Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • scl p. 101-103
  • Nkasi Obi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nkasi Obi
  • Amaokwu Baịbụl Ndị Na-enyere Anyị Aka Ife Jehova
Amaokwu Baịbụl Ndị Na-enyere Anyị Aka Ife Jehova
scl p. 101-103

Nkasi Obi

Otú Baịbụl si akasi anyị obi ma anyị daa mbà

Nchegbu

Gụọ isiokwu bụ́ “Nchegbu”

Obi mgbawa; iwe

Ọtụtụ nsogbu ma ọ bụ mmegbu na-eme ka iwe ju ụfọdụ ndị obi

Ekli. 9:11, 12

I nwekwara ike ịgụ Ọma 142:4; Ekli. 4:1; 7:7

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Rut 1:11-13, 20​—Obi gbawara Naomi maka na di ya na ụmụ ya abụọ nwụnahụrụ ya, ya echee na Jehova ahapụla ya

    • Job 3:1, 11, 25, 26; 10:1​—Obi gbawara Job maka na akụnụba ya lara n’iyi, ụmụ ya iri anwụọ, ya amalitekwa ịrịa ọrịa

  • Amaokwu Baịbụl ndị na-akasi obi:

    • Rom 12:19; Jems 1:13

  • Ihe e kwuru na Baịbụl nke na-akasi obi:

    • Rut 1:6, 7, 16-18; 2:2, 19, 20; 3:1; 4:14-16​—Naomi malitere inwe obi ụtọ ọzọ mgbe ọ laghachiri n’Izrel, ndị mmadụ enyere ya aka, ya enyekwara ndị ọzọ aka

    • Job 42:7-16; Jems 5:11​—Okwukwe Job nwere mere ka o die nsogbu ndị bịaara ya. Jehova gọzikwara ya otú na-enweghị atụ

Ụfọdụ ndị anaghị enwe obi ụtọ n’ihi àgwà ọjọọ a na-akpaso ha

Ekli. 4:1, 2

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 1 Sam. 1:6, 7, 10, 13-16​—Hana anaghị enwe obi ụtọ n’ihi àgwà ọjọọ Penina na-akpaso ya. Nnukwu onye nchụàjà bụ́ Ịlaị chekwara na ọ na-aṅụ oké mmanya

    • Job 8:3-6; 16:1-5; 19:2, 3​—Mmadụ atọ sị na ha bịara ịkasi Job obi bụ ndị ezi omume n’anya onwe ha. Ha bokwara Job ebubo na ọ bụghị ezigbo mmadụ. Ihe a wutere Job

  • Amaokwu Baịbụl ndị na-akasi obi:

    • Ọma 37:8, 9; Efe. 4:26

  • Ihe e kwuru na Baịbụl nke na-akasi obi:

    • 1 Sam. 1:9-11, 18​—Obi bịara ruo Hana ala mgbe o kpechara ekpere o ji gwa Jehova ihe na-ewute ya n’obi

    • Job 42:7, 8, 10, 17​—Mgbe Job gbaghachaara ndị enyi ya, Jehova mere ka ọ gbakee, ya amalitekwa ịna-enwe obi ụtọ

Obi amamikpe

Ezra 9:6; Ọma 38:3, 4, 8; 40:12

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 2 Eze 22:8-13; 23:1-3​—Eze Josaya na ndị ọ na-achị bịara ghọta otú ihe ọjọọ ha mere jọruru ná njọ mgbe a gụụrụ ha ihe dị n’Iwu Mosis

    • Ezra 9:10-15; 10:1-4​—O wutere onye nchụàjà bụ́ Ezra na ndị Izrel ndị ọzọ maka na ụfọdụ ụmụ nwoke Izrel nupụụrụ Jehova isi gaa lụọ ndị ala ọzọ

    • Luk 22:54-62​—O wutere Pita onyeozi na ọ gọnahụrụ Jizọs ugboro atọ

  • Amaokwu Baịbụl ndị na-akasi obi:

    • Ọma 32:5; 103:9-14; Aịza. 1:18; Ọrụ 3:19

    • I nwekwara ike ịgụ Aịza. 38:17; Maị. 7:18, 19

  • Ihe e kwuru na Baịbụl nke na-akasi obi:

    • 2 Ihe 33:9-13, 15, 16​—Manase bụ otu n’ime ndị eze ọjọọ chịrị Juda. Ma, Chineke meere ya ebere mgbe o chegharịrị

    • Luk 15:11-32​—Jizọs mere ihe atụ banyere nwa mmefu iji gosi otú Jehova si eji obi ya niile agbaghara ndị mmadụ kpamkpam

Mgbe obi na-ajọ anyị njọ maka na ndị ọzọ gharịpụrụ anyị ma ọ bụkwanụ mejọọ anyị

Gụọ isiokwu bụ́ “Obi Ịjọ Mmadụ Njọ”

Mgbe obi na-ajọ anyị njọ n’ihi adịghị ike anyị ma ọ bụkwanụ n’ihi ihe anyị mejọrọ

Gụọ isiokwu bụ́ “Obi Ịjọ Mmadụ Njọ”

Mgbe ọ dị anyị ka anyị abaghị uru

Gụọ isiokwu bụ́ “Inwe Obi Abụọ”

Anyị nwere ike ịna-eche na anyị agaghị emerili nsogbu bịaara anyị ma ọ bụ na anyị agaghị arụli ọrụ e nyere anyị

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • Ọpụ. 3:11; 4:10​—Mosis onye amụma echeghị na ya ruru eru ịgakwuru Fero mgbe Chineke gwara ya ka ọ gaa gwa Fero ka ọ hapụ ụmụ Izrel ka yanwa bụ́ Mosis duru ha pụọ n’Ijipt

    • Jere. 1:4-6​—Jeremaya chere na ya ka bụ nwata nakwa na o rubeghị ịbụ onye amụma nke ga na-agwa ndị isi ike ihe Jehova ga-eme ha

  • Amaokwu Baịbụl ndị na-akasi obi:

    • Ọma 29:11; Aịza. 40:29; 2 Kọr. 3:4, 5; 4:7

  • Ihe e kwuru na Baịbụl nke na-akasi obi:

    • Ọpụ. 3:12; 4:11, 12​—Jehova gwara Mosis onye amụma ugboro ugboro na ya ga-enyere ya aka ka o nwee ike ịrụ ọrụ o nyere ya

    • Jere. 1:7-10​—Jehova mesiri Jeremaya onye amụma obi ike na ya ga-enyere ya aka n’ọrụ ahụ siri ike o nyere ya

Ekworo; anyaụfụ

Gụọ isiokwu bụ́ “Anyaụfụ”

Ndị ọrịa na nká na-egbochi ime ihe ha chọrọ ime

Ọma 71:9, 18; Ekli. 12:1-7

  • Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:

    • 2 Eze 20:1-3​—Eze Hezekaya bere ezigbo ákwá mgbe ọ dara ọrịa ma nọrọ n’ọnụ ọnwụ

    • Fil. 2:25-30​—Obi dara Epafrọdaịtọs mbà maka na ọ nọ na-echegbu onwe ya na ụmụnna nọ na Filipaị nụrụ na ahụ́ adịghị ya nakwa na ha nwere ike ịna-eche na ọ rụlighị ọrụ e nyere ya

  • Amaokwu Baịbụl ndị na-akasi obi:

    • Ọma 92:12-14; Aịza. 40:29-31; 46:4; 2 Kọr. 8:12

  • Ihe e kwuru na Baịbụl nke na-akasi obi:

    • 2 Sam. 17:27-29; 19:31-38​—Bazilaị nọ na-akwado Eze Devid. Devid na-akwanyekwara ya ezigbo ùgwù. Ma, mgbe Devid gwara ya ka o soro ya gaa biri na Jeruselem, ọ jụrụ maka na ọ ma na ya emeela agadi

    • Ọma 41:1-3, 12​—Mgbe ọrịa na-arịasi Eze Devid ike, obi siri ya ike na Jehova ga-enyere ya aka

    • Mak 12:41-44​—Jizọs jara otu nwaanyị di ya nwụrụ nke dara ogbenye mma maka onyinye o nyere n’ihi na o nyere ihe niile o nwere

Obi nwere ike ịjọte anyị njọ aka maka ihe e mere anyị

Gụọ isiokwu bụ́ “Mmegbu”

Egwu; ụjọ

Gụọ isiokwu bụ́ “Egwu”

Mkpagbu

Gụọ isiokwu bụ́ “Mkpagbu”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya