-
Ụlọ Nsọ A Rụụrụ JehovaIhe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
-
-
ISI NKE 44
Ụlọ Nsọ A Rụụrụ Jehova
Mgbe Solomọn ghọchara eze Izrel, Jehova jụrụ ya, sị: ‘Gịnị ka ị ga-achọ ka m nye gị?’ Solomọn sịrị ya: ‘Abụ m nwata, o nweghịkwa ihe m ma. Biko, nye m amamihe ka m nwee ike ịna-elekọta ndị gị.’ Jehova sịrị ya: ‘Ebe ọ bụ na ị rịọrọ amamihe, m ga-eme ka ị bụrụ onye kacha mara ihe n’ụwa. M ga-emekwa ka ị bụrụ ọgaranya. Ọ bụrụ na i rubere m isi, ị ga-adị ogologo ndụ.’
Solomọn malitere ịrụrụ Chineke ụlọ nsọ. O ji ọlaedo, ọlaọcha, osisi, na nkume ndị kacha mma rụọ ya. Ọtụtụ puku ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ma otú e si arụ ụlọ so rụọ ya. Mgbe afọ asaa gafere, a rụchara ụlọ nsọ ahụ, e nyefeekwa ya Jehova. Ụlọ nsọ ahụ nwere ebe ịchụàjà, e dowekwara àjà a ga-achụrụ Jehova n’elu ya. Solomọn gburu ikpere n’ala n’ihu ebe ịchụàjà ahụ kpee ekpere, sị: ‘Jehova, ụlọ nsọ a ebughị ibu, ọ maghịkwa mma ịbụ nke gị, ma biko, nabata ofufe anyị na-efe gị, nụrụkwa ekpere anyị.’ Gịnị ka Jehova mere iji gosi na ọ nabatara ụlọ nsọ ahụ nakwa na ọ nụrụ ekpere Solomọn? Ozugbo Solomọn kpechara ekpere ahụ, Jehova zitere ọkụ, ya erechapụ àjà ahụ e dowere n’ebe ịchụàjà. N’eziokwu, Jehova nabatara ụlọ nsọ ahụ. Mgbe ndị Izrel hụrụ ihe a merenụ, ha ṅụrịrị ọṅụ.
A ma Eze Solomọn ama ka onye ma ihe n’Izrel nakwa n’obodo ndị dị anya. Ndị mmadụ na-abịa akọsara Solomọn nsogbu ha ka o nyere ha aka. Eze nwaanyị Shiba bịadịrị jụọ Solomọn ajụjụ ndị siri ike ka ọ mara ma ọ̀ ga-azata ha. Mgbe ọ nụrụ ihe Solomọn zara, ọ sịrị: ‘Ekwetaghị m ihe ndị mmadụ kọọrọ m banyere gị. Ma ugbu a, ahụla m na ị ma ihe karịa otú ha kwuru. Jehova Chineke gị agọziela gị.’ Ihe nọ na-agaziri ndị Izrel, obi ana-atọkwa ha ụtọ. Ma n’oge na-adịghị anya, ihe ga-agbanwe.
“Ma, onye ka Solomọn nọ ebe a.”—Matiu 12:42
-
-
E Kewara Alaeze IzrelIhe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
-
-
ISI NKE 45
E Kewara Alaeze Izrel
N’oge niile Solomọn na-efe Jehova, udo dị n’ebe niile n’Izrel. Ma, Solomọn lụrụ ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị mba ọzọ. Ụmụ nwaanyị ndị ahụ na-efe arụsị. Solomọn ji nwayọọ nwayọọ gbanwee, sorozie ha fewe arụsị. Ihe a were Jehova iwe. Ọ gwara Solomọn, sị: ‘A ga-anapụ ezinụlọ gị alaeze Izrel, kewaa ya abụọ. M ga-enye otu n’ime ndị na-ejere gị ozi nke buru ibu, ezinụlọ gị ga na-achị nke ntakịrị.’
E nwere ihe ọzọ Jehova mere iji mee ka ihe a ọ chọrọ ime doo anya. Otu ụbọchị, otu n’ime ndị na-ejere Solomọn ozi aha ya bụ Jeroboam nọ na-aga n’ụzọ, ya ezute Ahaịja onye amụma. Ahaịja dọwara uwe elu ya ụzọ iri na abụọ ma gwa Jeroboam, sị: ‘Jehova ga-anapụ ezinụlọ Solomọn alaeze Izrel ma kewaa ya ụzọ abụọ. Chịrị iberibe iri n’uwe a, n’ihi na ị ga-abụ eze ebo iri.’ Mgbe Eze Solomọn nụrụ ihe a, ọ chọwara igbu Jeroboam. Ihe a mere ka Jeroboam gbaga Ijipt. Ka oge na-aga, Solomọn nwụrụ, Rehoboam nwa ya abụrụzie eze. Ọ bụ mgbe ahụ ka Jeroboam lọghachiri n’Izrel.
Ndị okenye Izrel bịara gwa Rehoboam, sị: ‘Ọ bụrụ na i jiri obiọma meso ndị Izrel ihe, ha ga na-ejere gị ozi.’ Ma, ndị enyi Rehoboam bụ́ ndị ọgbọ ya gwara ya, sị: ‘Mesiwe ha ike. Na-enyekwu ha ọrụ tara akpụ.’ Rehoboam mere ihe a ndị enyi ya bụ́ ndị ọgbọ ya gwara ya. O ji aka ike na-achị ndị Izrel, ya emee ka ha nupụrụ ya isi. Ha mere Jeroboam eze ka ọ chịwa ebo iri. A kpọziri ebo iri a alaeze Izrel, kpọwa ebo abụọ fọrọnụ alaeze Juda. Ebo abụọ a dụnyeere Rehoboam úkwù. Otú a ka e si kewaa ebo iri na abụọ e nwere n’Izrel ụzọ abụọ.
Jeruselem so n’ebe ndị Rehoboam na-achị. Ma, Jeroboam achọghị ka ndị Izrel na-aga ebe ahụ na-efe Chineke. Ị̀ ma ihe mere ya? O chere na ọ bụrụ na ha ana-aga ebe ahụ, ha ga-ahapụ ya, Rehoboam achịwazie ha. Ọ kpụrụ nwa ehi ọlaedo abụọ ma gwa ndị Izrel, sị: ‘Jeruselem dị ezigbo anya. Nọrọnụ ebe a fewe Chineke.’ Ndị Izrel bidoro ife nwa ehi ọlaedo ahụ ma chefuo Jehova ọzọ.
“Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu, n’ihi na unu na ha abụghị otu. Gịnị jikọrọ ezi omume na mmebi iwu? . . . Gịnịkwa jikọrọ onye kwere ekwe na onye na-ekweghị ekwe?”—2 Ndị Kọrịnt 6:14, 15
-