Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ndị Nnyopụta Iri na Abụọ
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ebe ụmụ nwoke ndị Izrel na-enyopụta ala Kenan

      ISI NKE 26

      Ndị Nnyopụta Iri na Abụọ

      Ndị Izrel hapụrụ Ugwu Saịnaị ma si n’ala ịkpa Peran ruo n’ebe a na-akpọ Kedesh. N’ebe ahụ, Jehova gwara Mosis, sị: ‘Zie ụmụ nwoke iri na abụọ, otu onye ga-esi n’otu ebo, ka ha gaa nyopụta otú ala Kenan dị, bụ́ ala m ga-enye ndị Izrel.’ N’ihi ya, Mosis họọrọ ụmụ nwoke iri na abụọ ma gwa ha, sị: ‘Gaanụ Kenan, chọpụtanụ ma ala ya ọ̀ na-eme nri nke ọma. Chọpụtanụ ma ndị bi na ya hà siri ike ka ọ̀ bụ na ha esighị ike, ma hà bi n’ụlọikwuu ka ọ̀ bụ n’obodo a rụsiri ike.’ Ndị nnyopụta iri na abụọ ahụ gawara Kenan, ma Joshụa ma Keleb.

      Ebe ndị Izrel na-atamu ntamu nke mere ka ike gwụ ha

      Mgbe ụbọchị iri anọ gachara, ndị nnyopụta iri na abụọ ahụ lọtara. Ha wetara mkpụrụ fig, mkpụrụ pọmigranet, nakwa mkpụrụ vaịn. Ha kwuru, sị: ‘Ala ahụ bụ ezigbo ala, ma ndị bi na ya siri ike. Mgbidi obodo ha dị elu.’ Keleb kwuziri, sị: ‘Anyị ga-emeri ha. Ka anyị gawa ozugbo.’ Ị̀ ma ihe mere Keleb ji kwuo ihe a? Ọ bụ n’ihi na ya na Joshụa tụkwasịrị Jehova obi. Ma ndị nnyopụta ndị nke ọzọ sịrị: ‘Mba, ndị bi n’ala ahụ gbara ajọ dimkpa. Anyị dị ka ụkpara n’ebe ha nọ.’

      Mgbe ndị Izrel nụrụ ihe a, ike gwụrụ ha. Ha malitere ịtamu ntamu ma na-agwa ibe ha, si: ‘Ka anyị họrọ onye ndú ọzọ ka o duru anyị laghachi Ijipt. Gịnị mere anyị ga-eji gaa ebe ahụ ka e gbuo anyị?’ Joshụa na Keleb gwara ha, sị: ‘Unu enupụrụla Jehova isi, unu atụkwala egwu. Jehova ga-anọnyere anyị.’ Ma ndị Izrel egeghị ha ntị. Ha chọdịrị igbu Joshụa na Keleb.

      Gịnị ka Jehova mere? Ọ gwara Mosis, sị: ‘Ndị Izrel ka na-enupụrụ m isi n’agbanyeghị ihe niile m meere ha. N’ihi ya, ha ga-anọ afọ iri anọ n’ala ịkpa a, ha ga-anọkwa na ya nwụọ. Ọ bụ naanị ụmụ ha na Joshụa na Keleb ga-ebi n’ala ahụ m kwere nkwa na m ga-enye ha.’

      “Gịnị mere ụjọ ji na-atụ unu, unu ndị okwukwe nta?”​—Matiu 8:26

      Ajụjụ: Gịnị mere mgbe ndị nnyopụta iri na abụọ si Kenan lọta? Olee otú Joshụa na Keleb si gosi na ha tụkwasịrị Jehova obi?

      Ọnụ Ọgụgụ 13:1–14:38; Diuterọnọmi 1:22-33; Abụ Ọma 78:22; Ndị Hibru 3:17-19

  • Ha Nupụụrụ Jehova Isi
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ebe Kora na ndị òtù ya guzo n’ihu Mosis na Erọn

      ISI NKE 27

      Ha Nupụụrụ Jehova Isi

      Mgbe ndị Izrel nọ n’ala ịkpa, Kora, Detan, Abaịram, na narị mmadụ abụọ na iri ise (250) ndị ọzọ nupụụrụ Mosis isi. Ha gwara ya, sị: ‘O zuorola unu! Gịnị mere ị ga-eji bụrụ onye ndú anyị, Erọn abụrụ nnukwu onye nchụàjà? Jehova nọnyeere anyị niile, ọ bụghị naanị gị na Erọn.’ Ihe a were Jehova iwe. O weere ya na ọ bụ ya ka ha na-enupụrụ isi.

      Mosis gwara Kora na ndị òtù ya, sị: ‘Bịanụ n’ụlọikwuu echi, werekwanụ ihe e ji amụ insens na insens bịa. Jehova ga-egosi anyị onye ọ họọrọ.’

      N’echi ya, Kora na narị mmadụ abụọ na iri ise (250) ahụ bịakwutere Mosis n’ụlọikwuu. Ha mụnyere insens ọkụ n’ebe ahụ ka à ga-asị na ha bụ ndị nchụàjà. Jehova gwaziri Mosis na Erọn, sị: ‘Sinụ n’ebe Kora na ndị òtù ya pụọ.’

      Kora gakwuuru Mosis n’ụlọikwuu, ma Detan, Abaịram, na ndị ezinụlọ ha ekweghị aga. Jehova gwara ndị Izrel ka ha si n’ebe ụlọikwuu Kora, Detan, na Abaịram dị pụọ. Ndị Izrel si ebe ahụ pụọ ozugbo. Detan, Abaịram, na ndị ezinụlọ ha guzooro n’ihu ụlọikwuu ha. Na mberede, ala meghere loo ha niile. Ọkụ sikwa n’elu regbuo Kora na narị ụmụ nwoke abụọ na iri ise (250) nọ n’ụlọikwuu.

      Ebe ala meghere loo Detan, Abaịram, na ndị ezinụlọ ha

      Jehova gwaziri Mosis, sị: ‘Nata onyeisi ebo nke ọ bụla mkpara ya ma dee ya aha ya. Ma, ị ga-ede aha Erọn na mkpara ebo Livaị. Tinye ha n’ime ụlọikwuu. Mkpara onye m họọrọ ga-awa okooko osisi.’

      N’echi ya, Mosis wepụtara mkpara niile ahụ ma gosi ha ndị isi ahụ. Mkpara Erọn wara okooko osisi, mịakwa mkpụrụ almọnd chara acha. Jehova si otú a gosi na ya họọrọ Erọn ka ọ bụrụ nnukwu onye nchụàjà.

      “Na-eruberenụ ndị na-eduzi unu isi, na-edokwanụ onwe unu n’okpuru ha.”​—Ndị Hibru 13:17

      Ajụjụ: Gịnị mere Kora na ndị òtù ya ji nupụrụ Mosis isi? Olee otú anyị si mara na Jehova họọrọ Erọn ka ọ bụrụ nnukwu onye nchụàjà?

      Ọnụ Ọgụgụ 16:1–17:13; 26:9-11; Abụ Ọma 106:16-18

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya