Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Gidiọn Meriri Ndị Midian
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ebe Gidion na ndị agha ya na-afụ opi, na-akụri ite ha, na-efegharị ọwa ọkụ ha ma na-eti mkpu

      ISI NKE 34

      Gidiọn Meriri Ndị Midian

      Ka oge na-aga, ndị Izrel kwụsịrị ife Jehova, fewe chi ọzọ. Ruo afọ asaa, ndị Midian nọ na-ezuru anụ ụlọ ndị Izrel ma na-emebisị ihe ndị ha kụrụ n’ubi. Ndị Izrel na-ezo n’ọgba nakwa n’ugwu ka ndị Midian ghara ịna-enye ha nsogbu. Ha rịọrọ Jehova ka ọ zọpụta ha n’aka ndị Midian. N’ihi ya, Jehova zigara otu mmụọ ozi ka ọ gaa hụ otu nwa okorobịa aha ya bụ Gidiọn. Mmụọ ozi ahụ gwara ya, sị: ‘Jehova ahọrọla gị ka ị bụrụ onye agha dị ike.’ Gidiọn jụrụ ya, sị: ‘Olee otú m ga-esi azọpụta ndị Izrel? O nweghị ihe m bụ.’

      Olee otú Gidiọn ga-esi amara na Jehova ahọrọla ya? Gidiọn dowere ajị anụ n’ala ma gwa Jehova, sị: ‘N’ụtụtụ, ọ bụrụ na igirigi adaa n’ajị anụ a, ma ghara ịda n’ala a, m ga-ama na ị họrọla m ka m zọpụta ndị Izrel.’ N’ụtụtụ echi ya, igirigi dara n’ajị anụ ahụ ma ala niile adịrị kọrọ kọrọ. Ma, Gidiọn rịọrọ Jehova ka o mee ka naanị ajị anụ ahụ dịrị kọrọ kọrọ, ka igirigi daa n’ala ahụ niile. Mgbe Jehova zara Gidiọn ekpere ya, o doro ya anya na Jehova ahọrọla ya. Ọ kpọkọtara ndị agha ya ka ha gaa lụso ndị Midian agha.

      Jehova gwara Gidiọn, sị: ‘M ga-eme ka ndị Izrel merie. Ma, ebe ọ bụ na ị kpọ ọtụtụ ndị agha, unu nwere ike iche na ọ bụ ike unu ka unu ji merie. Gwa onye ọ bụla ụjọ na-atụ ka ọ lawa.’ N’ihi ya, ndị agha dị puku iri abụọ na puku abụọ (22,000) lawara, ya afọdụ puku iri (10,000). Jehova gwaziri ya, sị: ‘Ndị agha gị ka dị ọtụtụ. Kpọrọ ha gaa na mmiri ma gwa ha ka ha ṅụọ mmiri. Naanị ndị ị ga-ahapụ bụ ndị na-aṅụ mmiri ma na-ele ma ndị iro ha hà na-abịa.’ Ọ bụ naanị narị ndị agha atọ (300) ṅụrụ mmiri ma na-ele ma ndị iro ha hà na-abịa. Jehova gwara Gidiọn na ọ bụ naanị mmadụ ole na ole a ga-emeri ndị agha Midian dị otu narị puku na puku iri atọ na puku ise (135,000).

      Jehova gwara Gidiọn n’abalị ahụ, sị: ‘Oge eruola ka unu lụso ndị Midian agha.’ Gidiọn nyere ndị agha ya opi na nnukwu ite e tinyere ọwa ọkụ n’ime ha. Ọ gwara ha, sị: ‘Na-elenụ m anya, meenụ ihe m mere.’ Gidiọn fụrụ opi ya, kụrie ite ya, fegharịa ọwa ọkụ ya ma tie mkpu, sị: ‘Mma agha Jehova na nke Gidiọn!’ Narị mmadụ atọ (300) ahụ so ya mekwara otú ahụ. Ụjọ tụwara ndị Midian, ha agbasasịa. Ha malitere ịlụso ibe ha agha maka na ha amaghịzi ihe ha na-eme eme. Otú a ka Jehova si nyere ndị Izrel aka ọzọ, ha emerie ndị iro ha.

      Ndị Agha Midian ụjọ ji

      “Ike a abụghị nke anyị, kama, ọ bụ Chineke nyere ya anyị.”​—1 Ndị Kọrịnt 4:7

      Ajụjụ: Olee ihe Jehova mere iji gosi Gidiọn na ọ họrọla ya ka ọ zọpụta ndị Izrel? Gịnị mere ndị agha Gidiọn ji dịrị naanị narị atọ (300)?

      Ndị Ikpe 6:1-16; 6:36–7:25; 8:28

  • Hana Kpere Ekpere Ka Ọ Mụta Nwa Nwoke
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
    • Ebe Hana na-akpọnye Ịlaị obere nwa ya Samuel n’ụlọikwuu

      ISI NKE 35

      Hana Kpere Ekpere Ka Ọ Mụta Nwa Nwoke

      Otu onye Izrel aha ya bụ Elkena lụrụ ụmụ nwaanyị abụọ. Aha ha bụ Hana na Penina. Ma, Elkena hụrụ Hana n’anya karịa Penina. Penina na-akparị Hana mgbe niile n’ihi na ọ mụtaghị nwa, ma Penina nwere ọtụtụ ụmụ. N’afọ ọ bụla, Elkena na-akpọrọ ezinụlọ ya aga ife Chineke n’ụlọikwuu dị na Shaịlo. Otu ụbọchị ha nọ ebe ahụ, ọ chọpụtara na obi adịghị Hana, nwunye ya ọ hụrụ n’anya, mma. Ọ sịrị Hana: ‘Biko, ebezila ákwá. Anọ m ya. Ahụrụ m gị n’anya.’

      Mgbe e mechara, Hana gawara n’ụlọikwuu ka o kpee ekpere naanị ya. Ọ nọ na-ebesi ákwá ike, na-arịọ Jehova ka o nyere ya aka. O kwere Jehova nkwa, sị: ‘Ọ bụrụ na i nye m nwa nwoke, m ga-enye gị ya, ọ ga-eji ndụ ya niile jeere gị ozi.’

      Ebe Ịlaị Nnukwu Onye Nchụàjà nọ na-ele Hana ka ọ na-ebe ákwá ma na-ekpe ekpere

      Ịlaị, Nnukwu Onye Nchụàjà, hụrụ Hana ka egbugbere ọnụ ya na-emegharị emegharị, ya echee na mmanya na-egbu ya. Hana gwara ya, sị: ‘Onyenwe m, o nweghị mmanya na-egbu m. Enwere m ezigbo nsogbu, m na-akọrọ ya Jehova.’ Ịlaị chọpụtara na ihe yanwa kwuru adịghị mma. Ọ gwaziri Hana, sị: ‘Ka Chineke nye gị ihe ị na-achọ.’ Ihe a Ịlaị kwuru mere ka obi ruo Hana ala, ya alawa. O rughị otu afọ, Hana amụta nwa nwoke ma gụọ ya Samuel. Olee otú i chere obi dị Hana ugbu a ọ mụtara nwa?

      Hana echefughị nkwa o kwere Jehova. Ozugbo Samuel tolitetụrụ, ọ kpọtara ya n’ụlọikwuu ka o jewere Jehova ozi. Ọ gwara Ịlaị, sị: ‘Lee nwa ahụ m rịọrọ Jehova ka o nye m. Enyefeela m ya Jehova, ọ ga-eji ndụ ya niile jeere ya ozi.’ Elkena na Hana na-aga eleta Samuel kwa afọ, ha na-achịtakwara ya uwe ọhụrụ na-enweghị aka. Jehova mere ka Hana mụta ụmụ nwoke atọ ọzọ na ụmụ nwaanyị abụọ.

      “Na-arịọnụ, a ga-enye unu. Na-achọnụ, unu ga-achọta.”​—Matiu 7:7

      Ajụjụ: Gịnị mere obi adịghị Hana mma? Olee otú Jehova si gọzie ya?

      1 Samuel 1:1–2:11, 18-21

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya