Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g04 12/8 p. 20
  • Ụlọikpe Europe Akwadoo Ihe Ndị Ruuru Otu Nne

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụlọikpe Europe Akwadoo Ihe Ndị Ruuru Otu Nne
  • Teta!—2004
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú Anyị Si Mee Ihe Niile Anyị Nwere Ike Ime Ka E Kwe Anyị Ịna-efe Chineke Otú Ọ Chọrọ
    Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!
  • Mmeri E Nwere n’Ụlọikpe Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na Europe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Okwu Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze Chineke Wepụrụ n’Ụlọikpe
    Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!
  • E Wepụ Ndịàmà Jehova n’Ụta na Gris
    Teta!—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2004
g04 12/8 p. 20

Ụlọikpe Europe Akwadoo Ihe Ndị Ruuru Otu Nne

Site n’aka onye edemede Teta! na France

NA December 16, 2003, Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na Europe, bụ́ nke dị na Strasbourg, France, mara ụlọikpe ndị dị na France ikpe ịkpa ókè n’ihi okpukpe megide Séraphine Palau-Martínez, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova.

N’afọ 1996, e kwere ka Séraphine gbaa di ya alụkwaghịm, bụ́ onye gbahapụrụ ya afọ abụọ tupu mgbe ahụ. E kwere ka ọ kpọrọ ụmụ abụọ ha mụrụ. Ma n’afọ 1997, bụ́ mgbe ụmụaka ahụ na nne ha biworo ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ atọ na ọkara, nna ha ekweghị ịkpọlata ha mgbe ha gara ileta ya. Séraphine na-akọ, sị: “Mgbe m gara n’ụlọ akwụkwọ ịkpọlata ụmụaka ahụ, onyeisi ụlọ akwụkwọ ha kpọrọ ndị uwe ojii. Ọ bịaziri bụrụ na aghaghị m ịnọ n’ihu ndị uwe ojii hụ ụmụ m ka e wee jide n’aka na agwaghị m ha ihe banyere okpukpe m. Ọ dị nnọọ ka a ga-asị na m bụ onye omekome. Ha gwara m na m pụrụ ịkpọrọ ụmụ m laa nanị ma ọ bụrụ na m ga-abịanye aka n’akwụkwọ nke na-ekwu na m gaghị agwa ha ihe banyere Chineke ma ọ bụ Bible, ma ọ bụkwanụ kpọrọ ha gaa nzukọ Ndị Kraịst.”

Séraphine gara gbaa akwụkwọ n’ụlọikpe. Otú ọ dị, n’afọ 1998, Ụlọikpe Mkpegharị Ikpe nke Nîmes kpebiri ka nna ụmụaka ahụ kpọrọ ha. Ụlọikpe ahụ mere ka mkpebi ikpe ya yie ihe ziri ezi site n’ịkatọ n’ụzọ dị njọ, ụkpụrụ ndị o kweere na Ndịàmà Jehova na-akụziri ụmụ ha. Séraphine na-echeta, sị, “O wutere m nke ukwuu na e boro m ebubo na m na-emebi ụmụ m, ebe nanị ihe m na-agbalị ime bụ inye ha ihe m chere ga-akasị abara ha uru—ịzụlite ha ịghọ Ndị Kraịst.”

Mgbe Cour de Cassation, bụ́ ụlọikpe mkpegharị ikpe kasị elu na France, kwenyere n’ihe ụlọikpe mbụ ahụ kpere, Séraphine kpebiri iwepụ okwu ahụ n’Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na Europe. Ná mkpebi nke mmadụ isii n’ime ndị ọkàikpe asaa kpere ikpe ahụ kwadoro, e kpebiri na “n’anya Ụlọikpe a, ihe ịrụ ụka ọ bụla adịghị ya na ụlọikpe mkpegharị ikpe [nke France] kpere ikpe mkpegbu n’etiti nne na nna ahụ n’ihi okpukpe onye nke gbara akwụkwọ. . . . Ikpe mkpegbu dị otú ahụ bụ ịkpa ókè.” Ọ chọpụtara na mkpebi ụlọikpe France mere adabereghị n’ikike Séraphine nwere ilekọta ụmụ ya—ihe ọ na-adịghị mgbe a gbaghara—ma ọ bụkwanụ n’akaebe ndị mere eme, kama ọ dabeere “n’ihe a na-ekwukarị banyere Ndịàmà Jehova.” N’ihi ịkpa ókè okpukpe a na nnapụ a napụrụ Séraphine ihe ndị ruuru ya, Ụlọikpe ahụ nyere France iwu ka ọ kwụọ ego iti aka n’obi na nke ihe ndị e mefuru.

Mkpebi a kwekọrọ n’ihe Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na Europe kpebiri na June 1993 n’ikpe yiri nke a bụ́ nke Ụlọikpe ahụ chọpụtara na Austria kpara ókè megide Ingrid Hoffmann, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, n’ihi okpukpe ya.a “N’ụzọ kwekọrọ ná mkpebi e mere n’ikpe Hoffmann,” ka akwụkwọ na-atụle ikpe ndị e kpere na France bụ́ La Semaine juridique na-ekwu, “mkpebi a na-eme ka o doo anya na okpukpe abụtụghị ihe bụ́ isi a ga-adabere na ya wee na-ekpebi onye o ruuru ilekọta ụmụ.” Ọkàiwu kpechiteere Séraphine ọnụ ya kwuru, sị: “Mkpebi a dị nnọọ mkpa, ebe ọ bụ na mkpebi Ụlọikpe a mere adịghị agbanwe agbanwe ma a bịa n’oruru o ruuru nne ma ọ bụ nna bụ́ Onyeàmà Jehova inweta ikpe kwụ ọtọ.”

Mgbe a jụrụ ya otú obi dị ya, Séraphine, bụ́ onye bizi na Spen, kwuru, sị: “Obi dị m ụtọ nke ukwuu, obi m alọtuwokwa. Ọ bụụrụ m ahụmahụ jọgburu onwe ya ịbụ onye a napụrụ ụmụ m n’ihi okpukpe m ma ghara ịhụ ha anya ruo afọ ise, ma Jehova kwagidere m n’oge a nile. Ana m enwe olileanya na mkpebi ikpe a ga-enyere ndị ọzọ nọ n’ọnọdụ m aka.”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Lee Teta! nke February 8, 1994, peeji nke 15, “E Wepụrụ Ndịàmà Jehova n’Ụta n’Agha A Na-ebu Maka Ikuchi Nwa.”

[Foto dị na peeji nke 20]

Séraphine

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya