-
Jekọb Ketara Ihe A Na-ekenye ỌkparaIhe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
-
-
ISI NKE 12
Jekọb Ketara Ihe A Na-ekenye Ọkpara
Aịzik dị afọ iri anọ mgbe ọ lụrụ Ribeka. Ọ hụrụ ya n’anya nke ukwuu. Ha mechara mụta ụmụ nwoke abụọ bụ́ ejima.
Aha nke mbụ bụ Ịsọ. Aha nke abụọ abụrụ Jekọb. Ịsọ na-agakarị n’ọhịa. Ọ makwa otú e si achụ nta. Ma, Jekọb na-anọkarị n’ụlọ.
N’oge ahụ, a na-ekenye ọkpara ala na ego buru ibu karịa ụmụnne ya ma nna ya nwụọ. A na-akpọ ya ihe a na-ekenye ọkpara. Ma, a bịa n’ezinụlọ Aịzik, nkwa ndị Jehova kwere Ebreham so n’ihe ọkpara Aịzik kwesịrị inweta. Ịsọ ejighị nkwa ndị ahụ kpọrọ ihe, ma Jekọb ji ha kpọrọ ihe.
Otu ụbọchị, Ịsọ si ịchụ nta lọta, ezigbo ike gwụkwara ya. Ọ nụrụ ísì ọmarịcha nri Jekọb nọ na-esi. Ọ sịrị ya: ‘Agụụ agụgbuola m. Kunyetụ m ofe ahụ na-acha ọbara ọbara.’ Jekọb sịrị ya: ‘M ga-ekunye gị ya, ma buru ụzọ nyefee m ihe i kwesịrị inweta dị ka ọkpara.’ Ịsọ zara ya, sị: ‘Olee uru ọ baara m? Werenụ ya, achọrọ m iri nri.’ Ì chere na ihe a Ịsọ mere bụ ihe o kwesịrị ime? Mba. Ịsọ tụfuru ihe dị ezigbo mkpa n’ihi otu efere ofe.
Mgbe Aịzik merela ezigbo agadi, ọ gwara ọkpara ya ka ọ bịa ka ya gọzie ya. Ma, Ribeka nyeere Jekọb, bụ́ nwa ya nke obere aka, Aịzik agọzie ya. Mgbe Ịsọ matara ihe merenụ, ezigbo iwe were ya. Ọ chọwara otú ọ ga-esi egbu nwanne ya. Aịzik na Ribeka achọghị ka Ịsọ gbuo Jekọb. Ọ bụ ya mere ha ji gwa Jekọb, sị: ‘Gakwuru nwanne nne gị Leban ka gị na ya biri ruo mgbe iwe nwanne gị dajụrụ.’ Jekọb mere ihe a nne na nna ya gwara ya.
“Olee uru ọ ga-abara mmadụ ma o nwetachaa ụwa niile ma tụfuo ndụ ya? Ma ọ bụ, gịnị ka mmadụ ga-eji gbanwere ndụ ya?”—Mak 8:36, 37
-
-
Jekọb na Ịsọ KpeziriIhe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
-
-
ISI NKE 13
Jekọb na Ịsọ Kpeziri
Jehova kwere Jekọb nkwa na ọ ga-echebe ya otú o chebere Ebreham na Aịzik. Jekọb gara biri n’ebe a na-akpọ Heran. Ọ nọ ebe ahụ lụọ nwaanyị, mụta ọtụtụ ụmụ ma baa ọgaranya.
Jehova mechara gwa Jekọb, sị: “Laghachi n’ala nna gị.” N’ihi ya, Jekọb na ezinụlọ ya malitere ogologo njem iji laghachi. Ka ha na-aga, ụfọdụ ndị bịara gwa Jekọb, sị: ‘Nwanne gị Ịsọ na-abịa, ya na narị ụmụ nwoke anọ (400).’ Ụjọ tụrụ Jekọb na Ịsọ chọrọ igbu ya na ndị ezinụlọ ya. N’ihi ya, ọ rịọrọ Jehova, sị: ‘Biko, napụta m n’aka nwanne m nwoke.’ N’echi ya, Jekọb zigaara Ịsọ onyinye. O nyere ya ọtụtụ atụrụ, ewu, ehi, kamel, na jakị.
Mgbe Jekọb nọ naanị ya n’abalị ụbọchị ahụ, ọ hụrụ otu mmụọ ozi. Ya na Jekọb malitere ịgba mgba. Ha gbagidere mgba chi abọọ. Ọ bụ eziokwu na mmụọ ozi ahụ merụrụ Jekọb ahụ́, Jekọb ahapụghị ya. Mmụọ ozi ahụ gwara ya, sị: “Hapụ m ka m laa.” Ma Jekọb sịrị ya: ‘Agaghị m ahapụ gị ruo mgbe ị gọziri m.’
Mmụọ ozi ahụ mechara gọzie Jekọb. Ihe a mere ka Jekọb mata na Jehova agaghị ekwe ka Ịsọ gbuo ya.
Mgbe chi bọchara, Jekọb nọ n’ebe dị anya hụ Ịsọ na narị ụmụ nwoke anọ (400) ka ha na-abịa. Jekọb gafere ndị ezinụlọ ya ma kpọọrọ nwanne ya isiala ugboro asaa. Ịsọ gbaara ọsọ gakwuru Jekọb ma makụọ ya. Ha abụọ malitere ibe ákwá ma kpezie. Olee otú i chere obi dị Jehova maka otú Jekọb si mee ka ya na nwanne ya kpezie?
Ịsọ mechara laghachi n’ụlọ ya, Jekọb alawara onwe ya. Jekọb mụrụ ụmụ nwoke iri na abụọ. Aha ha bụ Ruben, Simiọn, Livaị, Juda, Dan, Naftalaị, Gad, Asha, Ịsaka, Zebulọn, Josef, na Benjamin. Jehova si n’aka Josef, bụ́ otu n’ime ụmụ Jekọb, zọpụta ndị na-efe ya. Ị̀ ma otú o si mee ya? Ka anyi chọpụta n’isi nke 14.
“Unu akwụsịla ịhụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwanụ ekpere maka ndị na-akpagbu unu, ka unu wee bụrụ ụmụ nke Nna unu nọ n’eluigwe.”—Matiu 5:44, 45
-