Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g05 2/8 p. 24-25
  • Hanbok Ejiji Ndị Korea

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Hanbok Ejiji Ndị Korea
  • Teta!—2005
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Uwe A Na-akwa n’Ụzọ Pụrụ Iche
  • Uwe A Pụrụ Iyi Mgbe Ọ Bụla
  • Hanbok Taa
  • Isiokwu Ndị dị n’Akwụkwọ a
    Teta!—2004
  • Kaba—Ụdị Uwe Africa nke Mara Mma
    Teta!—1998
  • Ụdị Uwe Ị Na-eyi Ọ̀ Na-eme Ka E Too Chineke?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Mgbanwe Ejiji Na-agbanwe
    Teta!—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2005
g05 2/8 p. 24-25

Hanbok Ejiji Ndị Korea

Site n’aka onye edemede Teta! na Republic of Korea

NYE ndị Korea, uwe karịrị nanị ihe e ji ekpuchi ọtọ. Otu ihe atụ na-egosi nke a bụ ejiji ndị Korea a na-akpọ hanbok.

Uwe A Na-akwa n’Ụzọ Pụrụ Iche

Ihe mejupụtara ejiji hanbok bụ uwe owoghoro na sket owoghoro nke na-agbadaru n’ala.a N’ụfọdụ n’ime ha, sket ya na-eto ogo okpukpu anọ karịa uwe ya. N’ihi ya, ọbụna nwanyị dị mkpụmkpụ na-adị ka ò toro ogo ma o yiri ya.

A na-asụ sket Hanbok asụ̀. Aka ya na-emepe ka nku nnụnụ, ebe sket ya na-esi n’obi gbasara ruo n’ala. Iji mee ka a hụkwuo ebe obi nke onye yi ya, a na-adụnye ákwà e kere ka taị n’ebe obi ya. Ọ na-afọkwa nke nta ka ọnụ ákwà ahụ e kere ka taị na-akpụ n’ala. Ọtụtụ hanbok nwekwara ọmarịcha ihe osise fụlawa na ihe osise ndị ọzọ e ji chọọ ha mma n’aka na n’olu uwe ha nakwa na sket ha. N’ezie, otú hanbok haruru, ọdịdị ya, na ụcha ya gbakọrọ aka mee ka ọ bụrụ ejiji magburu nnọọ onwe ya.

Uwe A Pụrụ Iyi Mgbe Ọ Bụla

Otú e si akwa hanbok na-eme ka mma ya pụtakwuo. Ebe ọ bụ na a na-esikarị n’ihe ndị sitere n’okike enweta ihe ndị e ji ekwe ákwà hanbok, ọ dị mfe iyi ya mgbe ọ bụla n’afọ. Dị ka ihe atụ, hanbok e si n’ahụ́ osisi dị ka hemp nweta ihe e ji kwee ya, na-eme ka ikuku na-abata n’ahụ́ onye yi ya. Nke a na-emekwa ka ahụ́ jụọ onye ahụ oyi ma o yiri ya n’oge okpomọkụ n’agbanyeghị na ọ ga-ekpuchicha ahụ́ ya. Ihe ndị ọzọ e ji ekwe ya na-eme ka ahụ́ kporo onye yi ya ọkụ, nke a na-eme ka ha kara baa uru n’oge ụgụrụ.

Uwe Hanbok na-ekusa ekusa n’ahụ́. A kwaghị ya otú ahụ iji mee ka ọ bụrụ ejiji na-ewu ewu kama ọ bụ n’ihi ezigbo mkpa e nwere ọtụtụ narị afọ gara aga bụ́ mgbe a na-agbakarị ịnyịnya n’ógbè ahụ. Magazin bụ́ Culture & I kwuru, sị: “E wepụtara uwe a iji na-eche oyi na iji na-achụ nta ma na-achịgharị anụmanụ.” N’ihi ya, ndị Korea na-agba ịnyịnya ekweghị eyi uwe ọ bụla na-ekusaghị ha ekusa n’ahụ́. N’ezie, ndị Korea bụ́ ndị na-eyi hanbok taa ji ndị nna nna ha hà ụgwọ ekele maka otú uwe ahụ si ekusa ekusa n’ahụ́!

Ihe ọzọ na-akpali mmasị banyere hanbok bụ ihe a na-eme kemgbe ụwa nke bụ́ iji ụcha uwe amata onye bụ́ onye. N’oge gara aga, ndị ọchịchị Korea na-eyi uwe tụrụ àgwà, ebe ndị nọ n’ọkwá dị ala na-eyikarị uwe ọcha. Ọzọkwa, a pụrụ ịmata nwanyị na-alụbeghị di site na ya iyi uwe na-achakọta odo odo na ọbara ọbara. Ọ lụọ di, ụcha hanbok ya ga-ekwekọ n’ọkwá di ya nọ na ya. N’ememe agbamakwụkwọ taa, nne nwanyị a na-alụ alụ kwesịrị iyi uwe na-acha pinki pinki, ebe nne nwoke na-alụ nwanyị ahụ na-eyi nke na-acha anụnụ anụnụ. N’ezie, nke a na-eme ka ọ dị mfe ịmata ha.

Hanbok Taa

Mgbe Agha Korea (1950-1953) biri, a malitere ime mkpọsa ka e jiri ihe ọgbara ọhụrụ na-eme ihe. N’ihi ya, ka ọ na-eru n’afọ ndị 1970, a kwụsịrị iyi uwe hanbok, e jikwa ejiji ndị bi n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa dochie ya. Ihe bụbu uwe a na-eyi kwa ụbọchị si otú a ghọọ uwe na-anọzi n’ala igbe. Nanị mgbe a na-ahụ ya bụ n’oge agbamakwụkwọ, n’oge ememe, na n’oge ndị ọzọ a na-eme ihe omume pụrụ iche.

Otú ọ dị, n’oge na-adịbeghị anya, a maliteghachiwo iyi hanbok. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1996, e mere mgbalị ime ka ejiji ahụ maliteghachi iwu ewu mgbe e wepụtara Saturday mbụ nke ọnwa ọ bụla dị ka “ụbọchị a ga na-eyi hanbok.” Ndị na-emepụta uwe mepụtara hanbok ndị ọhụrụ, bụ́ ndị e mepụtara karịsịa maka ndị ntorobịa. Ihe àmà na-egosi na ndị mmadụ ịlaghachi n’ihe e jibu mara ha na-enye afọ ojuju, n’ihi na ejiji hanbok nke oge a na-ewuzi nnọọ ewu. N’ọgbọ nke ọtụtụ n’ime ejiji ndị e nwere na-egosipụta ọchịchọ anụ ahụ́, hanbok bụ ihe atụ magburu onwe ya nke ejiji mara mma ma kwesị ekwesị.—1 Timoti 2:9.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụ ezie na e nwere hanbok nke ụmụ nwoke na nke ụmụ nwanyị, nke anyị na-atụle n’isiokwu a bụ nke ụmụ nwanyị.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya