Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • nwt p. 1958-1959
  • B1 Ihe Baịbụl Na-ekwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • B1 Ihe Baịbụl Na-ekwu
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mgbe Afọ 4026 T.O.N.K. Gachara
  • Afọ 1943 T.O.N.K.
  • Mgbe Afọ 1070 T.O.N.K. Gachara
  • Afọ 29 O.N.K.
  • Afọ 33 O.N.K.
  • Ihe Dị Ka n’Afọ 1914 O.N.K.
  • N’Ọdịnihu
  • Amụma E Buru n’Oge Ochie nke Gbasara Gị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Jehova Na-eme Ka A Mata Ihe O Zubere
    Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!
  • Mkpụrụ Nke Agwọ Ahụ—olee Ụzọ E Si Kpughee Ya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
B1 Ihe Baịbụl Na-ekwu

B1

Ihe Baịbụl Na-ekwu

Nke E Biri Ebi

Ọ bụ Jehova Chineke kwesịrị ịchị eluigwe na ụwa. Otú o si achị kacha mma. Ihe o bu n’obi kee ụwa na ụmụ mmadụ ga-emezu.

Ebe Adam na Iv nọ n’ogige Iden, agwọ anọrọ ha nso

Mgbe Afọ 4026 T.O.N.K. Gachara

“Agwọ ahụ” mara Jehova aka, sị na otú o si achị adịghị mma nakwa na o kwesịghị ịchị. Jehova kwere nkwa na ya ga-eme ka e nwee “nwa” ma ọ bụ “mkpụrụ” nke ga-emecha gwepịa agwọ ahụ bụ́ Setan isi. (Jenesis 3:1-5, 15, ihe e dere n’ala ala peeji ya) Ma, Jehova hapụgodịrị agwọ ahụ ka o jiri ụmụ mmadụ kwara ngwá ọrụ o ji achị ụwa.

Ebe Ebreham na-ege ntị ná nkwa Chineke na-ekwe ya

Afọ 1943 T.O.N.K.

Jehova gwara Ebreham na “nwa” ahụ o kwere ná nkwa ga-abụ otu n’ime ụmụ ya.—Jenesis 22:18.

Eze Devid

Mgbe Afọ 1070 T.O.N.K. Gachara

Jehova gwara Eze Devid nakwa nwa ya bụ́ Solomọn na “nwa” ahụ o kwere ná nkwa ga-esi n’ezinụlọ ha.—2 Samuel 7:12, 16; 1 Ndị Eze 9:3-5; Aịzaya 9:6, 7.

Mgbe e mere Jizọs baptizim

Afọ 29 O.N.K.

Jehova mere ka a mata na ọ bụ Jizọs bụ “nwa” ahụ o kwere ná nkwa, onye ga-anọchi n’ocheeze Devid.—Ndị Galeshia 3:16; Luk 1:31-33; 3:21, 22.

Mgbe a kpọgidere Jizọs n’osisi

Afọ 33 O.N.K.

Agwọ ahụ bụ́ Setan merụrụ “nwa” ahụ Chineke kwere ná nkwa ahụ́ mgbe o mere ka e gbuo Jizọs. Ma, Jehova kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, mee ka ọ dịrị ndụ n’eluigwe. Ọ nabatakwara àjà Jizọs ji ndụ ya zuru okè chụọ. Ọ bụ àjà ahụ mere o ji agbaghara ụmụ Adam mmehie ha, ọ bụkwa ya mere ọ ga-eji enye ha ndụ ebighị ebi.—Jenesis 3:15; Ọrụ Ndịozi 2:32-36; 1 Ndị Kọrịnt 15:21, 22.

Ebe a na-achụdata agwọ ahụ bụ́ Setan n’ụwa otú ahụ e kwuru n’akwụkwọ Mkpughe

Ihe Dị Ka n’Afọ 1914 O.N.K.

Jizọs chụdara agwọ ahụ bụ́ Setan n’ụwa. Ọ ga-anọ n’ụwa obere oge.—Mkpughe 12:7-9, 12.

Ebe Jizọs si n’ocheeze ya dị n’eluigwe na-achị ụwa niile otú ahụ e buru n’amụma n’akwụkwọ Mkpughe

N’Ọdịnihu

Jizọs ga-atụ Setan mkpọrọ otu puku afọ. E mechaa, ọ ga-egwepịa ya isi, nke pụtara igbu ya egbu. Ihe Jehova bu n’obi kee ụmụ mmadụ na ụwa ga-emezuzi. O nwekwaghị onye ga-emebi aha ya, ọ ga-edokwa onye ọ bụla anya na otú o si achị kacha mma.—Mkpughe 20:1-3, 10; 21:3, 4.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya