ABỤ NKE 107
Ṅomie Ịhụnanya Chineke
1. Jehova chọrọ k’anyị n’eṅomi ya.
Ọ bụ ya n’edua-nyị.
Anyị n’amata n’ọ hụr’anyị n’anya.
Anyị n’ahụ obiọma ya.
O nyere Nwa ya ọ kacha hụ n’anya
K’ọ gbapụt’anyị, mee k’a gbaghar’anyị.
O ji ya gosi n’ọ hụr’anyị n’anya.
Ịhụnanya ka Chineke bụ.
2. K’anyị ṅomie ya, hụn-dị ’madụ n’anya,
N’emekwa ebere.
K’anyị n’agbalị n’ah’ụmụnna n’anya.
’Madụ niile, hụ ha n’anya.
Ọ bụrụ n’anyị hụ Jehova n’anya,
Anyị g’ahụkwa ụmụnn’anyị n’anya.
Ha mejọọkw’anyị, k’anyị gbaghara ha.
Anyị hụrụ ha niile n’anya.
3. Ịhụnanya ya n’eme k’anyị niile
Bụr’enyi, ezie-nyi.
Jehova chọrọ k’anyị bịakwute ya,
K’anyị bịa hụ ịdị n’otu.
Bịa soron-dị ya. Ha nwer’ịhụnanya.
’Mụọn-sọ Chineke n’Okwu ya n’edua-nyị.
Anyị nwekwara ụmụnna n’agw’anyị
Na Chineke hụr’anyị n’anya.
(Gụọkwa Rom 12:10; Efe. 4:3; 2 Pita 1:7.)