-
Jehova Bụ “Onye Na-ekpughe Ihe Nzuzo”Ụlọ Nche—2012 | Jun 15
-
-
Jehova Bụ “Onye Na-ekpughe Ihe Nzuzo”
“N’ezie, Chineke unu bụ Chi kasị chi niile na Onyenwe ndị eze na Onye na-ekpughe ihe nzuzo.”—DAN. 2:47.
GỊNỊ KA Ị GA-AZA?
Olee ihe ndị Jehova mere ka anyị mata banyere ọdịnihu?
Olee mba ndị isi isii mbụ nke anụ ọhịa ahụ nọchiri anya ha?
Gịnị jikọrọ anụ ọhịa ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe na ihe oyiyi ahụ Nebukadneza hụrụ ná nrọ?
1, 2. Olee ihe Jehova mere ka anyị mata, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
OLEE ọchịchị ndị ga na-achị ụwa mgbe Alaeze Chineke ga-ebibi ọchịchị ụmụ mmadụ? Anyị ma azịza ajụjụ a n’ihi na Jehova Chineke bụ “Onye na-ekpughe ihe nzuzo.” O mere ka anyị mata ọchịchị ndị ahụ n’ihe Daniel onye amụma na Jọn onyeozi dere.
2 Jehova gosiri ha abụọ ọhụụ ndị gbasara anụ ọhịa dị iche iche. Ná nrọ Nebukadneza rọrọ, ọ hụrụ otu nnukwu ihe oyiyi e ji ọla na ígwè kpụọ. Jehova mere ka Daniel ghọta ihe ihe oyiyi ahụ pụtara, meekwa ka e dee ihe ndị ahụ na Baịbụl ka ha baara anyị uru. (Rom 15:4) Ihe mere o ji mee ya bụ ka o mee ka olileanya anyị sie ike na Alaeze ya ga-egwepịa ọchịchị ụmụ mmadụ niile n’oge na-adịghị anya.—Dan. 2:44.
3. Olee ihe anyị kwesịrị ibu ụzọ ghọta tupu anyị aghọta amụma Baịbụl nke ọma, n’ihi gịnịkwa?
3 Amụma Daniel na ọhụụ e gosiri Jọn onyeozi mere ka anyị mata eze ma ọ bụ ọchịchị asatọ, nakwa nke ga-achị ma ibe ya chịchaa. Ma, naanị otú anyị ga-esi ghọta amụma ndị ahụ nke ọma bụ ịghọta amụma mbụ e dere na Baịbụl. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ihe niile e kwuru na Baịbụl gbasara amụma mbụ ahụ. Amụma ahụ dị ka ihe jikọtara amụma ndị ọzọ niile e buru na Baịbụl.
MKPỤRỤ AGWỌ AHỤ NA ANỤ ỌHỊA AHỤ
4. Ole ndị bụ mkpụrụ nwaanyị ahụ, gịnịkwa ka mkpụrụ ahụ ga-arụ?
4 Obere oge ka Adam na Iv nupụchara isi n’Iden, Jehova kwere nkwa na otu “nwaanyị” ga-enwe “mkpụrụ.”a (Gụọ Jenesis 3:15.) Mkpụrụ ahụ ga-emecha gwepịa agwọ ahụ, bụ́ Setan, isi. Jehova mechara mee ka a mata na mkpụrụ ahụ ga-esi n’ezinụlọ Ebreham, na ọ ga-esi ná mba Izrel, na ọ ga-abụ onye Juda, bụrụkwa nwa nwa Eze Devid. (Jen. 22:15-18; 49:10; Ọma 89:3, 4; Luk 1:30-33) Onye bụ́ isi sekpụ ntị ná mkpụrụ ahụ bụ Jizọs Kraịst. (Gal. 3:16) Ndị so ya bụrụ mkpụrụ ahụ bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ. (Gal. 3:26-29) Ọ bụ Jizọs na ndị a e tere mmanụ ga-achị n’Alaeze Chineke, nke bụ́ ọchịchị Chineke ga-eji zọpịa Setan.—Luk 12:32; Rom 16:20.
5, 6. (a) Ọchịchị ole kpara ike n’ụwa ka Daniel na Jọn kwuru banyere ha? (b) Gịnị ka isi anụ ọhịa ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe nọchiri anya ya?
5 Amụma mbụ ahụ e buru n’Iden kwuru na Setan ga-enwe “mkpụrụ.” Mkpụrụ Setan ga-ebuso mkpụrụ nwaanyị ahụ iro, ma ọ bụ kpọọ ya asị. Ole ndị bụ mkpụrụ agwọ ahụ? Ọ bụ ndị niile kpọrọ Chineke asị ma na-emegide ndị ya otú ahụ Setan na-eme. Kemgbe ụwa, Setan ahaziela mkpụrụ ya ka ọ bụrụ ọchịchị ma ọ bụ alaeze dị iche iche. (Luk 4:5, 6) Ma ọ bụ naanị alaeze ole na ole bụ ndị kpagburu ndị Chineke, ya bụ, ndị Izrel oge ochie ma ọ bụ ọgbakọ Ndị Kraịst e tere mmanụ. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị buru ihe a n’obi? Ọ bụ n’ihi na ọ ga-eme ka anyị ghọta ihe mere ọhụụ Daniel na Jọn ji kwuo banyere naanị ọchịchị asatọ kpara ike n’ụwa.
6 N’ọgwụgwụ narị afọ mbụ O.A., Jizọs gosiri Jọn onyeozi ụfọdụ ọhụụ dị egwu. (Mkpu. 1:1) N’otu n’ime ha, Jọn hụrụ dragọn, nke nọchiri anya Ekwensu, ka o guzo n’elu ájá nke oké osimiri. (Gụọ Mkpughe 13:1, 2.) Jọn hụkwara otu anụ ọhịa dị egwu nke si n’oké osimiri na-apụta, Ekwensu enyekwa ya ikike dị ukwuu. Otu mmụọ ozi mechara gwa Jọn na isi asaa nke anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie, nke bụ́ onyinyo nke anụ ọhịa ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe 13:1, nọchiri anya “ndị eze asaa” ma ọ bụ ọchịchị asaa. (Mkpu. 13:14, 15; 17:3, 9, 10) Mgbe Jọn na-ede akwụkwọ Mkpughe, ise n’ime ndị eze ahụ adaala, otu na-achị mgbe ahụ, nke ọzọ “abịabeghị.” Olee ọchịchị ndị eze ndị ahụ nọchiri anya ha? Ka anyị tụlee isi nke ọ bụla anụ ọhịa ahụ a kọwara ná Mkpughe nwere. Anyị ga-atụlekwa otú akwụkwọ Daniel si kọwakwuo ọtụtụ n’ime alaeze ndị ahụ, mgbe ụfọdụ, ọtụtụ narị afọ tupu ha amalite ịchị.
IJIPT BỤ ISI NKE MBỤ, ASIRIA ABỤRỤ ISI NKE ABỤỌ
7. Gịnị ka isi nke mbụ ahụ nọchiri anya ya, gịnịkwa mere anyị ji kwuo otú ahụ?
7 Isi nke mbụ nke anụ ọhịa ahụ nọchiri anya Ijipt. Maka gịnị? Ọ bụ maka na Ijipt bụ mba mbụ chịrị ụwa nke kpọrọ ndị Chineke asị ma lụso ha ọgụ. Chineke kwere Ebreham nkwa na a ga-esi n’ezinụlọ ya nweta mkpụrụ nwaanyị ahụ. Ndị Izrel bụ ụmụ Ebreham. Mgbe ha bi n’Ijipt, ha mụbara, ndị Ijipt malitekwara imegbu ha. Setan chọrọ igbukpọ ndị Chineke tupu a mụọ mkpụrụ ahụ. Olee otú o si chọọ ime ya? O mere ka Fero nye iwu ka e gbuo nwa ọhụrụ Izrel ọ bụla bụ́ nwoke. Jehova kụghasịrị ihe ahụ Fero chọrọ ime ma napụta ndị ya n’ohu ha na-agba n’Ijipt. (Ọpụ. 1:15-20; 14:13) Jehova mechara nye ndị Izrel Ala Nkwa ahụ.
8. Gịnị ka isi nke abụọ ahụ nọchiri anya ya, gịnịkwa ka ọ gbalịrị ime?
8 Isi nke abụọ nke anụ ọhịa ahụ nọchiri anya Asiria. Alaeze ukwu ahụ gbalịkwara igbukpọ ndị Chineke. N’eziokwu, Jehova si n’aka Asiria taa alaeze ebo iri Izrel ahụhụ n’ihi na ha nọ na-ekpere arụsị, na-enupụkwara Chineke isi. Ma, Asiria gbalịrị ibibi Jeruselem. O nwere ike ịbụ na Setan chọrọ igbukpọ ezinụlọ ndị eze na Jeruselem, bụ́ ebe a ga-emecha mụọ Jizọs. Jehova achọghị ka e bibie Jeruselem. Ọ bụ ya mere o ji bibie ndị agha Asiria ma zọpụta ndị ya.—2 Eze 19:32-35; Aịza. 10:5, 6, 12-15.
BABỊLỌN BỤ ISI NKE ATỌ
9, 10. (a) Gịnị ka Jehova kwere ka ndị Babịlọn mee? (b) Ka amụma nwee ike imezu, gịnị kwesịrị ime?
9 Isi nke atọ nke anụ ọhịa ahụ Jọn hụrụ nọchiri anya alaeze nke isi obodo ya bụ Babịlọn. Jehova kwere ka ndị Babịlọn bibie Jeruselem ma dọrọ ndị Chineke n’agha. Ma, tupu Jehova ekwe ka ihe a mee ndị Izrel na-enupụ isi, ọ dọrọ ha aka ná ntị na ụdị ọdachi ahụ ga-adakwasị ha. (2 Eze 20:16-18) O buru amụma na a ga-ewepụ ndị eze Izrel, bụ́ ndị na-anọ “n’ocheeze Jehova” na Jeruselem. (1 Ihe 29:23) Ma, Jehova kwere nkwa na onye si n’agbụrụ Eze Devid, bụ́ “onye o ruuru,” ga-abịa were ọchịchị ahụ.—Ezik. 21:25-27.
10 Amụma ọzọ gosiri na ndị Juu ka ga na-efe Chineke n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem mgbe Mesaya, ma ọ bụ Onye E Tere Mmanụ, ga-abịa. (Dan. 9:24-27) Amụma ọzọ e buru tupu a dọrọ ndị Izrel n’agha laa Babịlọn kwuru na a ga-amụ Mesaya na Betlehem. (Maị. 5:2) Amụma ndị a agaghị emezu ma ọ bụrụ na a hapụghị ndị Juu ka ha laghachi n’ala ha ma wughachi ụlọ nsọ ahụ. Ma ndị Babịlọn anaghị ahapụ ndị ha dọọrọ n’agha. Oleekwanụ otú ndị Chineke ga-esi laghachi n’ala ha? Jehova kpugheere ndị amụma ya azịza ajụjụ a.—Emọs 3:7.
11. Olee ihe Daniel na Jọn ji mee ihe atụ Alaeze Ukwu Babịlọn? (Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji a.)
11 Daniel onye amụma so ná ndị a dọọrọ n’agha laa Babịlọn. (Dan. 1:1-6) Jehova si n’aka ya mee ka a mata alaeze ndị ọzọ ga-achị mgbe Babịlọn chịchara. O ji ihe atụ dị iche iche gosi Daniel ọchịchị ndị ahụ. Dị ka ihe atụ, Jehova mere ka Eze Nebukadneza nke Babịlọn rọọ nrọ ma hụ otu nnukwu ihe oyiyi e ji ọla na ígwè kpụọ. (Gụọ Daniel 2:1, 19, 31-38.) Jehova si n’aka Daniel mee ka a mata na isi ihe oyiyi ahụ e ji ọlaedo kpụọ nọchiri anya Alaeze Ukwu Babịlọn.b Obi ya na ogwe aka ya nọchiri anya mba ga-achị ụwa ma Babịlọn chịchaa. Olee mba ọ ga-abụ, oleekwa otú ọ ga-esi emeso ndị Chineke?
ISI NKE ANỌ BỤ MIDIA NA PESHIA
12, 13. (a) Gịnị ka Jehova kpughere banyere mmeri a ga-emeri Babịlọn? (b) Gịnị mere anyị ga-eji kwuo na isi nke anọ nke anụ ọhịa ahụ bụ Midia na Peshia?
12 Ihe karịrị otu narị afọ tupu oge Daniel, Jehova kpugheere Aịzaya onye amụma ihe dị iche iche banyere ọchịchị ga-emeri Babịlọn. Jehova mere ka a mata ma otú a ga-esi merie Babịlọn ma aha onye ga-emeri ya. Onye ahụ meriri ya bụ Saịrọs onye Peshia. (Aịza. 44:28–45:2) Jehova gosiri Daniel ọhụụ abụọ ọzọ banyere Midia na Peshia. N’otu n’ime ha, Daniel hụrụ anụ ọhịa bea nke weliri otu akụkụ ya elu, nke a gwakwara ka o “rie anụ buru ibu.” (Dan. 7:5) N’ọhụụ ọzọ, Daniel hụrụ otu ebule nwere mpi abụọ, bụ́ nke nọchiri anya Midia na Peshia.—Dan. 8:3, 20.
13 Jehova ji Alaeze Ukwu Midia na Peshia merie Babịlọn ma mee ka ndị Izrel laghachi n’ala ha, otú ahụ o buru n’amụma. (2 Ihe 36:22, 23) Ma, alaeze ahụ mechara gbalịa ibibi ndị Chineke. Akwụkwọ Baịbụl bụ́ Esta kọrọ otú praịm minista ndị Peshia, bụ́ Heman, si kpaa nkata igbu ndị Juu niile n’alaeze ukwu ahụ n’ụbọchị a kara aka. Ma, Jehova zọpụtara ndị ya ọzọ n’aka ndị bụ́ mkpụrụ Setan. (Esta 1:1-3; 3:8, 9; 8:3, 9-14) N’ihi ya, Midia na Peshia bụ isi nke anọ nke anụ ọhịa ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe.
ISI NKE ISE BỤ GRIS
14, 15. Olee ihe ụfọdụ Jehova kpughere banyere Alaeze Ukwu Gris oge ochie?
14 Isi nke ise nke anụ ọhịa ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe nọchiri anya Gris. Ná nrọ ahụ Daniel kọwaara Nebukadneza, afọ ihe oyiyi ahụ na apata ụkwụ ya, nke e ji ọla kọpa kpụọ, nọchikwara anya alaeze ahụ. Jehova mekwara ka Daniel hụ ọhụụ abụọ ndị kọwakwuru alaeze ukwu ahụ na onye ọchịchị ya kasị ike.
15 N’otu n’ime ọhụụ ndị ahụ, Daniel hụrụ otu agụ owuru nwere nku anọ, nke nọchiri anya Gris. Agụ owuru ahụ ga-emeri mba ndị ọzọ n’egbughị oge. (Dan. 7:6) N’ọhụụ ọzọ, Daniel kọwara otú mkpi nke nwere otu nnukwu mpi si gbuo ebule nwere mpi abụọ n’egbughị oge. Ebule ahụ bụ Midia na Peshia. Jehova gwara Daniel na mkpi ahụ nọchiri anya Gris nakwa na nnukwu mpi ahụ nọchiri anya otu n’ime ndị eze ya. Daniel dekwara na a ga-agbaji nnukwu mpi ahụ, obere mpi anọ anọchie ya. Ihe niile ahụ e buru n’amụma mezuru n’agbanyeghị na e dere ya ihe dị ka narị afọ abụọ tupu Gris amalite ịchị ụwa. Alegzanda Onye Ukwu bụ eze kacha kpaa ike n’alaeze Gris oge ochie, ọ bụkwa ya du ndị agha gaa merie Midia na Peshia. Ma, a gbajiri mpi ahụ mgbe eze ukwu ahụ nwụrụ n’ike mgbe ọ dị naanị iri afọ atọ na abụọ. Ndị ọchịagha ya anọ mechara kewaa alaeze ukwu ya ahụ.—Gụọ Daniel 8:20-22.
16. Gịnị ka Antiokọs nke Anọ mere?
16 Mgbe ndị Gris merichara Peshia, ha chịrị ndị Izrel. N’oge ahụ, ndị Juu alaghachila n’Ala Nkwa ahụ, wughachikwa ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Ha ka bụ ndị Chineke, ụlọ nsọ ahụ ha wughachiri ka bụkwa ebe ha nọ na-efe Chineke. Ma, ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ narị afọ abụọ tupu a mụọ Kraịst, Gris nke bụ́ isi nke ise nke anụ ọhịa ahụ, lụsoro ndị Chineke ọgụ. Antiokọs nke Anọ, bụ́ otu n’ime ndị ọchịagha ahụ ketara alaeze Alegzanda, rụrụ ebe a na-achụrụ arụsị àjà n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem ma kwuo na a ga-egbu onye ọ bụla kpere okpukpe ndị Juu. Mkpụrụ Setan alusowakwala ndị Chineke ọgụ! Ma n’oge na-adịghị anya, alaeze ọzọ nọchiri Gris ma chịwa ụwa. Olee alaeze ga-abụ isi nke isii nke anụ ọhịa ahụ?
ROM BỤ ISI NKE ISII “NKE NA-EMENYE ỤJỌ MA DỊ EGWU”
17. Olee otú isi nke isii nke anụ ọhịa ahụ si soro mezuo amụma dị na Jenesis 3:15?
17 Rom bụ mba na-achị ụwa mgbe Jọn hụrụ anụ ọhịa ahụ n’ọhụụ. (Mkpu. 17:10) Rom bụ isi nke isii nke anụ ọhịa ahụ, o sokwa mezuo amụma ahụ dị na Jenesis 3:15. Setan ji ndị ọchịchị Rom merụọ mkpụrụ ahụ ahụ́ “n’ikiri ụkwụ.” Olee otú o si mee ya? Ha kpere Jizọs ikpe n’ihi ebubo ụgha e boro ya na ọ na-agba ọchịchị ha mgba okpuru, mechaakwa gbuo ya. (Mat. 27:26) Ma, ahụ́ e merụrụ Jizọs lara n’oge na-adịghị anya n’ihi na Jehova kpọlitere ya.
18. (a) Olee mba ọhụrụ Jehova họọrọ ịbụ ndị ya, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? (b) Olee otú mkpụrụ nke agwọ ahụ si ka na-ebuso mkpụrụ nwaanyị ahụ iro mgbe ọnwụ Jizọs gachara?
18 Ndị ndú okpukpe Izrel na ndị Rom gbakọtara aka kpaa nkata igbu Jizọs, ọtụtụ ndị Izrel jụkwara ya. N’ihi ya, Jehova jụrụ mba Izrel. (Mat. 23:38; Ọrụ 2:22, 23) Ọ họọrọ mba ọhụrụ ga-abụ ndị ya, ya bụ, “Izrel nke Chineke.” (Gal. 3:26-29; 6:16) Mba ahụ bụ ọgbakọ nke Ndị Kraịst e tere mmanụ, nke ma ndị Juu ma ndị Jentaịl nọ na ya. (Efe. 2:11-18) Mgbe ọnwụ Jizọs na mbilite n’ọnwụ ya gachara, mkpụrụ nke agwọ ahụ ka nọ na-akpọ mkpụrụ nwaanyị ahụ asị ma na-alụso ya ọgụ. Ndị Rom gbalịrị ugboro ugboro ikpochapụ ọgbakọ Ndị Kraịst, nke so bụrụ mkpụrụ nwaanyị ahụ.c
19. (a) Olee otú Daniel si kọwaa mba nke isii ga-achị ụwa? (b) Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu ọzọ?
19 Ná nrọ ahụ Daniel kọwaara Nebukadneza, ogwe ụkwụ ígwè nke ihe oyiyi ahụ nọchiri anya Rom. (Dan. 2:33) Daniel hụkwara ọhụụ kọwara Alaeze Ukwu Rom nke ọma nakwa mba ọzọ ga-esi na ya pụta, nke ga-anara ya ọchịchị ụwa. (Gụọ Daniel 7:7, 8.) Ruo ọtụtụ narị afọ, ndị iro Rom na-ele ya anya ka anụ ọhịa “nke na-emenye ụjọ ma dị egwu.” Ma, amụma ahụ kwuru na “mpi iri” ga-epulite n’alaeze ukwu ahụ nakwa na mpi ọzọ ga-esi ezigbo ike ga-epulitekwa n’etiti ha. Olee ndị mpi iri ahụ nọchiri anya ha, oleekwa mba mpi ahụ nke dị ntakịrị nọchiri anya ya? Gịnị jikọrọ mpi ahụ dị ntakịrị na nnukwu ihe oyiyi ahụ Nebukadneza hụrụ ná nrọ? Isiokwu dị na peeji nke 14 ga-aza ajụjụ ndị a.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nwaanyị ahụ nọchiri anya nzukọ Chineke yiri nwunye ya, nke ndị nọ na ya bụ ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe.—Aịza. 54:1; Gal. 4:26; Mkpu. 12:1, 2.
b Isi ihe oyiyi ahụ dị n’akwụkwọ Daniel na isi nke atọ nke anụ ọhịa ahụ dị n’akwụkwọ Mkpughe nọchichara anya Babịlọn. Gaa na chaatị dị na peeji nke 12-13.
c Ọ bụ ezie na Rom bibiri Jeruselem n’afọ 70 O.A., mbibi ahụ esoghị mezuo Jenesis 3:15. N’oge ahụ, mba Izrel abụkwaghị ndị Chineke họọrọ.
-
-
Jehova Na-ekpughe “Ihe Ndị Na-aghaghị Ime N’oge Na-adịghị Anya”Ụlọ Nche—2012 | Jun 15
-
-
Jehova Na-ekpughe “Ihe Ndị Na-aghaghị Ime N’oge Na-adịghị Anya”
“Mkpughe nke si n’aka Jizọs Kraịst, nke Chineke kpugheere ya ka o gosi ndị ohu ya ihe ndị na-aghaghị ime n’oge na-adịghị anya.”—MKPU. 1:1.
GỊNỊ KA Ị GA-AZA?
Ná nnukwu ihe oyiyi ahụ, olee ihe nọchiri anya Briten na Amerịka?
Gịnị ka Jọn kwuru n’ọhụụ ya nke gosiri na Briten na Amerịka na-enye Òtù Mba Ụwa ike?
Olee otú ọhụụ Daniel na Jọn si gosi na a ga-ebibi ọchịchị ụmụ mmadụ?
1, 2. (a) Gịnị ka amụma Daniel na Jọn na-enyere anyị aka ịghọta? (b) Olee mba ndị isi isii mbụ nke anụ ahụ nọchiri anya ha?
Ọ BỤRỤ na anyị atụlee amụma Daniel na nke Jọn, anyị ga-aghọta ihe ọtụtụ ihe ndị na-eme ugbu a na ndị ka ga-eme n’ọdịnihu pụtara. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa nke Jọn hụrụ n’ọhụụ, n’anụ ọhịa nwere mpi iri nke Daniel hụrụ nakwa n’ihe Daniel kwuru banyere nnukwu ihe oyiyi ahụ Nebukadneza hụrụ ná nrọ? Oleekwa ihe anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị aghọta amụma ndị ahụ nke ọma?
2 Ka anyị tụlee anụ ọhịa ahụ Jọn hụrụ n’ọhụụ. (Mkpu., isi 13) N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị hụrụ na isi isii mbụ nke anụ ọhịa ahụ nọchiri anya Ijipt, Asiria, Babịlọn, Midia na Peshia, Gris, na Rom. Ha niile gosiri na ha kpọrọ mkpụrụ nwaanyị ahụ asị. (Jen. 3:15) Ọ bụ Rom, bụ́ isi nke isii nke anụ ọhịa ahụ, na-achị ụwa mgbe Jọn dere ọhụụ ahụ, ọ chịkwara ọtụtụ narị afọ mgbe e dechara ọhụụ ahụ. Isi nke asaa ga-emecha nara Rom ọchịchị ụwa. Olee mba ọ ga-emecha bụrụ, oleekwa otú ọ ga-esi mesoo mkpụrụ nwaanyị ahụ?
MGBE BRITEN NA AMERỊKA MALITERE ỊCHỊ ỤWA
3. Gịnị ka anụ ọhịa ahụ dị egwu nwere mpi iri nọchiri anya ya, gịnịkwa ka mpi iri ahụ nọchiri anya ha?
3 Anyị ga-amata mba isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe isi 13 nọchiri anya ya ma ọ bụrụ na anyị atụlee ọhụụ Jọn na anụ ọhịa ahụ dị egwu nke nwere mpi iri Daniel hụrụ n’ọhụụ.a (Gụọ Daniel 7:7, 8, 23, 24.) Anụ ọhịa ahụ Daniel hụrụ nọchiri anya Rom, bụ́ mba chịrị ụwa. (Gaa na chaatị dị na peeji nke 12-13.) Ihe dị ka narị afọ anọ Kraịst nwụchara, Alaeze Ukwu Rom malitere itisa. Mpi iri ndị pulitere n’isi anụ ọhịa ahụ dị egwu nọchiri anya alaeze ndị si n’Alaeze Ukwu Rom pụta.
4, 5. (a) Gịnị ka mpi ahụ nke dị ntakịrị mere? (b) Gịnị bụ isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ?
4 Baịbụl kwuru ihe mere anọ n’ime mpi ndị ahụ ma ọ bụ alaeze ndị ahụ pulitere n’isi anụ ọhịa ahụ dị egwu. Mpi ọzọ “nke dị ntakịrị” fopụrụ atọ n’ime mpi ndị ahụ. Nke a mezuru mgbe Briten, bụ́ mba nọbu n’okpuru Alaeze Ukwu Rom, ghọrọ ọchịchị a ma ama. Ruo na narị afọ nke iri na asaa, Briten bụ ọchịchị a na-amaghị ama. E nwere mba atọ ndị ọzọ ha na ya nọ n’okpuru Rom, bụ́ ndị a ma ama karịa ya. Mba ndị ahụ bụ Spen, Nedalandz, na Frans. Briten fopụrụ ha atọ otu otu, ghọzie mba a ma ama karịa ha. N’ihe dị ka narị afọ atọ gara aga, Briten achọwala ịghọ ọchịchị kasị ike n’ụwa. Ma, ọ ghọbeghị isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ.
5 N’agbanyeghị na Briten ghọrọ alaeze kacha ike, ụfọdụ mba ha na-achị nupụụrụ ha isi ma ghọọ mba Amerịka. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị Briten kwere ka Amerịka ghọọ mba dị ike, ha jikwa ndị agha mmiri ha na-echebe ya. Mgbe ụbọchị Onyenwe anyị malitere n’afọ 1914, Briten aghọọla alaeze kacha ukwuu e nwetụrụla, Amerịka aghọọkwala mba kacha nwee ụlọ ọrụ na-emepụta ihe n’ụwa.b Mgbe a na-alụ Agha Ụwa Mbụ, Amerịka na Briten gbakọrọ aka lụọ agha. Ọ bụ mgbe ahụ ka isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ pụtara, ya bụ, Briten na Amerịka Bụ́ Mba Abụọ Jikọrọ Aka Na-achị Ụwa. Olee otú isi nke asaa ahụ si mesoo mkpụrụ nwaanyị ahụ?
6. Olee otú isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ sirila mesoo ndị Chineke?
6 Obere oge ụbọchị Onyenwe anyị malitechara, isi nke asaa ahụ malitere imegide ndị Chineke, bụ́ ụmụnna Kraịst ndị fọrọ n’ụwa. (Mat. 25:40) Jizọs mere ka anyị mata na n’oge ọnụnọ ya, ndị fọrọ ná mkpụrụ nwaanyị ahụ ka ga-anọ n’ụwa ma na-arụ ọrụ o nyere ha. (Mat. 24:45-47; Gal. 3:26-29) Briten na Amerịka busoro ndị nsọ ahụ agha. (Mkpu. 13:3, 7) Mgbe a na-alụ Agha Ụwa Mbụ, ọ kpagburu ndị Chineke, machibido ụfọdụ akwụkwọ ha iwu, tụọkwa ndị nnọchianya nke ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi mkpọrọ. Ọ fọrọ obere ka isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ kwụsị ozi ọma ndị Chineke na-ekwusa. Jehova gwara Jọn n’ọhụụ na ihe a ga-eme. Chineke gwakwara Jọn na ndị so ná mkpụrụ nwaanyị ahụ ga-amaliteghachi ikwusa ozi ọma. (Mkpu. 11:3, 7-11) Akụkọ ndị ohu Jehova n’oge a gosiri na ihe ndị ahụ mere.
BRITEN NA AMERỊKA NA ALA ALA ỤKWỤ AHỤ E JI ÍGWÈ NA ỤRỌ KPỤỌ
7. Gịnị jikọrọ isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ na nnukwu ihe oyiyi ahụ?
7 Olee ihe jikọrọ isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ na nnukwu ihe oyiyi ahụ? Briten si n’Alaeze Ukwu Rom pụta. Ebe ọ bụ na Amerịka si na Briten pụta, anyị nwere ike ikwu na o sikwa na Rom pụta. Ma, gịnị ka ala ala ụkwụ nke ihe oyiyi ahụ pụtara? Baịbụl kwuru na e ji ígwè na ụrọ kpụọ ya. (Gụọ Daniel 2:41-43.) Ihe a e kwuru banyere ala ala ụkwụ ihe oyiyi ahụ bụ ihe mere mgbe isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ pụtara, ya bụ, mgbe Briten na Amerịka gbakọrọ aka chịwa ụwa. Otú ahụ ígwè a gwakọtara ya na ụrọ na-agaghị esiru ike ka ígwè nkịtị, Briten na Amerịka esirughị ike ka Alaeze Ukwu Rom bụ́ ebe o si pụta. Gịnị mere ka ha ghara isi ike ka Rom?
8, 9. (a) Olee otú ọchịchị nke asaa ahụ chịrị ụwa si gosi na o siri ike ka ígwè? (b) Gịnị ka ala ala ụkwụ nke ihe oyiyi ahụ nọchiri anya ya?
8 Mgbe ụfọdụ, isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ gosiri na ya siri ike ka ígwè. Dị ka ihe atụ, o gosiri ike ya mgbe o meriri n’Agha Ụwa Mbụ. Mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ, o gosikwara ike ya.c Mgbe a lụchara agha ahụ, ọ ka nọkwa na-akpa ike iji gosi na ya siri ike ka ígwè. Ma, a gwakọtara ígwè ahụ na ụrọ kemgbe Briten na Amerịka malitere ịchị ụwa.
9 Ọ dịla anya ndị Jehova chọwara ịghọta ihe ala ala ụkwụ ihe oyiyi ahụ nọchiri anya ya. Daniel 2:41 kpọrọ ígwè ahụ na ụrọ ahụ gwakọtara agwakọta otu “alaeze,” ọ bụghị ọtụtụ alaeze. N’ihi ya, ụrọ ahụ nọchiri anya ihe ndị dị ka òtù na ndị dị iche iche nọ n’ebe Briten na Amerịka na-achị, bụ́ ndị na-eme ka ha ghara isi ike ka Alaeze Ukwu Rom, nke ígwè nọchiri anya ya. Amụma Daniel kpọrọ ụrọ ahụ “ụmụ mmadụ,” ma ọ bụ, ndị nkịtị. (Dan. 2:43) N’ọchịchị Briten na Amerịka, e nweela ọtụtụ ndị na-esi ọnwụ inweta ihe ndị ruuru ha, inwetakwu ihe ha chọrọ n’ụlọ ọrụ ha, nakwa mba ndị na-alụ ọgụ ka ha nwere onwe ha. Ihe a niile ha na-eme anaghị ekwe ka Briten na Amerịka kpaa ike ka ígwè. Ndị mmadụ nwere echiche dị iche iche banyere ọchịchị. Ọ na-esikwara ọtụtụ ndị ọchịchị a ma ama ike ime ihe ha chọrọ ime n’ihi na ọ bụ naanị obere ihe ka ha ji merie ná ntụliaka, ọtụtụ ndị anaghịkwa akwado ọchịchị ha. Daniel buru amụma, sị: “Alaeze ahụ ga-esi ike n’otu aka, ma n’aka nke ọzọ, ọ gaghị esi ike.”—Dan. 2:42; 2 Tim. 3:1-3.
10, 11. (a) Gịnị ga-eme “ala ala ụkwụ ahụ”? (b) Olee ihe anyị ghọtara banyere ole mkpịsị ụkwụ ihe oyiyi ahụ dị?
10 N’oge anyị a, Briten na Amerịka ka na-agbakọ aka, nke ka nke, n’ihe ndị dị mkpa. Amụma ndị ahụ e buru banyere nnukwu ihe oyiyi ahụ na anụ ọhịa ahụ mere ka o doo anyị anya na Briten na Amerịka bụ ọchịchị ikpeazụ ga-achị ụwa. Ọ bụ ezie na ha esirughị ike ka ọchịchị Rom, bụ́ ogwe ụkwụ ígwè nke ihe oyiyi ahụ, ha agaghị eji aka ha tisaa.
11 Ole mkpịsị ụkwụ ihe oyiyi ahụ dị ò nwere ihe pụrụ iche ọ pụtara? Chegodị echiche: N’ọhụụ ndị ọzọ Daniel hụrụ, o kwuru kpọmkwem ole ihe ụfọdụ dị. Dị ka ihe atụ, o kwuru mpi ole dị n’isi anụ ọhịa dị iche iche. Ole ihe ndị ahụ dị nwere ihe ha pụtara. Ma, mgbe Daniel na-akọwa ihe oyiyi ahụ, o kwughị ole mkpịsị ụkwụ ya dị. N’ihi ya, o yiri ka ole mkpịsị ụkwụ ihe oyiyi ahụ dị adịghị mkpa, otú ahụ ọ na-adịghị mkpa ikwuwe na o nwere aka abụọ, mkpịsị aka iri, na ụkwụ abụọ. Ma, Daniel kwuru hoo haa na e ji ígwè na ụrọ kpụọ mkpịsị ụkwụ ihe oyiyi ahụ. Ihe ọ kọwara mere ka anyị ghọta na Briten na Amerịka bụ ọchịchị ga na-achị ụwa mgbe “nkume” ahụ nke nọchiri anya Alaeze Chineke ga-akụrisị ala ala ụkwụ ihe oyiyi ahụ.—Dan. 2:45.
BRITEN NA AMERỊKA NA ANỤ ỌHỊA AHỤ NWERE MPI ABỤỌ
12, 13. Gịnị ka anụ ọhịa ahụ nwere mpi abụọ nọchiri anya ya, gịnịkwa ka o mere?
12 Ọ bụ eziokwu na ọchịchị Briten na Amerịka bụ ígwè na ụrọ a gwakọtara agwakọta, ọhụụ Jizọs gosiri Jọn mere ka a mata na ọchịchị a ga-arụ ọrụ dị mkpa n’oge ikpeazụ. Olee otú ọ ga-esi rụọ ya? Jọn hụrụ otu anụ ọhịa nwere mpi abụọ nke na-ekwu okwu ka dragọn. Gịnị ka anụ ọhịa a pụrụ iche nọchiri anya ya? O nwere mpi abụọ, n’ihi ya, ọ nọchiri anya mba abụọ gbakọrọ aka na-achị. Anụ ọhịa a Jọn hụrụ bụkwa Briten na Amerịka Bụ́ Mba Abụọ Jikọrọ Aka Na-achị Ụwa, ma ugbu a, ha rụrụ ọrụ pụrụ iche.—Gụọ Mkpughe 13:11-15.
13 Anụ ọhịa a kwuru ka e mee onyinyo nke anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa. Jọn kwuru na onyinyo nke anụ ọhịa ahụ ga-adị, kwụsị ịdị, ma pụta ọzọ. Nke ahụ bụkwa ihe mere otu òtù Briten na Amerịka mere ka e hiwe, bụ́ òtù e hiwere ka o jikọta mba dị iche iche ma bụrụ ọnụ na-ekwuru ha.d Òtù a pụtara mgbe Agha Ụwa Mbụ gachara, a kpọkwara ya Njikọ Mba Niile. O tisara mgbe Agha Ụwa nke Abụọ malitere. Mgbe a na-alụ agha ahụ, ndị Chineke kwuru na n’ihi amụma e buru ná Mkpughe, anụ ọhịa ahụ ga-apụta ọzọ. Ọ pụtakwara ọzọ, bụrụzie Òtù Mba Ụwa.—Mkpu. 17:8.
14. Olee otú onyinyo nke anụ ọhịa ahụ si bụrụ “eze nke asatọ”?
14 Jọn kpọrọ onyinyo nke anụ ọhịa ahụ “eze nke asatọ.” N’ihi gịnị? E kwughị na ọ bụ isi nke asatọ anụ ọhịa mbụ ahụ nwere. Ihe ọ bụ bụ naanị onyinyo nke anụ ọhịa ahụ. Ike ọ bụla o nwere bụ nke mba ndị so na ya nyere ya, karịsịa, ndị nke kacha akwado ya, bụ́ Briten na Amerịka. (Mkpu. 17:10, 11) Ma, e nyere ya ike ịchị ka eze ka o nwee ike ịrụ otu ọrụ dị mkpa ga-emetụta ụwa niile.
ONYINYO NKE ANỤ ỌHỊA AHỤ GA-ALA NWAANYỊ AKWỤNA AHỤ N’IYI
15, 16. Gịnị ka nwaanyị akwụna ahụ nọchiri anya ya, oleekwa ihe ndị na-akwadobu ya na-eme ugbu a?
15 Jọn kwuru na otu nwaanyị akwụna nọ n’elu otu anụ ọhịa nke na-acha uhie uhie, na-eduzikwa ya. Anụ ọhịa a na onyinyo nke anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa bụ otu ihe. A kpọrọ nwaanyị ahụ “Babịlọn Ukwu ahụ.” (Mkpu. 17:1-6) Nwaanyị akwụna a nọchiri anya okpukpe ụgha niile, karịsịa chọọchị Krisendọm. Okpukpe ụgha dị iche iche na-agọzi onyinyo nke anụ ọhịa ahụ ma na-agbalị ịgwa ya ihe ọ ga-eme.
16 Ma, n’ụbọchị Onyenwe anyị, ọtụtụ mmiri nke Babịlọn Ukwu ahụ nọ n’elu ya, ya bụ, ndị na-akwado ya, atawala n’ike n’ike. (Mkpu. 16:12; 17:15) Dị ka ihe atụ, mgbe mbụ onyinyo nke anụ ọhịa ahụ pụtara, chọọchị dị iche iche nke Krisendọm, bụ́ ndị a kacha mara amara na Babịlọn Ukwu ahụ, na-akpa ezigbo ike n’Ala Bekee. Taa, ọtụtụ ndị anaghịzi akwanyere chọọchị na ndị pastọ ha ùgwù. N’ezie, ha chere na okpukpe so na-akpata nsogbu n’ụwa. Kwa ụbọchị, ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n’okwu n’Ala Bekee na-ekwu ka e bibie okpukpe niile.
17. Gịnị ga-eme okpukpe ụgha n’oge na-adịghị anya, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
17 Ma, okpukpe ụgha agaghị eji nwayọọ nwayọọ nwụọ. Nwaanyị akwụna ahụ ka ga na-akpa ike, na-agbalị ka ndị eze ụwa na-eme ihe ọ chọrọ ruo mgbe Chineke ga-etinye otu ihe n’obi ndị ọchịchị ahụ. (Gụọ Mkpughe 17:16, 17.) Òtù Mba Ụwa nọchiri anya ndị na-achị ụwa Setan a. N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-eme ka ha lụso okpukpe ụgha ọgụ. Nwaanyị akwụna ahụ agaghịzi enwe ike ịgwa ndị ọchịchị ihe ha ga na-eme, ha ga-ebibikwa akụ̀ ya niile. Ihe dị ka iri afọ atọ gara aga, ụdị ihe ahụ yiri ihe na-agaghị eme eme. Taa, nwaanyị akwụna ahụ anọsizighị ike n’elu anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie. Ma, ọ gaghị eji nwayọọ nwayọọ dapụ. Ọ ga-ada na mberede, e bibiekwa ya.—Mkpu. 18:7, 8, 15-19.
A GA-EBIBI ANỤ ỌHỊA NDỊ AHỤ
18. (a) Gịnị ka anụ ọhịa ahụ ga-eme, gịnịkwa ga-esi na ya pụta? (b) Olee alaeze ndị Daniel 2:44 gosiri na Alaeze Chineke ga-ebibi? (Gụọ ihe e kwuru n’igbe dị na peeji nke 17.)
18 E bibichaa okpukpe ụgha, a ga-eme ka anụ ọhịa ahụ, bụ́ ọchịchị ụwa nke dị n’aka Setan, lụso Alaeze Chineke ọgụ. Ebe ọ bụ na ndị eze ụwa agaghị agali n’eluigwe, ha ga-alụso ndị na-akwado Alaeze Chineke n’ụwa ọgụ. A naghị ajụ ajụ ihe ga-eme ha. (Mkpu. 16:13-16; 17:12-14) Daniel kọwara otu ihe ga-eme n’agha ahụ. (Gụọ Daniel 2:44.) A ga-ebibi ma anụ ọhịa ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe 13:1, ma onyinyo ya ma anụ ọhịa ahụ nwere mpi abụọ.
19. Gịnị ka obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga-eme, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ime ugbu a?
19 Anyị bi mgbe isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ na-achị. O nweghị isi ọzọ ga-epulite n’isi anụ ọhịa ahụ tupu e bibie ya. Ọ bụ Briten na Amerịka ga na-achị ụwa mgbe a ga-ebibi okpukpe ụgha. Ihe ndị ahụ Daniel na Jọn buru n’amụma emezuola otú ha si dee ha. Obi kwesịrị isi anyị ike na a ga-ebibi okpukpe ụgha nakwa na agha Amagedọn ga-amalite n’oge na-adịghị anya. Chineke emeela ka anyị mara ihe ndị ga-emenụ. Ànyị ga-aṅa ntị n’amụma ndị a e ji adọ anyị aka ná ntị? (2 Pita 1:19) Anyị kwesịrị ịkwado Jehova na Alaeze ya ugbu a.—Mkpu. 14:6, 7.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Na Baịbụl, iri na-anọchikarị anya ihe zuru ezu. N’ebe a, ọ pụtara alaeze niile si n’Alaeze Ukwu Rom pụta.
b Alaeze Ukwu Briten na Amerịka dị adị kemgbe narị afọ nke iri na asatọ. Ma, ọhụụ Jọn gosiri na ha abụọ ga-agbakọ aka na-achị ụwa mgbe ụbọchị Onyenwe anyị ga-amalite. N’eziokwu, ọ bụ “n’ụbọchị Onyenwe anyị” ka ọhụụ ndị e dere ná Mkpughe ga-emezu. (Mkpu. 1:10) Ọ bụ mgbe a na-alụ Agha Ụwa Mbụ ka isi nke asaa ahụ ghọrọ ọchịchị na-achị ụwa.
c Daniel hụrụ na eze a ga-ebibi nnukwu ihe n’agha ahụ. O dere, sị: ‘Ọ ga-eweta mbibi n’ụzọ dị ịtụnanya.’ (Dan. 8:24) Dị ka ihe atụ, Amerịka bibiri nnukwu ihe mgbe ọ tụrụ ndị iro ha bọmbụ abụọ.
d Gụọ akwụkwọ bụ́ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! peeji nke 240, 241, 253.
[Igbe dị na peeji nke 17]
OLEE NDỊ BỤ́ “ALAEZE NDỊ A NIILE”?
Daniel 2:44 buru amụma na Alaeze Chineke “ga-egwepịa alaeze ndị a niile.” Amụma ahụ kwuru banyere naanị alaeze ndị so n’ihe oyiyi ahụ.
Gịnị ga-eme alaeze ndị ọzọ niile? Amụma e buru ná Mkpughe, nke kwuru banyere otu ihe ahụ, mere ka anyị ghọtakwuo ihe ga-eme alaeze ndị ahụ. O gosiri na a ga-akpọkọta “ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi” ka ha lụso Jehova ọgụ ‘n’oké ụbọchị nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.’ (Mkpu. 16:14; 19:19-21) N’ihi ya, ọ bụghị naanị alaeze ndị so n’ihe oyiyi ahụ ka a ga-ebibi n’Amagedọn, kama a ga-ebibikwa alaeze ụmụ mmadụ niile.
-
-
E Meela Ka Anyị Mata Eze Asatọ AhụỤlọ Nche—2012 | Jun 15
-
-
E Meela Ka Anyị Mata Eze Asatọ Ahụ
Akwụkwọ Daniel na Mkpughe mere ka anyị mata ndị eze asatọ ma ọ bụ ọchịchị asatọ, nakwa nke ga-achị ma ibe ya chịchaa. Ma, otú anyị ga-esi ghọta amụma ndị ahụ nke ọma bụ ịghọta amụma mbụ e dere na Baịbụl.
Kemgbe ụwa, Setan ahaziela mkpụrụ ya ka ọ bụrụ ọchịchị ma ọ bụ alaeze dị iche iche. (Luk 4:5, 6) Ma, ọ bụ naanị alaeze ole na ole bụ ndị kpagburu ndị Chineke, ya bụ, ndị Izrel oge ochie ma ọ bụ ọgbakọ Ndị Kraịst e tere mmanụ. Ọhụụ Daniel na Jọn kwuru banyere naanị ọchịchị asatọ kpara ike n’ụwa.
[Chaatị/Foto ndị dị na peeji nke 12]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
AMỤMA NDỊ E BURU AMỤMA NDỊ E BURU
N’AKWỤKWỌ DANIEL N’AKWỤKWỌ MKPUGHE
1. Ijipt
2. Asiria
3. Babịlọn
4. Midia na
Peshia
5. Gris
6. Rom
7. Briten na
Amerịkaa
8. Njikọ Mba Niile
na Òtù Mba Ụwab
NDỊ CHINEKE
2000 T.O.A.
Ebreham
1500
Mba Izrel
1000
Daniel 500
T.O.A./O.A.
Jọn
Izrel nke Chineke 500
1000
1500
2000 O.A.
[Okwu nkọwa dị na peeji nke 12]
a N’oge ọgwụgwụ, a ga-enwe ndị eze abụọ ahụ. Gụọ ihe dị na peeji nke 19.
b N’oge ọgwụgwụ, a ga-enwe ndị eze abụọ ahụ. Gụọ ihe dị na peeji nke 19.
[Foto]
Nnukwu ihe oyiyi ahụ (Dan. 2:31-45)
Anụ ọhịa anọ si n’oké osimiri pụta (Dan. 7:3-8, 17, 25)
Ebule na mkpi (Dan., isi 8)
Anụ ọhịa nke nwere isi asaa (Mkpu. 13:1-10, 16-18)
Anụ ọhịa nke nwere mpi abụọ kwuru ka e mee onyinyo nke anụ ọhịa ahụ (Mkpu. 13:11-15)
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
Ebe e si nweta foto: Ijipt na Rom: A natara British Museum ikike see foto a; Midia na Peshia: Musée du Louvre, Paris
-