Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g02 4/8 p. 32
  • Anya Nọ Na-ele Ha

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Anya Nọ Na-ele Ha
  • Teta!—2002
Teta!—2002
g02 4/8 p. 32

Anya Nọ Na-ele Ha

ỤMỤ okorobịa abụọ dị afọ iri na ụma banyere n’otu ụlọ nri dị n’otu obodo nta n’Ohio, U.S.A. iji rie nri ụtụtụ. Dị ka ha na-eme mgbe nile, tupu ha erie nri, ha hulatara isi ma kpee ekpere n’ime obi ha.

Mgbe nke ahụ gasịrị, otu nwanyị nke nọ na-ekiri ihe ha na-eme bịara na tebụl ha ma welie mpempe akwụkwọ e depụtara ego ole ha ga-akwụ. Ọ gwara ha, sị: “N’ụwa ebe anyị na-anụ nnọọ akụkọ ọjọọ banyere ndị ntorobịa anyị, ọ bụ ihe dị nnọọ mma bụ́ nke a na-adịghị ahụkebe ịhụ ụmụ okorobịa abụọ na-ewepụta oge iji kelee Chineke maka nri ha. Ọ ga-amasị m ịkwụrụ unu ụgwọ nri a.”

Nke a riri ụmụ okorobịa abụọ ahụ ọnụ ma ha kelere nwanyị ahụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, ha tụgharịrị uche na ha ekwesịghị ịhapụ nwanyị ahụ ka o chewe na ọ bụ nnọọ Chi nkịtị ọzọ ka ha nọ na-ekpegara ekpere. Ya mere, otu n’ime ha gakwuuru nwanyị ahụ, mgbe o kelesịkwara ya ọzọ, ọ gwara ya na ha bụ Ndịàmà Jehova.

Ọ bụ ihe Ndịàmà Jehova na-eme mgbe nile bụ́ isoro ezinụlọ ha na-amụ Bible. Ndị mụrụ ụmụ okorobịa a na-eme otú ahụ. Otu n’ime akwụkwọ ezinụlọ ndị ahụ mụrụ bụ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Isiokwu nke otu n’ime isiakwụkwọ 19 nke akwụkwọ a na-ekwu banyere ekpere bụ “Otú Ị Pụrụ Isi Bịaruo Chineke Nso.”

Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu n’ime akwụkwọ a e ji amụ Bible bụ́ nke nwere peeji 192, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya