Na-enweta Obi Ụtọ n’Okwu Chineke
ONYE ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ onye ọ bụ “n’iwu Jehova ka [obi, NW] ụtọ ya dị.” Mmadụ dị otú ahụ na-atụgharị uche n’Okwu Chineke “ehihie na abalị.” (Ọma 1:1, 2) Ị̀ na-enweta obi ụtọ dị otú ahụ? Olee otú ị pụrụ isi mụbaa ọṅụ nke Okwu Chineke na-enye gị?
Ṅaa Ntị Ka Jehova Na-ekwu Okwu
Agụla nanị mkpụrụ okwu. Jiri anya nke uche hụ ọnọdụ ndị ị na-agụ banyere ha. Were ya na ị na-anụ olu nke ndị ahụ a na-ehota. Ka ị na-agụ isiakwụkwọ ndị mbụ nke Bible, nụrụ ka Jehova n’onwe ya na-ekpughe, nke nta nke nta, ihe e mere iji kwadebe ụwa maka mmadụ. Ṅaa ntị ka ọ na-agwa Ọkpara ya, bụ́ Onye Ọrụ Bụ́ Ọkà, na oge iji kepụta ụmụ mmadụ mbụ ahụ eruwo. See onyinyo nke ihe ahụ merenụ: Adam na Iv enupụ isi, Chineke amaa ha ikpe ma mesịakwa chụpụ ha na Paradaịs. (Jenesis, isi 1-3) Nwee mmetụta nke ịtụ ụjọ mgbe ị na-agụ na otu olu nke sitere n’eluigwe kwuru na Jizọs Kraịst bụ Ọkpara Chineke, onye ọ hụrụ n’anya, onye Chineke zitere ka ọ tọgbọ ndụ ya maka ihe a kpọrọ mmadụ. (Mat. 3:16, 17) Gbalịa iche n’echiche mmeghachi omume Jọn onyeozi mgbe ọ nụrụ ka Jehova na-ekwu, sị: “Lee! Ana m eme ihe nile ka ha dị ọhụrụ.” (Mkpu. 21:5) N’eziokwu, ịgụ Okwu Chineke n’ụzọ dị otú a bụ ihe omume na-enye obi ụtọ!
Nọgide na-agụ ihe ndekọ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ, ị ga-abịakwa mara Jehova dị ka onye dị ukwuu ma dị ebube. Ị ga-enwe mmetụta siri ike nke ịbụ onye a dọtara n’ebe Onye a nke hụrụ anyị n’anya nọ, nke na-emeso anyị ihe n’obi ebere, nke na-enyere anyị aka ma ọ bụrụ na anyị ejiri obi umeala nọgide na-agbalị ime uche ya, nke na-egosikwa anyị otú anyị ga-esi nwee ihe ịga nke ọma n’ihe nile anyị na-eme.—Josh. 1:8; Ọma 8:1; Aịsa. 41:10.
Ka ị na-etinyekwu oge n’ịgụ Bible, otú ahụ ka ị ga na-enwe afọ ojuju ka ukwuu ka ị na-amụtakwu ihe bụ́ uche Chineke maka gị. Ma obi ụtọ ị ga-enweta ga-akarị nnọọ nke ahụ. Mgbe ihe ị na-agụ na-enyere gị aka n’ụzọ dị gị mkpa iji jiri amamihe na-emeri nsogbu, ị ga-enwe mmetụta yiri nke ọbụ abụ ahụ bụ́ onye sịrị: “Oké ọrụ ka ihe àmà Gị nile bụ: n’ihi nke a ka mkpụrụ obi m chebeworo ha.” (Ọma 119:129) Gị onwe gị kwa ga-aṅụrị ọṅụ ka ị na-aghọta site n’Akwụkwọ Nsọ ụkpụrụ ndị na-enye aka ịkpụzi echiche gị na ọchịchọ gị n’ụzọ nke Chineke.—Aịsa. 55:8, 9.
Bible na-enye nduzi maka ụkpụrụ omume nke na-echebe anyị pụọ ná mmerụ ahụ́ ma na-egosi anyị ụzọ ziri ezi. Ka anyị na-agụ ya, anyị na-aghọta na Jehova bụ Nna nke maara nsogbu ndị ga-esi na ya pụta mgbe anyị kwere ka ọchịchọ nke anụ ahụ́ na-ezughị okè merie anyị. Ọ chọghị ka oké ihe ọjọọ ndị na-aghaghị isi n’ilelị ụkpụrụ omume ya ndị dị elu pụta dakwasị anyị. Ọ na-eche banyere anyị ma chọọ ka anyị bie ụdị ndụ nke kasị mma. Anyị ịgụ Okwu ya na-enyere anyị aka ịghọta n’ụzọ zuru ezu karị ụdị ngọzi ọ bụ inwe ya dị ka Chineke na Nna anyị nke eluigwe.
Na-agụ Bible Kwa Ụbọchị
Ọbụ abụ ahụ kwuru banyere mmadụ nke na-agụ Okwu Chineke kwa ụbọchị, sị: “Ihe ọ bụlakwa nke ọ na-eme, ọ na-eme ka ọ gaa nke ọma.” (Ọma 1:3) Ee, n’agbanyeghị ezughị okè anyị, n’agbanyeghị na anyị bi n’ajọ usoro ihe nke Setan, n’agbanyeghịkwa mgbalị Ekwensu na-eme iripịa anyị, ịgụ Okwu Chineke mgbe nile na itinye ihe dị n’ime ya n’ọrụ ga-enyere anyị aka inwe ihe ịga nke ọma n’ihe nile metụtara mmekọrịta anyị na Jehova.
Ebe anyị na-enweta nrụgide site n’usoro ihe ochie nke a, inweta echiche Onye Okike ọbụna ruo nwa mkpirikpi oge ndị bara uru kwa ụbọchị, pụrụ inye anyị ume. Ụfọdụ ndị, bụ́ ndị a tụrụ mkpọrọ n’ihi okwukwe ha nwetara nanị amaokwu ndị ha na-ahụ a na-ehota mgbe ụfọdụ n’isiokwu akwụkwọ akụkọ. Ha na-ebekapụta ha, buru ha n’isi, ma na-atụgharị uche na ha. Jehova gọziri mgbalị ha n’ihi na ha mere ihe ha nwere ike ime n’ọnọdụ ha n’inweta ihe ọmụma sitere n’Okwu Chineke. (Mat. 5:3) Ma, ihe ka ọtụtụ n’ime anyị nwere nnwere onwe buru ibu karịa nke ahụ. Anyị ekwesịghị ikwubi na nanị ịgụ otu amaokwu Bible ọkụ ọkụ otu ugboro n’ụbọchị ga-arụpụta, n’onwe ya, oké ihe dị ebube. Otú ọ dị, anyị ga-enweta ọtụtụ ngọzi ma ọ bụrụ na anyị ahazigharịa ihe ndị anyị na-ewere n’ihe ka mkpa ka anyị wee nwee ike ịgụ otu akụkụ Bible kwa ụbọchị, chebara ya echiche, ma tinye ya n’ọrụ ná ndụ anyị.
N’ikwu nke bụ́ eziokwu, atụmatụ ndị anyị ji nlezianya kasị mma mee pụrụ ịkụ afọ n’ala. Mgbe nke ahụ mere, anyị na-ebute ihe ndị dị mkpa n’ezie, ụzọ. Dị ka ihe atụ, anyị agaghị ama ụma hapụ ịṅụ mmiri ruo otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ. Ya mere, n’agbanyeghị ihe bilitere ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị, anyị kwesịrị iwepụtatụ oge iji nweta ume ọhụrụ site ná mmiri nke eziokwu.—Ọrụ 17:11.
Gụọ Okwu Chineke Dum
Ị̀ gụchawo Bible dum n’onwe gị? Echiche nke ịgụ malite na Jenesis ruo Mkpughe eyiwo ka ọ bụ ihe siri ike omume nye ụfọdụ ndị. N’ihi ya, ọtụtụ ndị, bụ́ ndị chọrọ ịgụ Bible dum malitere site n’ibu ụzọ gụọ Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. N’ihi gịnị? Eleghị anya ọ bụ n’ihi na ọ kaara ha mfe ịhụ otú akwụkwọ ndị ahụ nke Bible si emetụta ha dị ka ndị na-achọ ịgbaso nzọụkwụ Kraịst. Ma ọ bụ ikekwe n’ihi na Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst eyighị ka o buru ibu nke ukwuu ịgụ—nanị ihe ji nke nta karịa otu ụzọ n’ụzọ anọ nke Bible. Ma mgbe ha gụchara akwụkwọ 27, ha gafere n’akwụkwọ 39 nke Akwụkwọ Nsọ Hibru ma malite ịgụ na ịnụ ụtọ ha. Mgbe ha na-agụchala Akwụkwọ Nsọ Hibru, ha azụlitewo usoro nke ịgụ Bible mgbe nile, ya mere ha gara n’ihu ịgụ Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst nke ugboro abụọ ya, ha akwụsịbeghịkwa. N’otu aka ahụ, mee ka ịgụ Okwu Chineke kwa ụbọchị bụrụ ihe ị na-eme ná ndụ gị nile.
Ọ̀ dị onye ọ bụla n’ezinụlọ ma ọ bụ n’ọgbakọ gị nke na-apụghị ịgụ ihe? Gịnị ma ị wepụta onwe gị ịgụrụ ya Bible mgbe nile? Ị ga-erite uru, ya onwe ya ga-eritekwa ka ọ na-atụgharị uche n’ihe ọ na-anụ ma na-etinye ya n’ọrụ ná ndụ ya.—Mkpu. 1:3.
Ka oge na-aga, ị pụrụ ịchọ ịmalite ime ihe pụrụ iche n’ọgụgụ Bible gị. Ụfọdụ n’ime ha pụrụ ime ka ị ghọtakwuo otú akụkụ dị iche iche nke Bible siri metụta ibe ha. Ọ bụrụ na Bible gị nwere ntụaka etiti peeji, ha pụrụ iduga gị n’ụmụ irighiri ihe ụfọdụ dị n’akụkọ ahụ nakwa n’ihe ndekọ ndị yiri ya. Ha pụrụ inyere gị aka ịghọta ọnọdụ ndị dugara n’ide abụ ọma dị iche iche nakwa akwụkwọ ozi ndị ndịozi Jizọs Kraịst dere. Insight on the Scriptures na-enye ihe ọmụma dị ukwuu banyere ndị mmadụ, ebe dị iche iche, na àgwà ndị a kpọtụrụ aha na Bible. Chaatị dị iche iche na-adọrọ uche gaa ná mmezu nke amụma Bible dị iche iche, na-egosi ndị eze na ndị amụma ndị dịrị ndụ n’otu oge, ma na-enye oge ndị kasị yie mgbe ọtụtụ ihe omume ndị dị na Bible weere ọnọdụ.
Ka ị na-atụgharị uche n’ihe ị na-amụta, ị ga-aghọta ihe mere ọnọdụ ụfọdụ ji bilite n’etiti ndị Chineke. Ị ga-achọpụtakwa ihe mere Jehova ji mesoo ndị ya ihe otú o siri mesoo ha. Ị ga-ahụ otú Jehova si ele ihe ndị ọchịchị, ndị mmadụ, na ụmụ mmadụ n’otu n’otu na-eme anya. Nke a ga-eme ka ị ghọtakwuo otú o si eche echiche.
Akụkọ ihe mere eme nke Bible ga na-akpali mmasị gị karị mgbe i ji anya nke uche na-ahụ ebe ihe dị iche iche mere. Maapụ nke ala ndị a kpọtụrụ aha na Bible na-ekpughe ọdịdị ala nakwa ịdị anya nke otu ebe site n’ebe ọzọ. Dị ka ihe atụ, ebee ka o yikarịsịrị ka ụmụ Izrel hà si gabiga Oké Osimiri Uhie? Olee otú Ala Nkwa ahụ ha n’ibu? Olee ebe ndị Jizọs garuru ka ọ na-eje ozi elu ala ya? Ihe ndị dị aṅaa ka Pọl hụrụ na njem ozi ala ọzọ ya? Maapụ na nkọwa nke ọdịdị ala nke ebe dị iche iche na-enye ihe ọmụma zuru ezu nke ga-eme ka ihe ị na-agụ bụrụ nke na-akpali mmasị. Ebee ka ị pụrụ ịchọta maapụ nke ala ndị a kpọtụrụ aha na Bible? Ụfọdụ dị na New World Translation of the Holy Scriptures. Mpịakọta abụọ nke Insight nwere ihe dị ka maapụ 70, e nwekwara ndepụta ntụaka maapụ n’azụ mpịakọta nke mbụ ya. Jiri Watch Tower Publications Index chọta maapụ ndị ọzọ. Ọ bụrụ na akwụkwọ ndị a adịghị, jiri maapụ ndị a na-ebipụta n’Ụlọ Nche iji nyere gị aka, mee ihe n’ọgụgụ Bible gị.
N’Akwụkwọ Nsọ Hibru, Eze Devid nyere Jehova otuto dị ukwuu, na-asị: “Lee ka echiche Gị nile si dị oké ọnụ ahịa . . . , Chineke! Lee ka ọnụ ọgụgụ nile ha si dị ukwuu hie nne!” (Ọma 139:17) N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, Pọl onyeozi toro Jehova n’ihi na Ya Onwe Ya “enwuwokwa n’obi anyị iji were ihe ọmụma ahụ dị ebube banyere Chineke nye ha ìhè site n’ihu Kraịst.” (2Kọr. 4:6) Ọtụtụ narị afọ gafere n’agbata oge Devid dịrị ndụ na mgbe Pọl dịrị ndụ; n’agbanyeghị nke ahụ, ha abụọ nwetachara obi ụtọ n’Okwu Chineke. Gị onwe gị pụkwara inweta obi ụtọ ma ọ bụrụ na i wepụta oge iji gụọ ihe nile Jehova nyeworo gị na peeji nile nke Okwu ya sitere n’ike mmụọ nsọ.