Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Otu Ohu nke Rubeere Chineke Isi
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ebe Josef na-agba ọsọ ka nwunye Pọtịfa ghara ijide ya

      ISI NKE 14

      Otu Ohu Nke Rubeere Chineke Isi

      Josef bụ otu n’ime ụmụ ikpeazụ Jekọb mụrụ. Ụmụnne ya ndị tọrọ ya hụrụ na nna ha hụrụ ya n’anya karịa ha. Olee otú i chere obi dị ha maka ihe a? Ha nweere Josef anyaụfụ, kpọọkwa ya asị. Josef rọrọ ụfọdụ nrọ pụrụ iche ma kọọrọ ya ụmụnne ya. Ha ghọtara na nrọ ndị ahụ pụtara na otu ụbọchị, ha ga-akpọrọ Josef isiala. Ihe a mere ka ha kpọkwuo ya asị.

      Mgbe ụmụnne Josef chọrọ ịtụba ya n’olulu

      Otu ụbọchị, ụmụnne Josef nọ na-azụ atụrụ n’ebe dị nso na Shikem. Jekọb zigara Josef ka ọ gaa mata ma ahụ́ ọ̀ dịkwa ha. Mgbe ha hụrụ ya n’ebe dị anya ka ọ na-abịa, ha gwara ibe ha, sị: “Lee, ọrọ nrọ abịawala. Bịanụ ka anyị gbuo ya.” Ha jidere ya ma tụba ya n’otu olulu miri emi. Ma otu n’ime ụmụnne ya aha ya bụ Juda sịrị: ‘Ka anyị ghara igbu ya. Kama, ka anyị ree ya ka ọ gaa gbawa ohu.’ N’ihi ya, ha resịrị ya ndị ahịa si Midian na-aga Ijipt. Ha rere ya mkpụrụ ego ọlaọcha iri abụọ.

      Ụmụnne Josef chịịrị uwe ya, bịanye ya n’ọbara ewu ma chịgara ya nna ha. Ha gwara nna ha, sị: ‘Ihe a ọ́ bụghị uwe nwa gị?’ N’ihi ya, Jekọb chere na anụ ọhịa adọgbuola Josef. Obi gbawara ya. E nweghị onye na-akasili ya obi.

      Ebe Josef nọ n’ụlọ mkpọrọ

      Mgbe Josef na ndị ahụ zụụrụ ya ruru Ijipt, otu onye a ma ama aha ya bụ Pọtịfa zụụrụ ya ka ọ gbawara ya ohu. Ma Jehova nọnyeere Josef. Pọtịfa chọpụtara na Josef na-arụsi ọrụ ike nakwa na ọ bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi. Obere oge, Pọtịfa mere ya onye na-elekọta ihe niile o nwere.

      Nwunye Pọtịfa hụrụ na Josef mara mma ma gbasie ike. Kwa ụbọchị, ọ na-agwa Josef ka ya na ya kwaa iko. Olee ihe Josef ga-eme? O kweghị eme ihe a o kwuru. Josef gwara ya, sị: ‘Mba. Ọ bụ ihe ọjọọ. Nna m ukwu tụkwasịrị m obi, ị bụkwa nwunye ya. Ọ bụrụ na mụ na gị akwaa iko, m ga-emehie Chineke.’

      Otu ụbọchị, nwunye Pọtịfa chọrọ ịmanye Josef ka ya na ya kwaa iko. O jidere Josef n’uwe. Ma, ọ hapụụrụ ya uwe ya gbaa ọsọ. Mgbe Pọtịfa lọtara, nwunye ya gwara ya na Josef chọrọ idina ya n’ike. Ihe a ọ gwara ya abụghị eziokwu. Ihe a mere ka ezigbo iwe wee Pọtịfa, ya atụba Josef n’ụlọ mkpọrọ. Ma, Jehova echefughị Josef.

      “N’ihi ya, wedanụ onwe unu ala otú Chineke, onye dị ike, chọrọ, ka o bulie unu elu mgbe oge ruru.”​—1 Pita 5:6

      Ajụjụ: Olee ihe ụmụnne Josef mere ya? Gịnị mere e ji tụọ Josef mkpọrọ?

      Jenesis 37:1-36, 39:1-23; Ọrụ Ndịozi 7:9

  • Jehova Echefughị Josef
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ebe Josef na-akọwara Fero nrọ ya

      ISI NKE 15

      Jehova Echefughị Josef

      Mgbe Josef nọ n’ụlọ mkpọrọ, Fero, eze Ijipt, rọrọ nrọ mmadụ ọ bụla na-enweghị ike ịkọwa. Otu n’ime ndị na-ejere ya ozi gwara ya na Josef nwere ike ịkọwara ya nrọ ya. Fero ziri ozi ozugbo ka a kpọọ Josef.

      Mgbe Josef ruru, Fero jụrụ ya, sị: ‘Ì nwere ike ịkọwa nrọ m rọrọ?’ Ọ gwara Fero, sị: ‘A ga-enwe afọ asaa nri ga-eju ebe niile n’Ijipt. Afọ asaa ahụ gachaa, a ga-enwe ụkọ nri afọ asaa ọzọ. Họrọ onye ma ihe ka o chekwaa nri ka agụụ ghara igbu ndị gị n’oge ahụ a ga-enwe ụkọ nri.’ Fero gwara ya, sị: ‘Ahọrọla m gị. Ị ga-abụ osote m.’ Olee otú Josef si mara ihe nrọ Fero pụtara? Ọ bụ Jehova mere ka ọ mara ya.

      Ebe Josef na-agwa ndị Ijipt ebe ha ga-echekwa nri

      Josef ji afọ asaa nri juru ebe niile chekwaa nri. Mgbe afọ asaa ahụ gachara, e nwere ụkọ nri n’ụwa niile otú Josef kwuru. Ndị mmadụ si ebe niile bịa ka Josef resị ha nri. Mgbe nna ya Jekọb nụrụ na e nwere nri n’Ijipt, o ziri mmadụ iri n’ime ụmụ ya ka ha gaa ebe ahụ zụta nri.

      Ụmụ Jekọb bịakwutere Josef ka o resị ha nri. Ozugbo ọ hụrụ ha, ọ matara ha. Ma ha amataghị ya. Ha kpọọrọ ya isiala otú ha mere ná nrọ ọ rọrọ mgbe ọ ka bụ nwata. Josef chọrọ ịma ma ụmụnne ya hà agbanweela àgwà ọjọọ ha. N’ihi ya, ọ gwara ha, sị: ‘Unu bụ ndị nnyopụta. Unu chọrọ ịmata ebe unu nwere ike isi bata lụso anyị agha.’ Ha sịrị ya, ‘Mba. Anyị si n’obodo Kenan. Anyị dị ụmụnne iri na abụọ. Otu anwụọla, nke ọdụdụ na nna anyị nọ.’ Josef gwaziri ha, sị: ‘Kpọtaranụ m nwanne unu nke ọdụdụ, m ga-ekweta ihe unu kwuru.’ Ha lawaziri ka ha gaa hụ nna ha.

      Mgbe ezinụlọ Jekọb richara nri ha nwere, Jekọb zigara ụmụ ya Ijipt ọzọ. Na nke ugbu a, ha na Benjamin, nwanne ha nke ọdụdụ, so. Josef lere ụmụnne ya ule. Otú o si mee ya bụ na o tinyere iko ọlaọcha ya n’akpa Benjamin ma kwuo na ụmụnne ya zuuru ya. Mgbe ndị na-ejere Josef ozi hụrụ iko ahụ n’akpa Benjamin, o juru ụmụnne ya anya. Ha rịọrọ Josef ka ọ taa hanwa ahụhụ kama ịta ya Benjamin.

      Ugbu a, o doola Josef anya na ụmụnne ya agbanweela. O nweghịzi ike ijide onwe ya, ya ebewe ákwá ma kwuo, sị: ‘Abụ m Josef nwanne unu. Nna m, ọ̀ ka nọ ndụ?’ Ihe a juru ụmụnne ya ezigbo anya. Ọ gwara ha, sị: ‘Obi ajọla unu njọ maka ihe unu mere m. Ọ bụ Chineke zitere m n’ebe a ka unu wee dị ndụ. Gaanụ ozugbo kpọta nna m n’ebe a.’

      Ha lawara ka ha gaa kọọrọ nna ha ihe ọma merenụ nakwa ka ha kpọta ya n’Ijipt. Otú a ka Josef na nna ya si mechaa nọkọta ọnụ ọzọ mgbe ọtụtụ afọ gafere.

      Ebe Josef na nna ya na-ekele

      “Ọ bụrụ na unu anaghị agbaghara ndị mehiere unu, Nna unu agaghịkwa na-agbaghara unu mmehie unu.”​—Matiu 6:15

      Ajụjụ: Olee otú Jehova si nyere Josef aka? Gịnị ka Josef mere iji gosi na ọ gbaghaara ụmụnne ya?

      Jenesis 40:1–45:28; 46:1-7, 26-34; Abụ Ọma 105:17-19; Ọrụ Ndịozi 7:9-15

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya