Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • M̀ Kwesịrị Ime Baptizim?—Nke 1: Ihe Baptizim Pụtara
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
    • Ebe a na-eme otu nwa okorobịa baptizim ná mgbakọ Ndịàmà Jehova.

      NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

      M̀ Kwesịrị Ime Baptizim?​—Nke 1: Ihe Baptizim Pụtara

      Kwa afọ, a na-eme ọtụtụ ndị na-eto eto nne na nna ha zụrụ ka ha bụrụ Ndịama Jehova baptizim. Ì chewala echiche ime baptizim? Ọ bụrụ otú ahụ, ihe mbụ i kwesịrị ime bụ ịghọta ihe inyefe Chineke onwe gị na ime baptizim pụtara.

      • Gịnị bụ baptizim?

      • Gịnị bụ inyefe Chineke onwe gị?

      • Gịnị mere ime baptizim ji dị mkpa?

      • Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

      • Ihe ndị bụ́ ụgha na ihe ndị bụ́ eziokwu

      Gịnị bụ baptizim?

      Baptizim e kwuru okwu ya na Baịbụl bụ imikpu mmadụ ná mmiri, ọ bụghị ifesa mmadụ mmiri n’isi. Imikpu mmadụ na mmiri nwekwaranụ ezigbo ihe ọ pụtara.

      • Imikpu gị ná mmiri n’oge a na-eme gị baptizim na-egosi ọhaneze na ị gaghịzi na-ebi ndụ otú dị gị mma.

      • Isi ná mmiri kulite gị na-egosi na ị malitela ibi ndụ ọhụrụ, nke ị ga na-emezi naanị ihe dị Chineke mma.

      I mee baptizim, o gosiri na i kwetara n’ihu ọha na ọ bụ Jehova kwesịrị ịna-agwa gị ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ nakwa na i kwela ya nkwa na ị ga na-eme ihe ọ bụla ọ chọrọ ka i mee.

      Ihe ị ga-echebara echiche: Gịnị mere i kwesịrị iji nọrọ n’ihu ọha mmadụ kwe Jehova nkwa na ị ga na-erubere ya isi ná ndụ gị niile? Gụọ 1 Jọn 4:19 na Mkpughe 4:11.

      Gịnị bụ inyefe Chineke onwe gị?

      Tupu i mee baptizim, i kwesịrị inyefe Jehova onwe gị mgbe naanị gị nọ. Olee otú ị ga-esi eme ya?

      Ị ga-ekpe ekpere gwa Jehova na ị na-ekwe ya nkwa na ị ga-efe ya ruo mgbe ebighị ebi nakwa na ị ga na-eme ihe ọ chọrọ n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ nakwa n’agbanyeghị ihe ndị ọzọ kpebiri ime.

      Ọ bụ baptizim ị ga-eme ga-eme ka ndị ọzọ mara na i nyefeela Chineke onwe gị. Ọ ga-eme ka ndị ọzọ mara na ọ bụghịzi gị nwe onwe gị, kama na ọ bụzi Jehova nwe gị.​—Matiu 16:24.

      Ihe ị ga-echebara echiche: Gịnị mere ndụ gị ga-eji ka mma ma ị bụrụ nke Jehova? Gụọ Aịzaya 48:17, 18 na Ndị Hibru 11:6.

      Gịnị mere ime baptizim ji dị mkpa?

      Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ime baptizim. (Matiu 28:19, 20) N’ihi ya, baptizim ka bụkwa ihe dị mkpa Ndị Kraịst ga-emerịrị. N’eziokwu, Baịbụl kwuru na mmadụ kwesịrị ime baptizim ka e wee zọpụta ya.​—1 Pita 3:21.

      Ma, ihe kwesịrị ime ka i kpebie ime baptizim bụ maka na ị hụrụ Jehova n’anya, jirikwa adịm ná mma gị na ya kpọrọ ihe. Obi kwesịrị ịdị gị otú ahụ ọ dị ọbụ abụ, onye dere, sị: ‘Gịnị ka m ga-eji kwụọ Jehova ụgwọ maka ihe ọma niile o meere m? M ga-akpọku aha Jehova. M ga-emezu nkwa m kwere Jehova.’​—Abụ Ọma 116:12-14.

      Ihe ị ga-echebara echiche: Olee ihe ọma Jehova meere gị, oleekwa otú ị ga-esi kwụghachi ya? Gụọ Diuterọnọmi 10:12, 13 na Ndị Rom 12:1.

      Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

      Mijin.

      “Mmadụ inyefe Jehova onwe ya bụ nkwa ka onye ahụ na-ekwe ya, ọ bụghịkwa ihe e ji egwu egwu. Ma, mmadụ nyefee Jehova onwe ya, ọ na-agọzi onye ahụ nke ukwuu. A sị ka e kwuwe, ọ ga-elekọtali anyị karịa otú anyị ga-elekọta onwe anyị.”​—Mijin.

      Ember.

      “Jehova ebula ụzọ gosi na ọ hụrụ gị n’anya. Ị ga-egosi ya na ị hụrụ ya n’anya nke ukwuu ma i mee baptizim. Mmadụ mee baptizim, ọ bụ nnukwu ihe ọma meere ya, a ga-agọzikwa ya mmaji kwuru mmaji maka ya.”​—Ember.

      Julian.

      “Ikpebi inyefe Chineke onwe gị na ime baptizim bụ mkpebi kacha mkpa i nwere ike ime. Ma, ụjọ ekwesịghị ịtụ gị ikpebi ya. Ọ bụrụ na i jikere maka ya, kpebiekwa ime ya maka na ị hụrụ Jehova n’anya, ọ ga-abụ mkpebi kacha mma ị ga-eme ná ndụ gị.”​—Julian.

      Ihe ndị bụ́ ụgha na ihe ndị bụ́ eziokwu

      ỤGHA ​— Ọ bụ naanị ndị toro eto ruru eru ka e mee ha baptizim.

      EZIOKWU ​— Ọ bụghị afọ ole mmadụ dị ka e ji ama ma ò ruru eru ime baptizim, kama ọ bụ ma onye ahụ ọ̀ hụrụ Jehova n’anya, dịkwa njikere irubere ya isi. Josef, Samuel, na Josaya mechara ihe dị mma mgbe ha ka dị obere. Ọtụtụ ndị na-eto eto na-emekwa otú ahụ taa.

      Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụ ihe nwatakịrị na-eme ka e ji ama ma ọ̀ na-akpa ezigbo àgwà ma na-eme ihe dị mma.”​—Ilu 20:11.

      ỤGHA ​— Ọ bụrụ na ndị enyi gị emeela baptizim, gịnwa kwesịkwara ime baptizim.

      EZIOKWU ​— Mmadụ inyefe Chineke onwe ya na ime baptizim bụ ihe mmadụ na-eji aka ya kpebie ime maka na ọ bụ ihe ọ chọrọ ime. Ọ bụghị ihe mmadụ na-eme maka afọ ole ọ dị ma ọ bụ maka na o toola, ọ bụghịkwa ihe mmadụ na-eme maka na ndị ọzọ na-eme ya ma ọ bụ maka na ndị ọzọ na-atụ anya ka o mee ya.

      Baịbụl kwuru, sị: “Ndị [Chineke] ga-eji obi ha wepụta onwe ha.”​—Abụ Ọma 110:3.

      ỤGHA ​— Ọ bụrụ na i mebeghị baptizim, ị gaghị aza ajụjụ maka ihe ndị ị na-eme.

      EZIOKWU ​— Ozugbo ị matara ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ n’anya Jehova, ị ga-aza ya ajụjụ maka ihe ndị ị na-eme, ọ bụrụgodị na i mebeghị baptizim.

      Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ ma otú ọ ga-esi mee ihe dị mma ma o meghị ya, o mehiela.”​—Jems 4:17.

      IHE Ị GA-EME: Ọ bụrụ na ụjọ na-atụ gị inyefe Chineke onwe gị ma mee baptizim, ọ ga-adị mma ka i leruo onwe gị anya chọpụta ihe bụ ụjọ gị, meekwa ihe ndị ga-enyere gị aka ịkwụsị ịtụ ụjọ? Otu ihe ga-enyere gị aka bụ ịgụ Isi nke 37 n’akwụkwọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ​—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2.

      Nchịkọta: Gịnị mere ime baptizim ji dị mkpa?

      • Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ime baptizim.

      • Mmadụ ga-emerịrị baptizim ka e wee zọpụta ya.

      • Mmadụ inyefe Jehova onwe ya ma bụrụ Onye Kraịst mere baptizim bụ ihe ọma na-enweghị atụ.

  • M̀ Kwesịrị Ime Baptizim?—Nke 2: Ijikere Maka Ime Baptizim
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
    • Ebe otu nwa agbọghọ ji Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl eme nchọnchọ banyere baptizim.

      NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

      M̀ Kwesịrị Ime Baptizim?​—Nke 2: Ijikere Maka Ime Baptizim

      Ọ bụrụ na ị na-ebi ụdị ndụ Baịbụl kwadoro, gị na Chineke adịkwa ná mma, o doro anya na ime baptizim ga na-abata gị n’obi. Olee otú ị ga-esi amata na ị dịla njikere ime ya?a

      Ihe ndị a ga-ekwu n’isiokwu a

      • Gịnị na gịnị ka m kwesịrị ịma?

      • Gịnị ka m kwesịrị ịna-eme?

      • Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

      Gịnị na gịnị ka m kwesịrị ịma?

      Ijikere maka ime baptizim apụtaghị na ị ga-eburu ọtụtụ ihe n’isi, ka à ga-asị na ị na-aga ile ule n’ụlọ akwụkwọ. Ma, i kwesịrị ịmụta ịna-eche “echiche” nke ọma, si otú ahụ mee ka obi sie gị ike na ihe Baịbụl na-akụzi bụ eziokwu. (Ndị Rom 12:1) Dị ka ihe atụ:

      • Ì kwetasiri ike na Chineke dị adị nakwa na ọ bụ ya ka i kwesịrị ịna-efe?

        Baịbụl sịrị: “Onye ọ bụla na-abịakwute Chineke ga-ekwetarịrị na ọ dị adị nakwa na ọ na-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.”​—Ndị Hibru 11:6.

        Jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị mere m ji kwere na Chineke?’ (Ndị Hibru 3:4) ‘Gịnị mere m ji kwesị ịna-efe ya?’​—Mkpughe 4:11.

        Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ isiokwu bụ́ “È Nwere Onye Kere Ihe Niile Ka Ọ̀ Bụ na E Nweghị?​—Agba nke Mbụ: Olee Ihe Mere Ị Ga-eji Kwere na Chineke Dị?”

      • Ì kwetasiri ike na ihe dị na Baịbụl si n’aka Chineke?

        Baịbụl sịrị: “Ihe niile dị n’Akwụkwọ Nsọ si n’ike mmụọ nsọ Chineke. Ha bakwara uru iji ha akụzi ihe, iji ha adọ mmadụ aka ná ntị, iji ha agbazi mmadụ, nakwa iji ha azụ mmadụ ka ọ na-eme ezi omume.”​—2 Timoti 3:16.

        Jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị mere m ji kwere na ihe e dere na Baịbụl abụghị uche mmadụ?’​—Aịzaya 46:10; 1 Ndị Tesalonaịka 2:13.

        Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ isiokwu bụ́ “Olee Otú Baịbụl Nwere Ike Isi Nyere M Aka?​​—Nke 1: Na-agụ Baịbụl Gị.”

      • Ì kwetasiri ike na Jehova ji ọgbakọ Ndị Kraịst emezu nzube ya?

        Baịbụl sịrị: “Ka a na-eto [Chineke] n’ọgbọ niile ruo mgbe niile ebighị ebi n’ihi ihe o sirila n’aka ọgbakọ nakwa n’aka Kraịst Jizọs rụọ.”​—Ndị Efesọs 3:21.

        Jụọ onwe gị, sị: ‘M gaa ọmụmụ ihe, m̀ na-ele ihe m na-amụta na Baịbụl anya ka ihe si n’aka mmadụ ka ọ̀ bụ ihe si n’aka Jehova?’ (Matiu 24:45) ‘M̀ na-aga ọmụmụ ihe ọ bụrụgodị na nne na nna m enweghị ike ịga (ma ọ bụrụ na ha kwere ka ị gaa)?’​—Ndị Hibru 10:24, 25.

        Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ịna-aga Ọmụmụ Ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze?”

      Gịnị ka m kwesịrị ịna-eme?

      A naghị atụ anya na ị ga-ezu okè ka i wee mee baptizim. Ma, i kwesịrị ịna-eme ihe ga-egosi n’eziokwu na ị chọrọ ‘ịhapụ ihe ọjọọ, mewe ezi ihe.’ (Abụ Ọma 34:14) Dị ka ihe atụ:

      • Ị̀ na-ebi ndụ otú dabara n’iwu Jehova?

        Baịbụl sịrị: “Na-agbanụ mbọ ka unu nwee ezigbo akọnuche.”​—1 Pita 3:16.

        Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú m sirila gosi na m “na-echebara ihe echiche nke ọma” nakwa na ‘azụọla m onwe m ka m mata ihe dị iche n’ihe ọma na ihe ọjọọ?’ (Ndị Hibru 5:14) ‘M̀ ga-echetali oge ndị m jụrụ ime ihe na-adịghị mma ndị ọgbọ m chọrọ ka m mee? Ndị m metere enyi hà na-agba m ume ime ihe dị mma?’​—Ilu 13:20.

        Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ isiokwu bụ́ “How Can I Train My Conscience?”

      • Ị̀ ghọtara na ị ga-aza Jehova ajụjụ maka ihe niile ị na-eme?

        Baịbụl sịrị: “Onye ọ bụla n’ime anyị ga-aza Chineke ajụjụ maka onwe ya.”​—Ndị Rom 14:12.

        Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-agwa onwe m na ndị ọzọ eziokwu?’ (Ndị Hibru 13:18) ‘M mehie ihe, m̀ na-ekweta na m mehiere ka m na-agba mbọ izochi ya ma ọ bụkwanụ bo ya ndị ọzọ?’​—Ilu 28:13.

        Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ isiokwu bụ́ “Olee Ihe M Kwesịrị Ime Ma M Mejọọ Ihe?”

      • Ị̀ na-agba mbọ ka gị na Jehova dịrị ná mma?

        Baịbụl sịrị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”​—Jems 4:8.

        Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee ihe m na-eme iji bịaruo Jehova nso?’ Dị ka ihe atụ, ‘M̀ na-agụchi Baịbụl anya?’ (Abụ Ọma 1:1, 2) ‘M̀ na-ekpe ekpere mgbe niile?’ (1 Ndị Tesalonaịka 5:17) ‘M̀ na-akpọ okwu aha ma m kpewe ekpere? Ndị enyi m hà bụ ndị enyi Jehova?’​—Abụ Ọma 15:1, 4.

        Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ isiokwu ndị a: “Olee Otú Baịbụl Nwere Ike Isi Nyere M Aka?​​—Nke 2: Mee Ka Ịgụ Baịbụl Na-atọ Gị Ụtọ” nakwa “Gịnị Mere M Kwesịrị Iji Na-ekpe Ekpere?”

      IHE I NWERE IKE IME: Gụọ isi nke 37 n’akwụkwọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ​—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2. Ọ ga-enyere gị aka ịkwadebe maka baptizim. Chebara ihe omume dị na peeji nke 308 na 309 echiche nke ọma.

      a Gụọ isiokwu bụ́ “M̀ Kwesịrị Ime Baptizim?​—Nke 1.” Ọ kọwara ihe mmadụ inyefe Chineke onwe ya na ime baptizim pụtara na ihe mere ha ji dị mkpa.

      Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

      Gabriella.

      “Ebe ahụ a jụrụ ajụjụ ụfọdụ banyere baptizim n’akwụkwọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ nyeere m aka ịhụ ebe ndị m kwesịrị imekwu nke ọma tupu m mee baptizim. O nyekwaara m aka ikpebi ihe ndị m ga-achọ ime mgbe m mechara baptizim. Mmadụ inyefe Jehova onwe ya nwere ọrụ ha na ya na-agakọ, ma ime ya bụ nnukwu ihe ọma.”​—Gabriella

      Caleb.

      “Na Baịbụl, a gwara Timoti, sị: ‘Ahapụkwala ihe ndị ị mụtara, ndị a kụziiri gị otú mere ka i kwere.’” (2 Timoti 3:14) “Wepụta oge mụọ Okwu Chineke ka obi wee sie gị ike na ihe dị na ya bụ eziokwu. Ọ bụ Jehova ka ị na-enyefe onwe gị, ọ bụghị mmadụ. N’ihi ya, ihe kwesịrị ịbụ mkpa gị ma i chewe ime baptizim kwesịrị ịbụ ime Jehova obi ụtọ.”​—Caleb.

      Nchịkọta: Olee otú m ga-esi ejikere ime baptizim?

      Leruo ihe ndị i kweere anya. Obi ò siri gị ike na Chineke dị? Ì kwetara na ọ bụ ya ka i kwesịrị ife ofufe? Ì kwetara na Baịbụl bụ Okwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee? Ì kwetara na Jehova nwere nzukọ o ji arụ ọrụ?

      Leruo àgwà gị anya. Ị̀ na-ebi ndụ otú dabara n’iwu Jehova? Ị̀ ghọtara na ị ga-aza Jehova ajụjụ maka ihe ị na-eme? Ị̀ na-agba mbọ ka gị na Jehova dịrị ná mma?

  • M̀ Kwesịrị Ime Baptizim?—Nke 3: Gịnị Na-egbochi M Ime Baptizim?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
    • Ebe a na-eme otu nwoke baptizim, ndị ọzọ anọrọ na-ekiri ya.

      NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

      M̀ Kwesịrị Ime Baptizim?​—Nke 3: Gịnị Na-egbochi M Ime Baptizim?

      Ụjọ ọ̀ na-atụ gị mgbe ọ bụla i chetara na ị ga-enyefe Jehova onwe gị, meekwa baptizim? Ọ bụrụ otú ahụ, isiokwu a ga-enyere gị aka ịma ihe ị ga-eme ka ụjọ kwụsị ịtụ gị.

      Ihe ndị a ga-ekwu n’isiokwu a

      • Ọ̀ bụrụkwanụ na mụ emee mmehie dị oké njọ ma m mechaa baptizim?

      • Ọ̀ bụrụkwanụ na m na-atụ ụjọ ma m̀ ga-emelikwa ihe ndị ha na ime baptizim so?

      • Ọ̀ bụrụkwanụ na ọ dị m ka m rughị eru ife Jehova?

      • Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

      Ọ̀ bụrụkwanụ na mụ emee mmehie dị oké njọ ma m mechaa baptizim?

      Ihe mere i ji eche otú ahụ: O nwere ike ịbụ na e nwere onye ị ma mere mmehie dị oké njọ, a chụọkwa ya n’ọgbakọ. (1 Ndị Kọrịnt 5:​11-13) I nwere ike ịna-echegbu onwe gị na ụdị ihe ahụ nwekwara ike ime gị.

      “Oge mbụ m chere echiche ime baptizim, ụjọ tụrụ m na m nwere ike imecha mee ihe ọjọọ. M chekwara otú ọ ga-esi ewute ndị mụrụ m.”​—Rebekah.

      Amaokwu Baịbụl ị ga-eburu n’uche: “Ka onye ajọ omume hapụ ụzọ ọjọọ ọ na-eso . . . Ya lọghachikwute Jehova, onye ga-emere ya ebere. Ya lọghachikwute Chineke anyị, n’ihi na ọ ga-agbaghara ya mmehie ya kpamkpam.”​—Aịzaya 55:7.

      Chee banyere ihe a: Ọ bụ eziokwu na mmadụ mee mmehie dị óke njọ ma jụ ichegharị, a na-achụpụ ya n’ọgbakọ, ma Jehova na-emere ndị dị umeala n’obi chegharịrịnụ ma nabata aka ná ntị a dọrọ ha ebere.​—Abụ Ọma 103:13, 14; 2 Ndị Kọrịnt 7:11.

      Ma, nke bụ eziokwu bụ na n’agbanyeghị na i zughị okè, Chineke nyere gị aka, i nwere ike imeri ọnwụnwa. (1 Ndị Kọrịnt 10:13) A sị ka e kwuwe, ònye na-ekpebiri gị ihe ị ga-eme? Ọ̀ bụ gị? Ka ọ̀ bụ onye ọzọ?

      “M nọ na-atụ ụjọ na m nwere ike ime mmehie dị oké njọ ma m mechaa baptizim. Ma, m mechara ghọta na ọ ga-abụrụ m mmehie ma m hapụ ime baptizim. M ghọtakwara na ekwesịghị m ikwe ka ihe ndị nwere ike ime n’ọdịnihu gbochie m ime baptizim ugbu a”​—Karen

      Ihe bụ́ isi bụ: Ọ bụrụ na ị chọrọ izere mmehie dị oké njọ, ị ga-ezereli ya, otú ahụ ọtụtụ ndị na-efe Jehova na-eme.​—Ndị Filipaị 2:12.

      Ihe ọzọ ga-enyere gị aka: Gụọ isiokwu bụ́ “How Can I Resist Temptation?”

      Ọ̀ bụrụkwanụ na m na-atụ ụjọ ma m̀ ga-emelikwa ihe ndị ha na ime baptizim so?

      Ihe mere i ji eche otú ahụ: Dị ka ihe atụ, o nwere ike bụrụ na ị ma ndị na-eto eto ụfọdụ hapụrụ ndị enyị ha na ndị ezinụlọ ha kwaga ebe dị anya ka ha nwee ike ijekwuru Jehova ozi. Ị na-echegbu onwe gị na a ga na-ele gị anya ka i mee otú ahụ.

      “Onye Kraịst ọ bụla e mere baptizim ruru eru ijekwuru Jehova ozi. Ma, ụfọdụ ndị achọghị iwepụta onwe ha ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ọnọdụ ha agaghị ekwe ha mee otú ahụ.”​—Marie.

      Amaokwu Baịbụl ị ga-eburu n’uche: “Ka onye ọ bụla na-eleru ihe ọ na-eme anya, ka o wee na-enwe ọṅụ maka ihe ọ na-eme ma ghara ịna-eji onwe ya atụnyere onye ọzọ.”​—Ndị Galeshia 6:4.

      Chee banyere ihe a: Kama iji onwe gị atụnyere ndị ọzọ, chebakwuoro ihe a dị na Mak 12:30 echiche: “Jiri obi gị niile  . . hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.”

      Cheta na ọ bụ obi gị niile ka ị ga-eji jeere Jehova ozi, ọ bụghị obi onye ọzọ. I jiri obi gị niile hụ Jehova n’anya, ị ga-achọta otú dị iche iche ị ga-esi na-ejere ya ozi otú kacha mma i nwere ike ime.

      “Ọ bụ eziokwu na ime baptizim abụghị obere okwu, ma ọ naghị eme ka ihe siere mmadụ ike. Ọ bụrụ na i mete ezigbo ndị enyi, ha ga na-enyere gị aka. Ị ga na-enwekwu obi ụtọ ma i jiri nwayọọ nwayọọ na-eme ihe ụfọdụ n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na ị na-agbara ime baptizim ọsọ, ọ bụ onwe gị ka ị na-eme.”​—Julia.

      Ihe bụ́ isi bụ: Gbalịa ka i jiri ịhụnanya Jehova gosiri gị kpọrọ ihe. Ọ bụ ya ga-eme ka inye ya ihe kacha mma.​—1 Jọn 4:19.

      Ihe ọzọ ga-enyere gị aka: Gụọ isiokwu bụ́ “How Responsible Am I?”

      Ọ̀ bụrụkwanụ na ọ dị m ka m rughị eru ife Jehova?

      Ihe mere i ji eche otú ahụ: Jehova bụ Ọkaakaa eluigwe na ụwa. E jiri ya tụnyere mmadụ, e nweghị ihe ha bụ. I nwere ike ịna-eche ma Jehova ọ̀ ma na e nwere onye dị ka gị.

      “Ebe ọ bụ na ndị mụrụ m bụ Ndịàmà Jehova, m nọ na-eche na ọ bụ ndị mụrụ m ka ha na Jehova dị ná mma, ọ bụghị mụnwa nakwa na ọ bụghị mụnwa ka Jehova dọtara.”​—Natalie.

      Amaokwu Baịbụl ị ga-eburu n’uche: “E nweghị onye ga-abịakwute m ma ọ bụrụ na Nna m, onye zitere m, adọtaghị ya.”​—Jọn 6:44.

      Chee banyere ihe a: Na ị na-eche echiche ime baptizim nwere ike ịna-egosi na Jehova na-adọta gị ka gị na ya dịrị n’ezigbo mma. Ị̀ ga-ekwenụ ka gị na ya dịrị ná mma?

      Chetakwa na ọ bụ Jehova na-ekpebi ihe ndị ọ chọrọ ka ha bịaruo ya nso ga na-eme, ọ bụghị gịnwa ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ. Okwu ya na-emesikwa gị obi ike na ị ‘bịaruo Chineke nso, ọ ga-abịarukwa gị nso.’​—Jems 4:8.

      “Nke bụ́ eziokwu bụ na na ị matara Jehova ma na-abịaru ya nso gosiri na ọ hụrụ gị n’anya. N’ihi ya, i chewe na i rughị eru ife Jehova, chetara onwe gị na ọ naghị ele gị anya otú ahụ. Otú Jehova si ele ihe anyị zikwara ezi.”​—Selina.

      Ihe bụ́ isi bụ: Ọ bụrụ na ị na-eme ihe Baịbụl kwuru na ndị chọrọ ime baptizim ga na-eme, ọ pụtara na i ruru eru ife Jehova. Chetakwa na ọ bụ Jehova ka i kwesịrị ife ofufe.​—Mkpughe 4:11.

      Ihe ọzọ ga-enyere gị aka: Gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Mere M Kwesịrị Iji Na-ekpe Ekpere?”

      Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

      Skye.

      “Ụjọ imejọ ihe ekwesịghị ime ka ị na-egbu oge ime baptizim. Ọ dị ka ịgba ọsọ. I nwere ike ikpebi na ị gaghị agba asọ maka na ị na-atụ ujọ na ị ga-ada. Ma ị dagodị, ị ga-ebilitelikwa. E nweghị otú ị ga-esi agbaru ọsọ n’isi ma ọ bụrụ na ị maliteghị amalite.”​—Skye.

      Vinicio.

      “Ụjọ imerụ ahụ anaghị egbochi onye na-eto eto ịmụ otú e si anya ụgbọala. Otú ahụ ka ọ dị ime baptizim. Anyị kwesịrị ilekwasị anya n’ime ka anyị na Jehova dịrị n’ezigbo mma, ọ bụghị ichegbuwe onwe anyị gbasara ihe ndị nwere ike ime.”​—Vinicio.

      Nchịkọta: Gịnị na-egbochi m ime baptizim?

      • Ụjọ na ị ga-eme mmehie dị oké njọ. Ọ bụrụ na ị chọrọ izere mmehie dị oké njọ, ị ga-ezereli ya, otú ahụ ọtụtụ ndị na-efe Jehova na-eme.

      • Ụjọ ma ị̀ ga-emelikwa ihe ndị ya na ime baptizim so. Gbalịa ka i jiri ịhụnanya Jehova gosiri gị kpọrọ ihe. Ọ bụ ya ga-eme ka i nye ya ihe kacha mma.

      • Ụjọ na i rughị eru. Ọ bụrụ na ị na-eme ihe Baịbụl kwuru na ndị chọrọ ime baptizim ga na-eme, ọ pụtara na i ruru eru ife Jehova. Chetakwa na ọ bụ Jehova ka i kwesịrị ife ofufe.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya