-
Ahụhụ nke Anọ Ruo nke ItooluIhe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
-
-
ISI NKE 20
Ahụhụ Nke Anọ Ruo Nke Itoolu
Mosis na Erọn gakwuuru Fero ka ha zie ya ozi Chineke ziri ya, sị: ‘Ọ bụrụ na ị hapụghị ndị m ka ha laa, m ga-ezite odudu n’obodo a.’ Odudu feere n’ìgwè n’ìgwè nubata n’ụlọ ndị Ijipt, ma n’ụlọ ndị ọgaranya ma n’ụlọ ndị ogbenye. Ha juru n’obodo ahụ niile. Ma, e nweghị odudu dị na Goshen, ebe ndị Izrel bi. Ọ bụ naanị ndị Ijipt ka ahụhụ nke anọ ruo na nke iri mesiri ike. Fero gwara Mosis, sị: ‘Biko, rịọ Jehova ka o wepụrụ anyị odudu ndị a. Unu nweziri ike ịlawa.’ Ma, mgbe Jehova wepụrụ ha, Fero ahapụghị ndị Izrel ka ha laa. Fero ọ̀ ga-emecha mụta ihe?
Jehova gwara Mosis, sị: ‘Ọ bụrụ na Fero ahapụghị ndị m ka ha laa, anụmanụ ndị Ijipt ga-arịawa ọrịa ma nwụọ.’ N’echi ya, anụmanụ ndị ahụ bidoro ịnwụ. Ma o nweghị ihe mere anụ ụlọ ndị Izrel. Ma, Fero ka kpọchiri obi ya, o kweghịkwa ka ndị Izrel laa.
Jehova gwaziri Mosis ka ọ gaghachi na nke Fero wụlie ntụ elu. Mgbe Mosis wụliri ntụ elu, ya aghọọ uzuzu n’ala Ijipt niile. Ntụ ahụ mere ka etuto ọjọọ too ndị Ijipt niile na anụmanụ ha. N’agbanyeghị ihe a, Fero ekweghị ahapụ ndị Izrel ka ha laa.
Jehova zigara Mosis ọzọ na nke Fero. Mosis gwara Fero na Jehova kwuru, sị: ‘Ị̀ ka jụrụ ịhapụ ndị m ka ha laa? Echi, akụ́ mmiri ígwé ga-ezo n’obodo a.’ N’echi ya, Jehova zitere akụ́ mmiri ígwé, égbè eluigwe, na ọkụ. E nwetụbeghị ụdị akụ́ mmiri ígwé a mbụ n’Ijipt. O bibiri osisi na ihe niile a kụrụ n’ubi. Ma e nweghị ihe mere ndị nke dị na Goshen. Fero gwara Mosis, sị: ‘Biko, rịọ Jehova ka o mee ka akụ́ mmiri ígwé a kwụsị. Unu nweziri ike ịlawa.’ Ma ozugbo akụ́ mmiri ígwé ahụ na mmiri ahụ kwụsịrị, Fero gbanwere obi ya.
Mosis kwuziri, sị: ‘Ugbu a, igurube ga-erichapụ ihe ọ bụla dị n’ubi unu nke akụ́ mmiri ígwé na-emebighị.’ Ọtụtụ nde igurube richapụrụ ihe niile fọrọ n’ubi nakwa n’osisi. Fero rịọrọ Mosis, sị: ‘Rịọ Jehova ka o wepụ igurube ndị a.’ Ma mgbe Jehova wepụchara igurube ndị ahụ, Fero ka kpọchiri obi ya.
Jehova gwara Mosis, sị: ‘Welie aka gị elu.’ Ozugbo ahụ, ọchịchịrị gbachiri ebe niile. Ndị Ijipt ahụghị ihe ọ bụla ma ọ bụkwanụ mmadụ ọ bụla ruo abalị atọ. Ma ọchịchịrị agbaghị n’ụlọ ndị Izrel.
Fero gwara Mosis, sị: ‘Gị na ndị gị nwere ike ịlawa. Ma hapụnụ anụ ụlọ unu.’ Mosis sịrị ya: ‘Anyị ga-achịrị anụ ụlọ anyị ka anyị nwee ike iji ha chụọrọ Chineke anyị àjà.’ Ihe a were Fero ezigbo iwe. Ya agwa Mosis, sị: ‘Si ebe a pụọ! M hụ gị ọzọ, m ga-egbu gị.’
“Unu ga-ahụkwa ọzọ ihe dị iche n’onye ezi omume na onye ajọ omume, n’onye na-ejere Chineke ozi na onye na-anaghị ejere ya ozi.”—Malakaị 3:18
-
-
Ahụhụ nke IriIhe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
-
-
ISI NKE 21
Ahụhụ Nke Iri
Mosis gwara Fero na ya agaghị anwa anwa bịa ịhụ ya ọzọ. Ma tupu ya alawa, ọ gwara Fero, sị: ‘N’etiti abalị, nwa nwoke ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’Ijipt ga-anwụ, malite n’ọkpara Fero ruo n’ọkpara ndị na-eje ozi.’
Jehova gwaziri ndị Izrel ka ha rie nri pụrụ iche. Ọ gwara ha, sị: ‘Gbuonụ otu ebule ma ọ bụ mkpi dị otu afọ, fesakwanụ ọbara ya n’ọnụ ụzọ ụlọ unu. Hụọnụ ya n’ọkụ, riekwanụ ya na achịcha na-ekoghị eko. Yirinụ uwe unu na akpụkpọ ụkwụ, dịrịkwanụ njikere ịla. N’abalị a ka m ga-eme ka unu nwere onwe unu.’ Chegodị otú obi si tọọ ndị Izrel ezigbo ụtọ mgbe Jehova gwara ha ihe a.
N’etiti abalị, mmụọ ozi Jehova gara n’ụlọ niile dị n’Ijipt. Mmụọ ozi ahụ gburu nwa nwoke ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’ụlọ ọ bụla a na-efesaghị ọbara n’ọnụ ụzọ ya. Ma, mmụọ ozi ahụ gafere ụlọ ọ bụla e fesara ọbara n’ọnụ ụzọ ya. E nweghị ezinụlọ ndị Ijipt mmadụ na-anwụghị na ya, ma ezinụlọ ndị ọgaranya ma nke ndị ogbenye. Ma, e nweghị nwa ọ bụla nwụrụ n’ezinụlọ ndị Izrel.
Ọkpara Fero nwụdịrị. Ihe a ekweghịzi Fero odidi. Ọ bụ ya mere o ji gwazie Mosis na Erọn ozugbo, sị: ‘Bilienụ, sinụ ebe a pụọ. Gaanụ fee Chineke unu. Chịrịnụ anụ ụlọ unu lawa.’
Ndị Izrel si n’Ijipt pụọ n’oge ọnwa gbazuru agbazu, na-etikwa gbaa. Ha haziri onwe ha n’ezinụlọ n’ezinụlọ nakwa n’ebo n’ebo. Ha dị narị puku ụmụ nwoke isii (600,000) nakwa ọtụtụ ụmụ nwaanyị na ụmụaka. Ọtụtụ ndị na-abụghị ndị Izrel sokwa ha ka ha fewezie Jehova. Ndị Izrel emechaala nwere onwe ha.
N’afọ ọ bụla, ndị Izrel ga na-eri nri ahụ pụrụ iche iji na-echeta otú Jehova si napụta ha. Ihe a na-akpọ ya bụ Ememme Ngabiga.
“Ọ bụ ihe a mere m ji hapụ gị ndụ: ka m wee jiri gị gosi ike m, ka m wee mee ka a kọsaa aha m n’ụwa niile.” —Ndị Rom 9:17
-