị, olee otú unu ga-esi kwere ma ọ bụrụ na mụ agwa unu ihe nke eluigwe?’”—Jọn 3:1-12.

  • Olee Otú Ịmụ Mmadụ Ọzọ Dịruru ná Mkpa?
    Ụlọ Nche—2009 | Eprel 1
    • Olee Otú Ịmụ Mmadụ Ọzọ Dịruru ná Mkpa?

      N’IHE niile ahụ Jizọs na Nikọdimọs kwurịtara, Jizọs gosiri nnọọ na ịmụ mmadụ ọzọ dị oké mkpa. Olee otú o si mee ka nke a doo anya?

      N’ụka ahụ Jizọs na Nikọdimọs kparịtara, lee ihe Jizọs kwuru bụ́ nke gosiri na ịmụ mmadụ ọzọ dị mkpa. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na a mụghị mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịhụ alaeze Chineke.” (Jọn 3:3) Okwu bụ́ “ọ bụrụ na” na “ọ pụghị” gosiri na ịmụ mmadụ ọzọ dị oké mkpa. Iji maa atụ: Ọ bụrụ na mmadụ asị, “Ọ bụrụ na anwụ achaghị, a pụghị inwe ìhè,” ihe ọ na-ekwu bụ na anwụ bụ ihe dị oké mkpa na-eme ka e nwee ìhè. N’otu aka ahụ, Jizọs kwuru na ịmụ mmadụ ọzọ bụ ihe dị oké mkpa ga-eme ka mmadụ hụ Alaeze Chineke.

      Iji mee ka ihe ọ na-ekwu doo anya nke ọma, Jizọs kwuziri, sị: “A ghaghị ịmụ unu ọzọ.” (Jọn 3:7) O doro anya na dị ka Jizọs kwuru, a ga-amụrịrị mmadụ ọzọ ka onye ahụ nwee ike “ịbanye n’Alaeze Chineke.”—Jọn 3:5.

      Ebe ọ bụ na Jizọs kweere na ịmụ mmadụ ọzọ dị oké mkpa otú ahụ, Ndị Kraịst kwesịrị ịhụ na ha ghọtara nke ọma ihe ịmụ mmadụ ọzọ pụtara. Dị ka ihe atụ, ì chere na Onye Kraịst nwere ike iji aka ya họrọ ka a mụọ ya ọzọ?

      [Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 5]

      “Ọ bụrụ na anwụ achaghị, a pụghị inwe ìhè”

  • Ọ̀ Bụ Mmadụ Ga-ekpebi Ma À Ga-amụ Ya Ọzọ?
    Ụlọ Nche—2009 | Eprel 1
    • Ọ̀ Bụ Mmadụ Ga-ekpebi Ma À Ga-amụ Ya Ọzọ?

      ÒNYE na-eme ka a mụọ mmadụ ọzọ? Mgbe ndị ụkọchukwu ụfọdụ na-agba ndị na-ege ha ntị ume ka ha ghọọ Ndị Kraịst a mụrụ ọzọ, ha na-ekwu ihe a Jizọs kwuru: “A ghaghị ịmụ unu ọzọ.” (Jọn 3:7) Ndị ụkọchukwu ahụ na-ekwu ya ka ọ̀ bụ iwu, ka à ga-asị na ha na-asị ndị ahụ, “Bụrụnụ ndị a mụrụ ọzọ!” Ha na-esi otú ahụ akụzi na ọ bụ Onye Kraịst nke ọ bụla ga-ekpebi ma ọ̀ ga-erubere Jizọs isi ma mee ihe ndị o kwesịrị ime ka a mụọ ya ọzọ. Ihe ha na-ekwu bụ na ọ bụ mmadụ ga-ahọrọ ma à ga-amụ ya ọzọ. Ma, ihe a ha na-ekwu ọ̀ dabara n’ihe Jizọs gwara Nikọdimọs?

      Ọ bụrụ na anyị agụọ ihe ahụ Jizọs kwuru nke ọma, anyị ga-aghọta na Jizọs akụzighị na ọ bụ mmadụ ga-ahọrọ ma à ga-amụ ya ọzọ ma ọ bụ na a gaghị amụ ya. Gịnị mere anyị ji kwuo otú a? Okwu Grik a sụgharịrị ‘ịmụ ọzọ’ nwekwara ike ịbụ “isi n’elu mụọ mmadụ.”a Ya mere, ụzọ nke abụọ a e nwere ike isi sụgharịa ya gosiri na ịmụ mmadụ ọzọ ‘na-esi n’elu,’ ya bụ, ọ ‘na-esi n’eluigwe,’ ma ọ bụ “n’aka Nna” anyị. (Jọn 19:11; Jems 1:17) N’eziokwu, ọ bụ Chineke na-eme ka a mụọ mmadụ ọzọ.—1 Jọn 3:9.

      Ọ bụrụ na anyị eburu okwu ahụ bụ́ “isi n’elu” n’uche, ọ gaghị esiri anyị ike ịghọta ihe mere o ji bụrụ na mmadụ enweghị ike ime ka a mụọ ya ọzọ. Chegodị echiche otú e si mụọ gị. Ọ̀ bụ gị kpebiri ka a mụọ gị? Mbanụ! A mụrụ gị maka na nna gị tụrụ ime gị. N’otu aka ahụ, ihe ga-eme ka a mụọ anyị ọzọ bụ naanị ma ọ bụrụ na Chineke, bụ́ Nna anyị nke eluigwe, emee ka a mụọ anyị ọzọ. (Jọn 1:13) Ọ bụ ya mere o ji bụrụ na ihe Pita onyeozi kwuru ziri ezi. Ọ sịrị: “Ka Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst bụrụ onye a gọziri agọzi, n’ihi na dị ka ebere ya si dị ukwuu, ọ mụrụ anyị ọzọ.”—1 Pita 1:3.

      Ọ̀ Bụ Iwu?

      Ma, ụfọdụ ndị nwere ike ịjụ, sị, ‘Ọ bụrụ eziokwu na ọ bụghị mmadụ ga-ekpebi ma à ga-amụ ya ọzọ, gịnị mere Jizọs ji nye iwu, sị: “A ghaghị ịmụ unu ọzọ”?’ Ihe a bụ ezigbo ajụjụ, n’ihi na ọ bụrụ n’ezie na ọ bụ iwu ka Jizọs nyere, ọ pụtara na o nyere anyị iwu ka anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli. Jizọs agaghị enye ụdị iwu ahụ. Ya bụrụ otú ahụ, olee otú anyị kwesịrị isi ghọta okwu ahụ bụ́ na a ghaghị “ịmụ unu ọzọ”?

      Ọ bụrụ na anyị eleruo ya anya n’asụsụ mbụ e ji dee ya, anyị ga-achọpụta na ọ bụghị iwu ka Jizọs nyere. Kama nke ahụ, ọ bụ okwu nkịtị ka o kwuru. E kwuo ya n’ụzọ ọzọ, mgbe Jizọs kwuru na a ghaghị “ịmụ unu ọzọ,” ọ na-ekwu otú ihe dị, ọ naghị enye iwu. Ọ sịrị: “Ọ dị mkpa ka e si n’elu mụọ unu.”—Jọn 3:7, Baịbụl Modern Young’s Literal Translation.

      Iji ghọta ọdịiche dị n’iwu na n’okwu, chebara ihe atụ a echiche. Ka e were ya na otu obodo nwere ụlọ akwụkwọ dị iche iche. Otu n’ime ha bụ ụlọ akwụkwọ e wuru maka naanị ụmụ amaala obodo ahụ ndị bi n’ebe dị anya. Otu ụbọchị, otu nwa okorobịa na-abụghị nwa amaala obodo ahụ gakwuuru onyeisi ụlọ akwụkwọ ahụ, gwa ya, sị, “Achọrọ m ịbata n’ụlọ akwụkwọ unu.” Onyeisi ụlọ akwụkwọ ahụ asị ya, “Ị chọọ ịbata n’ụlọ akwụkwọ anyị, ị ghaghị ịbụ nwa amaala obodo anyị.” O doro anya na ọ bụghị iwu ka onyeisi ụlọ akwụkwọ ahụ nyere nwa okorobịa ahụ. O nyeghị ya iwu, sị, “Bụrụ nwa amaala obodo anyị!” Kama, ihe ọ gwara ya bụ, “Ị ga-abata n’ụlọ akwụkwọ anyị ma ọ bụrụ na ị bụ nwa amaala obodo anyị.” Ihe onyeisi ụlọ akwụkwọ ahụ mere bụ naanị ikwu otú ihe dị, ya bụ, otú mmadụ ga-esi bụrụ nwa akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ. N’otu aka ahụ, mgbe Jizọs sịrị: “A ghaghị ịmụ unu ọzọ,” ihe ọ na-ekwu bụ naanị otú ihe dị, ya bụ, otú mmadụ ga-esi ‘banye n’Alaeze Chineke.’

      Alaeze Chineke a o kwuru okwu ya bụ ihe ọzọ dị mkpa n’okwu ịmụ mmadụ ọzọ a. Ọ gbasara ajụjụ ahụ bụ́, Gịnị mere e ji amụ mmadụ ọzọ? Ịmata azịza ajụjụ ahụ ga-enyere mmadụ aka ịghọta nke ọma ihe ịmụ mmadụ ọzọ pụtara.

      [Ihe e dere n’ala ala peeji]

      a Ọ bụ otú a ka Baịbụl dị iche iche si sụgharịa Jọn 3:3. Dị ka ihe atụ, Baịbụl bụ́ A Literal Translation of the Bible na-agụ, sị: “Ọ bụrụ na e sighị n’elu mmụọ mmadụ, ọ gaghị enwe ike ịhụ alaeze Chineke.”

      [Foto dị na peeji nke 6]

      Olee otú ịmụ mmadụ ọzọ na ịmụ nwa ọhụrụ si yie?

  • Gịnị Mere E Ji Amụ Mmadụ Ọzọ?
    Ụlọ Nche—2009 | Eprel 1
    • Gịnị Mere E Ji Amụ Mmadụ Ọzọ?

      ỌTỤTỤ ndị kweere na ihe mere e ji amụ mmadụ ọzọ bụ ka o nweta nzọpụta ebighị ebi. Ma, buru n’obi ihe Jizọs kwuru banyere ihe mere e ji amụ mmadụ ọzọ. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na a mụghị mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịhụ alaeze Chineke.” (Jọn 3:3) Ya mere, ihe mere e ji amụ mmadụ ọzọ bụ ka onye ahụ banye n’Alaeze Chineke, ọ bụghị ka o nweta nzọpụta. Ụfọdụ nwere ike ịsị, ‘Ma, ịbanye n’Alaeze ahụ na inweta nzọpụta ọ́ bụghị otu ihe?’ Mba, ha abụghị otu ihe. Iji ghọta ihe dị iche na ha abụọ, ka anyị buru ụzọ leba anya n’ihe “alaeze Chineke” pụtara.

      Alaeze bụ ọchịchị. Ya mere, “alaeze Chineke” pụtara “ọchịchị Chineke.” Baịbụl na-akụzi na Jizọs Kraịst, bụ́ “nwa nke mmadụ,” bụ Eze nke Alaeze Chineke nakwa na Kraịst nwere ndị ya na ha ga-eso chịa. (Daniel 7:1, 13, 14; Matiu 26:63, 64) Ọhụụ e kpugheere Jọn onyeozi gosikwara na ndị ha na Kraịst ga-achị ga-abụ ụmụ mmadụ e “si n’ebo niile na asụsụ niile na ndị niile na mba niile” họrọ, nakwa na ‘ha ga-achị ụwa dị ka ndị eze.’ (Mkpughe 5:9, 10; 20:6) Okwu Chineke gosikwara na ndị ahụ ga-aghọ ndị eze bụ “ìgwè atụrụ nta” ndị dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ, “bụ́ ndị e si n’ụwa zụta.”—Luk 12:32; Mkpughe 14:1, 3.

      Olee ebe Alaeze Chineke ga-esi na-achị? Aha ọzọ a kpọrọ “alaeze Chineke” bụ “alaeze eluigwe,” nke na-egosi na Jizọs na ndị ya na ha ga-eso chịa ga-esi n’eluigwe na-achị. (Luk 8:10; Matiu 13:11) Ya mere, Alaeze Chineke bụ ọchịchị eluigwe nke ndị ọchịchị ya bụ Jizọs Kraịst na ndị eze ibe ya e si n’etiti ụmụ mmadụ họrọ.

      Ajụjụ bụzi, olee ihe Jizọs bu n’obi mgbe o kwuru na mmadụ ‘apụghị ịbanye n’alaeze Chineke’ ọ gwụla ma a mụrụ ya ọzọ? Ihe ọ na-ekwu bụ na a ga-amụ mmadụ ọzọ ka onye ahụ nwee ike iso Kraịst chịa n’eluigwe. N’igbu ya nkenke, ihe mere Chineke ji mee ka a mụọ ndị mmadụ ọzọ bụ iji kwadebe obere ìgwè mmadụ ka ha chịa n’eluigwe.

      Ka ọ dị ugbu a, anyị ahụla na ịmụ mmadụ ọzọ dị oké mkpa, hụkwa na ọ bụ Chineke na-eme ka a mụọ mmadụ ọzọ, nakwa na ọ na-akwadebe obere ìgwè mmadụ ka ha chịa n’eluigwe. Ma, oleedị otú e si amụ mmadụ ọzọ?

      [Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 7]

      Ihe mere Chineke ji mee ka a mụọ ndị mmadụ ọzọ bụ iji kwadebe obere ìgwè mmadụ ka ha chịa n’eluigwe

      [Foto dị na peeji nke 7]

      Ọ bụ Jizọs Kraịst na ndị eze ibe ya e si n’etiti ụmụ mmadụ họrọ bụ ndị ọchịchị Alaeze Chineke

  • Olee Otú E Si Amụ Mmadụ Ọzọ?
    Ụlọ Nche—2009 | Eprel 1
    • Olee Otú E Si Amụ Mmadụ Ọzọ?

      IHE Jizọs gwara Nikọdimọs abụghị naanị ihe mere ịmụ mmadụ ọzọ ji dị mkpa, onye na-eme ka a mụọ mmadụ ọzọ, na ihe mere e ji amụ mmadụ ọzọ, kama, ọ gwakwara ya otú e si amụ mmadụ ọzọ. Jizọs sịrị: “Ọ bụrụ na a mụghị mmadụ site na mmiri na mmụọ nsọ, ọ pụghị ịbanye n’alaeze Chineke.” (Jọn 3:5) N’ihi ya, ọ bụ mmiri na mmụọ nsọ ka e ji amụ mmadụ ọzọ. Ma, olee ihe “mmiri na mmụọ nsọ” a bụ?

      Gịnị Ka “Mmiri na Mmụọ Nsọ” Bụ?

      Ebe Nikọdimọs bụ ọkà mmụta okpukpe ndị Juu, o doro anya na ọ maara ihe “mmụọ Chineke” pụtara n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, ya bụ, ike Chineke nọ n’ọrụ nke na-eme ka ndị mmadụ mee ihe pụrụ iche ha na-enweghị ike ime n’ike onwe ha. (Jenesis 41:38; Ọpụpụ 31:3; 1 Samuel 10:6) Ya mere, mgbe Jizọs kwuru banyere “mmụọ nsọ,” Nikọdimọs ghọtara na ọ bụ ike Chineke nọ n’ọrụ ka ọ na-ekwu.

      Oleekwanụ maka mmiri ahụ Jizọs kwuru okwu ya? Chegodị echiche banyere ihe ndị e dere tupu e dee ụka ahụ Jizọs na Nikọdimọs kparịtara nakwa ihe e dere mgbe e dechara ya. Ihe ndị ahụ e dere gosiri na Jọn Onye Na-eme Baptizim na ndị na-eso ụzọ Jizọs nọcha na-eme ndị mmadụ baptizim n’ime mmiri. (Jọn 1:19, 31; 3:22; 4:1-3) Ime baptizim ghọrọ ihe a maara nke ọma na Jeruselem. Ya mere, mgbe Jizọs kwuru banyere mmiri, ọ ga-abụ na Nikọdimọs ghọtara na ihe Jizọs na-ekwu abụghị ụdị mmiri ọ bụla, kama, ọ bụ mmiri e ji eme mmadụ baptizim.

      A “Ga-eji Mmụọ Nsọ Mee” Ha Baptizim

      Ọ bụrụ na ‘ịmụ mmadụ site na mmiri’ pụtara ime onye ahụ baptizim n’ime mmiri, gịnị ka ‘ịmụ mmadụ site na mmụọ nsọ’ pụtara? Tupu Nikọdimọs na Jizọs akparịta ụka, Jọn Onye Na-eme Baptizim amaala ọkwa na ọ bụghị naanị mmiri ka a ga-eji mee ndị mmadụ baptizim, kama, na a ga-ejikwa mmụọ nsọ. O kwuru, sị: “Eji m mmiri mee unu baptizim, ma ọ [Jizọs] ga-eji mmụọ nsọ mee unu baptizim.” (Mak 1:7, 8) Mak, onye so dee Baịbụl, kwuru oge mbụ e mere mmadụ ụdị baptizim ahụ. O dere, sị: “Ka ụbọchị ndị ahụ na-aga, Jizọs si Nazaret nke Galili bịa, Jọn wee mee ya baptizim na Jọdan. Ozugbo o si na mmiri na-ebili, Jọn hụrụ ka eluigwe na-ekewa, hụkwa ka mmụọ nsọ na-ebekwasị ya dị ka nduru.” (Mak 1:9, 10) E ji mmiri mee Jizọs baptizim mgbe e mikpuru ya n’osimiri Jọdan. E ji mmụọ nsọ mee ya baptizim ozugbo ọ natara mmụọ nsọ si n’eluigwe.

      Ihe dị ka afọ atọ e mechara Jizọs baptizim, o mesiri ndị na-eso ụzọ ya obi ike, sị: “A ga-eji mmụọ nsọ mee unu baptizim ụbọchị ole na ole mgbe nke a gasịrị.” (Ọrụ 1:5) Olee mgbe ihe a mere?

      N’ụbọchị Pentikọst nke afọ 33 Oge Anyị, ihe dị ka otu narị mmadụ na iri abụọ bụ́ ndị na-eso ụzọ Jizọs zukọrọ n’otu ụlọ na Jeruselem. “Na mberede, a nụrụ ụzụ si n’eluigwe dị nnọọ ka oké ifufe nke na-efesi ike, o wee ju ụlọ ahụ dum bụ́ ebe ha niile nọ ala. Ha hụkwara ihe ndị dị ka ire ọkụ. . . .  Ha niile wee jupụta na mmụọ nsọ.” (Ọrụ 2:1-4) N’otu ụbọchị ahụ, a gbara ndị ọzọ nọ na Jeruselem ume ka e mee ha baptizim n’ime mmiri. Pita onyeozi gwara otu ìgwè mmadụ, sị: “Chegharịanụ, ka e meekwa onye ọ bụla n’ime unu baptizim n’aha Jizọs Kraịst ka e wee gbaghara unu mmehie unu, unu ga-anatakwa mmụọ nsọ ahụ a na-enye n’efu.” Oleezi ihe merenụ? “E mere ndị ji obi ha niile [nabata] okwu ya baptizim, a tụkwasịkwara ihe dị ka puku mkpụrụ obi atọ n’ụbọchị ahụ.”—Ọrụ 2:38, 41.

      Ụdị Baptizim Abụọ

      Gịnị ka baptizim ndị ahụ na-egosi anyị banyere ịmụ mmadụ ọzọ? Ha na-egosi na e nwere ụzọ ihe abụọ dị n’ịmụ mmadụ ọzọ. Cheta na e bu ụzọ jiri mmiri mee Jizọs baptizim, e mechaa, ya anata mmụọ nsọ. N’otu aka ahụ, e bu ụzọ jiri mmiri mee ndị mbụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs baptizim (ọ bụ Jọn Onye Na-eme Baptizim mere ụfọdụ n’ime ha baptizim), e mechaa, ha anatakwa mmụọ nsọ. (Jọn 1:26-36) E bukwa ụzọ jiri mmiri mee puku mmadụ atọ ahụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs baptizim, e mechaa, ha anatakwa mmụọ nsọ.

      Ebe anyị ghọtarala baptizim ndị ahụ e mere ndị na-eso ụzọ Jizọs na Pentikọst nke afọ 33 Oge Anyị, olee otú anyị kwesịrị ịtụ anya ka e si na-amụ ndị mmadụ ọzọ n’oge a? Ọ bụ otu ụzọ ahụ e si mụọ ndịozi Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya mbụ ọzọ. Mmadụ ga-ebugodị ụzọ chegharịa ná mmehie ya, hapụ omume ọjọọ ọ na-eme, were ndụ ya nyefee Jehova ife ya ofufe na ijere ya ozi, ya ekwekwa ka e mee ya baptizim na mmiri iji gosi ọha na eze na ya enyefeela Jehova ndụ ya. Ọ bụrụzie na Chineke ahọrọ ya ka o soro ná ndị ga-achị n’Alaeze Ya, a ga-eji mmụọ nsọ tee ya mmanụ. Ihe mbụ dị n’ịmụ mmadụ ọzọ bụ ihe mmadụ ga-ekpebi ka e mee ya (ya bụ, iji mmiri mee onye ahụ baptizim); nke abụọ abụrụ ihe Chineke ga-eji aka ya mee (ya bụ, iji mmụọ nsọ mee onye ahụ baptizim). Mgbe e mere mmadụ ụdị baptizim abụọ a, ihe ọ pụtara bụ na a mụọla ya ọzọ.

      Ma, gịnị mere Jizọs ji kwuo na a ‘ga-amụ mmadụ site na mmiri na mmụọ nsọ’ mgbe ya na Nikọdimọs na-akparịta ụka? Ọ bụ iji gosi nke ọma na a ga-enwe mgbanwe pụrụ iche ná ndụ ndị e ji mmiri na mmụọ nsọ mee baptizim. Isiokwu na-esonụ ga-eleba anya ná mgbanwe ahụ.

      [Foto dị na peeji nke 9]

      Jọn ji mmiri mee ndị Izrel chegharịrị echegharị baptizim

  • Olee Ihe Ịmụ Mmadụ Ọzọ Ga-arụzu?
    Ụlọ Nche—2009 | Eprel 1
    • Olee Ihe Ịmụ Mmadụ Ọzọ Ga-arụzu?

      GỊNỊ mere Jizọs ji kwuo na a ‘ga-amụ mmadụ site na mmụọ nsọ’ mgbe ọ na-ekwu banyere iji mmụọ nsọ mee mmadụ baptizim? (Jọn 3:5) Mgbe ụfọdụ, okwu bụ́ ‘ịmụ’ na-apụta “mmalite.” N’ihi ya, ‘ịmụ ọzọ’ na-egosi “mmalite ọhụrụ.” Ya mere, ‘ịmụ’ na ‘ịmụ ọzọ’ na-egosi nke ọma na ndị e ji mmụọ nsọ mee baptizim na Chineke ga-amalite inwe mmekọrịta ọhụrụ. Olee otú mmekọrịta ọhụrụ ahụ si amalite?

      Pọl onyeozi ji ihe atụ metụtara ezinụlọ kọwaa otú Chineke si akwadebe ụmụ mmadụ ka ha soro chịa n’eluigwe. O degaara Ndị Kraịst nọ n’oge ya akwụkwọ ozi, gwa ha na ha ga-aghọ “ndị e doro ịbụ ụmụ,” nakwa na nke a ga-eme ka Chineke na-emeso ha “dị ka ụmụ.” (Ndị Galeshia 4:5; Ndị Hibru 12:7) Iji hụ otú ihe atụ nke ime ka mmadụ ghọọ nwa onye ọzọ ga-esi nyere anyị aka ịghọta ụdị mgbanwe a na-enwe ná ndụ onye e ji mmụọ nsọ mee baptizim, ka anyị lebaghachi anya n’ihe atụ nwa okorobịa ahụ chọrọ ịbanye n’ụlọ akwụkwọ e wuru maka naanị ụmụ akwụkwọ ndị bụ́ ụmụ amaala.

      Otú Ndụ Ndị E Mere Ka Ha Ghọọ Ụmụ Si Agbanwe

      N’ihe atụ ahụ, nwa okorobịa ahụ enweghị ike ịbanye n’ụlọ akwụkwọ ahụ maka na ọ bụghị nwa amaala obodo ahụ. Ka e were ya na otu ụbọchị e nwere nnukwu mgbanwe ná ndụ nwa okorobịa ahụ. Otu nwoke bụ́ nwa amaala obodo ahụ mere ya nwa ya otú iwu obodo ahụ kwuru. Olee otú nke a ga-esi emetụta nwa okorobịa ahụ? Ebe ọ bụ na nwoke ahụ emeela ya nwa ya, ihe niile ruuru ndị ntorobịa ndị ọzọ bụ́ ụmụ amaala obodo ahụ rukwaara ya, ma ịbanye n’ụlọ akwụkwọ ahụ. Ihe ndị ọ ga-enwe ike ime agbanweela kpamkpam.

      Ihe atụ a na-egosi ihe na-eme ndị a mụrụ ọzọ, ma, ọ na-eme n’ụzọ dị ukwuu karịa otú o mere nwa okorobịa ahụ. Ka anyị tụlee ụzọ ụfọdụ ọnọdụ ha na ọnọdụ nwa okorobịa ahụ si yie. Naanị ihe ga-eme ka nwa okorobịa ahụ banye n’ụlọ akwụkwọ ahụ bụ ma ọ bụrụ na o ruru ihe a chọrọ n’aka ndị na-abanye n’ụlọ akwụkwọ ahụ, ya bụ, ma ọ bụrụ na ọ bụ nwa amaala obodo ahụ. Ma, ọ gaghị enwe ike iru ihe ahụ a chọrọ n’onwe ya. N’otu aka ahụ, ụfọdụ ụmụ mmadụ ga-aghọ ndị ọchịchị n’Alaeze Chineke, ma ọ bụ n’ọchịchị eluigwe, naanị ma ọ bụrụ na ha ruru ihe a chọrọ n’aka ndị ga-eso chịa, ya bụ, ma ọ bụrụ na ‘a mụrụ ha ọzọ.’ Ma, ha enweghị ike iru ihe ahụ a chọrọ n’onwe ha n’ihi na ịmụ mmadụ ọzọ dị n’aka Chineke.

      Olee ihe gbanwere ọnọdụ nwa okorobịa ahụ? Ọ bụ ihe ahụ iwu kwadoro e mere, nke bụ́ ime ka ọ ghọọ nwa nwoke ahụ. Ma, ihe ahụ e mere emeghị ka nwa okorobịa ahụ ghara ịbụkwa onye ọ bụ. Mgbe ọ ghọchara nwa nwoke ahụ, ọ ka bụ otu onye ahụ ọ bụ. N’agbanyeghị ya, mgbe e mezuru ihe niile iwu chọrọ ka e mee iji mee ka ọ ghọọ nwa nwoke ahụ, ọnọdụ ya gbanwere. N’ezie, e nwere ike ịsị na ọ malitela ndụ ọhụrụ, dị ka à ga-asị na a mụrụ ya ọzọ. Ọ ghọrọ nwa nwoke ahụ, bụ́ nke mere o ji ruo eruo ịga ụlọ akwụkwọ ahụ na isonye n’ezinụlọ nna ọhụrụ ya.

      N’otu aka ahụ, Jehova gbanwere ọnọdụ ìgwè ụmụ mmadụ na-ezughị okè site n’ime ihe iwu kwadoro iji mee ka ha bụrụ ụmụ ya. Pọl onyeozi, bụ́ onye so n’ìgwè ahụ, degaara ndị kwere ekwe ibe ya akwụkwọ ozi, sị: “Unu natara mmụọ nke ịbụ ndị e doro dị ka ụmụ, bụ́ mmụọ nke anyị sitere na ya na-eti mkpu, sị: ‘Aba, Nna!’ Mmụọ nsọ n’onwe ya so mmụọ anyị na-agba àmà na anyị bụ ụmụ Chineke.” (Ndị Rom 8:15, 16) N’ezie, e sitere n’ido Ndị Kraịst ahụ dị ka ụmụ mee ka ha ghọọ ndị ezinụlọ Chineke, ma ọ bụ “ụmụ Chineke.”—1 Jọn 3:1; 2 Ndị Kọrịnt 6:18.

      Odido ahụ Chineke doro ha ịbụ ụmụ ya emeghị ka ha ghara ịbụkwa ndị ha bụ, n’ihi na ha ka bụ ndị na-ezughị okè. (1 Jọn 1:8) Ma, dị ka Pọl kwukwara, mgbe e mezuru ihe iwu chọrọ ka e mee iji doo ha dị ka ụmụ, ọnọdụ ha gbanwere. Mmụọ Chineke mekwara ka o doo ndị ahụ ghọrọ ụmụ Chineke anya na ha na Kraịst ga-ebi n’eluigwe. (1 Jọn 3:2) Ihe a mmụọ nsọ mere ka o doo ha anya nke ọma mere ka ndụ ha gbanwee. (2 Ndị Kọrịnt 1:21, 22) N’ezie, ha malitere ndụ ọhụrụ, ya bụ, e kwuo ya n’ụzọ ọzọ, a mụrụ ha ọzọ.

      Baịbụl kwuru banyere ndị ahụ Chineke doro dị ka ụmụ ya, sị: “Ha ga-abụ ndị nchụàjà nke Chineke na nke Kraịst, ha ga-esokwa ya chịa dị ka ndị eze ruo otu puku afọ.” (Mkpughe 20:6) Ndị ahụ Chineke doro dị ka ụmụ ya na Kraịst ga-aghọ ndị eze n’Alaeze Chineke, ma ọ bụ n’Alaeze eluigwe. Pita onyeozi gwara ndị kwere ekwe ibe ya na ha ga-enweta “ihe nketa a na-apụghị ibibi ebibi, nke a na-emerụghị emerụ, nke na-adịghịkwa emebi emebi” bụ́ nke ‘e debeere ha n’eluigwe.’ (1 Pita 1:3, 4) N’ezie, ọ bụ ihe nketa magburu onwe ya!

      Ma, e nwere ajụjụ ọzọ e kwesịrị ịza banyere ọchịchị ahụ. Ọ bụrụ na ndị ahụ a mụrụ ọzọ ga-aghọ ndị eze n’eluigwe, oleekwanụ ndị ha ga-achị? A ga-eleba anya n’ajụjụ a n’isiokwu na-esonụ.

      [Foto dị na peeji nke 10]

      Gịnị ka Pọl kwuru banyere ime ka ndị mmadụ ghọọ ụmụ Chineke?

  • Ụfọdụ Ga-aghọ Ndị Ọchịchị, Ọtụtụ Ndị Erite Uru
    Ụlọ Nche—2009 | Eprel 1
    • Ụfọdụ Ga-aghọ Ndị Ọchịchị, Ọtụtụ Ndị Erite Uru

      KEMGBE oge ndịozi Jizọs, Chineke si n’etiti ụmụ mmadụ na-ahọrọ Ndị Kraịst ole na ole kwesịrị ntụkwasị obi, na-eme ka ha bụrụ ụmụ ya. Mgbanwe ndị ahụ e doro ịbụ ụmụ Chineke na-enwe ná ndụ ha zuru nnọọ ezu nke na Okwu Chineke kwuru na a mụrụ ha ọzọ. Ihe mere e ji mụọ ndị ohu Chineke ahụ ọzọ bụ ka ha nwee ike ịghọ ndị ọchịchị n’eluigwe. (2 Timoti 2:12) Iji mee ka ha ghọọ ndị ọchịchị, a na-akpọlite ha n’ọnwụ, ha adịrị ndụ n’eluigwe. (Ndị Rom 6:3-5) Ha na Kraịst ga-anọ n’eluigwe ‘chịa ụwa dị ka ndị eze.’—Mkpughe 5:10; 11:15.

      Ma, Okwu Chineke kwukwara na ndị ọzọ, ma e wezụga ndị ahụ a mụrụ ọzọ, ga-enweta nzọpụta ebighị ebi. Na Baịbụl (n’Akwụkwọ Nsọ Hibru nakwa n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst), e kwuru na Chineke zubere ịzọpụta ìgwè ụmụ mmadụ abụọ. Otu bụ obere ìgwè mmadụ ndị ga-achị achị n’eluigwe, nke ọzọ abụrụ oké ìgwè mmadụ ndị ga-adị ndụ n’ụwa. Dị ka ihe atụ, lee ihe Jọn onyeozi degaara ndị kwere ekwe ibe ya a mụrụla ọzọ. O kwuru banyere Jizọs, sị: “Ọ bụ àjà ime udo maka mmehie anyị, ma ọ bụghị naanị maka mmehie anyị [ya bụ, obere ìgwè mmadụ ahụ], kama, ọ bụkwa maka mmehie nke ụwa dum [ya bụ, oké ìgwè mmadụ ahụ].”—1 Jọn 2:2.

      Pọl onyeozi dekwara, sị: “Ịtụsi anya ike nke ihe e kere eke [ya bụ, oké ìgwè mmadụ ahụ] na-echere mkpughe nke ụmụ Chineke [ya bụ, obere ìgwè mmadụ ahụ].” (Ndị Rom 8:19-21) Olee otú anyị kwesịrị isi ghọta ihe ndị a Jọn onyeozi na Pọl onyeozi kwuru? Lee otú anyị kwesịrị isi ghọta ha: Ndị ahụ a mụrụ ọzọ ga-eso ná ndị ga-achị n’eluigwe. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ iji mee ka ọtụtụ nde mmadụ ga-ebi n’ụwa, bụ́ ndị ọchịchị Chineke ga-achị, rite uru ga-adịru ebighị ebi. Ọ bụ ya mere Jizọs ji kụziere ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.”—Matiu 6:10.

      Akwụkwọ Nsọ Hibru kwukwara na a ga-azọpụta ìgwè ụmụ mmadụ abụọ. Dị ka ihe atụ, lee ihe Jehova gwara Ebreham, nna nna Jizọs. Ọ sịrị ya: “Ọ bụkwa site ná mkpụrụ gị [ya bụ, obere ìgwè mmadụ ahụ] ka mba niile nke ụwa [ya bụ, oké ìgwè mmadụ ahụ] ga-agọzi onwe ha n’ihi na i gewo ntị n’olu m.” (Jenesis 22:18) N’ezie, a ga-agọzi mba niile site ná “mkpụrụ” Ebreham.

      Ònye bụ “mkpụrụ” ahụ? Ọ bụ Jizọs Kraịst nakwa ndị ahụ a mụrụ ọzọ, ndị Chineke doro ịbụ ụmụ ya, ga-esonyere ya. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ọ bụrụkwa na unu bụ ndị nke Kraịst, unu bụ n’ezie mkpụrụ Ebreham.” (Ndị Galeshia 3:16, 29) Oleekwanụ ngọzi ndị nke mba niile ga-enweta site ná “mkpụrụ” ahụ? Ọ bụ ohere magburu onwe ya nke ịbụ ndị e mere ka ha na Chineke dịrị ná mma na ịdị ndụ ebighị ebi na paradaịs n’ụwa. Ọbụ abụ bụ́ Devid buru amụma, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:29; Aịzaya 45:18; Mkpughe 21:1-5.

      N’eziokwu, ọ bụ mmadụ ole na ole nwere ohere ịchị n’eluigwe, ma, uru ọchịchị eluigwe ahụ ga-eweta, nke bụ́ ndụ ebighị ebi n’elu ụwa na ngọzi niile ga-eso ya, ga-eru ọtụtụ ndị aka. Ka gị na ezinụlọ gị soro ná ndị ga-erite uru ebighị ebi ahụ Alaeze Chineke ga-eweta.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya