-
Ebreham na Sera Rubeere Chineke IsiIhe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
-
-
ISI NKE 8
Ebreham na Sera Rubeere Chineke Isi
E nwere otu obodo a na-akpọ Ọọ. Ọ dị nso na Babel. Ndị bi n’obodo Ọọ anaghị efe Jehova, kama ha nwere ọtụtụ chi ha na-efe. Ma, e nwere otu nwoke bi n’obodo Ọọ nke na-efe Jehova. Aha ya bụ Ebreham.
Otu ụbọchị, Jehova gwara Ebreham, sị: ‘Kwapụ n’obodo gị, hapụkwa ndị ikwu gị, kwaga n’obodo m ga-egosi gị.’ Chineke kwekwara ya nkwa, sị: ‘M ga-eme ka ị bụrụ nnukwu mba, m ga-emere ọtụtụ mmadụ n’ụwa niile ihe ọma n’ihi gị.’
Ebreham amaghị ebe Jehova sịrị ya gaa, ma ọ tụkwasịrị Jehova obi. N’ihi ya, Ebreham na nwunye ya Sera, nna ya Tira, na Lọt, nwa nwanne ya mere ihe Jehova kwuru. Ha buuru ihe ha malite ogologo njem ahụ.
Ebreham dị afọ iri asaa na ise mgbe ya na ndị ezinụlọ ya kwagara n’obodo ahụ Jehova chọrọ ka ha gaa. Aha obodo ahụ bụ Kenan. Ọ bụ n’obodo a ka Chineke kwere Ebreham nkwa, sị: ‘M ga-enye ụmụ gị ala a niile ị na-ahụ.’ Ma, Ebreham na Sera emeela agadi, ha amụtaghịkwa nwa ọ bụla. N’ihi ya, oleekwanụ otú Jehova ga-esi mezuo nkwa a?
“Ọ bụ okwukwe mere Ebreham ji rube isi . . . wee gaa n’ebe Chineke kwere nkwa na ọ ga-enye ya. Ọ gawara, n’agbanyeghị na ọ maghị ebe ọ na-aga.” —Ndị Hibru 11:8
-
-
Ebreham na Sera Mechara Mụta NwaIhe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
-
-
ISI NKE 9
Ebreham na Sera Mechara Mụta Nwa
Ebreham na Sera alụọla ọtụtụ afọ. Ha hapụrụ ọmarịcha ụlọ ha n’obodo Ọọ, gaa biri n’ụlọikwuu. Ma, Sera emeghị mkpesa ọ bụla maka na ha kwapụrụ n’ihi na ọ tụkwasịrị Jehova obi.
Ma, Sera chọsiri nwa ike nke na ọ gwara Ebreham, sị: ‘Ọ bụrụ na Hega, onye na-ejere m ozi amụta nwa, m ga-ewere ya ka nwa m.’ Ka oge na-aga, Hega mụtara nwa nwoke. Aha ya bụ Ishmel.
Mgbe ọtụtụ afọ gachara, n’oge Ebreham dị afọ iri itoolu na itoolu, nwunye ya Sera adịrịkwa afọ iri asatọ na itoolu, ndị ọbịa atọ bịara na nke ha. Ebreham gwara ha ka ha bịa zurutụ ike n’okpuru osisi ma soro ha rie nri. Ị̀ ma ndị ndị ọbịa ahụ bụ? Ha bụ ndị mmụọ ozi. Ha gwara Ebreham, sị: ‘N’ụdị oge a n’afọ ọzọ, gị na nwunye gị Sera ga-amụ nwa nwoke.’ Ma, Sera nọ n’ime ụlọikwuu na-ege ihe ha na-ekwu. Ọ chịrị ọchị n’obi ya, sị: ‘M̀ ga-amụli nwa ebe ọ bụ na mụ emeela agadi?’
Mgbe ọ na-erula otu afọ, Sera mụrụ nwa nwoke otú mmụọ ozi Jehova kwuru. Ebreham gụrụ ya Aịzik, nke pụtara “Ọchị.”
Mgbe Aịzik dị ihe dị ka afọ ise, Sera hụrụ ka Ishmel ji Aịzik na-eme ihe ọchị. Ọ chọrọ ichebe nwa ya nwoke. N’ihi ya, ọ gara gwa Ebreham ka ọ chụpụ Hega na nwa ya Ishmel. Ná mmalite, Ebreham achọghị ime ihe a nwunye ya gwara ya. Ma Jehova gwara Ebreham, sị: ‘Gee Sera ntị. M ga-elekọta Ishmel. Ma, m ga-esi n’aka Aịzik mezuo nkwa ahụ m kwere gị.’
“Ọ bụkwa okwukwe mere ka Sera nwee ike ịdị ime . . . n’ihi na o kwetara na e kwesịrị ịtụkwasị Onye kwere nkwa ahụ obi.” —Ndị Hibru 11:11
-