Ụwa Anyị A Na-emebi n’Ụzọ Dị Egwu
N’AFỌ 1805, ndị nchọpụta a ma ama bụ́ Meriwether Lewis na William Clark rutere n’Osimiri Columbia bụ́ nke dị na Steeti Washington, U.S.A. nke oge a.a Ihe dọọrọ mmasị ha karịa osimiri ahụ n’onwe ya bụ otú azụ salmon si jupụta na ya. “Azụ ndị a hiri nne nke ukwuu nke na ọ dị anyị ka ọ̀ bụ ná nrọ,” ka ha dere n’akwụkwọ njem ụgbọ mmiri ha. “Ọnụ ọgụgụ azụ mmiri ahụ na-ebu agbada na-akarị akarị, ọ na-ebupụtakwa ha n’ikpere mmiri nke na nanị ihe ndị obodo ahụ na-eme bụ ikpokọta ha, gburisie ha, ma chekpọọ ha.” N’ezie, azụ salmon hiri nnọọ nne nke na ndị obodo ahụ na-echekpọ ha ma jiri ha mere nkụ!
Taa, a na-anụzi ihe dị iche. “Ruo ihe karịrị afọ iri, ndị ọkà mmụta sayensị maara na ọnụ ọgụgụ azụ a na-egbu n’oké osimiri karịrị nnọọ ihe azụ na-amụ,” ka otu akụkọ e si na magazin bụ́ Newsweek nweta na-ekwu. Dị ka ihe atụ, e mere atụmatụ na e gbuchapụla pasent iri itoolu nke azụ salmon dị n’Ebe Ugwu nke Oké Osimiri Atlantic.
Ma, ọ bụghị nanị azụ bụ ihe dịzi ụkọ. A na-egwukpọ ihe ndị dị ka mmanụ ala na akụ̀ ndị ọzọ dị n’ime ala, na-egbukpọkwa osisi ndị dị n’oké ọhịa, n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị egwu. Òtù Na-ahụ Maka Anụ Ndị Bi n’Ọhịa Ụwa na-akọ na, n’agbata afọ 1970 na afọ 1995, pasent iri atọ nke akụ̀ ndị sitere n’okike funahụrụ ụmụ mmadụ. Mgbe mgbe, usoro e ji enweta akụ̀ ndị a sitere n’okike na-eyi mma ihu abụọ, ebe ọ bụ na usoro ahụ pụrụ ibibi ihe ndị gbara akụ̀ ndị a gburugburu.
Ụfọdụ na-eche na ebe nsogbu ndị a si ụmụ mmadụ n’aka, na ụmụ mmadụ pụrụ idozi ha. Iji maa atụ, n’afọ ndị na-adịbeghị anya, mmetọ ikuku belatara n’ọtụtụ obodo mepere emepe. Olileanya dị otú ahụ e nwetụrụ ọ̀ pụtara na ihe a kpọrọ mmadụ achịkwawala ọnọdụ ahụ?
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a E zigara Lewis na Clark ka ha gaa nyochaa ma see map nke ógbè ahụ a ka nwetara ọhụrụ bụ́ nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Mississippi.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]
© Kevin Schafer/CORBIS