Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Rehab Zoro Ndị Nnyopụta
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ebe Rehab na-agwa ndị agha ka ha gaa chọọ ndị nnyopụta ahụ ebe ọzọ. O si otú a chebe ndị nnyopụta ahụ

      ISI NKE 30

      Rehab Zoro Ndị Nnyopụta

      Mgbe ndị Izrel abụọ gara inyopụta otú Jeriko dị, ha banyere n’ụlọ otu nwaanyị aha ya bụ Rehab. Eze Jeriko chọpụtara na ha gara n’ụlọ Rehab, ya eziga ndị agha ya ebe ahụ. Rehab zoro mmadụ abụọ ahụ n’uko ụlọ ya ma gwa ndị agha ahụ ka ha gaa chọọ ha ebe ọzọ. Ọ gwara ndị nnyopụta ahụ, sị: ‘M ga-enyere unu aka n’ihi na m ma na Jehova nọnyeere unu, amakwa m na unu ga-emeri obodo a. Biko, kwenụ m nkwa na unu ga-echebe ndị ezinụlọ anyị.’

      Ndị nnyopụta ahụ gwara Rehab, sị: ‘Anyị na-ekwe gị nkwa na e nweghị ihe ga-eme onye ọ bụla nọ n’ụlọ gị.’ Ha sịkwara ya: ‘Kee ụdọ na-acha uhie uhie na windo gị. Ọ bụrụ na i kee ya, e nweghị ihe ga-eme ndị ezinụlọ unu.’

      Ụlọ Rehab, bụ́ nke e kere ụdọ na-acha uhie uhie na windo ya, adaghị mgbe mgbidi Jeriko dakasịrị

      Rehab kegidere ụdọ na windo ya, ndị nnyopụta ahụ esi na ya rịtuo. Ha gara zoo n’ugwu ruo abalị atọ tupu ha alaghachikwuru Joshụa. Ndị Izrel mechara gafee Osimiri Jọdan ma jikere ka ha weghara Jeriko. Jeriko bụ obodo mbụ ha meriri. Jehova gwara ha ka ha gbaa obodo ahụ gburugburu otu ugboro n’ụbọchị ruo abalị isii. N’ụbọchị nke asaa, ha gbara obodo ahụ gburugburu ugboro asaa. Mgbe ha gbachara ya, ndị nchụàjà fụrụ opi ha, ndị agha tiri mkpu, tisie ya ike, mgbidi obodo ahụ adakasịa. Ma, ụlọ Rehab adaghị n’agbanyeghị na ọ dị ná mgbidi ahụ. E nweghị ihe mere Rehab na ezinụlọ ha n’ihi na ọ tụkwasịrị Jehova obi.

      “Otú ahụ ka Chineke sikwa gụọ Rehab . . . n’onye ezi omume n’ihi ihe dị mma o mere. Ọ nabatara ndị bịara inyopụta otú obodo ha dị, nyekwara ha aka ha esi n’ụzọ ọzọ laa.”​—Jems 2:25

      Ajụjụ: Gịnị mere Rehab ji nyere ndị nnyopụta ahụ aka? Olee otú ndị Izrel si weghara Jeriko? Gịnị mere Rehab na ndị ezinụlọ ha?

      Joshụa 2:1-24; 6:1-27; Ndị Hibru 11:30, 31; Jems 2:24-26

  • Joshụa na Ndị Gibiọn
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ebe ndị Gibiọn yi nkịrịka uwe bịakwute Joshụa na ndị agha ya

      ISI NKE 31

      Joshụa na Ndị Gibiọn

      Akụkọ ihe mere Jeriko bịara gazuo n’obodo ndị ọzọ dị na Kenan. Ndị eze obodo ndị a kpebiri na ha ga-ejikọ aka lụso ndị Izrel agha. Ma ndị Gibiọn kpebiri na ha ga-eme ihe dị iche. Ha yi nkịrịka uwe gakwuru Joshụa ma sị: ‘Anyị si n’obodo dị anya bịa. Anyị anụla banyere Jehova na ihe niile o meere unu n’Ijipt nakwa na Moab. Kwenụ anyị nkwa na unu agaghị alụso anyị agha, anyị ga-abụ ndị ohu unu.’

      Joshụa kwetara ihe ha kwuru ma kweta na ha agaghị alụso ha agha. Mgbe ụbọchị atọ gachara, ọ chọpụtara na ha esighị n’obodo dị anya bịa. Ha si Kenan. Joshụa jụrụ ndị Gibiọn, sị: ‘Gịnị mere unu ji ghaara anyị ụgha?’ Ha gwara ya, sị: ‘Ụjọ tụrụ anyị. Anyị ma na Jehova Chineke unu na-alụrụ unu agha. Biko, unu egbula anyị.’ Joshụa egbughị ha otú o kwere ha ná nkwa.

      Obere oge, ndị eze ise na-achị ndị Kenan na ndị agha ha kpebiri ịlụso ndị Gibiọn agha. Mgbe Joshụa na ndị agha ya nụrụ ya, ha si n’abalị gagide ije chi abọọ ka ha nwee ike ịzọpụta ndị Gibiọn. Ha na ndị Kenan malitere ịlụ agha n’isi ụtụtụ ahụ. Ndị Kenan malitere ịgba ọsọ. Jehova mere ka akụ́ mmiri ígwé dagbuo ha ebe ọ bụla ha gbagara. Joshụa gwaziri Jehova ka o mee ka anyanwụ kwụrụ otu ebe. Gịnị mere o ji gwa Jehova ka o mee otú ahụ ebe ọ bụ na ụdị ihe a emetụbeghị? Ọ bụ n’ihi na Joshụa tụkwasịrị Jehova obi. Anyanwụ adaghị n’ụbọchị ahụ niile ruo mgbe ndị Izrel meriri ndị eze Kenan na ndị agha ha.

      Ebe Joshụa na-ele anya n’elu ma na-arịọ Jehova ka o mee ka anyanwụ kwụrụ otu ebe

      “Ka ‘Ee’ unu kwuru bụrụ ee, ka ‘Ee e’ unu kwuru bụrụ ee e, n’ihi na ihe gafere ihe ndị a si n’aka ajọ onye ahụ.”​—Matiu 5:37

      Ajụjụ: Gịnị ka ndị Gibiọn mere ka ndị Izrel ghara ịlụso ha agha? Olee otú Jehova si nyere ndị Izrel aka?

      Joshụa 9:1–10:15

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya