Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g00 6/8 p. 21
  • Ọnwa—Ọ̀ Na-emetụta Ndụ Gị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọnwa—Ọ̀ Na-emetụta Ndụ Gị?
  • Teta!—2000
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ememme Afọ Ọhụrụ Ndị China—Ọ̀ Bụ Maka Ndị Kraịst?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Usoro Mbara Igwe Anyị Pụrụ Iche Otú O Si Malite
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Mgbe Chi Jiri n’Ehihie
    Teta!—2002
  • Chineke Amalite Ike Ihe
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Teta!—2000
g00 6/8 p. 21

Ọnwa—Ọ̀ Na-emetụta Ndụ Gị?

RUO ọtụtụ puku afọ, ụmụ mmadụ ekwetawo na ọnwa na-achịkwa akụkụ dị iche iche nke ndụ n’elu ụwa. E chewo na mgbanwe n’ọdịdị nke ọnwa na-emetụta ihe ọkụkụ, anụmanụ, na ọbụna ụmụ mmadụ. Ọ bụ ezie na nchọpụta nke sayensị ọgbara ọhụrụ egosiwo na echiche ụfọdụ e nwere eri oge abụghị eziokwu, nkweta ndị ọzọ ka dị ruo taa. Gịnị ka ihe ndị bụ eziokwu na-egosi?

Ụfọdụ ndị kwetara na e nwere njikọ dị n’etiti mgbanwe n’ọdịdị nke ọnwa na uto nke ihe ọkụkụ. N’ihi ya, ha na-ele anya na kalenda iji kpebie mgbe a ga-akụ ihe ọkụkụ, fesa nri ala, kwụchie mmanya, ma ọ bụ chekwaa ihe ná mkpọ. A na-eme nke a ná nkweta bụ́ na e mee ihe ụfọdụ n’oge na-ekwekọghị ná mgbanwe n’ọdịdị nke ọnwa, ihe a ga-arụpụta agaghị adị mma. Otu akwụkwọ na-enye ndị ọrụ ubi ndụmọdụ a: “E kwesịrị ịkpata akwụkwọ nri ndị a ga-eri ozugbo n’oge ọnwa na-etisi ike, ebe a ga-akpata akwụkwọ nri ndị a ga-echekwa echekwa n’oge ọnwa na-adịghị etisi ike.” È nwere ihe ndabere nkà mmụta sayensị maka isi otú a ewe ihe ubi?

O yiri ka nnyocha ụfọdụ hà na-ejikọ uto nke ihe ọkụkụ na ngagharị nke ọnwa. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị ekwenyebeghị. Ha na-ekwu na ngagharị ndị ọnwa na-eme dị mgbagwoju anya, ha adịghị adị n’usoro mgbe nile, mmetụta ha adịghị abụkwa otu ụdị, ya mere o siri ike imeghachi nchọpụta ndị ahụ nnyocha ahụ dabeere na ha.

Otú ọ dị, e gosiwo na mmetụta ụfọdụ nke ọnwa dị adị. Dị ka ihe atụ, e gosiwo na e nwere ihe jikọrọ ebili mmiri bụ́ nke ikike ndọda nke ọnwa na-emetụta kpọmkwem na mgbanwe ndị dị n’ịrụ ọrụ, iri nri, ịmụ nwa, na usoro ndụ nke ọtụtụ ihe ndị dị ndụ.

Ụfọdụ na-azọrọ na ọ bụrụ na ọnwa na-emetụta ebili mmiri, ọ ghaghị imetụta ụmụ mmadụ n’otu aka ahụ, ebe ọ bụ na mmiri mejupụtara akụkụ ka ukwuu nke ahụ mmadụ. Gịnịkwa banyere mmekọrịta ahụ a sịrị dị n’etiti mgbanwe n’ọdịdị nke ọnwa na isi mgbaka, oge a mụrụ mmadụ, na ọbụna oge ịhụ nsọ, bụ́ nke ogologo oge ọ na-adịru na-afọdụ nke nta ka ọ kwekọọ ná mpụta nke ọnwa?

E mewo nnyocha ná mmụta banyere ọrịa uche, akparamàgwà mmadụ, na ọrịa ụmụ nwanyị iji mata ihe bụ eziokwu banyere okwu ahụ. E nwebeghị ezigbo ihe a chọpụtara. Ndị nchọpụta ụfọdụ na-azọrọ na ha ahụwo obere njikọ dị n’etiti ihe omume ụmụ mmadụ na ngagharị nke ọnwa, ma ndị ọzọ na-ekwu hoo haa na e nwetụghị njikọ ọ bụla dịnụ. Ha na-arụ ụka na ọ bụrụ na usoro ngagharị nke ọnwa nwere mmetụta pụtara ìhè n’ịmụ nwa, a gaara egosiworị njikọ ahụ eri ogologo oge n’ụzọ doro anya. E kwuwerị, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime nchepụta echiche ndị ahụ e zubere iji kọwaa ihe ahụ e weere na ọ bụ mmetụta ọnwa na-enwe n’ahụ mmadụ, nke doworo ndị ọkà mmụta sayensị n’ozuzu ha anya.a

Ọ bụ ezie na nkà mmụta sayensị egosiwo na ọnwa na-enwe mmetụta ụfọdụ n’ahụ ihe dịgasị iche dị ndụ n’ụwa, ọ dịghị mfe ikwubi ókè ọ na-emetụtaru ha. Eluigwe na ala anyị dị nnọọ mgbagwoju anya, ma ọ dịghịkwa ihe ọzọ ka ọ dị ugbu a, a mabeghị ọtụtụ usoro ndị dị ebube na-achịkwa ha.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ụfọdụ n’ime nchepụta echiche ndị a metụtara ìhè nke ọnwa, ike ndọda, ikike ndọta, na ikike ndọta nke eletrik.

[Foto dị na peeji nke 21]

Chi nwanyị bụ́ Selene, nke ndị Gris na ndị Rom oge ochie fere ofufe dị ka ihe nnọchianya nke ọnwa

[Ebe E Si Nweta Foto]

Musei Capitolini, Roma

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya