Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g05 5/8 p. 32
  • Ndị Ntorobịa Bụ́ Ndị Na-achọ Azịza

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Ntorobịa Bụ́ Ndị Na-achọ Azịza
  • Teta!—2005
Teta!—2005
g05 5/8 p. 32

Ndị Ntorobịa Bụ́ Ndị Na-achọ Azịza

Mgbe e mere ememe Ụbọchị Ụwa Nile nke Ndị Ntorobịa Katọlik nke ugboro 17 na Toronto, Canada, n’afọ 2002, ọtụtụ narị puku mmadụ si n’akụkụ nile nke ụwa bịa. Ọ bụ ezie na Ndịàmà Jehova esoghị n’ememe ahụ, ha tụrụ anya na ọtụtụ ndị na-eto eto ga-abịaju n’obodo ahụ. Olee otú ha si jikere maka nke a? Dị nnọọ ka Ndị Kraịst narị afọ mbụ mere, ha ji ohere ahụ gwa ha banyere ihe ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ.—Ọrụ 16:12, 13.

Ndịàmà jara ndị ntorobịa ndị a mma maka mmasị ha nwere n’ihe ime mmụọ. Nke a mere ka ha soro ọtụtụ n’ime ha kparịta dị ka enyi na enyi banyere ihe ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ. Mgbe otu Onyeàmà jụrụ otu nwa agbọghọ ma Ụbọchị Ụwa Nile nke Ndị Ntorobịa ahụ ọ̀ dị otú ọ tụrụ anya ya, ọ zara, sị: “Ka ọ dị ugbu a, ihe anyị ka hụrụ bụ iti egwú na ịgba egwú, ma ahụbeghị m ihe mere ka okwukwe m sikwuo ike.”

Mgbe ahụ, Onyeàmà ahụ nyere nwa agbọghọ ahụ broshuọ aha ya bụ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, na-akọwara ya na ọ zara ọtụtụ ajụjụ ndị mmadụ jụworo banyere Bible, ndị dị ka, “Ọ̀ bụ Okwu Chineke n’ezie?” na “Olee otú anyị pụrụ isi mara na a gbanwebeghị ihe ndị e dere na ya?”

Nwa agbọghọ ahụ zara, sị: “Ndị a bụ ajụjụ ndị na-agbagwoju m anya ná ndụ m ugbu a. Ọ dị m mkpa inweta azịza ha. Achọrọ m ịgụ akwụkwọ a ozugbo. O nwere ike ịbụ ihe kasị mkpa m nwetara na njem a.”

Nke ahụ bụ nanị otu n’ime ọtụtụ mkparịta ụka Ndịàmà na ọtụtụ ndị bịara ememe Ụbọchị Ụwa Nile nke Ndị Ntorobịa Katọlik ahụ nwere. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu broshuọ a dị peeji 32 bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya