Olee Ebe Ha Si Enweta Ume Ha?
ỌBỤRỤ na i leruo urukurubụba dị na foto a anya, ị ga-ahụ na otu n’ime nku ya anọ abatụghị nnọọ uru. Ma, urukurubụba ahụ na-anọgide na-eri nri ma na-efe efe. Nke a abụghị ọnọdụ pụrụ iche. A hụwo ka urukurubụba dị iche iche na-eme ihe dịịrị ha kwa ụbọchị na-abụ ndị 70 pasent nke elu nku ha na-adịkwaghị.
N’otu aka ahụ, ọtụtụ ndị mmadụ na-egosipụta mmụọ kwụụrụ chịm. N’agbanyeghị ịdị na-enwe oké nsogbu elu ahụ ma ọ bụ mmetụta uche, ha adịghị ada mbà.—Tụlee 2 Ndị Kọrint 4:16.
Pọl onyeozi n’onwe ya tachiri obi n’oké ihe isi ike n’oge ọ na-eme njem ozi ala ọzọ ya. A pịara ya ụtarị, tie ya ihe, tụọ ya nkume, ma tụọ ya mkpọrọ. Tụkwasị na nke ahụ, o nwere ụdị nkwarụ ụfọdụ, eleghị anya nsogbu anya ya, nke nọgidere bụụrụ ya “ogwu n’anụ ahụ.”—2 Ndị Kọrint 12:7-9; Ndị Galetia 4:15.
Onye Kraịst bụ́ okenye aha ya bụ David gbasoro oké mwakwasị nke ịda mbà n’obi mgba ruo ọtụtụ afọ, na-ekwenye na ike Jehova dị mkpa ná mgbake ya. “Ọtụtụ mgbe, ihe ịga nke ọma e jisiri ike nweta na-eyi ka ọ na-apụ,” ka ọ na-akọwa. “N’ihu ụdị nkụda mmụọ dị otú ahụ, m tụkwasịrị onwe m na Jehova, ọ kwagidekwara m n’ezie. E nwere oge ndị m kpere ekpere ruo ọtụtụ hour n’otu mgbe. Mgbe m gwara Jehova okwu, mmetụta m nke ịnọ nanị m na abaghị uru pụrụ. Ejisiwo m ike gafere oge oké adịghị ike, ma ekele dịrị Jehova, ume esitewo n’adịghị ike a pụta—ọbụna ume iji nyere ndị ọzọ aka.”
Jehova Chineke wusiri Pọl ike. Ya mere, ọ pụrụ ikwu, sị: “Mgbe ọ bụla m na-adịghị ike, mgbe ahụ ka m na-adị ike.” (2 Ndị Kọrint 12:10) Ee, adịghị ike nile nke Pọl kụziiri ya ịdabere n’ume nke Chineke na-enye. “Enwere m ike n’ihe nile n’ime Onye ahụ Nke na-eme m ka m dị ike,” ka onyeozi ahụ kwuru. (Ndị Filipaị 4:13) Jehova na-enye ndị ohu ya ike n’ezie.