Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • O Gburu Nwanne Ya n’Ihi Iwe
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ebe iwe na-ewe Ken mgbe nwanne ya Ebel na-achụrụ Jehova àjà

      ISI NKE 4

      O Gburu Nwanne Ya n’Ihi Iwe

      Adam na Iv mụrụ ọtụtụ ụmụ mgbe ha si n’ogige Iden pụta. Nwa mbụ ha bụ́ Ken bụ onye ọrụ ugbo. Nwa ha nke abụọ bụ́ Ebel na-azụ atụrụ.

      Otu ụbọchị, Ken na Ebel chụụrụ Jehova àjà. Ị̀ ma ihe àjà bụ? Ọ bụ onyinye pụrụ iche a na-enye Jehova. Jehova nabatara àjà Ebel, ma ọ nabataghị nke Ken. Ihe a mere ka Ken wee ezigbo iwe. Jehova gwara Ken na iwe ọ na-ewe nwere ike ime ka o mee ihe ọjọọ. Ma, Ken egeghị Jehova ntị.

      Kama, ọ gwara Ebel, sị: “Ka anyị gaa n’ọhịa.” Mgbe ha nọ naanị ha n’ọhịa, Ken kụgburu ya. Gịnị ka Jehova mere Ken? Ọ tara Ken ahụhụ. Ahụhụ ọ tara ya bụ na ọ chụpụrụ ya n’ụlọ ha, chụga ya ebe dị anya. E kweghị ka Ken laghachi n’ụlọ ha ọzọ.

      Ebe iwe na-ewe Ken mgbe nwanne ya Ebel na-achụrụ Jehova àjà

      Gịnị ka anyị ga-amụta n’akụkọ a? Iwe nwere ike wewe anyị ma ihe anaghị aga otú anyị si chọọ. Ọ bụrụ na anyị wewe iwe, ma ọ bụ na ndị ọzọ achọpụta na anyị na-ewe iwe ma gwa anyị kwụsị ya, anyị kwesịrị ịkwụsị ya ozugbo tupu iwe ahụ emee ka anyị mee ihe ọjọọ.

      Jehova na-echeta Ebel n’ihi na o mere ihe dị mma, hụkwa ya n’anya. Chineke ga-akpọlite ya n’ọnwụ mgbe ọ ga-eme ka ụwa a bụrụ paradaịs.

      “Buru ụzọ gaa ka gị na nwanne gị kpezie, gaghachizie, nye onyinye gị.”​—Matiu 5:24

      Ajụjụ: Ole ndị bụ ụmụ abụọ mbụ Adam na Iv mụrụ? Gịnị mere Ken ji gbuo nwanne ya?

      Jenesis 4:1-12; Ndị Hibru 11:4; 1 Jọn 3:11, 12

  • Ụgbọ Noa
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ebe Noa na ndị ezinụlọ ya na-arụ ụgbọ

      ISI NKE 5

      Ụgbọ Noa

      Ka oge na-aga, a bịara nwee ọtụtụ mmadụ n’ụwa. Ọtụtụ n’ime ha na-eme ihe ọjọọ. Ụfọdụ ndị mmụọ ozi bi n’eluigwe bidodịrị ime ihe ọjọọ. Ha hapụrụ eluigwe bịa biri n’ụwa. Ị̀ ma ihe mere ha ji bịa biri n’ụwa? Ọ bụ ka ha nwee ike ịghọ mmadụ ma lụrụ ụmụ nwaanyị.

      Ndị mmụọ ozi ahụ na ụmụ nwaanyị ahụ mụtara ụmụ. Ụmụ ha toro, sie ezigbo ike ma na-etigbu ndị mmadụ. Ha na-emesi ndị mmadụ ike. Jehova ekweghị ka ha mere ihe ọjọọ ndị ahụ na-aga. N’ihi ya, o kwuru na ya ga-eji iju mmiri bibie ndị na-eme ihe ọjọọ.

      Ebe Noa na ndị ezinụlọ ya na-arụ ụgbọ

      Ma, o nwere otu nwoke dị iche. Ọ hụrụ Jehova n’anya. Aha ya bụ Noa. Ya na nwunye ya mụrụ ụmụ atọ. Aha ha bụ Shem, Ham, na Jefet. Ha atọ lụkwara ụmụ nwaanyị. Jehova gwara Noa ka ọ rụọ nnukwu ụgbọ. Ụgbọ a bụ nnukwu igbe nwere ike ise n’elu mmiri. Noa na ezinụlọ ya ga-anọ n’ime ya ka mmiri ahụ ghara igbu ha. Jehova gwakwara Noa ka ọ chịbata ọtụtụ ụmụ anụmanụ n’ime ụgbọ ahụ ka ha ghara ịnwụ.

      Noa malitere ịrụ ụgbọ ahụ ozugbo. Ịrụcha ya were ya na ezinụlọ ya ihe dị ka afọ iri ise. Ha rụrụ ya otú Jehova gwara ha rụọ ya. N’oge Noa na-arụ ụgbọ ahụ, ọ nọ na-agwa ndị mmadụ na Jehova ga-eji iju mmiri bibie ụwa. Ma o nweghị onye gere ya ntị.

      N’ikpeazụ, oge ruru ka ha banye n’ụgbọ ahụ. Ka anyị hụzie ihe merenụ n’isi nke 6.

      “Otú ihe dị n’oge Noa ka ọ ga-adị n’ọnụnọ Nwa nke mmadụ.”​—Matiu 24:37

      Ajụjụ: Gịnị mere Jehova ji kwuo na ya ga-eji iju mmiri bibie ụwa? Gịnị ka Jehova gwara Noa ka o mee?

      Jenesis 6:1-22; Matiu 24:37-41; 2 Pita 2:5; Jud 6

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya