Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • “Chebe Obi Gị!”
    Ụlọ Nche—2012 | Mee 1
    • “Chebe Obi Gị!”

      Mgbakọ Distrikti Nke Ndịàmà Jehova

      Isiokwu Ụbọchị Fraịdee

      “Jehova Na-ahụ Ihe Dị n’Obi”—1 SAMUEL 16:7.

      Isiokwu Ụbọchị Satọdee

      “Ọ Bụ Ihe Jupụtara Mmadụ n’Obi Ka Ọnụ Ya Na-ekwu”—MATIU 12:34.

      Isiokwu Ụbọchị Sọnde

      ‘Jiri Obi Gị Dum Jeere Jehova Ozi.’—1 IHE E MERE 28:9.

      Baịbụl kpọrọ okwu bụ́ obi aha ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu puku ugboro. Ọtụtụ mgbe Baịbụl kwuru banyere obi, ihe ọ na-ekwu abụghị obi nkịtị, kama ọ bụ obi ihe atụ. Gịnị bụ obi ihe atụ? Ọ bụ ụdị onye mmadụ bụ, ya bụ, ihe mmadụ na-eche n’echiche, otú obi dị ya na ihe na-agụ ya agụụ.

      Gịnị mere anyị kwesịrị iji chebe obi ihe atụ anyị? Chineke mere ka Eze Sọlọmọn dee, sị: “Karịa ihe niile ọzọ a ga-eche nche, chebe obi gị, n’ihi na ọ bụ na ya ka isi iyi nke ndụ si apụta.” (Ilu 4:23) Ọ bụ otú obi ihe atụ anyị dị na-ekpebi ụdị ndụ anyị na-ebi ugbu a nakwa ma ànyị ga-adị ndụ n’ọdịnihu. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ maka na Chineke na-ahụ ihe dị anyị n’obi. (1 Samuel 16:7) Ihe ga-egosi ma Chineke ọ̀ na-ele anyị anya ọma bụ ụdị mmadụ anyị bụ, ya bụ, “mmadụ zoro ezo nke dị n’ime obi.”—1 Pita 3:4.

      Olee otú anyị nwere ike isi chebe obi anyị? A ga-aza ajụjụ a nke ọma ná mgbakọ distrikti Ndịàmà Jehova ga-enwe n’ụwa niile malite n’ọnwa Mee. Isiokwu mgbakọ ahụ bụ “Chebe Obi Gị!” Ọ ga-amalite n’ọnwa Septemba na Naịjirịa. Anyị ji obi ụtọ na-akpọ gị ka ị bịazuo ụbọchị atọ nke mgbakọ a.a Ihe ị ga-amụta ga-eme ka ị na-ebi ndụ otú ga-eme ka obi Jehova Chineke ṅụrịa.—Ilu 27:11.

  • Ọ̀ Ga-amasị Gị Ka Mmadụ Bịa na Nke Gị?
    Ụlọ Nche—2012 | Mee 1
    • Ọ̀ Ga-amasị Gị Ka Mmadụ Bịa na Nke Gị?

      Ọbụna n’ụwa a jupụtara ná nsogbu, inweta ezi ihe ọmụma si na Baịbụl banyere Chineke, Alaeze ya, na ihe ndị magburu onwe ya o zubere maka ụmụ mmadụ nwere ike ime ka i nwee obi ụtọ. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmụtakwu banyere Chineke ma ọ bụ nwee mmasị ka mmadụ bịa na nke gị kụziere gị Baịbụl n’efu, ihe i nwere ike ime bụ izitere Ndịàmà Jehova ozi n’adres Ịntanet ha bụ́ www.watchtower.org.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya