Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ònye Bụ Job?
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ụmụ nwoke atọ ndị bịara ịhụ Job mgbe etuto toro ya n’ahụ́ niile

      ISI NKE 16

      Ònye Bụ Job?

      E nwere otu nwoke na-efe Jehova n’obodo a na-akpọ Ọz. Aha ya bụ Job. Ọ bụ ezigbo ọgaranya, nweekwa ọtụtụ ụmụ. Ọ dị obiọma, ọ na-enyekwara ma ndị ogbenye ma ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ ma ụmụ na-enweghị nne na nna aka. Ma, ọ̀ pụtara na e nweghị mgbe nsogbu ga-abịara ya maka na ọ na-eme ihe dị mma?

      Setan bụ́ Ekwensu

      Job amaghị na Setan bụ́ Ekwensu nọ na-ele ya. Jehova gwara Setan, sị: ‘Ị̀ hụla ohu m Job? E nweghị onye dị ka ya n’ụwa. Ọ na-erubere m isi ma na-eme ihe dị mma.’ Setan gwara Jehova, sị: ‘Ama m na Job na-erubere gị isi. Ị na-echebe ya ma na-agọzi ya. I nyere ya ala na ọtụtụ anụmanụ. Ọ bụrụ na ị napụ ya ihe a niile, ọ ga-akwụsị ịna-efe gị.’ Jehova gwara Setan, sị: ‘I nwere ike ịnwa Job. Ma egbukwala ya.’ Gịnị mere Jehova ji kwe ka Setan nwaa Job? Ọ bụ maka na obi siri Jehova ike na Job ga-erubere ya isi.

      Setan malitere ịkpatara Job ọtụtụ nsogbu iji nwaa ya. Ihe mbụ o mere bụ iziga ndị Siba ka ha zuru ìgwè ehi na ìgwè jakị Job. O mekwara ka ọkụ regbuo atụrụ ya niile. Ndị Kaldia bịakwara zuru kamel niile Job nwere. E gbukwara ndị na-azụrụ ya anụmanụ ndị ahụ. Nke ka njọ meziri. Ụmụ Job niile nwụrụ mgbe ụlọ ha nọ na ya na-eri oriri dara. Ihe ndị a gbawara Job obi, ma ọ kwụsịghị ife Jehova.

      Setan chọrọ ka Job takwuo ahụhụ. N’ihi ya, o mere ka etuto too ya n’ahụ́ ya niile. Ihe a mere ka ahụ́ niile na-egbu Job ezigbo mgbu. Job amaghị ihe mere ihe ndị a ji na-eme ya. Ma, ọ ka nọ na-efe Jehova. Obi tọrọ Chineke ezigbo ụtọ mgbe ọ hụrụ na Job akwụsịghị ife ya.

      Ihe ọzọ Setan mere bụ na o zitere ụmụ nwoke atọ ka ha bịa nwaa Job. Ha gwara Job, sị: ‘Ọ ga-abụrịrị na i meela ihe ọjọọ ma chọọ izo ya. Ọ bụ Chineke na-ata gị ahụhụ.’ Job kwuru, sị: ‘E nweghị ihe ọjọọ ọ bụla m mere.’ Ma, Job malitere iche na ọ bụ Jehova na-akpatara ya nsogbu ndị ahụ. O kwuru na ihe Chineke na-eme ya adịghị mma.

      Otu nwa okorobịa aha ya bụ Elaịhu gbara nkịtị na-ege ihe ha na-ekwu. Mgbe ha kwuchara, ọ sịrị ha: ‘Ihe unu niile kwuru adịghị mma. Jehova dị ukwuu karịa otú anyị nwere ike ịmata. Ọ naghị eme ihe ọjọọ. Ọ na-ahụ ihe niile ma na-enyere ndị nwere nsogbu aka.’

      Ebe Job na nwunye ya na nwa ọhụrụ ha nọ

      Jehova gwaziri Job, sị: ‘Olee ebe ị nọ mgbe m kere eluigwe na ụwa? Gịnị mere i ji ekwu na m na-eme gị ihe ọjọọ? Ị na-ekwu okwu, ma ị maghị ihe mere ihe ụfọdụ ji na-eme.’ Job kwetara na ihe ndị o kwuru adịghị mma. Ọ sịrị: ‘Emehiela m. Anụla m banyere gị, ma ugbu a, amatala m gị nke ọma. O nweghị ihe nyịrị gị. Biko, gbaghara m maka ihe ndị m kwuru.’

      Mgbe Setan nwachara Job, Jehova mere ka Job gbakee, meekwa ka o nwee ihe karịa otú o nweburu. Job biri ogologo ndụ, obi tọkwara ya ụtọ. Jehova gọziri Job maka na o rubeere ya isi, ma mgbe nsogbu bịaara ya. Ị̀ ga-achọ ịna-efe Jehova ka Job n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ?

      “Unu anụla otú Job si tachie obi, hụkwa ihe Jehova mechara mee.”​—Jems 5:11

      Ajụjụ: Olee otú Setan si nwaa Job? Olee otú Jehova si gọzie Job?

      Job 1:1–3:26; 4:7; 32:1-5; 34:5, 21; 35:2; 36:15, 26; 38:1-7; 40:8; 42:1-17

  • Mosis Họọrọ Ife Jehova
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Mgbe ada Fero hụrụ Mosis, Miriam anọrọ ebe na-adịghị anya na-ele ha

      ISI NKE 17

      Mosis Họọrọ Ife Jehova

      N’Ijipt, a kpọwara ndị ezinụlọ Jekọb ụmụ Izrel. Mgbe Jekọb na Josef nwụrụ, Fero ọhụrụ malitere ịchị Ijipt. Ụjọ tụrụ ya na ndị Izrel adịwala ọtụtụ ma dị ike karịa ndị Ijipt. N’ihi ya, o mere ka ndị Izrel gbawara ya ohu. Ọ manyere ha ịkpụ brik na ịrụsi ọrụ ike n’ugbo. Ma, ka ha na-emesikwu ndị Izrel ike bụ ka ndị Izrel na-adịkwu ọtụtụ. Fero achọghị ka ndị Izrel dịrị ọtụtụ, ọ bụ ya mere o ji nye iwu ka e gbuo ụmụ nwoke niile ndị Izrel mụrụ ọhụrụ. Ihe a mere ka ezigbo ụjọ tụwa ndị Izrel.

      Otu nwaanyị onye Izrel aha ya bụ Jokebed mụrụ otu nwatakịrị nwoke mara mma. O nyiwere ya na nkata ma zoo ya n’ahịhịa amị ndị dị n’akụkụ Osimiri Naịl. Miriam, bụ́ nwanne nwatakịrị a, nọ ebe na-adịghị anya ka ọ mara ihe ga-eme ya.

      Mgbe ada Fero bịara ịsa ahụ́ n’osimiri ahụ, ọ hụrụ nkata ahụ. O mepere ya, hụ nwa ọhụrụ na-ebe ákwá n’ime ya, ya emetere ya ebere. Miriam jụrụ ya, sị: ‘Ọ̀ bụ m gaa kpọọrọ gị nwaanyị ga-azụrụ gị nwa a?’ Mgbe ada Fero sịrị ya gaa kpọọ ya, ọ gara kpọọ mama ya bụ́ Jokebed. Ada Fero gwara Jokebed, sị: ‘Kuru nwa a gaa zụọrọ m, m ga-akwụ gị ụgwọ.’

      Ebe Mosis na-agbapụ n’Ijipt

      Mgbe nwa ahụ tolitere, Jokebed kpọọrọ ya kpọnye ada Fero. Ada Fero agụọ ya Mosis ma zụọ ya ka ọ bụrụ nwa ya. Mosis ghọrọ nwa eze, a na-enyekwa ya ihe ọ bụla ọ chọrọ. Ma, o chefughị Jehova. Mosis ma na ya bụ onye Izrel, ọ bụghị onye Ijipt. Ọ họọrọ ife Jehova.

      Mgbe Mosis dị afọ iri anọ, o kpebiri inyere ndị obodo ya aka. Otu ụbọchị, ọ hụrụ ebe onye Ijipt na-eti onye Izrel ihe, ya etigbuo onye Ijipt ahụ ma zoo ozu ya n’ime ájá. Mgbe Fero nụrụ ya, ọ chọwara igbu Mosis. Ma, Mosis gbagara obodo a na-akpọ Midian. Jehova lekọtara ya n’ebe ahụ.

      ‘Ọ bụ okwukwe mere na Mosis ekweghị ka a kpọọ ya nwa ada Fero. Ọ họọrọ ka e megbuo ya na ndị Chineke.’ ​—Ndị Hibru 11:24, 25

      Ajụjụ: Olee otú e si meso ndị Izrel ihe n’Ijipt? Gịnị mere Mosis ji gbapụ n’Ijipt?

      Jenesis 49:33; Ọpụpụ 1:1-14, 22; 2:1-15; Ọrụ Ndịozi 7:17-29; Ndị Hibru 11:23-27

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya