Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ndị Bụ́ “Eze Ugwu” n’Oge Ikpeazụ
    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2020 | Mee
    • ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 19

      Ndị Bụ́ “Eze Ugwu” n’Oge Ikpeazụ

      “N’oge ikpeazụ, [eze ugwu] na eze ndịda ga-asọrịta mpi.”—DAN. 11:40.

      ABỤ NKE 150 Chọọ Chineke Ka O Chebe Gị

      IHE ISIOKWU A NA-EKWUa

      1. Gịnị ka amụma Baịbụl mere ka anyị mata?

      GỊNỊ ga-eme ndị ohu Chineke n’oge na-adịghị anya? Anyị ga-amatali azịza ya. Amụma Baịbụl na-eme ka anyị mata ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ ga-agbasa anyị niile. E nwere otu amụma Baịbụl mere ka anyị mata ihe ọchịchị ụfọdụ na-akpa ike n’ụwa ga-eme. Daniel isi nke iri na otu kwuru gbasara ọchịchị abụọ ga na-emegide ibe ha. Ọ kpọrọ ha eze ugwu na eze ndịda. Ọtụtụ n’ime ihe e buru n’amụma ahụ emezuola. N’ihi ya, obi siri anyị ike na ndị nke fọrọ afọ ga-emezukwa.

      2. Dị ka e kwuru na Jenesis 3:15 na Mkpughe 11:7 na 12:17, olee ihe ndị anyị kwesịrị iburu n’obi ka anyị na-eleba anya n’amụma Daniel?

      2 Iji ghọta amụma e buru na Daniel isi nke iri na otu nke ọma, anyị kwesịrị iburu n’obi na ndị amụma ahụ na-ekwu gbasara ha bụ ndị ọchịchị na ọchịchị ndị ahụ na-emegide ndị ohu Chineke. Ndị ohu Chineke dị ezigbo obere ma e jiri ha tụnyere ndị bi n’ụwa. Ma, gịnị mere ndị ọchịchị ji achọkarị imegide ha? Ọ bụ n’ihi na ihe Ekwensu na ụwa ya chọrọ bụ ikpochapụ ndị na-ejere Jehova na Jizọs ozi. (Gụọ Jenesis 3:15 na Mkpughe 11:7; 12:17.) Ihe ọzọ bụkwa na ihe e kwuru n’amụma Daniel na ihe e kwuru n’amụma ndị ọzọ dị na Baịbụl kwesịrị ịdaba. N’ihi ya, anyị kwesịrị ileba anya n’ihe ndị ọzọ e kwuru na Baịbụl ka anyị nwee ike ịghọta amụma Daniel nke ọma.

      3. Olee ihe ndị anyị ga-ekwu gbasara ha n’isiokwu a na nke na-eso ya?

      3 N’ihi ihe ndị a anyị kwuru, anyị ga-eleba anya na Daniel 11:25-39. Anyị ga-amata ndị bụ́ eze ugwu na eze ndịda malite n’afọ 1870 ruo 1991. Anyị ga-ahụkwa ihe mere anyị ji kwesị ịgbanwe otú anyị sibu ghọta ihe ụfọdụ e kwuru n’amụma ahụ. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-eleba anya n’ihe e kwuru na Daniel 11:40–12:1. Anyị ga-ekwukwa ihe ọhụrụ anyị ghọtara gbasara ihe amụma ahụ kwuru banyere ihe ga-emenụ malite n’afọ 1991 ruo n’agha Amagedọn. Ka ị na-amụ isiokwu abụọ a, ọ ga-adị mkpa ka ị gụọ ihe e dere na chaatị isiokwu ya bụ “Ndị Eze Na-amarịta Aka n’Oge Ikpeazụ.” Ma, ka anyị burugodị ụzọ mata ndị eze abụọ e kwuru gbasara ha n’amụma ahụ.

      OTÚ ANYỊ GA-ESI MATA EZE UGWU NA EZE NDỊDA

      4. Olee ihe atọ ga-enyere anyị aka ịmata ndị bụ eze ugwu na eze ndịda?

      4 “Eze ugwu” na “eze ndịda” bụ aha a kpọrọ ndị eze chịrị mba ndị nọ n’ebe ugwu na n’ebe ndịda mba Izrel oge ochie. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Lee ihe mmụọ ozi ziri Daniel ozi ahụ kwuru: “Abịawokwa m ime ka ị ghọta ihe ga-adakwasị ndị gị n’oge ikpeazụ.” (Dan. 10:14) Tupu Pentikọst afọ 33, ọ bụ mba Izrel bụ mba Chineke họọrọ. Malite mgbe ahụ gawa, Jehova mere ka o doo anya na ọ bụzi ndị na-eso ụzọ Kraịst bụ ndị ya. N’ihi ya, ndị amụma ahụ dị na Daniel isi iri na otu kacha gbasa bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst, ọ bụghị mba Izrel. (Ọrụ 2:1-4; Rom 9:6-8; Gal. 6:15, 16) Ndị bụ́ eze ugwu na eze ndịda nọkwa na-agbanwe kemgbe ahụ. Ma, e nwere ihe ha niile mere. Nke mbụ, ndị eze ndị ahụ megidere ndị na-efe Chineke. Nke abụọ, otú ha si mesoo ndị na-efe Chineke gosiri na ha kpọrọ ezi Chineke bụ́ Jehova asị. Nke atọ, ndị eze abụọ ahụ na-amarịta aka onye ga-aka ibe ya.

      5. Ànyị nwere ike ịmata ndị bụ́ eze ugwu na eze ndịda malite n’afọ 100 ruo afọ 1870? Kọwaa.

      5 Mgbe afọ 100 gachara, Ndị Kraịst adịgboroja batara n’ọgbakọ ezigbo Ndị Kraịst. Ha kụziwere ozizi ụgha ma mee ka ndị mmadụ ghara ịma eziokwu dị n’Okwu Chineke. Si mgbe ahụ ruo n’ihe dị ka afọ 1870, Chineke enweghị nzukọ ya n’elu ụwa. Ndị Kraịst adigboroja toro n’ike n’ike ka ata a ghara n’ubi a kụrụ ezi mkpụrụ ma mee ka a ghara ịmata ndị bụ́ ezigbo Ndị Kraịst. (Mat. 13:36-43) Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị mata ihe a? Ọ bụ n’ihi na o gosiri na amụma ahụ e buru gbasara eze ugwu na eze ndịda agbasaghị ndị eze ma ọ bụ ọchịchị ndị chịrị n’agbata afọ 100 na afọ 1870. E nweghị ndị bụ́ ndị ohu Chineke ha ga-akpagbu n’oge ahụ.b Ma, obere oge afọ 1870 gachara, a matara ndị bụ́ eze ugwu na eze ndịda. Olee otú anyị si mara?

      6. Olee mgbe a malitere ịmata ndị bụ́ ndị ohu Chineke? Kọwaa.

      6 Malite n’afọ 1870 gawa, ndị ohu Chineke malitere ịhazi onwe ha ka ha bụrụ otu ìgwè. Ọ bụ n’afọ ahụ ka Charles T. Russell na ndị enyi ya malitere ịnọkọ na-amụ Baịbụl. Nwanna Russell na ndị enyi ya jere ozi ka onye ozi ahụ e kwuru na ọ ‘ga-edozi ụzọ’ tupu e hiwe Alaeze Mesaya. (Mal. 3:1) Ihe a mere ka e nwee ndị bụ́ ndị ohu Chineke n’ụwa ọzọ. È nwere ọchịchị ndị nọ n’oge ahụ kpagburu ndị ohu Chineke? Ka anyị leba anya n’ihe ndị na-esonụ.

      ÒNYE BỤ EZE NDỊDA?

      7. Ònye bụ eze ndịda ruo mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Mbụ?

      7 N’afọ 1870, Briten ghọrọ alaeze ukwu kachanụ n’ụwa. Ọ bụkwa ndị agha ya kacha ike n’ụwa. Amụma Daniel kwuru banyere otu obere mpi nke meriri mpi atọ ndị ọzọ. Obere mpi ahụ nọchiri anya Briten, ebe mpi ndị nke ọzọ nọchiri anya Frans, Spen, na Nedalandz. (Dan. 7:7, 8) Ọ bụkwa Briten bụ eze ndịda ruo mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Mbụ. N’otu oge ahụ, Amerịka ghọrọ mba kacha baa ọgaranya. Ha na Briten malitekwara imekọ ihe ọnụ.

      8. Kemgbe oge ikpeazụ a, ònye bụ eze ndịda?

      8 N’oge a na-alụ Agha Ụwa nke Mbụ, Amerịka na Briten jikọrọ aka lụọ agha ma kpaa ezigbo ike. Ha mechara ghọọ mba abụọ kacha ike n’ụwa. Dị ka Daniel buru n’amụma, eze ahụ nwetara “ụsụụ ndị agha buru ibu.” (Dan. 11:25) Kemgbe oge ikpeazụ a, ọ bụ Briten na Amerịka jikọrọ aka bụrụ eze ndịda.c Ma, ònye bụ eze ugwu?

      Ihe Dị Iche Iche A Kpọrọ Ọchịchị Briten na Amerịka n’Amụma Baịbụl

      A kpọrọ eze ndịda, ya bụ, ọchịchị Briten na Amerịka, ihe dị iche iche n’amụma ndị dị na Baịbụl. A kpọrọ ya . . .

      • Ụkwụ e ji ígwè na ụrọ kpụọ.

        ala ala ụkwụ e ji ígwè na ụrọ kpụọ (Dan. 2:41-43)

      • Isi anụ ọhịa nwere ọtụtụ mpi. Otu obere mpi nwere anya na ọnụ si n’etiti mpi ndị ahụ pulite.

        mpi si n’isi anụ ọhịa na-emenye ụjọ pulite (Dan. 7:7, 8)

      • Anụ ọhịa nwere mpi iri na isi asaa.

        isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ (Mkpu. 13:1)

      • Anụ ọhịa nwere mpi abụọ.

        anụ ọhịa nwere mpi abụọ (Mkpu. 13:11-15)

      • Ụlọ ndị ọchịchị nọchiri anya ọchịchị Briten na Amerịka.

        “onye amụma ụgha” (Mkpu. 19:20)

      ÒNYE BỤ EZE UGWU?

      9. Olee mgbe eze ugwu pụtaghachiri, oleekwa otú amụma Daniel 11:25 si mezuo?

      9 N’afọ 1871, bụ́ afọ sochiri afọ Russell na ndị enyi ya malitechara ịna-amụkọ Baịbụl ọnụ, eze ugwu ọzọ pụtara. N’afọ ahụ, otu nwoke aha ya bụ Otto von Bismarck nyere aka mee ka e nwee Alaeze Ukwu Jamanị. Eze Prushịa aha ya bụ Wilhelm ghọrọ eze ukwu mbụ ya. Ọ họpụtakwara Bismarck ka ọ bụrụ onyeisi ala mbụ ya.d Ruokwa ọtụtụ afọ ndị sochiri ya, Jamanị ghọrọ mba dị ike. Ha chịkwara ọtụtụ mba dị n’Afrịka nakwa n’Oké Osimiri Pasifik. Jamanị malitekwara ịma Briten aka. (Gụọ Daniel 11:25.) Alaeze Ukwu Jamanị bịara nwee ndị agha fọrọ obere ka ha hara ka nke Briten. Jamanị ji ha lụsoo ndị iro ya ọgụ n’Agha Ụwa nke Mbụ.

      10. Olee otú Daniel 11:25b, 26 si mezuo?

      10 Daniel kwukwara ihe ga-eme Alaeze Ukwu Jamanị na ndị agha ya. O kwuru na eze ugwu ‘agaghị eguzoli.’ N’ihi gịnị? “N’ihi na ha ga-akpara ya nkata. Ọ bụ ndị na-eri nri ya pụrụ iche ga-eme ka ọ daa.” (Dan. 11:25b, 26a) N’oge Daniel, ndị ‘na-eje ozi n’ihu eze’ so ná ndị na-eri ihe “oriri pụrụ iche nke eze.” (Dan. 1:5) Ole ndị ka amụma a na-ekwu gbasara ha? Ọ bụ ndị isi n’Alaeze Ukwu Jamanị, ya bụ, ndị ọchịagha na ndị na-enye eze ndụmọdụ n’okwu gbasara agha. Ọ bụ ha mere e ji wepụ eze ha n’ọchịchị.e Amụma ahụ ekwughị naanị na alaeze ukwu ahụ ga-ada, kama o kwukwara ihe ga-eme n’agha ahụ o busoro eze ndịda. O kwuru gbasara eze ugwu, sị: “A ga-ekpochapụkwa ndị agha ya, a ga-egbukwa ọtụtụ ndị.” (Dan. 11:26b) N’Agha Ụwa nke Mbụ, e ‘kpochapụrụ’ ndị agha Jamanị, ‘gbuokwa ọtụtụ ndị,’ dị ka amụma ahụ kwuru. Ihe ahụ bụ agha a kacha gbuo ndị mmadụ na ya tupu oge ahụ.

      11. Gịnị ka eze ugwu na eze ndịda mere?

      11 Daniel 11:27, 28 kwuru ihe ga-eme tupu Agha Ụwa nke Mbụ ebido. Ọ sịrị na eze ugwu na eze ndịda “ga-anọ n’otu tebụl na-agha ụgha.” O kwukwara na eze ugwu ga-enweta “ọtụtụ ngwongwo.” Otú a o kwuru ya ka o sikwa mee. Jamanị na Briten gwara ibe ha na ha chọrọ udo. Ma, mgbe ha bidoro ịlụso ibe ha agha n’afọ 1914, a matara na ọ bụ ụgha ka ha ghara. Ọtụtụ afọ tupu afọ 1914, Jamanị ghọrọ mba nke abụọ kacha baa ọgaranya n’ụwa. Iji mezuo amụma dị na Daniel 11:29 na mbido amaokwu nke 30, Jamanị busoro eze ndịda agha, e merie ya.

      EZE ABỤỌ AHỤ LUSORO NDỊ CHINEKE ỌGỤ

      12. N’Agha Ụwa nke Mbụ, gịnị ka eze ugwu na eze ndịda mere?

      12 Malite n’afọ 1914 gawa, otú ndị eze abụọ ahụ si alụso ibe ha ọgụ na otú ha si alụso ndị Chineke ọgụ bịara ka njọ. Dị ka ihe atụ, n’Agha Ụwa nke Mbụ, ma ọchịchị Jamanị ma nke Briten kpagburu ndị Chineke jụrụ ịlụ agha. Ọchịchị Amerịka tụkwara ndị na-edu ndú n’ikwusa ozi ọma mkpọrọ. Mmegide a mezuru amụma dị na Mkpughe 11:7-10.

      13. Mgbe afọ 1930 gachara nakwa n’oge a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ, gịnị ka eze ugwu mere?

      13 Mgbe afọ 1930 gachara, eze ugwu ji obi ịta mmiri megide ndị Chineke, karịchaa, n’Agha Ụwa nke Abụọ. Mgbe ọchịchị Nazi malitere ịchị Jamanị, Hitler na ndị òtù ya machiri ọrụ ndị Chineke. Ha gburu ọtụtụ narị ndị Jehova, tụbakwa ọtụtụ puku n’ime ha n’ogige ịta ahụhụ. Daniel buru amụma na ihe ndị a ga-eme. Eze ugwu machiri ozi ọma anyị si otú ahụ ‘merụọ ebe nsọ,’ “wepụkwa àjà ahụ a na-achụ mgbe niile.” (Dan. 11:30b, 31a) Onye ndú ha bụ́ Hitler ṅụdịrị iyi na ya ga-ekpochapụ ndị Chineke na Jamanị.

      EZE UGWU ỌHỤRỤ APỤTA

      14. Ònye ghọrọ eze ugwu mgbe a lụchara Agha Ụwa nke Abụọ? Kọwaa.

      14 Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gachara, ọchịchị Kọmunist nke Sọviet Yuniọn ghọrọ eze ugwu. Ọ naara Jamanị ọtụtụ ebe ha na-achịbu. Ndị Sọviet Yuniọn kpagburu ndị niile kpebiri na ha ga na-erubere Chineke isi karịa ha otú ahụ ndị Nazi mere.

      15. Gịnị ka eze ugwu mere mgbe a lụchara Agha Ụwa nke Abụọ?

      15 Obere oge a lụchara Agha Ụwa nke Abụọ, eze ugwu ọhụrụ ahụ bụ́ Sọviet Yuniọn kpagburu ndị ohu Chineke. Mkpughe 12:15-17 ji mkpagbu ahụ ha kpagburu ndị ohu Chineke tụnyere “osimiri.” Dị ka amụma ahụ kwuru, eze ugwu machiri ozi ọma anyị ma chụga ọtụtụ puku ụmụnna anyị Saịberịa. Kemgbe oge ikpeazụ a malitere, eze ugwu ahụ na-akpagbu ndị Jehova n’ike n’ike, ma o nwebeghị ike ịkwụsị ọrụ anyị.f

      16. Olee otú ọchịchị Sọviet Yuniọn si mezuo amụma e buru na Daniel 11:37-39?

      16 Gụọ Daniel 11:37-39. Gịnị ka eze ugwu ahụ mere nke gosiri na o jighị “Chi ndị nna nna ya kpọrọ ihe”? Ọchịchị Sọviet Yuniọn kpebiri ikpochapụ okpukpe niile. N’ihi ya, ọ gbalịrị ime ka okpukpe ndị dị kemgbe ụwa ghara inwe ọnụ. Iji mezuo ihe a, kemgbe afọ 1918, ọchịchị Sọviet Yuniọn nyere iwu mere e ji bido ịkụziri ụmụ akwụkwọ na Chineke adịghị. Olee otú eze ugwu si “nye chi nke ebe dị iche iche e wusiri ike otuto”? O mefuru ego buru ibu n’ịzụ ndị agha ya, n’ime ka ndị agha ya bukwuo ibu, nakwa n’imepụta ngwá agha ọgwụrụ mba iji mee ka ọchịchị ya sikwuo ike. Ma eze ugwu ma eze ndịda mechara nweta ngwá agha ga-enwe ike igbu ọtụtụ ijeri mmadụ.

      NDỊ IRO ABỤỌ EJIKỌỌ AKA

      17. Gịnị bụ “ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu”?

      17 E nwere otu ihe gbara ọkpụrụkpụ eze ugwu na eze ndịda jikọrọ aka mee. Ha hiwere “ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu.” (Dan. 11:31) “Ihe arụ” ahụ bụ Òtù Mba Ụwa.

      18. Gịnị mere e ji kpọọ Òtù Mba Ụwa “ihe arụ”?

      18 Ihe mere e ji kpọọ Òtù Mba Ụwa “ihe arụ” bụ na ha sịrị na ha ga-eme ihe ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-emeli, ya bụ, ime ka udo dị n’ụwa niile. Amụma ahụ kwukwara na ihe arụ ahụ, bụ́ Òtù Mba Ụwa, “na-akpata ịtọgbọrọ n’efu,” n’ihi na ọ bụ ya ga-ebibi okpukpe ụgha niile.—Lee chaatị isiokwu ya bụ “Ndị Eze Na-amarịta Aka n’Oge Ikpeazụ.”

      GỊNỊ MERE ANYỊ JI KWESỊ ỊMATA GBASARA EZE UGWU NA EZE NDỊDA?

      19-20. (a) Olee ihe mere anyị ji kwesị ịmata gbasara eze ugwu na eze ndịda? (b) Olee ajụjụ a ga-aza n’isiokwu na-esonụ?

      19 Anyị kwesịrị ịmata gbasara eze ugwu na eze ndịda n’ihi na ọ na-egosi na amụma Daniel buru gbasara ha mezuru n’agbata afọ 1870 na afọ 1991. Ọ ga-eme ka obi sie anyị ike na ndị nke na-emezubeghị ga-emezukwa.

      20 N’afọ 1991, ọchịchị Sọviet Yuniọn dara. Ònye bụzi eze ugwu n’oge anyị a? A ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-esonụ.

      GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

      • Olee ihe atọ nyeere anyị aka ịmata ndị bụ́ “eze ugwu” na “eze ndịda”?

      • Ole ndị bụ́ eze ugwu na eze ndịda malite n’afọ 1870 ruo n’afọ 1991?

      • Gịnị mere anyị ji kwesị ịmata gbasara eze ugwu na eze ndịda?

      ABỤ NKE 128 Ka Anyị Tachie Obi Ruo Ọgwụgwụ

      a Anyị na-ahụ ihe gosiri na amụma Daniel gbasara “eze ugwu” na “eze ndịda” na-emezu. Gịnị mere obi ji sie anyị ike na ọ na-emezu? Gịnịkwa mere o ji dị mkpa ka anyị ghọta amụma ahụ nke ọma?

      b N’ihi ihe e kwuru ebe a, o yiri ka o kwesịghị ka a gụnye Eze Ukwu Rom bụ́ Aurelian (afọ 270 ruo afọ 275) ná ndị bụ́ “eze ugwu” ma ọ bụkwanụ gụnye Eze Nwaanyị Zenobia (afọ 267 ruo afọ 272) ná ndị bụ́ “eze ndịda.” A ga-eji ihe a dochie ihe e kwuru n’isi nke 13 na nke 14 n’akwụkwọ bụ́ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!

      c Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ihe Dị Iche Iche A Kpọrọ Ọchịchị Briten na Amerịka n’Amụma Baịbụl.”

      d N’afọ 1890, Kaiser Wilhelm nke Abụọ chụpụrụ Bismarck n’ọchịchị.

      e E nwere ọtụtụ ihe ha mere nke mere ka ọchịchị ha daa ngwa ngwa. Dị ka ihe atụ, ha kwụsịrị ịkwado eze ha, kọọkwara ndị ọzọ ihe nzuzo ha gbasara agha ahụ, manyekwa eze ahụ ka ọ gbaa arụkwaghịm.

      f Dị ka e kwuru na Daniel 11:34, e nwere mgbe eze ugwu ahụ kwụsịtụrụ ịkpagbu Ndị Kraịst, dị ka mgbe ọchịchị Sọviet Yuniọn dara n’afọ 1991.

  • Ònye Bụ “Eze Ugwu” Taa?
    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2020 | Mee
    • ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 20

      Ònye Bụ “Eze Ugwu” Taa?

      “Ọ ga-abịarukwa ọgwụgwụ ya, ọ dịghịkwa onye ga-enyere ya aka.”—DAN. 11:45.

      ABỤ NKE 95 Ìhè Na-enwusikwu Ike

      IHE ISIOKWU A NA-EKWUa

      1-2. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?

      E NWERE ọtụtụ ihe mere obi ji sie anyị ike ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ na anyị bi ná ngwụcha nke oge ikpeazụ. N’oge na-adịghị anya, Jehova na Jizọs Kraịst ga-ebibi ọchịchị niile na-emegide Alaeze Chineke. Ma tupu nke ahụ emee, eze ugwu na eze ndịda ga na-amarịta aka, ha ga na-emegidekwa ndị Chineke.

      2 N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’amụma dị na Daniel 11:40–12:1. Anyị ga-amata onye bụ́ eze ugwu ugbu a, kwuokwa ihe mere ụjọ ekwesịghị ịtụ anyị maka nsogbu ndị ga-abịara anyị n’ọdịnihu.

      E NWEELA EZE UGWU ỌHỤRỤ

      3-4. Ònye bụ eze ugwu taa? Kọwaa.

      3 Mgbe Sọviet Yuniọn dachara n’afọ 1991, ‘e nyetụụrụ’ ndị Chineke nọ n’ebe ahụ aka, ya bụ, ha nweretụụrụ onwe ha. (Dan. 11:34) N’ihi ya, ha nweere onwe ha ikwusa ozi ọma. Ọ dịghị anya, ndị nkwusa e nwere ná mba ọchịchị Kọmunist na-achị eruo ọtụtụ narị puku. Ka oge na-aga, Rọshịa na mba ndị na-akwado ya ghọrọ eze ugwu. Dị ka anyị kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, e nwere ihe atọ e ji amata ọchịchị bụ́ eze ugwu ma ọ bụ eze ndịda. Ha bụ: (1) ọ ga-emegide ndị na-efe Chineke, (2) otú o si emeso ndị na-efe Chineke ga-egosi na ọ kpọrọ Jehova na ndị ya asị, nakwa (3) ya na eze nke ọzọ ga na-amarịta aka.

      4 Lee ihe atọ mere anyị ji kwuo na ọ bụ Rọshịa na mba ndị na-akwado ya bụ eze ugwu taa. (1) Ha na-emegide ndị Chineke. Ha machiri ọtụtụ puku ụmụnna anyị bi n’ebe ha na-achị ikwusa ozi ọma, na-akpagbukwa ha. (2) Ihe ndị a ha na-eme gosiri na ha kpọrọ Chineke na ndị ya asị. (3) Ha na eze ndịda, bụ́ Briten na Amerịka, na-amarịtakwa aka. Ka anyị lee otú Rọshịa na mba ndị na-akwado ya si bụrụ eze ugwu.

      EZE UGWU NA EZE NDỊDA GA NA-ASỌRỊTA MPI

      5. Olee oge e kwuru okwu ya na Daniel 11:40-43, gịnịkwa ga-eme n’oge ahụ?

      5 Gụọ Daniel 11:40-43. Ihe e kwuru n’amụma a na-eme ka anyị mata ihe ga-eme n’oge ikpeazụ. Ọ kọwara otú eze ugwu na eze ndịda ga-esi na-asọrịta mpi. Dị ka Daniel buru n’amụma, n’oge ikpeazụ, eze ndịda na eze ugwu “ga-asọrịta mpi.”—Dan. 11:40.

      6. Olee ihe ndị gosiri na eze abụọ ahụ na-asọrịta mpi?

      6 Eze ugwu na eze ndịda ga na-amarịta aka n’ihi na nke ọ bụla n’ime ha chọrọ ịbụ ọchịchị kacha ike n’ụwa. Dị ka ihe atụ, chegodị ihe mere mgbe a lụchara Agha Ụwa nke Abụọ, mgbe Sọviet Yuniọn na mba ndị na-akwado ya chịwara ọtụtụ mba na Yurop. Ihe a mere ka eze ndịda na mba ndị ọzọ kwekọrịta ijikọ ndị agha ha iji megide eze ugwu. A kpọrọ ha NATO. Eze ugwu na eze ndịda na-emefu nnukwu ego iji mee ka ndị agha ha ka nke ibe ha. Eze ugwu lụsoro eze ndịda agha. Otú o si mee ya bụ na ọ kwadoro ndị iro eze ndịda n’Afrịka, Eshia, nakwa na Latịn Amerịka n’agha ha lụrụ. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, Rọshịa na mba ndị na-akwado ya esiela ezigbo ike n’ụwa. Ha na-ejikwa kọmputa alụso eze ndịda ọgụ. Ndị eze abụọ ahụ na-ebo ibe ha ebubo na ha na-eji kọmputa eme ka ibe ha na-emefu ego, na-ejikwa ya etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ha. Eze ugwu na-alụsokwa ndị Chineke ọgụ otú ahụ Daniel buru n’amụma.—Dan. 11:41.

      EZE UGWU BANYERE “N’ALA NKE IHE ỊCHỌ MMA”

      7. Gịnị bụ “ala nke Ihe Ịchọ Mma” ahụ?

      7 Daniel 11:41 kwuru na eze ugwu ga-abanye “n’ala nke Ihe Ịchọ Mma.” Gịnị bụ ala ahụ? N’oge ochie, ọ bụ ala Izrel. E weere ya ka ala kacha ala niile mma. (Ezik. 20:6) Ma, ihe mere o ji bụrụ ala kacha mma bụ na ọ bụ ebe a na-anọ efe Jehova. Kemgbe Pentikọst afọ 33, “ala” ahụ abụghịzi otu mba n’ihi na ndị na-efe Jehova nọzi n’ebe niile n’ụwa. Taa, “ala nke Ihe Ịchọ Mma” ahụ bụ ihe niile ndị Jehova na-eme n’ofufe ya, dị ka ịga ọmụmụ ihe na ikwusa ozi ọma.

      8. Olee otú eze ugwu si banye “n’ala nke Ihe Ịchọ Mma”?

      8 N’oge ikpeazụ, eze ugwu abanyela “n’ala nke Ihe Ịchọ Mma” ahụ ọtụtụ ugboro. Dị ka ihe atụ, mgbe ọchịchị ndị Nazi nke Jamani bụ eze ugwu, karịchaa, mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ, ọ banyere “n’ala nke Ihe Ịchọ Mma.” Otú o si mee ya bụ na ọ kpagburu ndị Chineke ma gbuo ha. Mgbe a lụchara Agha Ụwa nke Abụọ, Sọviet Yuniọn ghọrọ eze ugwu. Ọ banyere “n’ala nke Ihe Ịchọ Mma.” Otú o si mee ya bụ na ọ kpagburu ndị Chineke ma chụpụ ha n’ebe ha bi.

      9. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, olee otú Rọshịa na mba ndị na-akwado ya si banye “n’ala nke Ihe Ịchọ Mma”?

      9 N’afọ ndị na-adịbeghị anya, Rọshịa na mba ndị na-akwado ya banyere “n’ala nke Ihe Ịchọ Mma.” Olee otú ha si mee ya? N’afọ 2017, Rọshịa machiri ọrụ ndị Jehova, tụọkwa ụfọdụ ụmụnna anyị mkpọrọ. Ọ machiri akwụkwọ anyị, ma Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, jichiekwa alaka ụlọ ọrụ, Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ anyị niile dị na Rọshịa. Mgbe o mechara ihe a niile, Òtù Na-achị Isi kwuru n’afọ 2018 na ọ bụ Rọshịa na mba ndị na-akwado ya bụ eze ugwu. Ndị Jehova anaghị agba ọchịchị mgba okpuru ma ọ bụkwanụ na-achọ ka a gbanwee ya, ma mgbe ọ na-akpagbu ha. Kama nke ahụ, ha na-eme ihe Baịbụl kwuru, nke bụ́ ka ha na-ekpe ekpere maka “ndị niile nọ n’ọkwá dị elu,” karịchaa, mgbe ha na-ekpebi ihe ndị nwere ike ịgbasa ofufe anyị na-efe Chineke.—1 Tim. 2:1, 2.

      EZE UGWU Ọ̀ GA-EMERI EZE NDỊDA?

      10. Eze ugwu ọ̀ ga-emeri eze ndịda? Kọwaa.

      10 Amụma e buru na Daniel 11:40-45 kacha kwuo gbasara eze ugwu. Ọ̀ pụtara na eze ugwu ga-emeri eze ndịda? Mba. Eze ndịda ka ga-adị ruo mgbe Jehova na Jizọs ga-ebibi ọchịchị ụmụ mmadụ n’Amagedọn. (Mkpu. 19:20) Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ka anyị lee ihe amụma dị na Daniel na nke dị ná Mkpughe gosiri.

      Ebe otu nkume si n’ugwu bịara kụrie ụkwụ ihe oyiyi ahụ e ji ihe dị iche iche kpụọ.

      N’Amagedọn, Alaeze Chineke nke e ji tụnyere nkume ga-ebibi ọchịchị ụmụ mmadụ nke e ji tụnyere nnukwu ihe oyiyi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)

      11. Gịnị ka amụma e buru na Daniel 2:43-45 na-egosi? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

      11 Gụọ Daniel 2:43-45. Daniel onye amụma kọwara otu nnukwu ihe oyiyi e ji ihe dị iche iche kpụọ. Akụkụ dị iche iche nke ihe oyiyi ahụ nọchiri anya ọchịchị chịrị mba e nwere ọtụtụ ndị na-efe Chineke. Ha chịrị n’oge dị iche iche. E ji ígwè na ụrọ kpụọ ụkwụ ya. Ụkwụ ya ahụ nọchiri anya ọchịchị nke ikpeazụ bụ́ Briten na Amerịka. Amụma a na-egosi na Briten na Amerịka ga na-achị ruo mgbe Alaeze Chineke ga-abịa bibie ọchịchị ụmụ mmadụ niile.

      12. Gịnị ka isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ nọchiri anya ya, gịnịkwa mere ịmata ya ji dị mkpa?

      12 Jọn onyeozi kwukwara gbasara ọchịchị ndị chịrị mba e nwere ọtụtụ ndị na-efe Jehova. Jọn kọwara ọchịchị ndị a ka anụ ọhịa nwere isi asaa. Isi ya nke asaa nọchiri anya Briten na Amerịka Bụ́ Mba Abụọ Jikọrọ Aka Na-achị Ụwa. Ịmata isi nke asaa ahụ dị mkpa n’ihi na anụ ọhịa ahụ agaghị enwe isi ọzọ. Isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ ka ga na-achị mgbe Kraịst na ndị mmụọ ozi ya ga-abịa bibie ya na anụ ọhịa ahụ niile.b—Mkpu. 13:1, 2; 17:13, 14.

      GỊNỊ KA EZE UGWU GA-EME N’ỌDỊNIHU?

      13-14. Ònye bụ “Gọg nke ala Megọg,” gịnịkwa nwere ike ime ka ọ lụsowe ndị Chineke ọgụ?

      13 Amụma e dere n’Ezikiel mere ka anyị mata ihe ụfọdụ nwere ike ime tupu e bibie eze ugwu na eze ndịda. O yiri ka amụma e buru n’Ezikiel 38:10-23; Daniel 2:43-45; 11:44–12:1; na Mkpughe 16:13-16, 21 ọ̀ na-ekwu banyere ihe ga-eme n’otu oge. Ọ bụrụ otú ahụ, anyị ga-atụ anya na ihe ndị na-esonụ ga-eme.

      14 Oké mkpagbu malitechaa, “ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi” ga-ejikọ aka. (Mkpu. 16:13, 14; 19:19) Mba ndị ahụ jikọrọ aka ka Baịbụl kpọrọ “Gọg nke ala Megọg.” (Ezik. 38:2) Ha ga-alụso ndị Chineke niile ọgụ ma chọọ igbuchapụ ha. Gịnị mere ha ga-eji chọọ ilụso ndị Chineke ọgụ? N’amụma Jọn buru banyere oge a, o kwuru na nnukwu akụ́ mmiri ígwé ga-ada ndị iro Chineke. Akụ́ mmiri ígwé ahụ nwere ike ịnọchi anya ozi amamikpe ndị Jehova ga-ezi. O nwere ike ịbụ ozi ahụ ga-eme ka Gọg nke ala Megọg chọọ ikpochapụ ndị Chineke n’ụwa.—Mkpu. 16:21.

      15-16. (a) Olee ihe o nwere ike ịbụ ya ka Daniel 11:44, 45 na-ekwu okwu ya? (b) Gịnị ga-eme eze ugwu na mba ndị ọzọ so na Gọg nke ala Megọg?

      15 O nwere ike ịbụ ozi amamikpe a na ọgụ ikpeazụ a ga-alụso ndị Chineke ka e kwuru okwu ha na Daniel 11:44, 45. (Gụọ ya.) N’ebe ahụ, Daniel kwuru na ‘akụkọ ga-esi n’ebe ọwụwa anyanwụ na ebe ugwu’ ga-enye eze ugwu nsogbu, ya ejiri “ọnụma” pụọ. Ihe ọ ga-ebu n’obi bụ ịga “kpochapụ ọtụtụ ndị ma laa ha n’iyi.” “Ọtụtụ ndị” ahụ nwere ike ịbụ ndị Jehova.c O nwere ike ịbụ na ihe Daniel na-ekwu okwu ya bụ ọgụ ikpeazụ ahụ a ga-alụso ndị Chineke.

      16 Ọgụ a eze ugwu na mba ndị ọzọ ga-alụso ndị Chineke ga-akpasu Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ezigbo iwe, meekwa ka agha Amagedọn malite. (Mkpu. 16:14, 16) N’oge ahụ ka a ga-ebibi eze ugwu na mba ndị ọzọ so na Gọg nke ala Megọg. O nweghịkwa onye “ga-enyere ya aka.”—Dan. 11:45.

      Ebe Jizọs nọ n’elu ịnyịnya ọcha. Ọ dịkwa njikere ịgbapụ akụ́ ya. Ndị mmụọ ozi ndị ọzọ na-agba ịnyịnya ọcha, jirikwa mma agha n’aka.

      N’agha Amagedọn, Jizọs na ndị agha ya nke eluigwe ga-ebibi ụwa Ekwensu ma chebe ndị Chineke (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)

      17. Ònye bụ Maịkel “nnukwu onyeisi ahụ” e kwuru okwu ya na Daniel 12:1, gịnịkwa ka ọ na-eme?

      17 Daniel 12:1 kwuru otú a ga-esi bibie eze ugwu na mba ndị na-akwado ya nakwa otú a ga-esi zọpụta anyị. (Gụọ ya.) Gịnị ka ihe e kwuru n’amaokwu a pụtara? Maịkel bụ aha ọzọ nke Eze anyị na-achị ugbu a bụ́ Jizọs Kraịst. Jizọs “guzo ọtọ n’ihi” ndị Chineke kemgbe afọ 1914 e hiwere Alaeze Chineke n’eluigwe. N’oge na-adịghị anya, ọ “ga-ebili” ma laa ndị iro Chineke n’iyi n’agha Amagedọn. Agha ahụ ga-abụ ihe ikpeazụ ga-eme n’ihe ndị Daniel kpọrọ “oge ahụhụ” kachanụ e nwetụrụla. Amụma Jọn dị ná Mkpughe kpọrọ ihe ga-eme obere oge tupu Amagedọn “oké mkpagbu.”—Mkpu. 6:2; 7:14.

      À ‘GA-EDE AHA GỊ N’AKWỤKWỌ’ AHỤ?

      18. Gịnị mere ụjọ ihe ga-eme n’ọdịnihu ekwesịghị ịtụ anyị?

      18 Daniel na Jọn kwuru na Jehova na Jizọs ga-azọpụta ndị na-ejere ha ozi n’oge oké mkpagbu. N’ihi ya, ụjọ agaghị atụ anyị n’agbanyeghị ihe nwere ike ime mgbe ahụ. Daniel kwuru na ndị a ga-azọpụta bụ ndị ‘e dere aha ha n’akwụkwọ.’ (Dan. 12:1) Gịnị ka anyị ga-eme ka e dee aha anyị n’akwụkwọ ahụ? Anyị ga-eme ihe gosiri na anyị nwere okwukwe na Jizọs bụ́ Nwa Atụrụ Chineke. (Jọn 1:29) Anyị ga-eme baptizim iji gosi na anyị enyefeela Chineke onwe anyị. (1 Pita 3:21) Ihe ọzọ bụ na anyị ga-enyere ndị ọzọ aka ịmara Jehova iji gosi na anyị na-akwado Alaeze Chineke.

      19. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ugbu a? N’ihi gịnịkwa?

      19 Anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova na nzukọ nke ndị ya obi ugbu a. Ihe a bụ oge anyị kwesịrị ikwado Alaeze Chineke. Anyị mee otú ahụ, a ga-azọpụta anyị mgbe Alaeze Chineke ga-ebibi eze ugwu na eze ndịda.

      GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

      • Ònye bụ “eze ugwu” taa?

      • Olee otú eze ugwu si banye “n’ala nke Ihe Ịchọ Mma”?

      • Gịnị ga-eme eze ugwu na eze ndịda?

      ABỤ NKE 149 Abụ Mmeri

      a Ònye bụ “eze ugwu” taa, oleekwa otú a ga-esi bibie ya? Ịmata azịza ajụjụ ndị a ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike, nyekwara anyị aka ijikere maka nsogbu ndị ga-abịara anyị n’ọdịnihu.

      b Iji matakwuo otú e si kọwaa Daniel 2:36-45 na Mkpughe 13:1, 2, gụọ Ụlọ Nche nke Jun 15, 2012, peeji nke 7 ruo na nke 19.

      c Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu gbasara ya, gụọ Ụlọ Nche Mee 15, 2015, peeji nke 29-30.

  • Ndị Eze Na-amarịta Aka n’Oge Ikpeazụ
    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2020 | Mee
    • Ndị Eze Na-amarịta Aka n’Oge Ikpeazụ

      Ụfọdụ amụma ndị e kwuru gbasara ha na chaatị a mezuru n’otu oge. Ha niile na-egosi na anyị bi “n’oge ikpeazụ.”—Dan. 12:4.

      Chaatị gosiri amụma ndị e buru na ndị bụ́ eze ugwu na eze ndịda malite n’afọ 1870 ruo taa.
      • Chaatị nke mbụ, gosiri amụma ndị mezuru otu mgbe n’oge ikpeazụ malite n’ihe dị ka n’afọ 1870 ruo n’afọ 1918. Oge ikpeazụ bidoro n’afọ 1914 gawa. Amụma nke 1: Anụ ọhịa nwere isi asaa dị tupu afọ mbụ na chaatị a bụ́ afọ 1870. N’Agha Ụwa nke Mbụ, e merụrụ isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ ahụ́. Malite n’afọ 1917 gawa, isi nke asaa ahụ gbakere, anụ ọhịa ahụ esiekwa ike ọzọ. Amụma nke 2: E nweziri ike ịmata eze ugwu malite n’afọ 1871 na eze ndịda malite n’afọ 1870. N’afọ 1871, Jamanị ghọrọ eze ugwu. Ọ bụ Briten bụbu eze ndịda, ma, n’afọ 1917, ọchịchị Briten na Amerịka nọchiri ya. Amụma nke 3: Malite n’afọ 1870, ọ bụ Charles T. Russell na ndị enyi ya bụ “onye ozi” ahụ. Malite n’afọ 1881, Zion’s Watch Tower gbara ndị na-agụ ya ume ka ha kwusawa ozi ọma. Amụma nke 4: Malite n’afọ 1914, oge owuwe ihe ubi; e kewara ata na ọka wit. Amụma nke 5: Malite n’afọ 1917, anyị matara ndị bụ́ ụkwụ ígwè na ụrọ ahụ. Ihe ndị ọzọ chaatị a gosiri: Ihe ndị merenụ malite n’afọ 1914 ruo n’afọ 1918, Agha Ụwa nke Mbụ. Ihe ndị e mere ndị Jehova: Malite n’afọ 1914 ruo n’afọ 1918, a tụrụ Ndị Mmụta Baịbụl nọ na Briten na Jamanị mkpọrọ. N’afọ 1918, a tụrụ ụfọdụ ụmụnna nọ n’isi ụlọ ọrụ anyị dị n’Amerịka mkpọrọ.
        Amụma nke 1.

        Amaokwu Baịbụl Mkpu. 11:7; 12:13, 17; 13:1-8, 12

        Amụma “Anụ ọhịa ahụ” achịala ụwa ruo ọtụtụ puku afọ. N’oge ikpeazụ, e merụrụ isi ya nke asaa ahụ́. Ahụ́ ahụ e merụrụ ya mechara laa, “ụwa niile” esorokwa anụ ọhịa ahụ. Setan na-eji anụ ọhịa ahụ ebuso “ndị fọdụrụ” agha.

        Mmezu ya Mgbe Iju Mmiri ahụ gachara, ndị ọchịchị bụ́ ndị iro Jehova malitere ịchị. Mgbe ihe karịrị puku afọ atọ gara, n’Agha Ụwa nke Mbụ, e mere ka ọchịchị Briten ghara ịdịkwa ike. Ọ dịghachiri ike mgbe ya na Amerịka jikọrọ aka. Ekwensu na-eji ọchịchị niile dị n’ụwa emegide ndị ohu Chineke, karịchaa n’oge ikpeazụ a.

      • Amụma nke 2.

        Amaokwu Baịbụl Dan. 11:25-45

        Amụma Eze ugwu na eze ndịda ga na-amarịta aka n’oge ikpeazụ.

        Mmezu ya Jamanị busoro Briten na Amerịka agha. N’afọ 1945, Sọviet Yuniọn na mba ndị na-akwado ya ghọrọ eze ugwu. N’afọ 1991, Sọviet Yuniọn dara. Mgbe e mechara, Rọshịa na mba ndị na-akwado ya ghọrọ eze ugwu.

      • Amụma nke 3.

        Amaokwu Baịbụl Aịza. 61:1; Mal. 3:1; Luk 4:18

        Amụma Jehova zigara “onye ozi” ya ka ‘o dozie ụzọ’ tupu e hiwe Alaeze Mesaya. Onye ozi ahụ malitere “izi ndị dị umeala n’obi ozi ọma.”

        Mmezu ya Malite n’afọ 1870, Nwanna C. T. Russell na ndị enyi ya ji ịnụ ọkụ n’obi mụọ Baịbụl iji mata eziokwu Baịbụl na-akụzi. N’afọ 1881, ha chọpụtara na ọ dị ezigbo mkpa ka ndị ohu Chineke na-ekwusa ozi ọma. Ha wepụtara isiokwu ndị dị ka, “A Chọrọ Otu Puku Ndị Nkwusa” na “Ndị E Tere Mmanụ Ikwusa Ozi Ọma.”

      • Amụma nke 4.

        Amaokwu Baịbụl Mat. 13:24-30, 36-43

        Amụma Onye iro kụrụ ata n’ubi a kụrụ ọka wit. Ata ahụ toro ma mee ka a ghara ịmata ọka wit ahụ. N’oge owuwe ihe ubi, a chịkọtara ọka wit ma chịpụ ata iche.

        Mmezu ya Malite n’afọ 1870, a matara ihe dị iche n’ezigbo Ndị Kraịst na Ndị Kraịst ụgha. N’oge ikpeazụ, e kewapụrụ ezigbo Ndị Kraịst n’ebe Ndị Kraịst ụgha nọ.

      • Amụma nke 5.

        Amaokwu Baịbụl Dan. 2:31-33, 41-43

        Amụma E nwere ụkwụ ígwè na ụrọ n’ihe oyiyi ahụ e ji ihe dị iche iche kpụọ.

        Mmezu ya Ụrọ nọchiri anya ndị nkịtị Briten na Amerịka na-achị na-enupụrụ ha isi. Ndị ahụ mere ka ọchịchị ha ghara isi ike ka ígwè.

      • Chaatị nke 2, gosiri amụma ndị mezuru otu mgbe n’oge ikpeazụ malite n’ihe dị ka n’afọ 1919 ruo n’afọ 1945. Jamanị bụ eze ugwu ruo n’afọ 1945. Briten na Amerịka Bụ́ Mba Abụọ Jikọrọ Aka Na-achị Ụwa ghọrọ eze ndịda. Amụma nke 6: N’afọ 1919, ndị e tere mmanụ batara n’ọgbakọ e mere ka ọ dị ọcha. Malite n’afọ 1919, anyị kwusasiwere ozi ọma ike. Amụma nke 7: N’afọ 1920, E hiwere òtù Njikọ Mba Niile. Ọ nọgidere ruo ná mbido Agha Ụwa nke Abụọ. Ihe ndị ọzọ chaatị a gosiri: Amụma nke 1, anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa ka nọkwa. Amụma nke 5, ụkwụ ahụ e ji ígwè na ụrọ kpụọ ka nọkwa. Ihe ndị mere malite n’afọ 1939 ruo n’afọ 1945, Agha Ụwa nke Abụọ. Ihe ndị e mere ndị Jehova: Na Jamanị, malite n’afọ 1933 ruo n’afọ 1945, a tụrụ ihe karịrị 11,000 Ndịàmà Jehova mkpọrọ. Na Briten, malite n’afọ 1939 ruo n’afọ 1945, a tụrụ ụmụnna fọrọ obere ka ha ruo 1,600 mkpọrọ. N’Amerịka, malite n’afọ 1940 ruo n’afọ 1944, ndị iwe ji wakporo ụmụnna anyị ihe karịrị ugboro 2,500.
        Amụma nke 6.

        Amaokwu Baịbụl Mat. 13:30; 24:14, 45; 28:19, 20

        Amụma A chịbara “ọka wit” ahụ “n’ụlọ nkwakọba ihe,” họpụtakwa “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi” ka ọ na-elekọta “ezinụlọ” ahụ. “Ozi ọma nke a nke alaeze” malitekwara ịgbasa “n’elu ụwa dum mmadụ bi.”

        Mmezu ya N’afọ 1919, a họpụtara ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ka ọ na-elekọta ndị Chineke. Kemgbe ahụ, Ndị Mmụta Baịbụl ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. Taakwa, Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma n’ihe karịrị narị ala abụọ, na-ewepụtakwa ihe ndị e ji amụ Baịbụl n’ihe karịrị otu puku asụsụ.

      • Amụma nke 7.

        Amaokwu Baịbụl Dan. 12:11; Mkpu. 13:11, 14, 15

        Amụma Anụ ọhịa ahụ nwere mpi abụọ gwara ndị mmadụ ka ha mee “onyinyo nke dị ka anụ ọhịa ahụ.” O kunyekwara “onyinyo nke anụ ọhịa ahụ ume.”

        Mmezu ya Ọ bụ ọchịchị Briten na Amerịka malitere Njikọ Mba Niile. Mba ndị ọzọ mechara sonyere ha. Eze ugwu mechara soro ná Njikọ Mba Niile n’afọ 1926 ma pụọ n’afọ 1933. E kwuru na Njikọ Mba Niile ga-emeli ihe ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-eme, otú ahụ e kwukwara na Òtù Mba Ụwa ga-eme.

      • Chaatị nke 3, gosiri amụma ndị mezuru otu mgbe n’oge ikpeazụ malite n’afọ 1945 ruo n’afọ 1991. Sọviet Yuniọn na mba ndị na-akwado ya bụ eze ugwu ruo n’afọ 1991, Rọshịa na mba ndị na-akwado ya abụrụzie eze ugwu. Briten na Amerịka Bụ́ Mba Abụọ Jikọrọ Aka Na-achị Ụwa bụ eze ndịda. Amụma nke 8: Anwụrụ ọkụ ngwá agha ọgwụrụmba na-egosi mkpamkpa Briten na Amerịka kpara. Amụma nke 9: E hiwere Òtù Mba Ụwa n’afọ 1945, jiri ya dochie Njikọ Mba Niile. Ihe ndị ọzọ chaatị a gosiri: Amụma nke 1, anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa ka nọkwa. Amụma nke 5, ụkwụ ahụ e ji ígwè na ụrọ kpụọ ka nọkwa. Amụma nke 6, n’afọ 1945, e nwere ihe karịrị ndị nkwusa 156,000. N’afọ 1991, e nwere ihe karịrị ndị nkwusa 4,278,000. Ihe ndị e mere ndị Jehova: Na Sọviet Yuniọn, malite n’afọ 1945 ruo n’afọ 1951, a chụgara ọtụtụ puku ụmụnna anyị Saịberịa.
        Amụma nke 8.

        Amaokwu Baịbụl Dan. 8:23, 24

        Amụma Otu eze nke ihu ya na-emenye ụjọ ‘ga-eweta mbibi n’ụzọ dị ịtụnanya.’

        Mmezu ya Ọchịchị Briten na Amerịka egbuola ọtụtụ ndị, bibiekwa ọtụtụ ihe. Dị ka ihe atụ, n’Agha Ụwa nke Abụọ, Amerịka bibiri ọtụtụ ihe mgbe ha tụrụ ngwá agha ọgwụrụ mba abụọ n’obodo ndị iro ha.

      • Amụma nke 9.

        Amaokwu Baịbụl Dan. 11:31; Mkpu. 17:3, 7-11

        Amụma “Anụ ọhịa nke na-acha uhie uhie” nwere mpi iri si n’ime abis pụta. Ọ bụkwa eze nke asatọ. Akwụkwọ Daniel kpọrọ eze ahụ “ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu.”

        Mmezu ya Njikọ Mba Niile dara mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ. Mgbe agha ahụ biri, e hiwere Òtù Mba Ụwa. E kwuru na Òtù Mba Ụwa ga-emeli ihe Alaeze Chineke ga-eme, otú ahụkwa e kwuru na Njikọ Mba Niile bu ya ụzọ ga-eme. Òtù Mba Ụwa ga-alụso okpukpe ọgụ.

      • Chaatị nke 4, gosiri amụma ndị mezuru otu mgbe n’oge ikpeazụ malite n’oge anyị a ruo n’Amagedọn. Rọshịa na mba ndị na-akwado ya bụ eze ugwu. Briten na Amerịka Bụ́ Mba Abụọ Jikọrọ Aka Na-achị Ụwa bụ eze ndịda. Amụma nke 10: Ndị ndú ụwa ga-ekwu na e nweela ‘udo na obi iru ala.’ Nke ahụ gachaa, oké mkpagbu ebido. Amụma nke 11: Mba niile ga-ebibi okpukpe ụgha. Amụma nke 12: Ọchịchị ụwa ga-emegide ndị Chineke. A ga-achịkọta ndị e tere mmanụ gaa eluigwe. Amụma nke 13: Amagedọn. Onye nọ n’elu ịnyịnya ọcha ahụ ga-enwezu mmeri ya. E bibiri anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa; e bibiri ala ala ụkwụ nke ihe oyiyi ahụ e ji ígwè na ụrọ kpụọ. Ihe ndị ọzọ chaatị a gosiri: Amụma nke 1, anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa ka nọkwa ruo n’Amagedọn. Amụma nke 5, ala ala ụkwụ ahụ e ji ígwè na ụrọ kpụọ nọkwa ruo n’Amagedọn. Amụma nke 6, taa, e nwere ndị nkwusa karịrị 8,580,000. Ihe ndị e mere ndị Jehova: N’afọ 2017, ndị ọchịchị Rọshịa tụrụ Ndịàmà Jehova mkpọrọ, jichiekwa ụlọ ndị alaka ụlọ ọrụ anyị nwere.
        Amụma nke 10 na nke 11.

        Amaokwu Baịbụl 1 Tesa. 5:3; Mkpu. 17:16

        Amụma Mba niile ga-ekwu na e nweela “udo na obi iru ala.” “Mpi iri ahụ” na “anụ ọhịa ahụ” ga-ebibi “nwaanyị akwụna ahụ.” E mechaa, a ga-ebibi mba niile.

        Mmezu ya Mba dị iche iche nwere ike ikwu na ha emeela ka e nwee udo na obi iru ala. Mba ndị na-akwado Òtù Mba Ụwa ga-ebibi okpukpe ụgha. Ihe a ga-abụ mmalite nke oké mkpagbu. Oké mkpagbu ahụ ga-akwụsị mgbe a ga-ebibi ụwa Setan niile n’agha Amagedọn.

      • Amụma nke 12.

        Amaokwu Baịbụl Ezik. 38:11, 14-17; Mat. 24:31

        Amụma Gọg ga-abata n’ala ndị Chineke. E mechaa, ndị mmụọ ozi akpọrọ ‘ndị a họọrọ.’

        Mmezu ya Eze ugwu na ndị ọchịchị ụwa ndị ọzọ ga-alụso ndị Chineke ọgụ. Obere oge ha bidoro ịlụso ndị Chineke ọgụ, a ga-achịkọta ndị e tere mmanụ gaa eluigwe.

      • Amụma nke 13.

        Amaokwu Baịbụl Ezik. 38:18-23; Dan. 2:34, 35, 44, 45; Mkpu. 6:2; 16:14, 16; 17:14; 19:20

        Amụma “Onye nọ n’elu” “ịnyịnya ọcha” ahụ ga-enwezu “mmeri ya” mgbe ọ ga-ebibi Gọg na ndị agha ya. A tụbara “anụ ọhịa ahụ” “n’ime ọdọ ọkụ ahụ,” e bibiekwa nnukwu ihe oyiyi ahụ.

        Mmezu ya Eze nke Alaeze Chineke bụ́ Jizọs ga-abịa ịnapụta ndị Chineke. Jizọs na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga-eso ya chịa na ndị mmụọ ozi ga-ebibi mba dị iche iche jikọrọ aka. Otú ahụ ka a ga-esi ala ụwa Ekwensu n’iyi.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya