Akwụkwọ Ozi Sitere n’Aka Òtù Na-achị Isi
N’ỊGBASO ihe nlereanya Jizọs, anyị ji obi ọcha ekpegara Chineke ekpere, sị: “Ka e doo aha gị nsọ.” Dị ka Ndịàmà Jehova, ụzọ anyị si ebi ndụ na-egosi na anyị chọsiri ike ime ihe kwekọrọ n’ekpere ahụ. Otú ọ dị, ihe a chọrọ anyị n’aka abụghị nanị ịmara aha Chineke. Anyị aghaghị iji ohere ọ bụla dapụtaranụ na-eto aha ahụ. N’ezie, ịbụ onye a maara dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova bụ ihe ùgwù kachasịnụ onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ inwe.—Mat. 6:9; Aịsa. 43:10.
Iji mezuo ihe e dere n’Abụ Ọma 110:3, ndị Jehova na-eji obi ha dum arụ ọrụ ahụ Jehova kwuru na a ga-arụrịrị. Olee ihe mere ndị nọ n’afọ ndụ dịgasị iche iche na ndị a zụlitere n’ezinụlọ dịgasị iche iche ji ewepụta onwe ha ịrụ ọrụ nkwusa ahụ? Ihe bụ́ isi mere ha ji eme nke a bụ n’ihi ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ na nrara ha raara onwe ha nye ya. Jehova nyere anyị iwu na Deuterọnọmi 6:5, 6 ka anyị jiri ‘obi anyị nile, mkpụrụ obi anyị nile, na ike anyị nile,’ na-ahụ ya n’anya. Ịhụnanya dị otú a sitere n’obi na-akpali anyị iji oge anyị, ike anyị, na ihe onwunwe anyị na-akwado ihe ndị metụtara Alaeze Chineke, bụ́ nke gụnyere ikere òkè zuru ezu n’ozi ubi dị ka ọnọdụ anyị kwere anyị.
Ọ bụ ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ kpaliri ya inye iwu ka e kwusaa ozi ọma Alaeze ya n’ụwa nile. Ọ chọghị ka e bibie onye ọ bụla kama ọ chọrọ ka mmadụ nile si n’ụzọ ọjọọ ha chegharịa ma laghachikwuru Onye Okike ha iji wee dịrị ndụ. (2 Pita 3:9) Jehova kwuru, sị: “Ọnwụ nke onye na-emebi iwu adịghị atọ m ụtọ ma ọlị, kama ọ na-atọ m ụtọ mgbe onye na-emebi iwu si n’ụzọ ya chigharịa, wee dị ndụ.” (Ezik. 33:11) Mgbe anyị na-ekere òkè n’ozi ubi, anyị na-aghọ ihe àmà a na-ahụ anya nke na-egosi na Jehova hụrụ ụmụ mmadụ n’anya. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke a so n’ihe na-eme ka anyị na-enwe ọṅụ na afọ ojuju mgbe anyị na-arụ ọrụ a dị mkpa.
Anyị na-egosikwa na anyị hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu site n’otú anyị si ele Okwu ya bụ́ Bible e ji ike mmụọ nsọ dee, anya. E wezụga Bible, anyị agaraghị ama onye Chineke bụ, anyị agaraghịkwa abịaru ya nso, dị ka Jems 4:8 gbara anyị ume ka anyị mee. Anyị agaraghịkwa ama ihe mere anyị ji nọrọ n’ebe a nakwa ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Anyị agaraghị ama na ọ bụ nna anyị ochie bụ́ Adam bụ isi kotere ebù a na-agba anyị taa. (Rom 5:12) Anyị agaraghịkwa ama banyere ịhụnanya dị ukwuu Chineke gosiri site n’izite Ọkpara ọ mụrụ nanị ya ka ọ bịa gbapụta anyị. E nwere ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ Jehova si ekenyetụ anyị ihe ọmụma, amamihe, na nghọta ya. Obi dị anyị nnọọ ụtọ n’onyinye a dị oké ọnụ ahịa o nyere anyị, nke bụ́ Okwu ya e ji ike mmụọ nsọ dee! Ekele anyị nwere maka onyinye a magburu onwe ya na-akpali anyị ‘ịzụpụtara onwe anyị oge’ iji gụọ, mụọ, ma tụgharịa uche n’Okwu ya. (Efe. 5:15, 16; Ọma 1:1-3) Anyị ekwesịtụghị iwere oge anyị ji gụọ Okwu Chineke dị ka nke furu ọhịa. Kama nke ahụ, ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ kwesịrị ime ka anyị na-agụchi Okwu ya anya, nke ahụ ga-emekwa ka anyị ghọtakwuo ụdị onye ọ bụ, meekwa ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe ọ nọ sikwuo ike.
Anyị mụtara site na Bible na mgbe Adam mehiere megide Jehova, o mere ka ndị nile ga-abụ ụmụ ya, gụnyere anyị nile n’otu n’otu, banye n’ọnọdụ jọgburu onwe ya, nke olileanya na-adịghị na ya. Otú ọ dị, Chineke nwere ike nke imeghere ụmụ mmadụ ụzọ nnapụta, o mekwara ya, ma si otú ahụ hụ na nzube ya maka ụwa a ga-emezu.—Jen. 3:15.
Obi abụọ ọ bụla adịghị ya na onye ọ bụla n’ime anyị chọsiri ike ka e doo ọmarịcha aha Chineke anyị nsọ. Ka anyị na-amatakwu Chineke anyị dị ebube, bụ́ Jehova, a na-akpali anyị ịkwado ya na nzukọ ya ka ha na-eme ka a mara nzube ya na aha ukwu ya. A na-emesi anyị obi ike na ọ kwụ anyị n’azụ, na ọ na-agọzikwa anyị ugbu a, nakwa na ọ ga-enye anyị ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ.
Anyị bụ́ ndị so n’Òtù Na-achị Isi ji obi ụtọ na-agwa unu, bụ́ ezi ụmụnna anyị, na anyị hụrụ unu n’anya n’ezie. Obi dịkwa anyị ụtọ ịgwa unu na anyị nwere ekele pụrụ iche maka ezigbo mbọ unu na-agba iji oge a fọdụrụnụ hụ na unu ziri ọtụtụ mmadụ ozi ọma ruo ókè o kwere unu mee, tupu ‘oké mkpagbu ahụ’ abịa. (Mkpu. 7:14) Site n’ime otú ahụ, unu ga-enye ha ohere inweta ihe ọmụma na-eduba ná ndụ ebighị ebi, bụ́ ihe ọmụma banyere Chineke na Kraịst, nke unu onwe unu nwetarala.—Jọn 17:3.
Ụmụnna unu,
Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova