Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w21 Eprel p. 30-p. 31 para. 5
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Anyị Ga-amụta n’Ihe Ndị Ikpeazụ Jizọs Kwuru
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Jizọs Gịnị Mere O Ji Nwụọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Azịza nke Ajụjụ Ndị A Na-ajụ Banyere Jizọs Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Otú Jizọs Si Gosi Na Chineke Bụ Onye Ezi Omume
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
w21 Eprel p. 30-p. 31 para. 5
Ebe a kpọgidere Jizọs n’etiti ndị omekome abụọ n’osisi ịta ahụhụ mgbe chi jiri.

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Mgbe ọ fọrọ obere ka Jizọs nwụọ, gịnị mere o ji kwuo ihe Devid kwuru n’Abụ Ọma 22:1?

Ihe e dere na Matiu 27:46 so n’ihe ikpeazụ Jizọs kwuru tupu ya anwụọ. Ebe ahụ sịrị: “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i ji hapụ m?” Jizọs ji ihe a o kwuru mezuo ihe ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid kwuru n’Abụ Ọma 22:1. (Mak 15:34) Ọ gaghị adị mma ma anyị kpebie na ihe mere Jizọs ji kwuo ihe ndị a bụ na o chere na Nna ya agharịpụla ya ma ọ bụkwanụ na ọ kwụsịtụrụ inwe okwukwe. Jizọs ghọtara ihe mere o ji kwesị ịnwụ. Ọ dịkwa njikere ịnwụ. (Mat. 16:21; 20:28) Jizọs makwa na n’oge ọ ga-anwụ, Jehova kwesịrị ịkwụsị ichebe ya. (Job 1:10) N’ihi ya, Jehova kwụsịrị ichebe Jizọs ka Jizọs nwee ike igosi na ọ ga-anọgide na-erubere Nna ya isi n’agbanyeghị ụdị ọnwụ ọ na-aga ịnwụ.—Mak 14:35, 36.

Gịnịzi mere Jizọs ji kwuo ihe e dere n’abụ ọma a? Ọ bụ eziokwu na anyị amaghị kpọmkwem ihe mere o ji kwuo ya, ma ka anyị leba anya n’ihe ndị o nwere ike ịbụ ha mere o ji kwuo ya.a

Jizọs ò ji ihe ahụ o kwuru na-egosi na Jehova agaghị egbochi ya ịnwụ? Jehova agaghị eme ka ihe dịrị Jizọs mfe mgbe ahụ ọ na-anwụ ka o jiri ndụ ya chụọ àjà. Ọ bụ mmadụ n’oge ahụ, o kwesịkwara ịnwụ ka o nwee ike idetụ “ọnwụ ire maka mmadụ niile.”—Hib. 2:9.

Jizọs ò ji ihe ahụ o kwuru mee ka ndị ọzọ chewe gbasara ihe ndị ọzọ e kwuru n’abụ ọma ahụ? N’oge ahụ, ndị Juu na-ebukarị ọtụtụ abụ ọma n’isi. Mgbe Jizọs chetaara ha ihe e kwuru n’otu amaokwu n’abụ ọma ahụ, ọ ga-abụ na o mere ka ha chewe gbasara ihe ndị ọzọ e kwuru n’abụ ọma ahụ. Ọ bụrụ ihe a ka Jizọs bu n’obi, ọ pụtara na o ji ya mee ka ndị na-eso ụzọ ya bụ́ ndị Juu cheta ọtụtụ amụma e buru gbasara ya n’abụ ọma ahụ gbasara ihe ndị ga-eme n’oge ọ ga-anwụ. (Ọma 22:7, 8, 15, 16, 18, 24) Ihe ọzọkwa bụ na ná ngwụcha abụ ọma ahụ, e toro Jehova, kwuokwa na ọ bụ ya na-achị ụwa niile.—Ọma 22:27-31.

Jizọs ò ji ihe ahụ o kwuru na-egosi na aka ya dị ọcha? Tupu Jizọs anwụọ, ha kpere ya ikpe arụrụala, makwa ya ikpe na ọ na-ekwulu Chineke. (Mat. 26:65, 66) Ndị Sanhedrin gbakọrọ n’ime abalị kpee ya ikpe otú megidere iwu obodo ha. (Mat. 26:59; Mak 14:56-59) Mgbe Jizọs kwuru ihe ahụ, o nwere ike ịbụ na o ji ya na-eme ka ndị mmadụ mata na o nweghị ihe ọjọọ ọ bụla o mere ha ga-eji taa ya ụdị ahụhụ ahụ.

Jizọs ò ji ihe ahụ o kwuru na-echetara ndị ọzọ na n’agbanyeghị na Chineke kwere ka Devid bụ́ onye dere abụ ọma ahụ taa ahụhụ, ọ pụtaghị na Jehova na Devid adịghịzi ná mma? Ajụjụ ahụ Devid jụrụ egosighị na o nweghịzi okwukwe. Mgbe ọ jụchara ajụjụ ahụ, o kwuru ihe ndị gosiri na obi siri ya ike na Jehova ga-anapụta ya. Jehova nọgidekwara na-agọzi ya. (Ọma 22:23, 24, 27) Otú ahụkwa ka ọ dị Jizọs bụ́ “Nwa Devid.” N’agbanyeghị na ọ tara ahụhụ n’elu osisi ịta ahụhụ, nke ahụ apụtaghị na ya na Jehova adịghịzi ná mma.—Mat. 21:9.

Jizọs ò ji ihe ahụ o kwuru na-egosi otú o si ewute ya na Jehova anaghịzi echebe ya ka o nwee ike igosi na ọ na-erubere ya isi? Ná mmalite, Jehova ebughị n’obi ka Ọkpara ya taa ahụhụ ma nwụọ. Ọ bụ mmehie ahụ Adam mere n’ogige Iden mere o ji dị mkpa ka Jizọs taa ahụhụ ma nwụọ. O nweghị ihe ọjọọ Jizọs mere. Ma, ọ dị mkpa ka ọ taa ahụhụ ma nwụọ ka o nwee ike ime ka o doo anya na ihe ahụ Ekwensu kwuru bụ ụgha, chụọkwa àjà iji gbapụta ụmụ mmadụ. (Mak 8:31; 1 Pita 2:21-24) Ihe ga-eme ka Jizọs mezuo ihe a bụ ma Jehova kwụsịtụ ichebe ya. Nke a ga-abụkwa nke mbụ ọ ga-eme ụdị ihe ahụ.

Jizọs ò ji ihe ahụ o kwuru na-eme ka ndị na-eso ụzọ ya chee gbasara ihe mere Jehova ji kwe ka ọ nwụọ ụdị ọnwụ a?b Jizọs ma na otú a ga-esi egbu ya ka onye omekome n’elu osisi ịta ahụhụ ga-eme ka ọtụtụ ndị sụọ ngọngọ. (1 Kọr. 1:23) Ọ bụrụ na ndị na-eso ụzọ ya elekwasị anya n’ihe mere o ji nwụọ, ha ga-aghọta ihe ọ pụtara. (Gal. 3:13, 14) Ha ga-amatazi na ọ bụ Onye Nzọpụta, ọ bụghị onye omekome.

N’agbanyeghị ihe mere Jizọs ji kwuo ihe a dị n’akwụkwọ Abụ Ọma, ọ ma na ọnwụ ahụ ọ ga-anwụ n’elu osisi ịta ahụhụ bụ iji mezuo uche Nna ya. Obere oge Jizọs kwuchara ihe ahụ e dere n’abụ ọma ahụ, ọ sịrị: “E mechawo ya!” (Jọn 19:30; Luk 22:37) N’eziokwu, otú ahụ Jehova si kwụsịtụ ichebe Jizọs mere ka Jizọs mezuo ihe niile Nna ya zitere ya n’ụwa ka o mee. O mekwara ka o mezuo ihe niile e dere gbasara ya “n’iwu Mozis na n’Akwụkwọ Ndị Amụma na Abụ Ọma.”—Luk 24:44.

a Gụọ paragraf nke 9 na nke 10 n’isiokwu bụ́ “Ihe Anyị Ga-amụta n’Ihe Ndị Ikpeazụ Jizọs Kwuru.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche a.

b N’oge Jizọs na-eje ozi ya n’ụwa, ihe mere o ji kwuo ihe ụfọdụ ma ọ bụ jụọ ajụjụ ụfọdụ abụghị iji gosi otú obi dị ya. Kama, ọ bụ ka ndị na-eso ụzọ ya nwee ike ikwu uche ha.—Mak 7:24-27; Jọn 6:1-5; gụọ Ụlọ Nche Ọktoba 15, 2010, peeji nke 4 na nke 5.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya